Abụ nke 63
Guzosie Ike Mgbe Niile
Nke E Biri Ebi
1. Guzosi’ike n’ebe Jaa nọ,
K’anyị gos’ịhụnanya.
Anyị nyere ya onw’anyị,
Chọọkwa ịma iwu ya.
Ozizi ya ga n’edu anyị,
A’yị g’erubere y’isi.
Jehova bụ ony’eziokwu.
Anyị agagh’ahapụ ya
2. Guzosi’ike n’oge mkpa
N’ebe ụmụnn’anyị nọ.
Hụ ha n’anya n’obi gị dum,
Gosikwa ha obiọma.
N’asọpụrụ ụmụnn’anyị,
Kwanyere ha dum ùgwù.
Ka Okwu Jaa dọt’anyị nso;
Anyị agagh’ahapụ ha.
3. Guzosi’ike ná nduzi
Ndị okenye n’eny’anyị.
Ha gwa anyị ihe a g’eme,
K’anyị rubere h’isi.
Jehova g’agọzi anyị,
Meekwa k’anyị dị ike.
Anyị niile guzosi’ike,
A’yị g’abụ nke Jehova.
(Gụọkwa Ọma 149:1; 1 Tim. 2:8; Hib. 13:17.)