Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be p. 74-p. 77 para. 2
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-enwe Ọganihu
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọmụma na Ime Mgbanwe
  • Jiri Onyinye Ndị I Nwere Mee Ihe
  • Òkè Inwe Ahụmahụ Na-ekere
  • Nọgide Na-etinye Mgbalị
  • Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Ọganihu Unu Pụta Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mee Ka Ịga n’Ihu Gị Pụta Ìhè
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be p. 74-p. 77 para. 2

Nọgide Na-enwe Ọganihu

MGBE mbụ ị mụtara itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ụzọ ndị mawooro gị ahụ́ i si eche echiche, ekwu okwu, ma na-eme omume malitere iji nwayọọ nwayọọ na-agbanwe. Ihe dị ukwuu na mgbanwe a weere ọnọdụ ọbụna tupu i debanye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ma eleghị anya i nweela ọganihu ugbu a ruo n’ókè nke na ị rarawo ndụ gị nye Jehova. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ị pụrụ ịkwụsị inwe ọganihu? Ọ dịghị ma ọlị. Baptizim gị bụ nanị mmalite.

Timoti bụ́ onye na-eso ụzọ anọworị na-eje ozi dị ka Onye Kraịst bụ́ okenye mgbe Pọl gwara ya ka ọ “na-echebara” ma ndụmọdụ e nyere ya ma ihe ùgwù ije ozi ndị e nyefere ya n’aka echiche—ka ọ ‘na-etinye obi ya dum’ n’ihe ndị a—ka ‘ọganihu ya wee pụta ìhè nye mmadụ nile.’ (1 Tim. 4:12-15) Ma ị̀ ka na-amalite amalite igbaso ụzọ nke eziokwu ma ọ̀ bụ na i nwewo ahụmahụ dị ukwuu n’ibi ndụ dị ka Onye Kraịst, i kwesịrị inwe mmasị n’inwe ọganihu.

Ihe Ọmụma na Ime Mgbanwe

Ná Ndị Efesọs 3:14-19, anyị na-agụ na Pọl onyeozi kpere ekpere ka ndị kwere ekwe ibe ya “nwee ike nke ọma . . . [ijiri] uche ghọta ihe bụ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke eziokwu. Iji mee nke ahụ, Jizọs nyere onyinye n’ụdị mmadụ ka ha zie ọgbakọ ihe, gbazigharịa ya, ma wulie ya elu. Ịtụgharị uche mgbe nile n’Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ, tinyere nduzi a na-enweta site n’aka ndị ozizi nwere ahụmahụ, pụrụ inyere anyị aka ‘itolite’ n’ụzọ ime mmụọ.—Efe. 4:11-15.

Uto ahụ na-agụnye ịbụ ndị ‘e mere ka ha dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche ha.’ Nke a na-agụnye ịzụlite ụzọ iche echiche nke siri ike nke kwekọrọ na nke Chineke na nke Kraịst. Ọ chọrọ ịdị na-amata mgbe nile otú ha si eche echiche, iji wee ‘yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ.’ (Efe. 4:23, 24) Mgbe ị na-amụ Oziọma ndị ahụ, ị̀ na-ewere ihe ndekọ ndị a nke ndụ Kraịst dị ka ụkpụrụ ị ga-agbaso? Ị̀ na-agbalị ịmata àgwà ụfọdụ kpọmkwem ndị Jizọs gosipụtara, mgbe ahụkwa mee ezi mgbalị iṅomi ha ná ndụ nke gị?—1 Pita 2:21.

Isiokwu ndị ị na-ewebata ná mkparịta ụka pụrụ ịbụ ihe àmà na-egosi ókè i nweruworo ọganihu dị otú ahụ. Ndị yikwasịworo ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ adịghị ekwu okwu aghụghọ, okwu mkparị, okwu rụrụ arụ, ma ọ bụ okwu ọjọọ. Kama nke ahụ, okwu ha na-adị “mma maka iwuli elu . . . ka o wee nye ndị na-anụ ya ihe dị ụtọ.” (Efe. 4:25, 26, 29, 31; 5:3, 4; Jud 16) Ihe ha na-ekwu mgbe ha nọ nanị ha nakwa ná nzukọ ọgbakọ na-ekpughe na eziokwu ahụ na-agbanwe ndụ ha.

Ọ bụrụ na ị bụkwaghị onye “ebili mmiri na-erugharị na [onye] ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị,” nke a kwa bụ ihe àmà nke inwe ọganihu. (Efe. 4:14) Dị ka ihe atụ, olee otú i si emeghachi omume mgbe ụwa jiri ọtụtụ echiche ọhụrụ, nzube, ma ọ bụ ụdị ntụrụndụ dị iche iche gbaa gị gburugburu? À na-anwa gị ọnwụnwa isi n’ihe ime mmụọ ndị dịịrị gị ime wepụta oge iji chụsoo ihe ndị dị otú ahụ? Ime otú ahụ pụrụ igbochi ọganihu ime mmụọ. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya karị ịzụpụta oge iji chụsoo ihe ime mmụọ!—Efe. 5:15, 16.

Otú i si emeso ndị ọzọ pụkwara ịbụ ihe àmà nke ọganihu ime mmụọ. Ị̀ mụtawo ‘inwe obi ọmịiko, na-agbaghara ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị kpam kpam’?—Efe. 4:32.

Ọganihu gị n’ime ihe n’ụzọ Jehova chọrọ kwesịrị ịpụta ìhè ma n’ọgbakọ ma n’ebe obibi. O kwesịkwara ịpụta ìhè n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọha na eze na-anọ, na n’ebe ị na-arụ ọrụ ego. (Efe. 5:21–6:9) Ọ bụrụ na n’ọnọdụ nile dị otú ahụ na ị na-egosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke n’ụzọ zuru ezu karị, mgbe ahụ ọganihu gị na-apụta ìhè.

Jiri Onyinye Ndị I Nwere Mee Ihe

Jehova enyewo onye ọ bụla n’ime anyị ikike na nkà dị iche iche. Ọ na-atụ anya ka anyị jiri ha mee ihe maka ndị ọzọ n’ụzọ ga-eme ka o nwee ike isite n’aka anyị gosipụta obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Pita onyeozi dere banyere nke a, sị: “Ruo n’ókè onye nke ọ bụla nataworo onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke.” (1 Pita 4:10) Olee otú i si arụ ọrụ gị dị ka onye nlekọta ụlọ?

Pita gara n’ihu, na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ekwu okwu, ya kwuo dị ka ọ bụ okwu dị nsọ nke Chineke.” (1 Pita 4:11) Amaokwu a na-emesi ike ibu ọrụ nke ikwu okwu n’ụzọ nwere nkwekọ zuru ezu n’Okwu Chineke, ka e wee nye Chineke otuto. Ụzọ e si ekwu okwu dị otú ahụ kwesịkwara inye Jehova otuto. Ọzụzụ a na-enye site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke pụrụ inyere gị aka iji onyinye i nwere mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ—na-enye Chineke otuto site n’ụzọ i si enyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ nzube gị, olee otú i kwesịrị isi na-atụ ọganihu gị n’ụlọ akwụkwọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?

Kama ịdị na-eche echiche banyere isi ihe ole ị rụworo ọrụ na ha na fọm ndụmọdụ okwu gị ma ọ bụ ụdị ihe omume ndị e nyeworo gị, tụgharịa uche n’ókè ọzụzụ ahụ meworo ka àjà otuto gị karuo mma. Ụlọ akwụkwọ a na-akwadebe anyị ịbụ ndị dị irè karị n’ozi ubi. Ya mere, jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m akwadebe n’ezie ihe m ga-ekwu n’ozi ubi? Àmụtawo m igosi mmasị onwe onye n’ebe ndị m na-agbara àmà nọ? Àna m atọ ntọala maka ime nletaghachi site n’ịhapụrụ ndị mmadụ ajụjụ a ga-atụle n’oge ọzọ? Ọ bụrụ na mụ na mmadụ na-amụ Bible, àna m agbalị inwe ọganihu dị ka onye ozizi nke na-eru n’obi?’

Atụla ọganihu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nanị na-adabere n’ihe ùgwù ije ozi ndị a na-enye gị. A na-ahụ ọganihu gị, ọ bụghị n’ihe omume e nyere gị, kama n’otú i si eme ya. Ọ bụrụ na e nye gị ihe omume nke metụtara izi ihe, jụọ onwe gị, sị: ‘Èji m nkà izi ihe mee ihe n’ezie? M̀ mere ihe omume ahụ n’ụzọ mere ka o nwee mmetụta ná ndụ ndị nụrụ ya?’

Agbamume bụ́ ka i jiri onyinye gị na-eme ihe pụtara iji ọgụgụ isi gị na-eme ihe. Ị̀ na-ebu ụzọ eme ihe iji soro ndị ọzọ rụọ ọrụ n’ozi ubi? Ị̀ na-achọ ohere ndị ị ga-eji nyere ndị ọhụrụ, ndị na-eto eto, ma ọ bụ ndị na-adịkwaghị ike nọ n’ọgbakọ gị aka? Ị̀ na-ewepụta onwe gị idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụ inye aka n’ụzọ dịgasị iche iche ná mgbakọ dị iche iche? Ị̀ pụrụ ịdị na-edebanye aha site n’oge ruo n’oge dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka? Ì nwere ike ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nye aka n’ọgbakọ ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, ị̀ na-etinye mgbalị iji ruo ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ n’aka ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye? Njikere ị dị inye aka na ịnara ibu ọrụ bụ ihe àmà nke inwe ọganihu.—Ọma 110:3.

Òkè Inwe Ahụmahụ Na-ekere

Ọ bụrụ na i chere na i ruchaghị eru n’ihi na i nweghị ahụmahụ n’ibi ndụ dị ka Onye Kraịst, adala mbà. Okwu Chineke pụrụ ime ka “onye na-enweghị uche mara ihe.” (Ọma 19:7; 119:130; Ilu 1:1-4) Itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ na-eme ka anyị rite uru n’amamihe zuru okè nke Jehova, bụ́ nke bara uru karịa ihe ọ bụla a na-amụta site na nanị ahụmahụ. Otú ọ dị, ka anyị nọ na-enwe ọganihu n’ozi anyị na-ejere Jehova, anyị na-enweta ahụmahụ bara uru. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ ga-aba ezi uru?

N’ịbụ onye nọworo n’ọnọdụ dịgasị iche iche ná ndụ, mmadụ pụrụ ịdaba n’ọnwụnwa nke iche, sị: ‘Ezutewo m ọnọdụ a na mbụ. Amaara m ihe m ga-eme.’ Nke a ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ime? Ilu 3:7 na-adọ aka ná ntị, sị: “Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị.” Ahụmahụ kwesịrị n’ezie ime ka ụzọ anyị si na-ele ihe ndị anyị ga-atụle anya sakwuo mbara mgbe anyị na-eme ihe banyere ọnọdụ dị iche iche ná ndụ. Ma ọ bụrụ na anyị na-enwe ọganihu ime mmụọ, ahụmahụ anyị nwere kwesịkwara imesi ya ike n’uche na n’obi anyị na ngọzi Jehova dị anyị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma. Mgbe ahụ, ọganihu anyị na-apụta ìhè, ọ bụghị site n’anyị iji obi ike nke onwe anyị na-eche ọnọdụ dị iche iche ihu, kama site n’anyị ịdị na-echigharịkwuru Jehova n’egbughị oge maka nduzi ná ndụ anyị. A na-egosi ya site n’anyị inwe obi ike na ọ dịghị ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na o kweghị ka o mee, nakwa site n’anyị ịnọgide ná mmekọrịta nke ịhụnanya na ntụkwasị obi dị na ya, nke anyị na Nna anyị nke eluigwe.

Nọgide Na-etinye Mgbalị

Pọl onyeozi, n’agbanyeghị na ọ bụ Onye Kraịst e tere mmanụ, nke tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, ghọtara na ọ dị ya mkpa ịnọgide “na-amatị onwe” ya iji nweta ihe mgbaru ọsọ ahụ bụ́ ndụ ebighị ebi. (Fil. 3:13-16) Ì nwere ụdị echiche ahụ?

Ruo n’ókè hà aṅaa ka i nweworo ọganihu? Na-atụ uto gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adabere n’ókè i yikwasịruworo mmadụ ọhụrụ ahụ n’ụzọ zuru ezu, ókè i doruworo onwe gị n’ụzọ zuru ezu n’okpuru ọbụbụeze Jehova, na n’ókè ị dịruru uchu n’iji onyinye dị iche iche i nwere na-asọpụrụ Jehova. Ka ị na-erite uru site ná mmụta ị na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, àgwà ndị e mesiri ike n’Okwu Chineke kwesịrị iji nwayọọ nwayọọ na-apụta ìhè n’ụzọ i si ekwu okwu ma na-ezi ihe. Lekwasị anya n’akụkụ ndị a ị na-eto eto na ha. Ee, ṅụrịa ọṅụ na ha, ọganihu gị ga-apụtakwa ìhè ngwa ngwa.

GỊNỊ BỤ IHE MGBARU ỌSỌ IME MMỤỌ NDỊ I NWERE N’ONWE GỊ?

Olee ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị na ha ndị i nwere, bụ́ ndị i kwesịrị inwe ike iru n’ime afọ na-abịanụ?

  1. ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

  2. ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

Olee ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewe oge iru, ndị dị oké ọnụ ahịa nye gị nke na i kpebisiri ike ịdị na-arụ ọrụ maka ha ruo mgbe i ruru ha?

  1. ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

  2. ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

  3. ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya