Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Mbụ
“Enwere m ndị enyi ná mba ndị ọzọ, ebe kacha mma mụ na ha na-anọkwa akpa nkata bụ n’Ịntanet. Obi na-atọ m ụtọ ma mụ na ha na-akpa nkata n’agbanyeghị na ha nọ ebe dị ezigbo anya.”—Sue, ọ dị afọ iri na asaa.a
“A sị m kwuo, m ga-asị na ịkparịta ụka n’Ịntanet bụ mmadụ igbu oge. Ọ bụ onye umengwụ na-eme ụdị ihe ahụ. Ụtọ enyi na enyi ka mma ihu na ihu.”—Chidiebere, ọ dị afọ iri na itoolu.
N’IME mmadụ abụọ a kwuru ihe a e dere n’elu ebe a, olee onye nke kwuru obi gị? Ma ì chere na ịkparịta ụka n’Ịntanet dị mma ma ọ̀ bụkwanụ na i cheghị, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị taa na-akparịtazi ụka n’Ịntanet. Chebagodịrị ihe a echiche: O were afọ iri atọ na asatọ tupu ndị nwere redio eruo nde mmadụ iri ise, wee afọ iri na atọ tupu ndị nwere televishọn eruo nde mmadụ iri ise, weekwa afọ anọ tupu ndị na-aga n’Ịntanet eruo nde mmadụ iri ise. Ma, n’oge na-adịbeghị anya, ndị na-esi na Facebookb akparịta ụka ruru narị nde abụọ naanị n’ime ọnwa iri na abụọ!
Kanye ✔ n’eziokwu ma ọ bụkwanụ n’ụgha n’ihe a e kwuru n’okpuru ebe a:
Ndị na-akacha akparịta ụka n’Ịntanet bụ ndị gaferela afọ iri na abụọ. ․․․․․ Eziokwu ․․․․․ Ụgha
Azịza ya bụ ụgha. E kee ndị na-anọ n’Ịntanet akparịta ụka ụzọ atọ, ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ha bụ ndị rurula afọ iri abụọ na ise ma ọ bụ karịa. N’afọ 2009, ndị kacha kparịta ụka n’Ịntanet bụ ndị gaferela afọ iri ise na ise!
Ma, ọtụtụ nde ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ọtụtụ n’ime ha na-asịkwa na ọ bụ otú ahụ ka ọ kacha mma ka mmadụ na ibe ya si na-akparịta ụka. Nwa agbọghọ aha ya bụ Jessica kwuru, sị: “E nwere mgbe m kwụsịrị ịga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ma, e mechara m bido ịga ebe ahụ n’ihi na o nweghị onye na-akpọ m n’ekwe ntị ka mụ na ya kọrịa. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ọ bụrụhaala na mmadụ anaghị aga ebe ahụ na-akparịta ụka, ndị mmadụ echefuo onye ahụ.”
Gịnị mere ịkparịta ụka n’Ịntanet ji atọ ọtụtụ ndị ụtọ? Azịza ya bụ: Ụmụ mmadụ na-achọkarị ka ha na ibe ha na-akparịta ụka. Ọ bụkwa ya mere e ji wepụta ebe ndị a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Legodị ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-aga ebe ndị ahụ.
1. Ọ na-adị mfe.
“Ọ na-esi ike mmadụ na ndị enyi ya niile ịna-ekwurịta okwu mgbe niile. Ma, ọ bụrụ na e nwere ebe mmadụ nwere ike ịnọ na-akọrọ ha otú ya na ije ụwa si na-aga, ọ bụ ya kacha mfe.”—Leah, ọ dị afọ iri abụọ.
“M gaa ebe ahụ dee otu ihe, ọ na-adị m ka m̀ zigaara ndị enyi m niile iimel otu mgbe.”—Kelechi, ọ dị afọ iri abụọ.
2. Nsogbu ndị ọgbọ na-enye.
“Ndị mmadụ na-agwakarị m ka m gaa denye aha m n’otu n’ime ebe ndị ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet, ka ha nwee ike denye aha m ná ndị enyi ha nwere. Ma, ebe ọ na-enweghị ebe nke m denyere aha m, ọ pụtara na agaghị m eso ná ndị enyi ha.”—Chinomso, ọ dị afọ iri abụọ na abụọ.
“M gwa ndị mmadụ na achọghị m idenye aha m n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, ha elewe m anya ka à ga-asị na isi adịchaghị m mma.”—Eve, ọ dị afọ iri na asatọ.
3. Ihe ndị na-agbasa ozi na-ekwu.
“Ndị na-agbasa ozi na-asị na ọ bụrụ na mmadụ anaghị aga n’Ịntanet, ọ gaghị enwe enyi. Ị manụ na ọ bụrụ na mmadụ enweghị enyi, ụwa ga-ara ya ahụ́. Ọ pụtaziri na onye na-edenyeghị aha ya n’ebe ahụ ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet amaghị nke a na-akọ.”—Katrina, ọ dị afọ iri na asatọ.
4. Ụlọ akwụkwọ.
“Ndị nkụzi anyị na-aga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ụfọdụ ha na-aga ebe ahụ dee ụbọchị anyị ga-ele ule. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na e nwere ihe m na-aghọtachaghị n’ihe ọmụmụ mgbakọ na mwepụ onye nkụzi anyị kụziiri anyị, m nwere ike nọrọ ebe ahụ gwa ya ihe m na-aghọtaghị, ya anọrọkwa ebe ahụ nyere m aka.”—Chinyere, ọ dị afọ iri na asaa.
5. Ọrụ.
“Ndị na-achọ ọrụ na-aga ebe ahụ enweta ndị enyi. Mgbe ụfọdụ, ndị enyi ahụ ha nwetara na-enyere ha aka inweta ọrụ.”—Ugochi, ọ dị afọ iri abụọ.
“M na-anọ ebe ahụ akọrọ ndị mmadụ ihe gbasara ọrụ m na-arụ. Ọ na-abụ m sechaa ihe, mụ etinye ya ebe ahụ, ka ndị m na-arụrụ ọrụ nwee ike ịhụ ihe ọhụrụ m sere.”—David, ọ dị afọ iri abụọ na otu.
Ì kwesịrị idenye aha gị n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet? Ọ bụrụ gị na papa gị na mama gị bi, ọ bụ hanwa ga-ekpebi ma ì kwesịrị idenye aha gị.c (Ilu 6:20) Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị achọghị ka gị na ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet, gee ha ntị.—Ndị Efesọs 6:1.
Ma, ụfọdụ ndị nne na nna na-ahapụ ụmụ ha ndị torola eto ka ha na-aga ebe ahụ, ha na-elerukwa anya ala mara ihe ụmụ ha na-eme ebe ahụ. Ọ bụrụ otú ahụ ka papa gị na mama gị na-eme, ọ̀ pụtara na ha anaghị ekwe gị megharịa ahụ́? Mbanụ! Ebe ahụ abụghị ebe mmadụ ga-aga tụsara ahụ́ otú ahụ, ọ bụ ya mere o ji dị mma ka papa gị na mama gị mara ihe ị na-anọ ebe ahụ eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ nwere ike tinye onwe ya ná nsogbu n’ebe ahụ otú ahụ mmadụ nwekwara ike itinye onwe ya ná nsogbu n’ebe ndị ọzọ a na-aga n’Ịntanet. Ọ bụrụ na papa gị na mama gị hapụrụ gị ka ị na-aga ebe ahụ, gịnị ka i kwesịrị ime ka ị ghara itinye onwe gị ná nsogbu?
Kpachara Anya
Ịga n’Ịntanet dị ka mmadụ ịnya ụgbọala. Ị manụ na ọ bụghị mmadụ niile gọọmenti nyere ikike ịnya ụgbọala ma anya ụgbọala. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala na-akpọkasị ụgbọala ha, meruo onwe ha ahụ́, ma ọ bụdị nwụọ n’ihi akpacharaghị anya.
Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ihe gbasara ịga n’Ịntanet. Ụfọdụ na-akpachara anya n’ihe ha na-eme ebe ahụ, ndị ọzọ anaghị akpachara anya. Ọ bụrụ na papa gị na mama gị hapụrụ gị ka i denye aha gị n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, ọ pụtara na obi siri ha ike na ị ga-akpachara anya n’ihe ị na-eme ebe ahụ. Ma, ì nwerenụ ike ikwu ugbu a na ị na-akpachara anya? Ihe ị na-eme ebe ahụ ò gosiri na ị ‘na-echekwa ezi amamihe na ikike iche echiche’?—Ilu 3:21.
N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe abụọ i kwesịrị ilebara anya ma ọ bụrụ na i denyere aha gị n’ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ha bụ: (1) Ihe ndị ị na-agaghị achọ ka ndị ọzọ mara na (2) oge gị. Ihe anyị ga-atụle ná “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” ọzọ dị na Teta! a bụ: (1) Ụdị aha ị na-emere onwe gị n’ebe ahụ nakwa (2) ụdị ndị ị na-emete enyi n’ebe ahụ.
IHE NDỊ Ị NA-AGAGHỊ ACHỌ KA NDỊ ỌZỌ MARA
N’ihe a niile a na-ekwu gbasara ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, o nwere ike i chebeghịdị echiche n’ihe ndị ị na-agaghị achọ ka ndị ọzọ mara gbasara gị. A sị ka e kwuwe, ihe mere i ji gawadị ebe ahụ ọ́ bụghị ka ndị mmadụ mara gị, gịnwa amarakwa ha? Ma, ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, i nwere ike kpatara onwe gị nsogbu.
Ka e were ya na gị na ndị enyi gị na-aga n’okporo ụzọ, gị ejirikwa ego hiri nne, ị̀ ga-ejide ego ahụ otú onye ọ bụla na-agafe unu ga-ama na i ji ụdị ego ahụ? Ị gaghị eme ụdị ihe ahụ n’ihi na ị ma na i mee ya, ọ pụtara na i ji aka gị na-akpọ ndị ohi òkù! Ị bụrụ nwa ma ihe, ị ga-etinye ego ahụ ebe onye ọ bụla na-emekataghị hụ ya.
Were ya na ihe ndị i dere gbasara onwe gị n’ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet bụ ego ahụ anyị kwuru okwu ya. Buru ya n’obi ma lee anya n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a. Kanye ✔ na nke ọ bụla n’ime ha ị na-agaghị achọ ka onye ị na-amaghị mara.
․․․․․ ebe m bi
․․․․․ adres iimel m
․․․․․ ebe m gara akwụkwọ
․․․․․ mgbe m na-anọ n’ụlọ
․․․․․ mgbe o na-enweghị onye nọ n’ụlọ anyị
․․․․․ foto m
․․․․․ otú m si ele ihe anya
․․․․․ ihe ndị na-amasị m
Ọ bụrụgodị na ị na-achọkarị ka ndị mmadụ mara gị, o doro anya na o nwere ihe ụfọdụ e dere ebe ahụ ị na-agaghị achọ ka ọ bụrụ onye ọ bụla ma. Ma, ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa, ma ndị dimkpa, na-agwa ndị ha na-amaghị ihe ndị ahụ n’amaghị ama. Gịnị ka ị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime gị?
Ọ bụrụ na papa gị na mama gị hapụrụ gị ka ị na-aga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, gbalịa leruo anya ala n’ebe ahụ mmadụ nwere ike ịnọ kwuo ihe ndị ọ na-agaghị achọ ka onye ọzọ mee n’ebe ahụ o denyere aha ya. Hụkwa na ị họọrọ ihe ndị ga-eme ka ndị ọzọ ghara ịhụcha ihe niile gbasara gị. Asịkwala na nke ahụ dị ndị nwe ebe ahụ n’aka. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ị hapụ ime ihe a anyị kwuru, ọtụtụ ndị mmadụ nwere ike ịhụ ihe ndị i tinyere ebe ahụ, nweekwa ike ide ihe sọrọ ha ebe ahụ. Ọ bụ ihe a mere otu nwa agbọghọ, aha ya bụ Allison, ji jiri aka ya mee ebe ahụ ọ na-aga otú ọ ga-abụ naanị ndị bụ́ ndị enyi ya ga na-ahụ ihe ọ bụla o dere ebe ahụ. O kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị enyi m nwere ndị enyi mụnwa na-amaghị, achọghịkwanụ m ka ndị m na-amaghị na-agụ ihe ndị m dere ebe ahụ.”
A sịgodị na ọ bụ naanị ndị nke ị kpọrọ ndị enyi gị ka gị na ha na-akparịta ụka n’ebe ahụ, i kwesịkwara ịkpachara anya. Nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Amarachi kwuru, sị: “Ma ị́ kpachaghị anya, ị ga na-aga ebe ahụ mgbe niile ka ị hụ ihe ndị enyi gị dere. Ya mewe gị otú ahụ, ahụ́ agaghịzi na-ezu gị ike ma ị́ gabeghị denye ihe ebe ahụ. Tupu ị mara ihe na-eme, i dewela ihe gbasara onwe gị karịa otú i kwesịrị.”
Echefukwala na e nweghị ihe dị n’Ịntanet a ga-asị na e mekataghị ka onye ọzọ hụ ya. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ? Akwụkwọ bụ́ CyberSafe, nke Gwenn Schurgin O’Keeffe dere, kwuru, sị: “Ndị mepere ebe ndị ahụ a na-aga n’Ịntanet nwere ebe ha na-edewe ihe onye ọ bụla dere ebe ahụ. Ihe ọ bụla anyị dere n’Ịntanet ka nwere ebe ọ dị, a sịgodị na anyị mechara hichaa ya. O kwesịrị ido anyị anya na ihe ọ bụla e dere n’Ịntanet enweghị nhicha; onye na-eche na ya dee ihe mechaa hichaa ya na ọ pụtara na nke ahụ agaala na-aghọgbu onwe ya.”
OGE GỊ
Ọ bụghị naanị ihe ndị i dere gbasara onwe gị ka e nwere ike ịsị na o yiri ego ahụ anyị kwuru okwu ya na mbụ. E nwekwara ike ịsị na oge gị dị ka ego ahụ. I kwesịrị ịhazi oge gị ahazi, mara ihe i kwesịrị ime na oge i kwesịrị ime ya. (Ekliziastis 3:1) Ihe a bụ otu n’ime ihe ndị dị ezigbo mkpa mmadụ kwesịrị ịkpachara anya ma a bịa n’okwu gbasara ịga n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ ịkparịta ụka n’Ịntanet.d
“Ọtụtụ mgbe, m na-agwa onwe m na m ga-aga n’Ịntanet ka mụ na ndị enyi m jiri nkeji ole na ole kparịta ụka. Ma, m na-anọgide ebe ahụ otu awa agafee.”—Amanda, ọ dị afọ iri na asatọ.
“Ahụ́ a naghị ezu m ike ma mụ na ndị enyi m akparịtabeghị ụka n’Ịntanet. Mgbe ọ bụla m si ụlọ akwụkwọ lọta, m na-anọ n’Ịntanet ọtụtụ awa iji mara ihe ụfọdụ ndị enyi m kwuru gbasara ihe m dere. M na-agụkwa ihe hanwa dere.—Ugomma, ọ dị afọ iri na isii.
“M na-esi n’ekwe ntị m abanye n’Ịntanet. M na-abanye ya ma m na-aga ụlọ akwụkwọ, ma m nọrọ n’ụlọ akwụkwọ, nakwa ma m lọtawa ụlọ akwụkwọ. M lọtazie, mụ ejiri kọmputa dị n’ụlọ anyị banye n’Ịntanet. M ma na Ịntanet na-agbazi m ara, ma, achọghị m ịkwụsị ịga ya!”—Ifeyinwa, ọ dị afọ iri na asaa.
Ọ bụrụ na papa gị na mama gị hapụrụ gị ka gị na ndị enyi gị na-akparịta ụka n’Ịntanet, kpebie oge dị mma i kwesịrị ịnọru n’Ịntanet n’ụbọchị ọ bụla. Hụ na ị naghị anọfe oge ahụ i kpebiri. Gbalịa na-edetu nkeji ole ma ọ bụ awa ole ị nọrọ n’Ịntanet n’ụbọchị ọ bụla. Otu ọnwa gachaa, lee ma ị̀ na-anọfe oge ahụ i kpebiri. Cheta na oge gị dị ka ego gị. N’ihi ya, ekwela ka nkata gị na ndị mmadụ na-akpa n’Ịntanet rikpọọ oge gị niile. A sị ka e kwuwe, e nwere ihe ndị ka mkpa i kwesịrị iji oge gị na-eme.—Ndị Efesọs 5:15, 16; Ndị Filipaị 1:10.
E nwere ihe ụfọdụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị ha na ndị enyi ha na-akparịta ụka n’Ịntanet merela iji hụ na ọ naghị eri oge ha kwesịrị iji na-eme ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, legodị ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru:
“Mgbe m kwụsịrị ịga ebe ahụ, abịara m nwee ezigbote oge m ji eme ihe ndị ọzọ dịịrị m. Ọ bịara dị m ka è nwere ibu e buturu m. Emechara m na nso nso a maliteghachi ịga ebe ahụ, ma nke ugbu a, anaghị m anọfe oge m kwesịrị ịnọ ebe ahụ. M nwedịrị ike nọọ ọtụtụ ụbọchị n’agaghị ebe ahụ. O nwere mgbe ụfọdụ m na-echefudị ịga ya. Ọ bụrụ na o mechaa yie ka ò riwela m ahụ́ ọzọ, m ga-akwụsị ịga ebe ahụ.”—Allison, ọ dị afọ iri na itoolu.
“E nwere mgbe m kwụsịrị ịga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet ruo ọtụtụ ọnwa, mụ emechaakwa gawa. M na-emekarị otú ahụ mgbe ọ bụla m chọpụtara na ịga ebe ahụ na-anapụ m oge m kwesịrị iji na-eme ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ugbu a, ọ naghịzi echu m ụra otú ahụ ọ na-echubu m. Ihe m na-eme bụ, m gaa ebe ahụ mee ihe m kwo gaa, mụ apụọ ozugbo.”—Juliana, ọ dị afọ iri abụọ na abụọ.
Ihe Mere E Ji Wepụta Ebe Ahụ
O nwere ihe ọzọ i kwesịrị ịma gbasara ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ka i nwee ike ịghọta ihe anyị chọrọ ikwu nke ọma, n’okpuru ebe a kanye ✔ n’akụkụ nke i chere bụ́ eziokwu.
Ihe mere ndị wepụtara ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet ji wepụta ya bụ . . .
(A) ․․․․․ ka ha jiri ya na-akpa ego.
(B) ․․․․․ ka enyi na enyi nọrọ ya na-akparịta ụka.
(CH) ․․․․․ ka ndị mmadụ jiri ya na-atụrụ ndụ.
Ị̀ ma nke bụ́ eziokwu n’ime ha niile? Ọ bụ nke A. O nwere ike siere gị ike ikweta. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị wepụtara ebe ahụ ji ya akpa ego. Ha ji ya na-akpọsara ndị mmadụ ngwá ahịa ha, bụ́kwanụ ihe na-enye ha ego. Otú ndị a na-akpọsara ngwá ahịa ebe ahụ si erite uru bụ ma ọtụtụ ndị na-abịa ebe ahụ na-ede ihe, nke ga-eme ka ọtụtụ ndị enyi ha na-abịa agụ ihe ndị ahụ ha dere. Ị manụ na ị nọrọ ebe ahụ na-akpa nkata ma ọ bụ na-agụ ihe ndị mmadụ dere, ị ga na-ahụ ngwá ahịa ndị mmadụ na-akpọsa ebe ahụ. Ka ị na-anọkwu ebe ahụ, otú ahụ ka ị ga na-ahụkwu ihe ndị ha na-akpọsa.
Ọ bụ ihe a ka ị ga-eji ama na o nweghị ahịa na-asụ ma ndị wepụtara ebe ahụ ma ndị ha na-akpọsara ngwá ahịa ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị ana-agụ ihe ndị i dere ma ọ bụkwanụ gị ana-anọhi ebe ahụ nne. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-aga ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet, hụ na i zochiri ihe ndị ị na-agaghị achọ ka ndị ọzọ mara, hụkwa na ị naghị anọhi ebe ahụ nne.
IHE ANYỊ GA-ATỤLE N’ISIOKWU DỊ NA PEEJI NKE 26 BỤ
Ụdị aha ị na-emere onwe gị n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet na ụdị ndị ị na-emete enyi. Gbalịa gụọ ya.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b Facebook bụ ebe ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet.
c Teta! anaghị ekwu na ọ bụ ebe dị otú a ma ọ bụ ebe dị otú a ka mmadụ kwesịrị ịga denye aha n’Ịntanet, ka ya na ndị ọzọ nwee ike na-akparịta ụka n’ebe ahụ. Ọ naghịkwa ekwu na ebe dị otú a na ebe dị otú a adịghị mma idenye aha. Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na ihe ha na-eme n’Ịntanet abụghị ihe Baịbụl kpọrọ asị.—1 Timoti 1:5, 19.
d Ị chọọ ịghọtakwu ihe a e kwuru, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Ekwe Ntị, Tiivi ma ọ bụ Kọmputa Ò Riela M Ahụ́?” Ọ gbara na Teta! Eprel–Jun 2011. Ebe ị ga-akacha eleru anya bụ igbe dị na peeji nke 26, nke isiokwu ya bụ: “Izirịta Ozi n’Ịntanet Riri M Ahụ́.”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]
O were afọ iri atọ na asatọ tupu ndị nwere redio eruo nde mmadụ iri ise
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]
Ndị na-esi na Facebook akparịta ụka n’Ịntanet ruru ihe karịrị narị nde abụọ naanị n’otu afọ
[Igbe dị na peeji nke 19]
IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA
Gị na papa gị na mama gị kwurịta ihe i nwere ike ime ka ndị ọzọ ghara ịma ihe ị na-achọghị ka ha mara n’Ịntanet. Jụọ ha sị: ‘Olee ihe ndị mmadụ na-ekwesịghị ịma, oleekwa ihe mere ha ekwesịghị ịma ha? Olee ihe ọ ga-abụ m dee n’ebe ọ bụla n’Ịntanet, ya abụrụ na m ji aka m akpọ nsogbu òkù?’ Gwakwa ha ka ha tụọrọ gị aro ihe ndị i nwere ike ime ka nkata gị na ndị mmadụ na-akpa ghara ịbụ naanị n’Ịntanet. Jụọ ha ihe ha chere i kwesịrị ime ka otú ị na-eme ugbu a kakwuo mma.
[Foto dị na peeji nke 18]
Echekwala na ọ bụ naanị gị ma ihe ị na-eme ma ị gaa ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet
[Foto dị na peeji nke 19]
Oge mmadụ dị ka ego ya. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu ihe ka i ji oge gị niile na-eme, ị gaghị enwe oge ị ga-eji eme ihe ndị ọzọ dị gị mkpa