Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu
(O si ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ)
1. Ajọ Omume, Nsogbu Ụwa
A. Onye kpatara nsogbu ụwa
Ọchịchị kpatara oge ọjọọ nke dị taa. Ilu 29:2; 28:28
Onye na-achị ụwa bụ onye iro Chineke. 2Kọ 4:4; 1Jn 5:19; Jn 12:31
Ekwensu wetara ahụhụ, oge ya dị mkpirikpi. Mkp 12:9, 12
A ga-eke Ekwensu agbụ, udo dị ebube ga-esochi. Mkp 20:1-3; 21:3, 4
B. Ihe mere e ji kwe ka ajọ omume dịrị
Ekwensu mara aka na ndị e kere eke
agaghị eguzosi ike n’ebe Chineke nọ. Job 1:11, 12
A na-enye ndị kwesịrị ntụkwasị obi ohere igosi na ha
na-eguzosi ike n’ihe. Ro 9:17; Ilu 27:11
E gosiwo na Ekwensu bụ onye ụgha, a ga-ekpebi ihe iseokwu. Jn 12:31
A ga-akwụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi
ụgwọ ọrụ bụ́ ndụ ebighị ebi. Ro 2:6, 7; Mkp 21:3-5
CH. Ọ bụ ndokwa obi ebere na e mere ka oge ọgwụgwụ dị ogologo
Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, ọ na-ewe oge inye ịdọ aka ná ntị. Mt 24:14, 37-39
Chineke adịghị egbu oge, kama ọ na-eme ebere. 2Pi 3:9; Aịz 30:18
Baịbụl na-enyere anyị aka izere ịbụ ndị a
bịakwasịrị na mberede. Lu 21:36; 1Te 5:4
Chọọ ndokwa Chineke ugbu a ka e wee chebe gị. Aịz 2:2-4; Zef 2:3
D. Ihe ga-agwọta nsogbu ụwa agaghị esi n’aka mmadụ
Ndị mmadụ na-atụ oké egwu, ha nọ ná mgbagwoju anya. Lu 21:10, 11; 2Ti 3:1-5
Ọ bụ alaeze Chineke ga-enwe ihe ịga nke ọma,
ọ bụghị ụmụ mmadụ. Da 2:44; Mt 6:10
Iji dị ndụ, gị na Eze ahụ mee udo ugbu a. Ọma 2:9, 11, 12
2. Alaeze
A. Ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ
Ọ ga-eme ka uche Chineke mezuo. Mt 6:9, 10; Ọma 45:6; Mkp 4:11
Ọ bụ ọchịchị nke nwere eze na iwu. Aịz 9:6, 7; 2:3; Ọma 72:1, 8
Ọ ga-ebibi ajọ omume, chịa ụwa dum. Da 2:44; Ọma 72:8
Ọchịchị otu puku afọ ga-eme ka ụmụ mmadụ dịghachi
otú ha dị na mbụ, weghachikwa Paradaịs. Mkp 21:2-4; 20:6
B. Ọ ga-amalite ịrụ ọrụ mgbe ndị iro Kraịst ka na-akpa ike
Mgbe Kraịst bilitesịrị, o cheere ogologo oge. Ọma 110:1; Hib 10:12, 13
Ọ malitere ịchị, buso Setan agha. Ọma 110:2; Mkp 12:7-9; Lu 10:18
E guzobere Alaeze mgbe ahụ, ahụhụ ụwa wee sochie. Mkp 12:10, 12
Nsogbu dị ugbu a na-egosi na ugbu a bụ oge ịkwado Alaeze. Mkp 11:15-18
CH. Ọ dịghị ‘n’obi,’ ọ maliteghị site ná mgbalị ndị mmadụ
Alaeze dị n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa. 2Ti 4:18; 1Kọ 15:50; Ọma 11:4
Ọ dịghị ‘n’obi’; ọ bụ ndị Farisii ka Jizọs na-agwa okwu. Lu 17:20, 21
Ọ bụghị nke ụwa a ma ọlị. Jn 18:36; Lu 4:5-8; Da 2:44
A ga-eji ya dochie ọchịchị ụwa na ụkpụrụ ya. Da 2:44
3. Alụmdi na Nwunye
A. Njikọ alụmdi na nwunye aghaghị ịbụ ihe kwesịrị nsọpụrụ
E ji ya tụnyere Kraịst na nwunye ọhụrụ ya. Efe 5:22, 23
Ihe ndina alụmdi na nwunye aghaghị ịbụ ihe a na-emerụghị emerụ. Hib 13:4
E nyere di na nwunye ndụmọdụ ka ha ghara ikewa. 1Kọ 7:10-16
Naanị por·neiʹa bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru pụrụ
ime ka a gbaa alụkwaghịm. Mt 19:9
B. Ndị Kraịst aghaghị ịsọpụrụ ụkpụrụ ịbụisi
Dị ka isi, di aghaghị ịhụ ezinụlọ ya n’anya, na-elekọta ya. Efe 5:23-31
Nwunye ga-anọ n’okpuru di ya, hụ di
ya n’anya, na-erubere ya isi. 1Pi 3:1-7; Efe 5:22
Ụmụntakịrị aghaghị ịdị na-erube isi. Efe 6:1-3; Kọl 3:20
CH. Ọrụ dịịrị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst n’ebe ụmụ ha nọ
Ha aghaghị igosi ha ịhụnanya, na-ewepụtara ha oge, na-elebara ha anya. Taị 2:4
Akpasula ha iwe. Kọl 3:21
Na-egbo mkpa ha, tinyere mkpa ime mmụọ. 2Kọ 12:14; 1Ti 5:8
Na-enye ha ọzụzụ ka ha wee dị ndụ. Efe 6:4; Ilu 22:6, 15; 23:13, 14
D. Ndị Kraịst kwesịrị ịlụ naanị Ndị Kraịst
Lụọ naanị “n’ime Onyenwe anyị.” 1Kọ 7:39; Di 7:3, 4; Neh 13:26
E. Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ịlụ karịa otu nwaanyị
Na mbụ, a chọrọ ka nwoke nwee naanị otu nwunye. Je 2:18, 22-25
Jizọs weghachiiri Ndị Kraịst ụkpụrụ ahụ. Mt 19:3-9
Ndị Kraịst oge mbụ alụghị karịa otu nwaanyị. 1Kọ 7:2, 12-16; Efe 5:28-31
4. Amagedọn
A. Agha Chineke ga-eji kwụsị ajọ omume
A ga-akpọkọta mba niile maka agha Amagedọn. Mkp 16:14, 16
Chineke ga-eji Ọkpara ya na ndị mmụọ ozi lụọ ọgụ. 2Te 1:6-9; Mkp 19:11-16
Otú anyị pụrụ isi lanahụ. Zef 2:2, 3; Mkp 7:14
B. Ọ gaghị emebi ịhụnanya Chineke
Ụwa rụrụ arụ gabiga ókè. 2Ti 3:1-5
Chineke nwere ndidi, ma ikpe ziri ezi chọrọ ka o mee ihe. 2Pi 3:9, 15; Lu 18:7, 8
A ghaghị ibibi ndị ajọ omume ka ihe wee
gaziere ndị ezi omume. Ilu 21:18; Mkp 11:18
5. Atọ n’Ime Otu
A. Chineke bụ Nna, ọ bụ otu Onye, onye kasị ukwuu n’eluigwe na ụwa
Chineke abụghị ndị atọ. Di 6:4; Mal 2:10; Mk 10:18; Ro 3:29, 30
E kere Ọkpara eke; Chineke nọ naanị
ya tupu mgbe ahụ. Mkp 3:14; Kọl 1:15; Aịz 44:6
Ọ bụ Chineke bụ onye na-achị eluigwe na ụwa n’oge niile. Fil 2:5, 6; Da 4:35
A ga-ebuli Chineke elu karịa ihe niile. Fil 2:10, 11
B. Ọkpara ahaghị ka Nna ya tupu ya abịa n’ụwa, ọ haghịkwa ka ya mgbe ọ bịasịrị
Ọkpara rubere isi n’eluigwe, ọ bụ Nna ya zitere ya. Jn 8:42; 12:49
O rubere isi n’ụwa, Nna ya ka ya ukwuu. Jn 14:28; 5:19; Hib 5:8
E buliri ya elu n’eluigwe, ma ọ ka
nọ n’okpuru Nna ya. Fil 2:9; 1Kọ 15:28; Mt 20:23
Jehova bụ isi Kraịst, bụrụkwa Chineke ya. 1Kọ 11:3; Jn 20:17; Mkp 1:6
CH. Otú Chineke na Kraịst si bụrụ otu
Ha na-emekọ ihe ọnụ mgbe niile. Jn 8:28, 29; 14:10
Ha bụ otu, dị ka di na nwunye si bụrụ otu. Jn 10:30; Mt 19:4-6
Ndị niile kwere ekwe aghaghị ịbụ otu otú a. Jn 17:20-22; 1Kọ 1:10
Otu ofufe nke a na-efe Jehova site na Kraịst
ga-adịru mgbe ebighị ebi. Jn 4:23, 24
D. Mmụọ nsọ Chineke bụ ike ya nke nọ n’ọrụ
Ọ bụ ike, ọ bụghị onye. Mt 3:16; Jn 20:22; Ọrụ 2:4, 17, 33
Ọ bụghị onye ya na Chineke na Kraịst nọ n’eluigwe. Ọrụ 7:55, 56; Mkp 7:10
Chineke na-eji ya emezu nzube ya. Ọma 104:30; 1Kọ 12:4-11
Ndị na-efe Chineke na-anata ya, ọ na-eduzi ha. 1Kọ 2:12, 13; Ga 5:16
6. Baptizim
A. Ọ bụ ihe a chọrọ n’aka Onye Kraịst
Jizọs gosiri ihe nlereanya. Mt 3:13-15; Hib 10:7
Ọ bụ ihe na-egosi mmadụ ịjụ onwe
ya ma ọ bụ ịrara onwe ya nye. Mt 16:24; 1Pi 3:21
Ọ dịịrị naanị ndị toruru ịbụ ndị e ziri ihe. Mt 28:19, 20; Ọrụ 2:41
Imikpu mmadụ n’ime mmiri bụ otú e kwesịrị isi eme ya. Ọrụ 8:38, 39; Jn 3:23
B. Ọ dịghị asachapụ mmehie
E meghị Jizọs baptizim iji sachapụ mmehie ya. 1Pi 2:22; 3:18
Ọ bụ ọbara Jizọs na-asachapụ mmehie. 1Jn 1:7
7. Baịbụl
A. Okwu Chineke si n’ike mmụọ nsọ
Mmụọ Chineke kpaliri ndị mmadụ ide ya. 2Pi 1:20, 21
Amụma dị n’ime ya: Da 8:5, 6, 20-22; Lu 21:5, 6, 20-22; Aịz 45:1-4
Baịbụl dum si n’ike mmụọ nsọ, baakwa uru. 2Ti 3:16, 17; Ro 15:4
B. Ọ bụ ihe nduzi bara uru maka oge anyị
Ileghara ụkpụrụ Baịbụl anya na-eweta ọnwụ. Ro 1:28-32
A pụghị iji amamihe mmadụ dochie ya. 1Kọ 1:21, 25; 1Ti 6:20
Ọ bụ ihe ga-echebe anyị ka onye iro anyị
kasị ike ghara imeri anyị. Efe 6:11, 12, 17
Ọ na-eduzi mmadụ n’ezi ụzọ. Ọma 119:105; 2Pi 1:19; Ilu 3:5, 6
CH. E dere ya maka ndị mba niile na agbụrụ niile
A malitere ide Baịbụl n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ọp 17:14; 24:12, 16; 34:27
Ọ bụ Chineke nyere anyị ya, o nyeghị ya naanị ndị Yurop. Ro 10:11-13; Ga 3:28
Chineke na-anabata ụdị mmadụ niile. Ọrụ 10:34, 35; Ro 5:18; Mkp 7:9, 10
8. Chọọchị
A. Chọọchị bụ ihe ime mmụọ, e wuru ya n’elu Kraịst
Chineke adịghị ebi n’ụlọ nsọ mmadụ wuru. Ọrụ 17:24, 25; 7:48
Ezi chọọchị bụ ụlọ nsọ ime mmụọ nke e ji nkume dị ndụ wuo. 1Pi 2:5, 6
Kraịst bụ nkume isi nkuku ya; ndị ozi bụ ntọala nke na-akwado ya. Efe 2:20
A ghaghị ife Chineke n’ime mmụọ na eziokwu. Jn 4:24
B. E wukwasịghị chọọchị n’elu Pita
Jizọs asịghị na e wukwasịrị chọọchị n’elu Pita. Mt 16:18
E kwuru na ọ bụ Jizọs bụ “oké nkume” ahụ. 1Kọ 10:4
Pita kwuru na ọ bụ Jizọs bụ ntọala. 1Pi 2:4, 6-8; Ọrụ 4:8-12
9. Ekpere
A. Ekpere ndị Chineke na-anụ
Chineke na-aṅa ntị n’ekpere ndị mmadụ. Ọma 145:18; 1Pi 3:12
Ọ dịghị anụ ekpere ndị na-emebi iwu ọ gwụla
ma hà gbanwere ụzọ ha. Aịz 1:15-17
A ghaghị ikpe ekpere n’aha Jizọs. Jn 14:13, 14; 2Kọ 1:20
A ghaghị ikpe ekpere dị ka uche Chineke si dị. 1Jn 5:14, 15
Okwukwe dị oké mkpa. Jes 1:6-8
B. Okwu nkwukwasị efu, ikpeku Meri ma ọ bụ “ndị senti” ekpere ekwesịghị ekwesị
A ghaghị ikpeku Chineke ekpere n’aha Jizọs. Jn 14:6, 14; 16:23, 24
Ọ gaghị anụ okwu nkwukwasị. Mt 6:7
10. Ekwensu, Ndị Mmụọ Ọjọọ
A. Ekwensu bụ onye mmụọ
Ọ bụghị ajọ omume nke dị n’ime mmadụ kama ọ bụ onye mmụọ. 2Ti 2:26
Ekwensu bụ onye dị adị, dị ka ndị mmụọ ozi bụ ndị dị adị. Mt 4:1, 11; Job 1:6
O mere onwe ya Ekwensu site n’ọchịchọ ọjọọ. Jes 1:13-15
B. Ekwensu bụ onye a na-adịghị ahụ anya nke na-achị ụwa
Ụwa dị n’aka ya. Ọ bụ chi ya. 2Kọ 4:4; 1Jn 5:19; Mkp 12:9
A hapụrụ ya ka ọ nọrọ ruo mgbe e doziri ihe iseokwu. Ọp 9:16; Jn 12:31
A ga-atụba ya n’abis, e mesịa, e bibie ya. Mkp 20:2, 3, 10
CH. Ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi
Ha sonyeere Setan tupu Iju Mmiri. Je 6:1, 2; 1Pi 3:19, 20
E wedara ha ala, mee ka ha ghara inweta ìhè ọ bụla. 2Pi 2:4; Jud 6
Ha na-alụso Chineke ọgụ, na-emegbu ụmụ mmadụ. Lu 8:27-29; Mkp 16:13, 14
A ga-ebibi ha na Setan. Mt 25:41; Lu 8:31; Mkp 20:2, 3, 10
11. Eluigwe
A. Ọ bụ naanị 144,000 ga-aga eluigwe
A kpaara ọnụ ọgụgụ ha ókè; ha ga-eso Kraịst bụrụ eze. Mkp 5:9, 10; 20:4
Jizọs bụ onye mbụ; a họọrọ ndị ọzọ kemgbe ahụ. Kọl 1:18; 1Pi 2:21
Ọtụtụ ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa. Ọma 72:8; Mkp 21:3, 4
144,000 nọ n’ọnọdụ pụrụ iche nke ndị ọzọ na-anọghị. Mkp 14:1, 3; 7:4, 9
12. Ememme Ncheta, Mas
A. Ime Ememme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
A na-eme ya otu ugboro n’afọ n’ụbọchị
Ememme Ngabiga. Lu 22:1, 17-20; Ọp 12:14
A na-eme ya ka e wee cheta ọnwụ Kraịst
nwụrụ iji chụọ àjà. 1Kọ 11:26; Mt 26:28
Ndị nwere olileanya eluigwe na-eri ya. Lu 22:29, 30; 12:32, 37
Otú mmadụ si amata na ya nwere olileanya ahụ. Ro 8:15-17
B. Mas esighị n’Akwụkwọ Nsọ
A ghaghị ịwụsị ọbara ka e wee gbaghara mmadụ mmehie. Hib 9:22
Ọ bụ naanị Kraịst bụ Onye Ogbugbo
nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ. 1Ti 2:5, 6; Jn 14:6
Kraịst nọ n’eluigwe; ụkọchukwu adịghị akpọdata ya. Ọrụ 3:20, 21
Ọ dịghị mkpa ịchụghachi àjà Kraịst chụworo. Hib 9:24-26; 10:11-14
13. Hel (Hedis, Sheol)
A. Ọ bụghị ebe nkịtị e ji ọkụ emekpa mmadụ ahụ́
Job bụ́ onye nọ n’ahụhụ kpere ekpere ka ya jee ebe ahụ. Job 14:13
A dịghị arụ ọrụ na ya. Ọma 6:5; Ek 9:10; Aịz 38:18, 19
E si n’ili, ya bụ, hel, kpọlite Jizọs. Ọrụ 2:27, 31, 32; Ọma 16:10
Hel ga-ewepụta ndị ọzọ nwụrụ anwụ, a ga-ebibi ya. Mkp 20:13, 14
B. Ọkụ na-anọchi anya ịla n’iyi
Ọkụ nọchiri anya ọnwụ. Mt 25:41, 46; 13:30
Ndị ajọ omume na-echegharịghị, a ga-ebibi ha ruo
mgbe ebighị ebi dị ka à ga-asị na e ji ọkụ. Hib 10:26, 27
‘Imekpa Setan ahụ́’ n’ọkụ bụ ọnwụ ebighị ebi. Mkp 20:10, 14, 15
CH. Akụkọ ọgaranya na Lazarọs adịghị egosi na a na-emekpa mmadụ ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi
Ọkụ a abụghị ọkụ nkịtị dị ka obi Ebreham na-abụghị obi nkịtị. Lu 16:22-24
Inwe ihu ọma Ebreham dị iche n’ịnọ n’ọchịchịrị. Mt 8:11, 12
A kpọrọ mbibi a ga-ebibi Babịlọn imekpa ya ahụ́ n’ọkụ. Mkp 18:8-10, 21
14. Ife Meri
A. Meri bụ nne Jizọs, ọ bụghị “nne nke Chukwu”
Chineke enweghị mmalite. Ọma 90:2; 1Ti 1:17
Meri bụ nne Ọkpara Chineke, mgbe Ọ nọ n’ụwa. Lu 1:35
B. Meri abụghị ‘nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ruo mgbe ebighị ebi’
Ọ lụrụ Josef. Mt 1:19, 20, 24, 25
Ọ mụrụ ụmụ ndị ọzọ ma e wezụga Jizọs. Mt 13:55, 56; Lu 8:19-21
N’oge ahụ, ha abụghị “ụmụnna ya n’ụzọ ime mmụọ.” Jn 7:3, 5
15. Ife Ndị Nna Ochie Ofufe
A. Ife ndị nna ochie ofufe bụ ihe efu
Ndị nna ochie anwụwo, ha amaghị ihe ọ bụla. Ek 9:5, 10
Ndị nna ochie mbụ anyị erughị eru ka e fee ha ofufe. Ro 5:12, 14; 1Ti 2:14
Chineke kwuru ka a ghara ife ụdị ofufe ahụ. Ọp 34:14; Mt 4:10
B. A pụrụ ịsọpụrụ mmadụ, ma naanị Chineke ka a ga-efe ofufe
Ndị ntorobịa kwesịrị ịsọpụrụ ndị tọrọ ha. 1Ti 5:1, 2, 17; Efe 6:1-3
Ma ọ bụ naanị Chineke ka a ga-efe ofufe. Ọrụ 10:25, 26; Mkp 22:8, 9
16. Ihe Mgbapụta
A. E ji ndụ Jizọs dịrị dị ka mmadụ kwụọ ụgwọ ka ọ bụrụ ‘ihe mgbapụta maka mmadụ niile’
Jizọs nyere ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta. Mt 20:28
Uru nke ọbara ọ wụsịrị na-eme ka a gbaghara ndị mmadụ mmehie. Hib 9:14, 22
Otu àjà ezuwo maka mgbe niile. Ro 6:10; Hib 9:26
Abamuru ya adịghị abịara onwe ya; a ghaghị ịnabata ya anabata. Jn 3:16
B. Ya na ụgwọ e ji ya kwụọ hà
Adam zuru okè mgbe e kere ya. Di 32:4; Ek 7:29; Je 1:31
Ọ tụfuru izu okè ya na nke ụmụ ya site n’ime mmehie. Ro 5:12, 18
Ụmụ ya apụghị ịgbapụta onwe ha;
a chọrọ onye ya na Adam hà. Ọma 49:7; Di 19:21
Ndụ zuru okè Jizọs dịrị dị ka mmadụ bụ ihe mgbapụta. 1Ti 2:5, 6; 1Pi 1:18, 19
17. Ihe Oyiyi
A. Iji ihe oyiyi na ihe a kpụrụ akpụ efe ofufe bụ ịkọcha Chineke
A pụghị ime ihe oyiyi nke Chineke. 1Jn 4:12; Aịz 40:18; 46:5; Ọrụ 17:29
A dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere ihe oyiyi. 1Kọ 10:14; 1Jn 5:21
Ha aghaghị ife Chineke n’ime mmụọ na eziokwu. Jn 4:24
B. Ife ihe oyiyi ofufe wetaara mba Izrel ọnwụ
A gwara ndị Juu ka ha ghara ife ihe oyiyi ofufe. Ọp 20:4, 5
Ihe oyiyi apụghị ịnụ ihe ma ọ bụ ikwu okwu;
ndị na-eme ha ga-adị ka ha. Ọma 115:4-8
O wetara ọnyà na mbibi. Ọma 106:36, 40-42; Jer 22:8, 9
CH. ‘Iji ihe oyiyi efe Chineke ofufe’ ekwesịghị ekwesị
Chineke ekweghị ka ‘e jiri ihe oyiyi’ fee ya ofufe. Aịz 42:8
Ọ bụ naanị Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” Ọma 65:1, 2
18. Ịgba Àmà
A. Ndị Kraịst niile aghaghị ịgba àmà, kwusaa ozi ọma
Ha aghaghị ikwupụta Jizọs n’ihu ụmụ mmadụ
ka ihe ha wee masị Chineke. Mt 10:32
Ha aghaghị ịbụ ndị na-eme okwu ya, ndị na-egosi okwukwe. Jes 1:22-24; 2:24
Ndị ọhụrụ kwesịkwara ịghọ ndị ozizi. Mt 28:19, 20
Nkwupụta ihu ọha na-eweta nzọpụta. Ro 10:10
B. Ọ dị mkpa ije ugboro ugboro, ịnọgide na-agba àmà
A ghaghị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ. Mt 24:14
Jeremaya mara ọkwa ruo ọtụtụ afọ na a ga-ebibi Jeruselem. Jer 25:3
Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, ha apụghị ịkwụsị. Ọrụ 4:18-20; 5:28, 29
CH. Ha aghaghị ịgba àmà ka ikpe ọbara ghara ịma ha
A ghaghị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị maka
ọgwụgwụ nke na-abịa. Ezi 33:7; Mt 24:14
Adọghị ndị mmadụ aka ná ntị na-eweta ikpe ọmụma ọbara. Ezi 33:8, 9; 3:18, 19
Ikpe ọbara amaghị Pọl; ihe niile o kwuru bụ eziokwu. Ọrụ 20:26, 27; 1Kọ 9:16
Ọ na-azọpụta ma onye àmà ma onye na-aṅa ntị. 1Ti 4:16; 1Kọ 9:22
19. Ịgwọ Ọrịa, Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche
A. Uru ọgwụgwọ ime mmụọ bara na-adịgide adịgide
Ọrịa ime mmụọ na-eweta mbibi. Aịz 1:4-6; 6:10; Ho 4:6
Ọgwụgwọ ime mmụọ bụ ọrụ bụ́ isi. Jn 6:63; Lu 4:18
Ọ na-ewepụ mmehie; ọ na-enye obi ụtọ na ndụ. Jes 5:19, 20; Mkp 7:14-17
B. Alaeze Chineke ga-eweta ọgwụgwọ anụ ahụ́ na-adịgide adịgide
Jizọs gwọrọ ọrịa, kwusaa ngọzi Alaeze. Mt 4:23
E kwere nkwa Alaeze ịbụ ihe ngwọta na-adịgide adịgide. Mt 6:10; Aịz 9:7
A ga-ewepụ ọbụna ọnwụ. 1Kọ 15:25, 26; Mkp 21:4; 20:14
CH. E nweghị ihe na-egosi na iji okwukwe agwọ ọrịa n’oge a masịrị Chineke
Ndị na-eso ụzọ Kraịst ejighị ọrụ ebube gwọọ onwe ha. 2Kọ 12:7-9; 1Ti 5:23
Onyinye ịrụ ọrụ ebube kwụsịrị mgbe oge ndị ozi gasịrị. 1Kọ 13:8-11
Ịgwọ ọrịa abụghị ihe na-egosi kpọmkwem na
mmadụ nwere ihu ọma Chineke. Mt 7:22, 23; 2Te 2:9-11
D. Ịsụ asụsụ dị iche iche bụ ndokwa dịrị naanị nwa oge
Ọ bụ ihe ịrịba ama; e kwesịrị ịchọ onyinye ndị ka ukwuu. 1Kọ 14:22; 12:30, 31
E buru amụma na onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ ga-agabiga. 1Kọ 13:8-10
Ọrụ ebube abụghị ihe na-egosi kpọmkwem na
mmadụ nwere ihu ọma Chineke. Mt 7:22, 23; 24:24
20. Jehova, Chineke
A. Aha Chineke
“Chineke” bụ utu aha; Onyenwe anyị nwere aha nke onwe ya. 1Kọ 8:5, 6
Anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha ya nsọ. Mt 6:9, 10
Jehova bụ aha Chineke. Ọma 83:18; Ọp 6:2, 3; 3:15; Aịz 42:8
Aha ya dị ná nsụgharị KJ. Ọp 6:3 (Ihe e dere n’ala ala
peeji nke nsụgharị Dy). Ọma 83:18; Aịz 12:2; 26:4
Jizọs mere ka a mara aha ahụ. Jn 17:6, 26; 5:43; 12:12, 13, 28
B. Ịdị adị Chineke
A pụghị ịhụ Chineke anya ma dị ndụ. Ọp 33:20; Jn 1:18; 1Jn 4:12
Ọ dịghị mkpa ịhụ Chineke iji kwere. Hib 11:1; Ro 8:24, 25; 10:17
A na-amata Chineke site n’ọrụ ya ndị a na-ahụ anya. Ro 1:20; Ọma 19:1, 2
Mmezu amụma na-egosi na Chineke dị adị. Aịz 46:8-11
CH. Àgwà Chineke
Chineke bụ ịhụnanya. 1Jn 4:8, 16; Ọp 34:6; 2Kọ 13:11; Maị 7:18
Amamihe ya kasị ukwuu. Job 12:13; Ro 11:33; 1Kọ 2:7
Ọ bụ onye ezi omume, ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Di 32:4; Ọma 37:28
Ọ bụ onye pụrụ ime ihe niile, o nwere ike niile. Job 37:23; Mkp 7:12; 4:11
D. Ọ bụghị mmadụ niile na-ejere otu Chineke ahụ ozi
Ụzọ yiri nke dị mma adịghị ezi ezi mgbe niile. Ilu 16:25; Mt 7:21
E nwere ụzọ abụọ, naanị otu na-eduba ná ndụ. Mt 7:13, 14; Di 30:19
E nwere ọtụtụ chi, ma ọ bụ naanị otu ezi Chineke dị. 1Kọ 8:5, 6; Ọma 82:1
Ịmata ezi Chineke dị oké mkpa iji nweta ndụ. Jn 17:3; 1Jn 5:20
21. Jizọs
A. Jizọs bụ Ọkpara Chineke na Eze ọ họpụtara
Onye Chineke bu ụzọ mụọ, e si n’aka ya kee ihe niile ọzọ. Mkp 3:14; Kọl 1:15-17
E mere ka ọ ghọọ mmadụ nke nwaanyị mụrụ,
nke dị ala karịa ndị mmụọ ozi. Ga 4:4; Hib 2:9
E ji mmụọ Chineke mụọ ya, o wee nwee olileanya ibi n’eluigwe. Mt 3:16, 17
E buliri ya elu karịa otú ọ dị tupu ọ ghọọ mmadụ. Fil 2:9, 10
B. Ikwere na Jizọs Kraịst dị oké mkpa iji nweta nzọpụta
Kraịst bụ Mkpụrụ Ebreham nke e kwere ná nkwa. Je 22:18; Ga 3:16
Naanị Jizọs bụ Nnukwu Onye
Nchụàjà na ihe mgbapụta. 1Jn 2:1, 2; Hib 7:25, 26; Mt 20:28
A ga-enweta ndụ site n’ịmara Chineke na Kraịst,
site n’irube isi. Jn 17:3; Ọrụ 4:12
CH. A chọrọ ihe karịrị ikwere na Jizọs
A ghaghị ikwere na ya, rụọkwa ọrụ. Jes 2:17-26; 1:22-25
A ghaghị irube isi n’iwu ya, rụọ ọrụ ọ rụrụ. Jn 14:12, 15; 1Jn 2:3
Ọ bụghị ndị niile na-akpọ aha Onyenwe anyị ga-aba n’Alaeze. Mt 7:21-23
22. Mbilite n’Ọnwụ
A. Ọ bụ olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ
A ga-akpọlite ndị niile nọ n’ili. Jn 5:28, 29
Mbilite n’ọnwụ Jizọs bụ ihe na-emesi anyị obi ike. 1Kọ 15:20-22; Ọrụ 17:31
Ndị mehiere mmụọ nsọ agaghị ebili. Mt 12:31, 32
E mere ka obi sie ndị na-egosi okwukwe ike na ha ga-enweta ya. Jn 11:25
B. Ibilite n’ọnwụ wee dịrị ndụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa
Mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam;
ha na-enweta ndụ n’ime Jizọs. 1Kọ 15:20-22; Ro 5:19
E nwere ọdịiche n’otú ndị a ga-akpọlite ga-adị. 1Kọ 15:40, 42, 44
Ndị ga-eso Jizọs ga-adị ka ya. 1Kọ 15:49; Fil 3:20, 21
Ndị na-agaghị eso chịa ga-anọ n’ụwa. Mkp 20:4b, 5, 13; 21:3, 4
23. Oge Ikpeazụ
A. Ihe “ọgwụgwụ ụwa” pụtara
Ọ bụ ọgwụgwụ usoro ihe a. Mt 24:3; 2Pi 3:5-7; Mk 13:4
Ọ bụghị ọgwụgwụ ụwa nkịtị, kama nke ajọ usoro a. 1Jn 2:17
A ga-enwe oge ọgwụgwụ tupu mbibi abịa. Mt 24:14
Ndị ezi omume ga-alanahụ; ụwa ọhụrụ ga-esochi. 2Pi 2:9; Mkp 7:14-17
B. Ọ dị mkpa ịmụrụ anya iji mata ihe ịrịba ama nke oge ikpeazụ
Chineke nyere ihe ịrịba ama iji duzie anyị. 2Ti 3:1-5; 1Te 5:1-4
Ụwa aghọtaghị na ọ dị mkpa. 2Pi 3:3, 4, 7; Mt 24:39
Chineke adịghị egbu oge, kama ọ na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị. 2Pi 3:9
A ga-enweta ụgwọ ọrụ n’ihi ịmụrụ anya, n’ihi iji ya kpọrọ ihe. Lu 21:34-36
24. Mkpụrụ Obi
A. Ihe mkpụrụ obi bụ
Mmadụ bụ mkpụrụ obi. Je 2:7; 1Kọ 15:45; Jọs 11:11; Ọrụ 27:37
A kpọkwara ụmụ anụmanụ mkpụrụ obi. Ọg 31:28; Mkp 16:3; Le 24:18
Mkpụrụ obi nwere ọbara, ọ na-eri ihe,
ọ pụrụ ịnwụ anwụ. Jer 2:34; Le 7:18; Ezi 18:4
E kwuru na mmadụ nke dị ndụ nwere mkpụrụ obi. Mk 8:36; Jn 10:15
B. Ihe dị iche n’etiti mkpụrụ obi na mmụọ
Ndụ nke mmadụ ma ọ bụ ihe e kere eke dị bụ mkpụrụ obi. Jn 10:15; Le 17:11
Ike ndụ nke na-eme ka mkpụrụ obi rụwa
ọrụ ka a na-akpọ “mmụọ.” Ọma 146:4; 104:29
Mgbe mmadụ nwụrụ, ike ndụ na-alaghachikwuru Chineke. Ek 12:7
Ọ bụ naanị Chineke pụrụ ime ka ike ndụ rụwa ọrụ. Ezi 37:12-14
25. Mmegide, Mkpagbu
A. Ihe mere e ji emegide Ndị Kraịst
A kpọrọ Jizọs asị, o buru amụma na a ga-emegide ha. Jn 15:18-20; Mt 10:22
Ịgbaso ụkpụrụ ziri ezi na-ama ụwa ikpe. 1Pi 4:1, 4, 12, 13
Setan, bụ́ chi nke usoro ihe a, na-emegide Alaeze. 2Kọ 4:4; 1Pi 5:8
Onye Kraịst adịghị atụ egwu, Chineke na-akwado ya. Ro 8:38, 39; Jes 4:8
B. Nwunye ekwesịghị ikwe ka di kewapụ ya n’ebe Chineke nọ
E buwo ụzọ dọọ aka ná ntị; ndị ọzọ pụrụ iduhie di ya. Mt 10:34-38; Ọrụ 28:22
Ọ ghaghị ilekwasị Chineke na Kraịst anya. Jn 6:68; 17:3
Ọ pụrụ ịzọpụtakwa di ya site n’ikwesị ntụkwasị obi. 1Kọ 7:16; 1Pi 3:1-6
Di bụ isi, ma ọ bụghị ya ga-ekpebi otú a ga-esi fee ofufe. 1Kọ 11:3; Ọrụ 5:29
CH. Di ekwesịghị ikwe ka nwunye gbochie ya ijere Chineke ozi
Ọ ghaghị ịhụ nwunye ya na ezinụlọ ya n’anya,
ọ ga-achọ ka ha nweta ndụ. 1Kọ 7:16
Ọ bụ ọrụ ya ime mkpebi, igbo mkpa ha. 1Kọ 11:3; 1Ti 5:8
Chineke na-ahụ nwoke nke na-akwado eziokwu n’anya. Jes 1:12; 5:10, 11
Ikwenyere ihe ọjọọ ka udo wee dị na-eweta iwe Chineke. Hib 10:38
Na-edu ezinụlọ gị ruo mgbe ha ga-enweta obi ụtọ n’ime ụwa ọhụrụ. Mkp 21:3, 4
26. Mmehie
A. Ihe mmehie bụ
Ọ bụ imebi iwu Chineke na ụkpụrụ ya zuru okè. 1Jn 3:4; 5:17
Mmadụ ga-aza Chineke ajụjụ, ebe ọ bụ Ya kere ya. Ro 14:12; 2:12-15
Iwu kọwara ihe mmehie bụ́, mee ka ndị mmadụ mara na ọ dị. Ga 3:19; Ro 3:20
Mmadụ niile nọ ná mmehie, ha erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀
zuru okè nke Chineke. Ro 3:23; Ọma 51:5
B. Ihe mere mmadụ niile ji na-ata ahụhụ n’ihi mmehie Adam
Adam bufere mmadụ niile ezughị okè na ọnwụ. Ro 5:12, 18
Ọ bụ ebere Chineke mere o ji na-edi
ihe ụmụ mmadụ na-eme. Ọma 103:8, 10, 14, 17
Àjà Jizọs na-ekpuchi mmehie anyị. 1Jn 2:2
A ga-ewepụ mmehie na ọrụ niile ọzọ nke Ekwensu. 1Jn 3:8
CH. Mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu bụ nnupụisi, ọ bụghị mmekọahụ
E nyere iwu ka a ghara iri osisi ahụ mgbe a na-ekebeghị Iv. Je 2:17, 18
A gwara Adam na Iv ka ha mụọ ụmụ. Je 1:28
Ọ bụghị mmehie wetara ụmụ, kama ọ bụ ngọzi Chineke. Ọma 127:3-5
Iv mehiere mgbe di ya na-anọghị; o chereghị di ya. Je 3:6; 1Ti 2:11-14
Adam, onye bụ́ isi, nupụrụ isi n’iwu Chineke. Ro 5:12, 19
D. Ihe imehie mmụọ nsọ bụ (Mt 12:32; Mk 3:28, 29)
Ọ bụghị mmehie e ketara eketa. Ro 5:8, 12, 18; 1Jn 5:17
Mmadụ pụrụ ime ka mmụọ nsọ nwee mwute,
ma onye ahụ pụrụ ịgbanwe. Efe 4:30; Jes 5:19, 20
Ilezi anya nọrọ na-eme mmehie na-eduba n’ọnwụ. 1Jn 3:6-9
Chineke na-ekpe ndị dị otú ahụ ikpe, ọ na-ewepụ mmụọ ya. Hib 6:4-8
Anyị ekwesịghị ikpere ndị ahụ na-enweghị nchegharị ekpere. 1Jn 5:16, 17
27. Mmụọ, Ime Mgbaasị
A. Ihe mmụọ nsọ bụ
Ọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ, ọ bụghị onye. Ọrụ 2:2, 3, 33; Jn 14:17
E ji ya kee ihe, dee Baịbụl, meekwa ihe ndị ọzọ. Je 1:2; Ezi 11:5
E ji ya amụ ndị so n’ahụ́ Kraịst, e ji ya ete ha mmanụ. Jn 3:5-8; 2Kọ 1:21, 22
Ọ na-enye ike, na-edu ndị Chineke taa. Ga 5:16, 18
B. A na-akpọ ike ndụ mmụọ
Ọ bụ ihe na-eme ka a dị ndụ, iku ume na-eme ka ọ dịgide. Jes 2:26; Job 27:3
Ike ndụ dị n’aka Chineke. Zek 12:1; Ek 8:8
Ọ bụ Chineke nwe ike ndụ, ma nke mmadụ ma nke anụmanụ. Ek 3:19-21
A na-enyefe mmụọ n’aka Chineke, nwee
olileanya mbilite n’ọnwụ. Lu 23:46
CH. A ghaghị ịjụ mgbaasị dị ka ọrụ ndị mmụọ ọjọọ
Okwu Chineke machibidoro ya iwu. Aịz 8:19, 20; Le 19:31; 20:6, 27
Ịkọ ọdịnihu bụ ife ndị mmụọ ọjọọ; a kagburu ya. Ọrụ 16:16-18
Ọ na-eduga ná mbibi. Ga 5:19-21; Mkp 21:8; 22:15
A machibidoro ịgụ kpakpando iwu. Di 18:10-12; Jer 10:2
28. Ndịàmà Jehova
A. Mgbe Ndịàmà Jehova malitere
Jehova na-eme ka a mata ndịàmà ya. Aịz 43:10-12; Jer 15:16
Ndịàmà ya kwesịrị ntụkwasị obi malitere n’Ebel. Hib 11:4, 39; 12:1
Jizọs bụ ezi onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi. Jn 18:37; Mkp 1:5; 3:14
29. Ndị Amụma Ụgha
A. E buru amụma na a ga-enwe ndị amụma ụgha; ha dịrị n’oge ndịozi
Ụkpụrụ e ji amata ndị amụma ụgha. Di 18:20-22; Lu 6:26
E buru amụma na a ga-enwe ha;
a ga-amata ha site ná mkpụrụ ha. Mt 24:23-26; 7:15-23
30. Ndụ
A. Ụmụ mmadụ ndị na-erube isi aghaghị inweta ndụ ebighị ebi
Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere nkwa ndụ. Taị 1:2; Jn 10:27, 28
E kwere ndị nwere okwukwe nkwa ndụ ebighị ebi. Jn 11:25, 26
A ga-ebibi ọnwụ. 1Kọ 15:26; Mkp 21:4; 20:14; Aịz 25:8
B. Ọ bụ naanị ndị so n’ahụ́ Kraịst ga-eketa ndụ n’eluigwe
Chineke na-ahọrọ ndị ahụ dị ka o si masị ya. Mt 20:23; 1Kọ 12:18
Naanị 144,000 ka e si n’ụwa kpọrọ. Mkp 14:1, 4; 7:2-4; 5:9, 10
Ọbụna Jọn Onye Na-eme Baptizim agaghị anọ n’Alaeze eluigwe. Mt 11:11
CH. E kwere ọnụ ọgụgụ a na-akparaghị ókè, bụ́ “atụrụ ọzọ,” nkwa ịdị ndụ n’ụwa
Ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè ga-eso Jizọs nọrọ n’eluigwe. Mkp 14:1, 4; 7:2-4
“Atụrụ ọzọ” abụghị ụmụnna Kraịst. Jn 10:16; Mt 25:32, 40
A na-achịkọta ọtụtụ ndị ugbu a ka ha lanahụ n’ụwa. Mkp 7:9, 15-17
A ga-akpọlite ndị ọzọ ka ha dịrị ndụ n’ụwa. Mkp 20:12; 21:4
31. Ngwakọta Okwukwe
A. Isonyere okpukpe ndị ọzọ abụghị ụzọ Chineke
E nwere naanị otu ụzọ, ọ dị warara,
mmadụ ole na ole na-achọta ya. Efe 4:4-6; Mt 7:13, 14
A dọrọ aka ná ntị na ozizi ụgha na-emerụ emerụ. Mt 16:6, 12; Ga 5:9
E nyere iwu ka a nọpụ iche. 2Ti 3:5; 2Kọ 6:14-17; Mkp 18:4
B. “Okpukpe niile dị mma” abụghị eziokwu
Ụfọdụ na-anụ ọkụ n’obi ma ọ bụghị dị ka Chineke si chọọ. Ro 10:2, 3
Ihe ọjọọ na-emebi ihe ọ bụla ọzọ nke pụrụ ịdị mma. 1Kọ 5:6; Mt 7:15-17
Ndị ozizi ụgha na-eweta mbibi. 2Pi 2:1; Mt 12:30; 15:14
Ofufe dị ọcha chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa. Di 6:5, 14, 15
32. Nlọghachi Kraịst
A. Ụmụ mmadụ agaghị eji anya nkịtị hụ nlọghachi ya
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ụwa agaghị ahụ ya ọzọ. Jn 14:19
Ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya hụrụ mgbe ọ rịgooro;
otú ahụ ka nlọghachi ya ga-adị. Ọrụ 1:6, 10, 11
Ọ nọ n’eluigwe, ọ bụ mmụọ a na-adịghị ahụ anya. 1Ti 6:14-16; Hib 1:3
Nlọghachi ya bụ inweta ike Alaeze n’eluigwe. Da 7:13, 14
B. A ga-amata nke a site n’ihe na-eme eme a na-ahụ anya
Ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya ka ọ gwa ha ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. Mt 24:3
Ndị Kraịst “ga-ahụ” ọnụnọ ya site ná nghọta. Efe 1:18
Ihe na-egosi ọnụnọ ya dị ọtụtụ. Lu 21:10, 11
Ndị iro “ga-ahụ” ya mgbe mbibi bịakwasịrị ha. Mkp 1:7
33. Nzọpụta
A. Nzọpụta si n’aka Chineke site n’àjà mgbapụta Jizọs
Ndụ bụ onyinye Chineke na-enye site n’aka Ọkpara ya. 1Jn 4:9, 14; Ro 6:23
Nzọpụta ga-abịa naanị site n’àjà Jizọs. Ọrụ 4:12
Mmadụ apụghị ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na o
“chegharịrị n’ọnụ ọnwụ.” Jes 2:14, 26
Mmadụ aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji nweta ya. Lu 13:23, 24; 1Ti 4:10
B. “Onye a zọpụtara, a zọpụtachaala ya” esighị n’Akwụkwọ Nsọ
Ndị so keta mmụọ nsọ pụrụ ịdapụ. Hib 6:4, 6; 1Kọ 9:27
E bibiri ọtụtụ ndị Izrel ọ bụ ezie na a zọpụtara ha n’Ijipt. Jud 5
A dịghị azọpụta mmadụ n’otu ntabi anya. Fil 2:12; 3:12-14; Mt 10:22
Ndị laghachiri azụ na-adị njọ karịa otú ha dị mbụ. 2Pi 2:20, 21
CH. “Ịzọpụta mmadụ niile” esighị n’Akwụkwọ Nsọ
Ụfọdụ ndị apụghị ichegharị. Hib 6:4-6
Ọnwụ ndị ajọ omume adịghị atọ Chineke ụtọ. Ezi 33:11; 18:32
Ma ịhụnanya apụghị ịgba ajọ omume nkịtị. Hib 1:9
A ga-ebibi ndị ajọ omume. Hib 10:26-29; Mkp 20:7-15
34. Obe
A. A kwụwara Jizọs n’osisi e ji egbu mmadụ ka ọ bụrụ ihe nkọcha
A kwụwara Jizọs n’osisi e ji egbu mmadụ. Ọrụ 5:30; 10:39; Ga 3:13
Ndị Kraịst aghaghị iburu osisi dị ka ihe nkọcha. Mt 10:38; Lu 9:23
B. E kwesịghị ife ya ofufe
Ibugharị osisi Jizọs bụ ihe nkọcha. Hib 6:6; Mt 27:41, 42
Iji obe na-efe ofufe bụ ikpere arụsị. Ọp 20:4, 5; Jer 10:3-5
Jizọs bụ mmụọ, ọ nọkwaghị n’osisi. 1Ti 3:16; 1Pi 3:18
35. Okike
A. Ya na sayensị nke ziri ezi kwekọrọ; ọ na-egosi na evolushọn bụ ụgha
Sayensị na usoro e ji kee ihe kwekọrọ. Je 1:11, 12, 21, 24, 25
Iwu Chineke nyere ka ihe dịrị “n’ụdị ya dị
iche iche” bụ eziokwu. Je 1:11, 12; Jes 3:12
B. Ụbọchị ndị e ji kee ihe abụghị ụbọchị nke awa iri abụọ na anọ
“Ụbọchị” nwere ike ịpụta naanị oge. Je 2:4
N’anya Chineke, ụbọchị nwere ike ịbụ ogologo oge. Ọma 90:4; 2Pi 3:8
36. Okpukpe
A. Ọ bụ naanị otu ezi okpukpe ka e nwere
Otu olileanya, otu okwukwe, otu baptizim. Efe 4:5, 13
E nyere ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Mt 28:19; Ọrụ 8:12; 14:21
A ga-amata ya site ná mkpụrụ ya. Mt 7:19, 20; Lu 6:43, 44; Jn 15:8
Ịhụnanya na nkwekọrịta ga-adị n’etiti ndị òtù ya. Jn 13:35; 1Kọ 1:10; 1Jn 4:20
B. Ọ bụ ihe ziri ezi na a kagburu ozizi ụgha
Jizọs kagburu ozizi ụgha. Mt 23:15, 23, 24; 15:4-9
O mere nke a iji chebe ndị kpuru ìsì. Mt 15:14
Eziokwu mere ka ha nwere onwe ha
ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jn 8:31, 32
CH. Mmadụ ịgbanwe okpukpe ya dị oké mkpa ma ọ bụrụ na e gosi na o zighị ezi
Eziokwu na-eme ka mmadụ nwere onwe ya;
ọ na-egosi na ọtụtụ ndị ezighị ezi. Jn 8:31, 32
Ndị Izrel na ndị ọzọ hapụrụ ofufe mbụ ha. Jọs 24:15; 2Ez 5:17
Ndị Kraịst oge mbụ gbanwere echiche ha. Ga 1:13, 14; Ọrụ 3:17, 19
Pọl gbanwere okpukpe ya. Ọrụ 26:4-6
A na-eduhie ụwa dum; mmadụ aghaghị
ime ka uche ya dị ọhụrụ. Mkp 12:9; Ro 12:2
D. Ihe yiri ‘ihe ọma n’okpukpe niile’ adịghị egosi ihu ọma Chineke
Ọ bụ Chineke mere ụkpụrụ a ga-agbaso n’ife ofufe. Jn 4:23, 24; Jes 1:27
Okpukpe adịghị mma ma ọ bụrụ na ọ dịghị eme uche Chineke. Ro 10:2, 3
A pụrụ ịjụ “ọrụ ọma.” Mt 7:21-23
A ga-amata ya site ná mkpụrụ ya. Mt 7:20
37. Onye Ozi
A. Ndị Kraịst niile aghaghị ịbụ ndị ozi
Jizọs bụ onye ozi Chineke. Ro 15:8, 9; Mt 20:28
Ndị Kraịst na-eso ihe nlereanya ya. 1Pi 2:21; 1Kọ 11:1
Ha aghaghị ime nkwusa iji jezuo ozi ahụ. 2Ti 4:2, 5; 1Kọ 9:16
B. Ihe ga-eme ka mmadụ ruo eru ije ozi ahụ
Mmụọ Chineke na ihe ọmụma nke Okwu ya. 2Ti 2:15; Aịz 61:1-3
Soro ihe nlereanya Kraịst n’ikwusa ozi ọma. 1Pi 2:21; 2Ti 4:2, 5
Chineke na-eji mmụọ ya na nzukọ ya enye ọzụzụ. Jn 14:26; 2Kọ 3:1-3
38. Ọbara
A. Mmịnye ọbara na-emebi ịdị nsọ nke ọbara
A gwara Noa na ọbara bụ ihe dị nsọ, bụrụkwa ndụ. Je 9:4, 16
Ọgbụgba ndụ Iwu machibidoro iri ọbara iwu. Le 17:14; 7:26, 27
A gwakwara Ndị Kraịst na a machibidoro ya iwu. Ọrụ 15:28, 29; 21:25
B. Ịchọ ịzọpụta ndụ adịghị eme ka imebi iwu Chineke zie ezi
Irube isi dị mma karịa àjà. 1Sa 15:22; Mk 12:33
Mmadụ iji ndụ ya kpọrọ ihe karịa idebe iwu Chineke na-eweta ọnwụ. Mk 8:35, 36
39. Ọdịnihu A Kara Aka
A. A kaghị ọdịnihu mmadụ aka
E ji nzube Chineke n’aka. Aịz 55:11; Je 1:28
E nyere ndị mmadụ ohere ịhọrọ ma hà ga-ejere Chineke ozi. Jn 3:16; Fil 2:12
40. Ọgụgụ Oge
A. Oge Ndị Jentaịl gwụrụ na 1914 (O.A.)
A kwụsịtụrụ inwe ndị ọchịchị alaeze na 607 T.O.A. Ezi 21:25-27
“Oge asaa” ga-agafe tupu e weghachi ọchịchị ahụ. Da 4:32, 16, 17
Asaa = 2 × 3 1/2 oge, ma ọ bụ 2 × 1,260 ụbọchị. Mkp 12:6, 14; 11:2, 3
Otu ụbọchị maka otu afọ. [Ya abụrụ 2,520 afọ] Ezi 4:6; Ọg 14:34
Ọ ga-aga n’ihu ruo mgbe e guzobere Alaeze. Lu 21:24; Da 7:13, 14
41. Ọnwụ
A. Ihe wetara ọnwụ
Mmadụ zuru okè ná mmalite, o nwere olileanya
ndụ na-enweghị ọgwụgwụ. Je 1:28, 31
Nnupụisi mere ka a ma ya ikpe ọnwụ. Je 2:16, 17; 3:17, 19
Ụmụ Adam niile butere mmehie na ọnwụ. Ro 5:12
B. Ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ
E kere Adam ịbụ mkpụrụ obi, e nyeghị ya mkpụrụ obi. Je 2:7; 1Kọ 15:45
Ọ bụ mmadụ, ya bụ, mkpụrụ obi, na-anwụ. Ezi 18:4; Aịz 53:12; Job 11:20
Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. Ek 9:5, 10; Ọma 146:3, 4
Ndị nwụrụ anwụ nọ n’ụra, na-echere
mbilite n’ọnwụ. Jn 11:11-14, 23-26; Ọrụ 7:60
CH. Mmadụ na ndị nwụrụ anwụ apụghị ikwurịta okwu
Ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ dị ka mmụọ
wee binyere Chineke. Ọma 115:17; Aịz 38:18
A dọrọ aka ná ntị ka mmadụ ghara ịnwa ka ya
na ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. Aịz 8:19; Le 19:31
A mara ndị na-agba afa na ndị na-akọ ọdịnihu ikpe. Di 18:10-12; Ga 5:19-21
42. Ụbọchị Izu Ike
A. Ụbọchị izu ike adịrịghị Ndị Kraịst
Ọnwụ Jizọs wepụrụ Iwu ahụ. Efe 2:15
Ụbọchị Izu Ike adịrịghị Ndị Kraịst. Kọl 2:16, 17; Ro 14:5, 10
A baara ha mba n’ihi idebe Ụbọchị Izu Ike, na ihe ndị ọzọ. Ga 4:9-11; Ro 10:2-4
A na-abanye n’izu ike nke Chineke site n’inwe
okwukwe na irube isi. Hib 4:9-11
B. Ọ bụ naanị ndị Izrel oge ochie ka a chọrọ ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike
Ha debere Ụbọchị Izu Ike mbụ mgbe ha pụtasịrị n’Ijipt. Ọp 16:26, 27, 29, 30
A gwara naanị ndị Izrel anụ ahụ́ ka ha
debe ya dị ka ihe ịrịba ama. Ọp 31:16, 17; Ọma 147:19, 20
Iwu ahụ kwukwara ka ha na-edebe afọ Izu Ike. Ọp 23:10, 11; Le 25:3, 4
Ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst debe Ụbọchị Izu Ike. Ro 14:5, 10; Ga 4:9-11
CH. Ụbọchị Izu Ike nke Chineke (ụbọchị nke asaa ‘n’izu’ e kere ihe)
Ọ malitere mgbe e kechara ihe n’ụwa. Je 2:2, 3; Hib 4:3-5
Ọ dịgidere gafee mgbe Jizọs nọ n’ụwa. Hib 4:6-8; Ọma 95:7-9, 11
Ndị Kraịst na-ezu ike n’ọrụ ịchọ ọdịmma onwe onye. Hib 4:9, 10
Ọ ga-agwụ mgbe Alaeze rụchara ọrụ ọ ga-arụ n’ụwa. 1Kọ 15:24, 28
43. Ụbọchị Ọmụmụ, Ememme
A. Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememme icheta ụbọchị ọmụmụ na Krismas
Ọ bụ ndị na-anọghị n’ezi ofufe mere ya. Je 40:20; Mt 14:6
A ga na-eme ememme icheta ụbọchị Jizọs nwụrụ. Lu 22:19, 20; 1Kọ 11:25, 26
Ememme oké mkpọtụ ekwesịghị ekwesị. Ro 13:13; Ga 5:21; 1Pi 4:3
44. Ụwa
A. Ihe Chineke zubere maka ụwa
A rụrụ Paradaịs n’ụwa maka ụmụ mmadụ zuru okè. Je 1:28; 2:8-15
Nzube Chineke aghaghị imezu. Aịz 55:11; 46:10, 11
Ụwa ga-ejupụta ná ndị zuru okè,
bụ́ ndị nọ n’udo. Aịz 45:18; Ọma 72:7; Aịz 9:6, 7
Alaeze ga-eme ka e nweghachi Paradaịs. Mt 6:9, 10; Mkp 21:3-5
B. Ọ dịghị mgbe a ga-ebibi ya ma ọ bụ kpochapụ ndị bi na ya
Ụwa nkịtị ga-adịgide. Ek 1:4; Ọma 104:5
E bibiri ụmụ mmadụ n’oge Noa, ọ bụghị ụwa. 2Pi 3:5-7; Je 7:23
Ihe atụ a mere ka e nwee olileanya nlanahụ n’oge anyị. Mt 24:37-39
A ga-ebibi ndị ajọ omume;
“oké ìgwè mmadụ” ga-alanahụ. 2Te 1:6-9; Mkp 7:9, 14