Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lv isi 7 p. 74-85
  • Ì Ji Ndụ Kpọrọ Ihe Otú Chineke Ji Ya Kpọrọ Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Ji Ndụ Kpọrọ Ihe Otú Chineke Ji Ya Kpọrọ Ihe?
  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỤ NA ỌBARA DỊ NSỌ
  • IJI ỌBARA AGWỌ ỌRỊA
  • IWU JEHOVA NA-EGOSI NA Ọ BỤ NNA NKE HỤRỤ ANYỊ N’ANYA
  • ZERE ỊKPỌ MMADỤ ASỊ N’OBI GỊ!
  • ANỌLA N’ÒTÙ IKPE ỌBARA MARA
  • JIRI NDỤ KPỌRỌ IHE SITE N’IKWUSA OZI ALAEZE
  • Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Jiri Ndụ Kpọrọ Ihe
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Bụrụ Onye Chineke Ahụ Dị Ndụ Na-eduzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
lv isi 7 p. 74-85
Ebe otu nwanna nwanyị na-edeputa otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya n’akwụkwọ

ISI NKE ASAA

Ì Ji Ndụ Kpọrọ Ihe Otú Chineke Ji Ya Kpọrọ Ihe?

“Ọ bụ gị bụ isi iyi nke ndụ.”—ABỤ ỌMA 36:9.

1, 2. Gịnị bụ onyinye Chineke nyere anyị nke bara oké uru taa, gịnịkwa mere o ji baa uru?

NNA anyị nke eluigwe nyere anyị ihe bara oké uru, ya bụ, ndụ o nyere anyị nke mere anyị ji bụrụ ụmụ mmadụ nwere ọgụgụ isi, ndị nwere ike iṅomi àgwà ya. (Jenesis 1:27) N’ihi onyinye ahụ bara oké uru o nyere anyị, anyị nwere ike ịtụgharị uche n’ụkpụrụ Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ejiri ụkpụrụ Baịbụl na-ekpebi ihe anyị ga-eme, anyị ga-aghọ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, ndị hụrụ Jehova n’anya, “ndị zụworo ikike nghọta ha azụ . . . ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”—Ndị Hibru 5:14.

2 Ịtụgharị uche n’ụkpụrụ Baịbụl dị oké mkpa taa, n’ihi na ụwa a adịla mgbagwoju anya nke na ọ gaghị ekwe omume inwe iwu ndị ga-akọwa ihe a ga-eme n’ọnọdụ niile a na-enwe ná ndụ. Otu ihe atụ dabara adaba bụ nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike, nke ka nke, n’ihe metụtara ihe e ji irighiri ihe ndị dị n’ọbara mepụta nakwa otú e si eji ọbara agwọ ọrịa. Ihe a bụ okwu dị ndị niile chọrọ irubere Jehova isi oké mkpa. Ma, ọ bụrụ na anyị ghọtara ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara okwu ahụ, anyị kwesịrị ime mkpebi ndị dị mma, ndị akọnuche anyị ga-anabata, ndị ga-emekwa ka anyị nọrọ n’ịhụnanya Chineke. (Ilu 2:6-11) Chee echiche banyere ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị a.

NDỤ NA ỌBARA DỊ NSỌ

3, 4. Olee mgbe mbụ Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọbara dị nsọ, oleekwa ụkpụrụ ndị ọ dabeere na ha?

3 Mgbe mbụ Jehova kwuru ihe jikọrọ ndụ na ọbara, nakwa otú ha si dị nsọ, bụ mgbe Ken gbuchara Ebel. Chineke sịrị Ken, “Gee ntị! Ọbara nwanne gị si n’ala na-etiku m.” (Jenesis 4:10) N’otú Jehova si ele ihe anya, ọbara Ebel nọchiri anya ndụ ya, nke e wepụrụ n’ike. Ya mere, e nwere ike ikwu na ọbara Ebel tikuru Chineke ka ọ bọọrọ ya ọbọ.—Ndị Hibru 12:24.

4 Mgbe Iju Mmiri oge Noa gachara, Chineke nyere ndị mmadụ ikike iri anụ, ma ọ bụghị ọbara ya. Chineke sịrị: “Unu erikọtala anụ na mkpụrụ obi ya—ọbara ya. M ga-ajụkwa ajụjụ ọbara unu bụ́ mkpụrụ obi unu.” (Jenesis 9:4, 5) Iwu a gbasara ụmụ Noa niile, rute n’oge anyị a. Ọ na-egosi na okwu ahụ Chineke gwara Ken bụ eziokwu, ya bụ, na ọbara nọchiri anya mkpụrụ obi, ma ọ bụ, ndụ nke ihe niile e kere eke. Iwu ahụ na-egosikwa n’eziokwu na Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ndụ, ga-eme ka mmadụ niile ndị na-eji ndụ na ọbara egwuri egwu zaa ya ajụjụ.—Abụ Ọma 36:9.

5, 6. Olee otú Iwu Mozis si gosi na ọbara dị nsọ, dịrịkwa oké ọnụ ahịa? (Gụọ igbe dị na peeji nke 78.)

5 E mere ka eziokwu abụọ ndị a dị oké mkpa doo anya n’Iwu Mozis. Levitikọs 17:10, 11 kwuru, sị: “Ma onye ọ bụla nke . . . riri ụdị ọbara ọ bụla, m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ riri ọbara, m ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya. N’ihi na mkpụrụ obi nke anụ ahụ́ dị n’ọbara ya, mụ onwe m emewo ka ọ bụrụ maka ebe ịchụàjà ka unu were ya na-ekpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie, n’ihi na ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie site ná mkpụrụ obi nke dị n’ime ya.”a—Gụọ igbe dị na peeji nke 76, bụ́ “Ike Ọbara Nwere Ikpuchi Mmehie.”

IKE ỌBARA NWERE IKPUCHI MMEHIE

N’Okwu Chineke, ọbara na ndụ bụ otu ihe. Ya mere, n’Izrel oge ochie, kama ịma onye mere mmehie nke chegharịrị echegharị ikpe n’ihi na o mebiri iwu Jehova, onye ahụ nwere ike iji anụmanụ chụọrọ Chineke àjà n’ebe ịchụàjà. (Levitikọs 4:27-31) Àjà ahụ ọ chụrụ na-ekpuchiri ya mmehie ya, kama ọ bụ naanị mgbe ahụ.

Dị ka e si kwuo ya na Baịbụl, “mkpuchi mmehie” pụtara “ịgbanwere ihe” ma ọ bụ “ikwuchi ihe,” otú ahụ a na-eji okwuchi ite kwesịrị ekwesị ekwuchi ite. N’ezie, ọ dịghị anụmanụ nke nwere ike “ikpuchi” mmehie mmadụ kpamkpam. Otú ọ dị, àjà ndị e ji anụmanụ chụọ bụ ihe atụ àjà mkpuchi mmehie zuru okè nke gaje ịbịa.—Ndị Hibru 10:1, 4.

A chụrụ àjà mkpuchi mmehie ahụ ‘site n’iji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ àjà naanị otu ugboro.’ (Ndị Hibru 10:10) ‘Ọbara Kraịst nke dị oké ọnụ ahịa dị ka nke nwa atụrụ na-enweghị mmerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ’ nọchiri anya ndụ zuru okè o nwere mgbe ọ bụ mmadụ. Ya na ndụ ahụ Adam tụfuru bụ nnọọ otu ihe. (1 Pita 1:19) Ya mere, n’ụzọ magburu onwe ya nke na-egosi ịhụnanya, Jehova kpere ikpe ziri ezi ma mee ka o kwe anyị omume inweta “nnapụta nke na-adịru mgbe ebighị ebi.”—Ndị Hibru 9:11, 12; Jọn 3:16; Mkpughe 7:14.

6 E gbuo anụ, ma é jighị ọbara ya chụọ àjà, a na-awụsa ya n’ala. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na e si otú ahụ nyeghachi Onye nwe ndụ ndụ ahụ. (Diuterọnọmi 12:16; Ezikiel 18:4) Ma, cheta na a gwaghị ndị Izrel ka ha mee ihe na-agaghị ekwe ha omume iji hụ na ha wepụchara ọbara niile dị n’anụ ha chọrọ iri. Ọ bụrụhaala na e gbuziri anụ ahụ egbuzi, gbupụkwa ya ọbara, onye Izrel nwere ike iji akọnuche dị ọcha rie ya, n’ihi na a kwanyerela Onye nyere ndụ ùgwù kwesịrị ya.

7. Olee otú Devid si kwanyere ọbara ùgwù dị ka ihe dị nsọ?

7 Devid, bụ́ ‘nwoke obi Chineke nabatara,’ ghọtara ihe mere Chineke ji nye iwu ahụ o nyere banyere ọbara. (Ọrụ 13:22) N’otu oge, mgbe mmiri na-agụsi ya ike, mmadụ atọ n’ime ndị ikom ya wabara n’ebe ndị iro ha mara ụlọikwuu, sere mmiri n’otu olulu mmiri, butere ya Devid. Gịnị ka Devid mere? Ọ sịrị: “M̀ ga-aṅụ ọbara ndị ikom ndị tinyere mkpụrụ obi ha n’ihe ize ndụ gaa seta mmiri?” Devid lere mmiri ahụ anya dị ka ọbara ndụ nke ndị ikom ahụ. Ya mere, n’agbanyeghị na mmiri na-agụ ya, ọ “wụpụụrụ ya Jehova.”—2 Samuel 23:15-17.

8, 9. Chineke ọ̀ gbanwere otú o si ele ndụ na ọbara anya mgbe a malitere ọgbakọ Ndị Kraịst? Kọwaa.

8 N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị anọ Chineke nyechara Noa iwu ahụ, nakwa n’ihe dị ka otu puku afọ na narị ise e hiwechara ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Jehova nyere òtù na-achị isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ mmụọ nsọ ide, sị: “Ọ dị mmụọ nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma ka anyị ghara ịtụkwasịkwuru unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa, ya bụ, ịdị na-ezere ihe e ji chụọrọ arụsị àjà, na ọbara na anụ a nyagburu anyagbu na ịkwa iko.”—Ọrụ 15:28, 29.

9 O doro anya na òtù na-achị isi nke oge ahụ ghọtara na ọbara dị nsọ, nakwa na iji ya eme ihe na-ezighị ezi bụ ihe ọjọọ otú ahụ ikpere arụsị ma ọ bụ ịkwa iko bụkwa ihe ọjọọ. Ezi Ndị Kraịst taa ghọtakwara ya otú ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ebe ha na-eji ụkpụrụ Baịbụl ekpebi ihe ha na-eme, ha na-eme ihe dị Jehova mma mgbe ha na-ekpebi ihe metụtara ihe a ga-eji ọbara eme.

IJI ỌBARA AGWỌ ỌRỊA

Ebe nwanna nwaanyị onye Kraịst na-akọwara dọkịta ya ihe o kpebiri banyere iji ọbara agwọ ọrịa

Olee otú m ga-esi akọwara dọkịta ihe m kpebiri banyere iji irighiri ihe ndị si n’ọbara agwọ m ọrịa?

10, 11. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si ele mmịnye ọbara anya, tinyere ịmịnye isi ihe ndị dị n’ọbara? (b) Olee ihe ụfọdụ metụtara ọbara nke Ndị Kraịst nwere ike inwe echiche dị iche iche banyere ha?

10 Ndịàmà Jehova ghọtara na ‘izere . . . ọbara’ pụtara na ha agaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara, ha agaghịkwa enye ọbara ha ka a mịnye ya onye ọzọ, ma ọ bụ chekwaa ya ka a mịnyeghachi ya n’ahụ́ ha. N’ihi ùgwù ha na-akwanyere iwu Chineke, ha anaghị ekwe ka a mịnye ha ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara, ya bụ, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie, mkpụrụ ndụ na-acha ọcha, mkpụrụ ndụ nke na-eme ka ọbara kwụsị ịgba, na mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara.

11 Taa, a na-ekerisị ihe anọ ndị a ma nweta irighiri ihe ndị si n’ọbara ndị a na-eji agwọ ọrịa n’ụzọ dị iche iche. Onye Kraịst ò kwesịrị ikwe ka a mịnye ya irighiri ihe ndị ahụ? Ò kwesịrị iwere ha dị ka “ọbara”? Onye ọ bụla ga-ekpebi ihe ọ ga-eme n’okwu a. Otú ahụkwa ka onye ọ bụla ga-ekpebi ihe ọ ga-eme n’ihe banyere ụzọ ndị ọzọ e si e ji ọbara a na-echekwaghị echekwa agwọ ọrịa. Ụzọ ndị ahụ bụ: ịmịpụta ọbara n’ahụ́ mmadụ ma mechaa mịnyeghachi ya, ịgwa ọbara mmadụ agwa, na ichete ọbara mmadụ, zaa ya ma mịnyeghachi ya onye ahụ n’ahụ́.—Gụọ isiokwu dị na peeji nke 215-218.

12. Olee otú anyị kwesịrị isi ele ihe ndị a ga-ahapụrụ akọnuche anya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime banyere ha?

12 E kwuo na ihe a bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya, ọ̀ pụtara na ihe anyị kpebiri ime agbasaghị Jehova? Mbanụ, n’ihi na o nwere nnọọ mmasị n’ihe anyị na-eche na n’ihe anyị chọrọ ime. (Ilu 17:3; 21:2; 24:12) Ya mere, mgbe anyị kpechara ekpere banyere ya, chọọkwa nchọnchọ banyere ụdị ọgwụ anyị ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere otú a ga-esi agwọ anyị, anyị kwesịrị ige akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ ntị. (Ndị Rom 14:2, 22, 23) N’ezie, ndị ọzọ ekwesịghị ịmanye anyị ime ihe akọnuche ha gwara ha, anyị ekwesịghịkwa ịjụ ha, sị, “Ọ bụrụ na ọ bụ gị, gịnị ka ị ga-eme?” N’ụdị ihe ahụ, Onye Kraịst ọ bụla “ga-ebu ibu nke ya.”b—Ndị Galeshia 6:5; Ndị Rom 14:12; gụọ igbe dị na peeji nke 81, bụ́ “M̀ Na-ewere Ọbara Dị Ka Ihe Dị Nsọ?”

M̀ NA-EWERE ỌBARA DỊ KA IHE DỊ NSỌ?

Ụkpụrụ: “Na-ezere . . . ọbara.”—Ọrụ 15:20.

Ajụjụ ụfọdụ ị ga-ajụ onwe gị

  • Olee otú m ga-esi akọwa ihe dị iche n’ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara na irighiri ihe ndị dị n’ọbara?e

  • Gịnị mere m ga-eji kpebiere onwe m ma m̀ ga-ekwe ka a mịnye m irighiri ihe ndị dị n’ọbara ma ọ bụ nabata ụzọ ndị ọzọ a ga-esi ewere ọbara m gwọọ m ọrịa ma ọ bụ jụchaa ha niile?—Ndị Rom 12:2; Ndị Galeshia 6:5.

  • Olee otú m ga-esi akọwara dọkịta m ihe mere m ga-eji kwe ka a mịnye m irighiri ihe ndị si n’ọbara ma ọ bụ ihe mere m ji jụ ya?—Ilu 13:16.

IWU JEHOVA NA-EGOSI NA Ọ BỤ NNA NKE HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

13. Gịnị ka iwu na ụkpụrụ Jehova na-egosi banyere onye ọ bụ? Nye ihe atụ.

13 Iwu na ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl na-egosi na Jehova bụ Ome Iwu nke maara ihe nakwa Nna nke hụrụ anyị n’anya, bụ́ onye chọsiri ike ka ihe dịrị ụmụ ya mma. (Abụ Ọma 19:7-11) N’agbanyeghị na e nyeghị iwu ahụ bụ́ “na-ezere . . . ọbara” ka ọ bụrụ ihe ga-ekwu otú a ga-esi enwe ahụ́ ike, ọ na-echebe anyị ka anyị ghara inweta nsogbu ndị a na-enweta ná mmịnye ọbara. (Ọrụ 15:20) N’eziokwu, ọtụtụ ndị dọkịta ndị ma nke a na-akọ na-ekwu na ịwa mmadụ ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara bụ “ụzọ kacha mma” e si agwọ ọrịa n’oge anyị a. N’ebe ezi Ndị Kraịst nọ, ụdị okwu ahụ na-egosi na Jehova nwere amamihe a na-enweghị ike ịghọtacha aghọtacha, bụrụkwa Nna nke hụrụ anyị n’anya.—Aịzaya 55:9; Jọn 14:21, 23.

14, 15. (a) Olee iwu ndị gosiri na Chineke hụrụ ndị ya n’anya? (b) Olee otú ị ga-esi egosi na ị ghọtara ihe mere e ji nye iwu ndị ga-eme ka mmadụ ghara imerụ ahụ́?

14 N’ọtụtụ iwu Chineke nyere ndị ya n’Izrel oge ochie, o gosiri na ọ chọrọ ka ihe dịrị ha mma. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ha ka ha rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ ha, ka a ghara inwe ihe ọghọm, ebe ọ bụ na a na-anọkarị n’elu ụlọ eme ọtụtụ ihe. (Diuterọnọmi 22:8; 1 Samuel 9:25, 26; Nehemaya 8:16; Ọrụ 10:9) Chineke nyekwara iwu ka a ghara ịhapụ ehi ndị na-asọ mpi ka ha na-agagharị. (Ọpụpụ 21:28, 29) Mmadụ ileghara iwu ndị ahụ anya na-egosi na onye ahụ anaghị echebara ọdịmma ndị ọzọ echiche. O nwekwara ike ime ka ikpe ọbara ma ya.

15 Olee otú ị ga-esi egosi na ị ghọtara ihe mere e ji nye iwu ndị ahụ? Ọ́ gaghị adị mma ma i chee echiche banyere ụgbọala gị, otú i si anya ụgbọala, banyere ụmụ anụmanụ gị, ụlọ gị, ebe ị na-arụ ọrụ, na ntụrụndụ ndị ị na-ahọrọ? N’obodo ụfọdụ, ihe kacha akpata ọnwụ ndị na-eto eto bụ ihe mberede, nke na-abụkarị n’ihi iji ndụ ha egwuri egwu. Otú ọ dị, ndị na-eto eto ndị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke na-eji ndụ akpọrọ ihe. Ha anaghịkwa egwu egwuregwu ndị ga-emerụ mmadụ ahụ́. Ha anaghị eche echiche iberiibe bụ́ na o nweghị ihe ga-eme onye na-eto eto. Kama nke ahụ, oge ntorobịa ha na-atọ ha ụtọ n’ihi na ha na-ezere ọdachi na-enweghị isi na ọdụ.—Ekliziastis 11:9, 10.

16. Olee ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara isikwopụ afọ ime? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

16 Ọbụna ndụ nke nwa e bu n’afọ dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. N’Izrel oge ochie, ọ bụrụ na mmadụ emerụọ nwaanyị dị ime ahụ́, nwaanyị ahụ ma ọ bụ nwa ya anwụọ n’ihi ya, Chineke na-ele onye ahụ anya dị ka onye gburu mmadụ, onye ahụ ga-ejikwa ‘mkpụrụ obi ya kwụọ ụgwọ mkpụrụ obi ahụ.’c (Ọpụpụ 21:22, 23) Ya mere, chee echiche otú obi na-adị Jehova mgbe ọ hụrụ ọtụtụ ụmụ e bu n’afọ ndị a kpachaara anya na-esikwopụ kwa afọ, ya bụ, ọtụtụ ụmụ ọhụrụ ndị a na-egbu n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye naanị na ime omume rụrụ arụ.

17. Olee otú ị ga-esi akasi mmadụ obi, ma ọ bụrụ na onye ahụ sikwopụrụ afọ ime tupu ya amụta ụkpụrụ Chineke?

17 Otú ọ dị, gịnị ka anyị ga-ekwu banyere nwaanyị sikwopụrụ afọ ime tupu ya amụta eziokwu Baịbụl? Ọ̀ pụtara na Chineke enweghị ike imere ya ebere? Mbanụ! N’eziokwu, onye ji obi ya dum chegharịa kwesịrị inwe obi ike na Jehova ga-agbaghara ya n’ihi àjà Jizọs ji ọbara ya chụọ. (Abụ Ọma 103:8-14; Ndị Efesọs 1:7) N’ezie, Kraịst n’onwe ya sịrị: “Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie, ka ha wee chegharịa.”—Luk 5:32.

ZERE ỊKPỌ MMADỤ ASỊ N’OBI GỊ!

18. Olee otú Baịbụl si mee ka a mata ihe bụ́ isi na-akpata ịwụfu ọbara?

18 E wezụga na anyị ekwesịghị imerụ ndị ọzọ ahụ́, Jehova chọrọ ka anyị wepụ ihe ahụ na-akpata mwụfu ọbara n’obi anyị, ya bụ, ịkpọasị. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ.” (1 Jọn 3:15) Ọ bụghị naanị na onye ahụ kpọrọ nwanna ya asị, kama ọ na-adị ya ka nwanna ya ahụ nwụọ. Asị ọ kpọrọ onye ahụ nwere ike ime ka o jiri obi ọjọọ na-ekwutọ ya ma ọ bụ na-ebo ya ebubo ụgha ndị ọ ga-abụ, ha bụrụ eziokwu, Chineke kwesịrị ikpe onye ahụ ikpe. (Levitikọs 19:16; Diuterọnọmi 19:18-21; Matiu 5:22) Ọ dị oké mkpa na anyị ga-agbalịsi ike wepụ iwe ọ bụla nwere ike ịdị n’obi anyị!—Jems 1:14, 15; 4:1-3.

19. Olee otú onye na-eji ụkpụrụ Baịbụl ebi ndụ si ele Abụ Ọma 11:5 na Ndị Filipaị 4:8, 9 anya?

19 Ndị ji ndụ kpọrọ ihe dị ka Jehova ji ya kpọrọ ihe, ndị chọkwara ka ha nọrọ n’ịhụnanya Chineke, na-ezere ụdị ime ihe ike niile. Abụ Ọma 11:5 kwuru, sị: ‘Mkpụrụ obi Jehova kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.’ Ihe amaokwu Baịbụl ahụ na-agwa anyị abụghị naanị àgwà Chineke; ọ bụ ụkpụrụ anyị kwesịrị iji na-ebi ndụ. Ọ na-eme ka ndị hụrụ Chineke n’anya ghara itinye aka n’ụdị ntụrụndụ ọ bụla nke nwere ike ime ka ime ihe ike gụwa ha agụụ. Otú ahụkwa, okwu ahụ bụ́ na Jehova bụ “Chineke nke udo” na-eme ka ndị ohu ya na-eche naanị banyere ihe na-akpali ịhụnanya, ihe bụ́ omume ọma, ihe a na-ekwu okwu ọma banyere ya, na ihe kwesịrị otuto, bụ́ ihe ndị ga-eme ka e nwee udo.—Ndị Filipaị 4:8, 9.

ANỌLA N’ÒTÙ IKPE ỌBARA MARA

20-22. Gịnị ka Ndị Kraịst kpebiri ime n’ihe gbasara ụwa, n’ihi gịnịkwa?

20 N’anya Chineke, ikpe ọbara mara ụwa Setan dum. Ọchịchị ya dị iche iche, nke Akwụkwọ Nsọ ji anụ ọhịa mee ihe atụ ya, egbuola ọtụtụ nde mmadụ, ma ọtụtụ ndị ohu Jehova. (Daniel 8:3, 4, 20-22; Mkpughe 13:1, 2, 7, 8) Azụmahịa na nkà mmụta sayensị na ọchịchị anụ ọhịa ndị a jikọrọ aka na-akpụpụta ngwá agha ndị jọgburu onwe ha, bụ́ ndị ha ji na-akpa nnukwu ego. Ọ bụ nnọọ eziokwu na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ”!—1 Jọn 5:19.

21 Ndị na-eso ụzọ Jizọs “abụghị nke ụwa,” ha anaghịkwa etinye aka ma otu ma otu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’agha, n’ihi ya, ikpe ọbara amaghị onye ọ bụla n’ime ha ma ọ bụ nzukọ ha.d (Jọn 15:19; 17:16) Ebe ha na-eṅomi Kraịst, ha anaghị alụ ọgụ mgbe ndị ọzọ na-akpagbu ha. Kama nke ahụ, ha na-egosi na ha hụrụ ndị iro ha n’anya, na-ekpekwa ekpere n’ihi ha.—Matiu 5:44; Ndị Rom 12:17-21.

22 Nke ka nke, ezi Ndị Kraịst na-ezere ihe ọ bụla ga-ejikọ ha na “Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke kacha bụrụ ndị ikpe ọbara mara. Okwu Chineke sịrị: “A hụrụ ọbara ndị amụma na nke ndị nsọ na nke ndị niile e gburu n’ụwa n’ime ya.” N’ihi ya, a dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta.”—Mkpughe 17:6; 18:2, 4, 24.

23. Gịnị ka isi na Babịlọn Ukwu ahụ pụta pụtara?

23 Mmadụ isi na Babịlọn Ukwu ahụ pụta apụtaghị naanị na onye ahụ emeela ka a kagbuo aha ya n’akwụkwọ okpukpe ọ nọbu. Ọ pụtakwara na ọ ga-akpọ omume ọjọọ niile asị, bụ́ ndị okpukpe ụgha na-anabata ma ọ bụ na-akwado, ya bụ, ihe ndị dị ka omume rụrụ arụ, itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na iji anyaukwu na-achụ akụnụba. (Abụ Ọma 97:10; Mkpughe 18:7, 9, 11-17) Omume ndị a na-akpatakarị ịwụfu ọbara!

24, 25. Gịnị ga-eme ka Chineke meere onye chegharịrị echegharị nke ikpe ọbara mara ebere, olee otú e si mee ihe atụ ya n’oge Baịbụl?

24 Mgbe anyị na-amalitebeghị ife ezi ofufe, onye ọ bụla n’ime anyị nwere otú o si kwadoo ụwa Setan, nke mere na e nwere ike ikwu na ikpe ọbara mara anyị mgbe ahụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị gbanwere omume anyị, nwee okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ Kraịst chụrụ, rarakwa onwe anyị nye Chineke, Chineke meere anyị ebere, na-echebekwa anyị n’ụzọ ime mmụọ. (Ọrụ 3:19) N’oge Baịbụl, e ji obodo mgbaba mee ihe atụ nchebe dị otú ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 35:11-15; Diuterọnọmi 21:1-9.

25 Olee ndokwa e mere n’ihe banyere obodo mgbaba ahụ? Ọ bụrụ na onye Izrel egbuo mmadụ n’amaghị ama, ọ ga-agbaga n’otu obodo mgbaba. Mgbe ndị ikpe ruru eru lebachara anya n’okwu ahụ, onye ahụ gburu mmadụ n’amaghị ama ga-ebi n’obodo mgbaba ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ. Mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike ibi ebe ọzọ. Ọ bụ ihe magburu onwe ya nke na-egosi na Chineke nwere obi ebere, na o jikwa ndụ ndị mmadụ kpọrọ ihe nke ukwuu! Taa, ihe ya na obodo mgbaba oge ochie ndị ahụ yiri bụ ndokwa Chineke ji àjà mgbapụta ahụ Kraịst chụrụ mee, nke ga-echebe anyị ka anyị ghara ịnwụ n’ihi imebi iwu Chineke n’amaghị ama, ya bụ, iwu ya nke kwuru na ndụ na ọbara dị nsọ. Ì ji ndokwa ahụ kpọrọ ihe? Olee otú ị ga-esi egosi na i ji ya kpọrọ ihe? Otu ụzọ bụ ịkpọ ndị ọzọ ka ha soro gị banye n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ, nke ka nke, n’ihi “oké mkpagbu” ahụ nke na-abịa n’ike n’ike.—Matiu 24:21; 2 Ndị Kọrịnt 6:1, 2.

JIRI NDỤ KPỌRỌ IHE SITE N’IKWUSA OZI ALAEZE

26-28. Olee otú ọnọdụ anyị taa si yie nke Ezikiel onye amụma, oleekwa otú anyị ga-esi nọrọ n’ịhụnanya Chineke?

26 Ọnọdụ ndị Chineke n’oge anyị a na-echetara anyị ọnọdụ onye amụma oge ochie bụ́ Ezikiel, onye Jehova nyere ọrụ ịbụ onye nche nke na-agwa ụlọ Izrel ihe Chineke kwuru. Chineke sịrị: “Ị ga-anụkwa okwu n’ọnụ m ma dọọ ha aka ná ntị dị ka m gwara gị.” Ọ bụrụ na Ezikiel eleghara ọrụ ya anya, ọbara ndị a ga-egbu mgbe Chineke ga-ekpe Jeruselem ikpe ga-adị ya n’isi. (Ezikiel 33:7-9) Ma, Ezikiel rubere isi, ikpe ọbara amaghịkwa ya.

27 Taa, ọgwụgwụ nke ụwa Setan dum eruwela. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova weere ya na ọ bụ ma ọrụ dịịrị ha ma ihe ùgwù ikwusa ‘ụbọchị Chineke ga-abọ ọbọ’ nakwa ozi Alaeze Chineke. (Aịzaya 61:2; Matiu 24:14) Ì so na-arụsi ọrụ ahụ dị mkpa ike? Pọl onyeozi ji ọrụ e nyere ya ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Aka m dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị, n’ihi na ahapụghị m ịgwa unu nzube niile nke Chineke.” (Ọrụ 20:26, 27) Nke ahụ bụ ezi ihe nlereanya anyị ga-eṅomi!

28 N’ezie, ọ bụrụ na anyị ga-anọrọ n’ezi ịhụnanya Jehova nwere dị ka nna, ihe anyị ga-eme abụghị naanị iwere ndụ na ọbara otú Jehova si were ya. Anyị kwesịkwara ịdị ọcha ma ọ bụ ịdị nsọ n’anya ya, dị ka anyị ga-ahụ n’Isi nke Asatọ.

a Otu akwụkwọ nkà mmụta sayensị kwuru banyere okwu ahụ Chineke kwuru bụ́ “mkpụrụ obi nke anụ ahụ́ dị n’ọbara ya,” sị: “N’agbanyeghị na e nwere ike iji ọbara mee ihe atụ, ihe ahụ Chineke kwuru bụ nnọọ eziokwu n’ihi na ụdị mkpụrụ ndụ ọ bụla nke na-adị n’ọbara dị mkpa maka ịdị ndụ.”

b Gụọ Teta! (Bekee) nke August 2006, peeji nke 3-12, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

c Ndị na-ede akwụkwọ e ji akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na otú e si dee okwu ahụ n’asụsụ Hibru mere ka “o doo anya na amaokwu ahụ anaghị ekwu banyere imerụ naanị nwaanyị ahụ ahụ́.” Chetakwa na Baịbụl ekwughị na ọ bụ ọnwa ole nwa ahụ e bu n’afọ dị mere Jehova ji kwuo na a ga-egbu onye gburu ya.

d Gụọ Isi nke Ise, bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa.”

e Iji nweta ihe ọmụma zuru ezu, gụọ isiokwu dị na peeji nke 215-216.

JIRI NDỤ ANỤMANỤ KPỌRỌ IHE

Ọ bụ ezie na Jehova kwere ka anyị na-egbu ụmụ anụmanụ maka iri ha eri, maka iji ha rụọ ihe anyị ga-eyi, nakwa iji chebe onwe anyị ka ha ghara imerụ anyị ahụ́, anyị kwesịrị iji obiọma na-eme ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Jenesis 3:21; 9:3) Anyị ekwesịghị ịdị ka dinta ahụ nwere obi ọjọọ bụ́ Nimrọd, bụ́ onye o doro anya na ọ na-egbu ụmụ anụmanụ naanị iji nweta obi ụtọ. (Jenesis 10:9) Kama, anyị kwesịrị iṅomi Jehova, bụ́ onye nwere mmasị n’ọdịmma nke ụmụ anụmanụ niile, ọbụna ntakịrị nza.—Jona 4:11; Matiu 10:29.

Iwu Mozis gosiri na Chineke nwere mmasị n’ụmụ anụmanụ. (Ọpụpụ 23:4, 5, 12; Diuterọnọmi 22:10; 25:4) Ilu 12:10 kwadoro ihe Iwu ahụ kwuru mgbe ọ sịrị: “Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya, ma ebere ndị ajọ omume bụ obi ọjọọ.” Mgbe na-adịghị anya, ma ndị ọjọọ ma ọrụ ha agaghị adịkwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya