Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịmụ Baịbụl?
Ị̀ ma Baịbụl nke ọma? E nweghị akwụkwọ ọzọ e kesarala n’ụwa otú e kesara Baịbụl. Ndị si n’ebe niile achọpụtala na ozi dị na ya na-akasi obi ma na-eme ka e nwee olileanya nakwa na ndụmọdụ ndị dị na ya bara uru mgbe niile. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị taa amachaghị Baịbụl. Ma ị̀ na-aga chọọchị ma ị naghị aga, ikekwe ị chọrọ ịmatakwu Baịbụl. Ihe mere e ji dee akwụkwọ a bụ ka o nyere gị aka ịmụta isi ihe ndị dị na Baịbụl.
TUPU i bulite Baịbụl gụwa, ọ ga-aka mma ka i buru ụzọ mara ihe ole na ole banyere otú e si hazie ya. Ihe ọzọ a na-akpọ Baịbụl bụ Akwụkwọ Nsọ. O nwere akwụkwọ iri isii na isii. Nke mbụ bụ Jenesis, nke ikpeazụ abụrụ Mkpughe.
Okwu onye ka e dere na Baịbụl? Ajụjụ ahụ na-eme ka mmadụ chee echiche. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ihe dị ka ndị ikom iri anọ dere Baịbụl. O were ha ihe karịrị otu puku na narị afọ isii. Buru n’obi na ndị ikom ahụ ekwughị na ọ bụ okwu ha ka ha dere. Otu onye so dee Baịbụl dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Onye ọzọ dekwara, sị: “Ọ bụ mmụọ Jehova kwuru okwu site n’ọnụ m, okwu ya dịkwa n’ire m.” (2 Samuel 23:2) N’ihi ya, ndị dere Baịbụl kwuru na ihe dị na Baịbụl bụ okwu Jehova Chineke, bụ́ Onye Ọchịchị Kacha Elu n’eluigwe na ala. Ha kwuru na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ mara ya.
E nwere ihe ọzọ ga-enyere gị aka ịghọta Baịbụl. Akwụkwọ Nsọ nwere naanị otu isiokwu, ya bụ, igosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ site n’Alaeze eluigwe ya. N’akwụkwọ a, ị ga-ahụ otú isiokwu a si pụta malite na Jenesis ruo ná Mkpughe.
Buru ihe ndị a anyị kwuru n’uche tụlee ozi dị na Baịbụl, bụ́ akwụkwọ a kacha mara amara n’ụwa.
Igbe dị na peeji nke 3]
IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA BANYERE BAỊBỤL
◼ Ide Baịbụl were otu puku afọ, narị isii na iri, malite na 1513 T.O.A. ruo 98 O.A.a
◼ A na-akpọ akwụkwọ iri atọ na itoolu ndị mbụ Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma ọ bụ “Agba Ochie.” E dere ọtụtụ n’ime ha n’asụsụ Hibru, ma dee ụfọdụ n’asụsụ Arameik.
◼ A na-akpọ akwụkwọ iri abụọ na asaa ndị ikpeazụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ.” E dere ha n’asụsụ Grik.
◼ Baịbụl nwere isi na amaokwu. Dị ka ihe atụ, Matiu 6:9, 10 pụtara Matiu isi isii, amaokwu nke itoolu na nke iri.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a E nwere ụzọ dị iche iche e si ede oge. N’akwụkwọ a, O.A. pụtara “Oge Anyị.” T.O.A. pụtara “Tupu Oge Anyị.” Ị ga-ahụ ya n’ala ala peeji ndị dị n’akwụkwọ a, bụ́ ebe e dere ihe ụfọdụ ndị dị mkpa merenụ na mgbe ha mere.