Abụ nke 8
Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
Nke E Biri Ebi
1. Jehova, Nn’anyị bi n’elu,
Nke a bụ abalị dị nsọ!
N’abal’iri n’anọ na Naịsan k’a hụrụ
Ebube na àgwà gị dum,
E rie atụrụ Ngabiga,
Izrel niile apụọ n’ohu.
Onyenw’anyị mechara jir’ọbara ya
Mezuo amụma nke a dị nsọ.
2. Anyị abịal’ugbu a n’ihu gị
Dị ka atụrụ ị n’azụ,
Ito gị n’ihi na i ziteer’anyị Kraịst,
Na ịsọpụr’aha nsọ gị.
Nchet’ọnwụ Jizọs agaghị
Apụ apụ n’obi anyị.
Anyị ga n’eje ije n’ụzọ Kraịst zir’anyị,
K’anyị nwee ndụ ebigh’ebi.
(Gụọkwa Luk 22:14-20; 1 Kọr. 11:23-26.)