Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ma I Sonyere Ha?
    Ụlọ Nche—1998 | Ọgọst 1
    • Gịnị Ma I Sonyere Ha?

      NDJAUKUA ULIMBA dị afọ 73, n’afọ gakwara aga o mere njem dị ihe dị ka kilomita 450. O ji ụkwụ gaa njem ahụ dum, o wekwara ya ụbọchị 16.

      Nwoke a meworo agadi mere ogologo njem ya iji gaa otu n’ime mgbakọ Ndịàmà Jehova a na-eme kwa afọ. Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, n’ịbụ onye ọṅụ jupụtara obi na onye e wusiri ike n’ụzọ ime mmụọ, o ji ụkwụ laghachikwa ụlọ—ụbọchị 16 ọzọ. Ò kwesịrị mgbalị ahụ? Eenụ! Ndjaukua Ulimba emewo njem a kwa afọ ruo afọ ụfọdụ.

      Nwoke Africa a bụ otu n’ime ihe karịrị nde mmadụ 15 sitere ihe karịrị mba 230 bụ́ ndị gara mgbakọ Ndịàmà Jehova n’afọ gara aga. Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka ihe ka ọtụtụ jee ije ọtụtụ ụbọchị iji gaa n’ebe a na-eme mgbakọ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ji ụgbọala, bọs, ụgbọ okporo ígwè, ma ọ bụ ụgbọelu gaa. Ị̀ bụ otu n’ime ha?

      Na 1998, a ga-enwekwa mgbakọ ọzọ gburugburu ụwa, karịsịa n’ọnwa ndị nke oge okpomọkụ (ma ọ bụ n’oge ọkọchị). Ọ bụrụ na ahụ adị ya ike, o yikarịrị ka Ndjaukua Ulimba ga-emekwa otu ogologo njem ahụ iji gaa. Ya na ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-anụrụ usoro ihe omume dị irè, na-ewusi okwukwe ike, ma na-enye ume ọhụrụ. Nye ndị nile ga-abịanụ, mgbakọ ahụ ga-abụ ihe dị mkpa n’afọ. E ji ikpo ọkụ na-akpọkwa gị onwe gị òkù ịbịa. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ ịgwa gị ebe a ga-enwe mgbakọ dịkarịsịrị gị nso.

  • Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?
    Ụlọ Nche—1998 | Ọgọst 1
    • Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?

      Ọbụna n’ụwa a nọ ná nsogbu, ị pụrụ inweta obi ụtọ site n’ezi ihe ọmụma nke Bible banyere Chineke, Alaeze ya, na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya