Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be p. 4-p. 8 para. 1
  • Anyị Na-anabata Gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Na-anabata Gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Nta
  • Ụzọ Isi Rite Uru Zuru Ezu
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be p. 4-p. 8 para. 1
Foto dị na peeji nke 5

Anyị Na-anabata Gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

N’ỤWA nile, n’ihe karịrị ala 200, ọtụtụ nde ndị mmụta na-erite uru kwa izu site n’ihe a na-ezi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ụfọdụ bụ ndị ọhụrụ. Ndị ọzọ agawo ụlọ akwụkwọ ahụ ruo ọtụtụ afọ. A na-eduzi ụlọ akwụkwọ a n’ọtụtụ iri puku ebe dị iche iche. N’ebe ọ bụla i bi n’ụwa, ị pụrụ inweta otu usoro mmụta ahụ. Ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche, ndị si n’agbụrụ dị iche iche, na ndị gụruru akwụkwọ n’ókè dị iche iche na-anata izi ihe ọchịchị Chineke nke a n’akwụghị ụgwọ.

Mgbe a malitere ụlọ akwụkwọ ahụ n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na 1943, e kwupụtara nzube ya n’okwu ndị a: “Iji kwadebe ‘ndị ikom nile na-ekwesị ntụkwasị obi,’ bụ́ ndị nụworo Okwu Chineke ma gosipụta okwukwe ha nwere na ya, ‘inwe ike ịkụziri ndị ọzọ ihe’ . . . ka onye nke ọ bụla wee . . . bụrụ onye a kwadebere nke ọma karị ikwu olileanya ahụ nke dị n’ime ya n’ihu ọha.” (Course in Theocratic Ministry, p. 4) Ebumnobi nke ụlọ akwụkwọ ahụ ka bụ otu ihe ahụ ruo taa.

N’ezie, olee ihe kasị mma onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iji onyinye ikwu okwu nke Chineke nyere anyị mee? Bible na-aza, sị: “Ka ihe ọ bụla na-eku ume too Jaa.” (Ọma 150:6) Mgbe anyị na-eme nke ahụ, anyị na-eme ka obi nke Nna anyị nke eluigwe ṅụrịa. Anyị na-enye ya ihe àmà na-egosi na obi anyị ji ekele na-azaghachi n’ịdị mma na ịhụnanya ya. Ka a sịkwa ihe mere e ji na-agba Ndị Kraịst ume mgbe nile ka ha “chụọrọ Chineke àjà otuto . . . , ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha”! (Hib. 13:15) Iji nyere gị aka imeziwanye ikike i nwere iji onyinye ndị Chineke nyere gị na-eto Jehova, anyị na-anabata gị dị ka onye mmụta nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

Ọ bụ ezie na a na-elebara ịgụ ihe n’ihu ọha na nkà ikwu okwu na izi ihe anya nke ukwuu n’ụlọ akwụkwọ a, nke ahụ abụghị nanị abamuru nke ihe a na-amụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ka ị na-ekere òkè, a ga-enyere gị aka ịzụlite nkà ndị bara uru dị ka ịgụ ihe n’onwe gị, ige ntị na icheta ihe, ịmụ ihe, ime nnyocha, ịtụle na ịhazi ihe, ịkparịta ụka, ịza ajụjụ, na idetu echiche dị iche iche n’akwụkwọ. Bible n’onwe ya na akwụkwọ ndị dabeere na Bible ga-abụ ebe ndabere maka ihe a na-amụ na okwu a na-ekwu nakwa ihe omume a na-eme n’ụlọ akwụkwọ a. Ka ị na-eme ka eziokwu dị oké ọnụ ahịa ndị dị n’Okwu Chineke jupụta n’obi gị, ị ga-amụta iche echiche n’ụzọ kwekọrọ n’echiche Chineke. Lee ka nke ahụ pụrụ isi baa uru n’akụkụ ọ bụla nke ndụ! Banyere abamuru nke Okwu Chineke, otu onye nkụzi na mahadum na narị afọ nke 20 bụ́ William Lyon Phelps dere, sị; “A pụrụ n’ezie ịkpọ onye ọ bụla maara Bible nke ọma onye gụrụ akwụkwọ. . . . Ekwenyere m na ịmara Bible n’agaghị ụlọ akwụkwọ dị elu bara uru karịa ịga ụlọ akwụkwọ dị elu n’amaghị Bible.”

Ụzọ Isi Rite Uru Zuru Ezu

Foto dị na peeji nke 4

N’eziokwu, iji rite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe ị na-amụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, gị, bụ́ onye mmụta, aghaghị itinye mgbalị n’onwe gị. Pọl onyeozi gbara Onye Kraịst nke ya na ya jekọrọ ozi bụ́ Timoti ume, sị: “Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè nye mmadụ nile.” (1 Tim. 4:15) N’ụzọ ndị dị aṅaa dị irè ka ị pụrụ isi tinyesie mgbalị ike na nke a?

Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe nnọọ omume, na-aga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kwa izu. Jiri akwụkwọ a, bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Denye aha gị n’ụzọ a na-ahụ anya nke ọma n’ohere e mere maka ya na peeji e dere aha akwụkwọ. Jiri akwụkwọ a mgbe ọ bụla ị na-aga ụlọ akwụkwọ ahụ. A pụkwara iji akwụkwọ ọgụgụ a detuo ihe. Mgbe ị gụtara isi ihe ndị dị mkpa n’ime ya, bụ́ ndị i chere ga-enyere gị aka, kanye akara n’okpuru ha. Jiri ohere sara mbara ndị dị n’akụkụ peeji ya detuo isi ihe ndị bara uru ị mụtara n’oge a na-atụle ihe n’ụlọ akwụkwọ.

A na-ewepụta usoro ihe omume e biri ebi nke a ga-agbaso n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, iche. Usoro ihe omume ahụ ga-agụnye nkọwa sara mbara banyere otú a ga-esi duzie ụlọ akwụkwọ ahụ. Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe bara uru itinye usoro ihe omume a n’ime akwụkwọ a, bụ́ ebe aka ga-eru ya ngwa ngwa.

N’ịkwadebe maka ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ kwa izu, buru n’uche na ọ bụ Bible bụ akwụkwọ ọgụgụ bụ́ isi. Were ọgụgụ nke akụkụ Bible a ga-edokwa ka a gụọ n’izu dị ka ihe kasị mkpa. Ọ bụrụkwa na i nwee ike ịgụ ihe dị iche iche a ga-eme tupu oge eruo, nke a kwa ga-aba nnọọ uru.

Ka ụlọ akwụkwọ na-aga n’ihu, a pụrụ inwe ohere maka ndị na-ege ntị ikere òkè. Jiri ohere ndị a mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ikere òkè ná ntụle ndị dị otú ahụ bụ ihe dị mkpa n’icheta ihe ị na-anụ na inwe ike itinye ya n’ọrụ ná ndụ gị.

N’ezie, ndị mmụta nile ga-enwe ohere ikwu okwu ma ọ bụ ime ihe ngosi n’ihu ọgbakọ. Jiri nke ọ bụla n’ime ohere ndị ahụ mee ihe nke ọma. Tinye mgbalị n’ezie iji meziwanye ihe na nkà okwu ọ bụla e kenyere gị. A ga-enye gị ndụmọdụ iji wee mee ka ị nọgide na-enwe ọganihu. Nabata enyemaka onwe onye ahụ a ga-enye gị. N’akwụkwọ gị, detuo aro ndị a kapịrị ọnụ banyere ihe gị onwe gị pụrụ ime iji meziwanye ihe. Ebe ọ bụ na ọ na-esi ike mmadụ ịhụ onwe ya otú ndị ọzọ si ahụ ya, aro na ndụmọdụ ịhụnanya, ndị dabeere na Bible, bụ́ ndị a na-enye, pụrụ ịtụnye ụtụ dị ukwuu n’ọganihu gị. Nke ahụ bụ eziokwu ọ bụrụgodị na ọ dịwo ọtụtụ afọ e debanyere aha gị n’ụlọ akwụkwọ ahụ.—Ilu 1:5.

Ị̀ ga-achọ inwe ọganihu dị ngwa karị? Ọ bụrụ na i tinye mgbalị n’onwe gị, nke ahụ ga-ekwe omume. Mụọ ihe a ga-amụ n’oge okwu onye mmụta ọ bụla tupu oge eruo. Ọ bụrụ na a chọọ onye ga-anọchi anya ọkà okwu e kenyere okwu, ị ga-enwe ike iwepụta onwe gị, nke ahụ ga-emekwa ka i nwekwuo ahụmahụ. Mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu ha, ṅaa ntị nke ọma n’otú ha si eme ya. Anyị na-amụta ihe site n’aka ibe anyị.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọnọdụ gị enye gị ohere, ị pụrụ ime ka ọganihu gị dịkwuo ngwa site n’ịmụ akwụkwọ ọgụgụ a n’onwe gị tupu a mụwa ya. Mgbe ị mụtasịworo nke ọma ihe dị n’ime ihe ọmụmụ 15 na-esonụ, gaa n’ihu n’ịmụ “Usoro Iji Zụlite Ikike Gị Dị Ka Ọkà Okwu na Onye Ozizi,” bụ́ nke malitere na peeji nke 78. Nke mbụ, mụọ ihe ọmụmụ nke ọ bụla, meekwa ihe omume ndị e depụtara maka ya. Tinye ihe ị na-amụta n’ozi gị. Nke a pụrụ ime n’ụzọ dị ukwuu ka ọganihu ị na-enwe dị ka ọkà okwu na onye ozizi nke Okwu Chineke ka mma.

Ihe ị na-amụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-enye aka ịkwadebe gị maka ihe kasị mkpa ná ndụ. Ebe ọ bụ na anyị dị ndụ n’ihi na ọ bụ uche Chineke, inye ya otuto bụ imezu nzube anyị ji maka ya dịrị ndụ. Jehova Chineke kwesịrị ka e nye ya otuto kasịnụ. (Mkpu. 4:11) Ihe anyị na-amụta n’ụlọ akwụkwọ a bụ ụzọ isi mezuo nke a ka anyị wee nwee ike na-eche echiche nke ọma, na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya, na-ekwupụtakwa eziokwu dị ebube ndị sitere n’Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ.

AKỤKỤ DỊ ICHE ICHE NKE ỤLỌ AKWỤKWỌ A

  • Usoro ịgụ ihe, ịmụ ihe, na ime nnyocha dabeere na Bible a na-enwe kwa izu

  • Ntụziaka n’ịgụ ihe n’ihu ọha nakwa na nkà ikwu okwu na izi ihe

  • Ikere òkè ná nkwurịta okwu klas

  • Ohere nke ime ihe omume n’ihu ọgbakọ

  • Enyemaka onwe onye iji nyere gị aka inwe ọganihu

NKÀ NDỊ E LEBAARA ANYA

  • Ige ntị na icheta ihe

  • Ịgụ ihe n’onwe gị

  • Ịmụ ihe

  • Ime nnyocha

  • Ịtụle na ịhazi ihe

  • Ịkparịta ụka

  • Ịza ajụjụ

  • Idetu echiche dị iche iche n’akwụkwọ

NTỌALA A GA-EWUKWASỊ IHE NA YA

Ikike iso ndị ọzọ kwurịta okwu n’ụzọ dị irè bụ nkà. Ọ bụghị onye ọ bụla na-emezi ya emezi. E dewo ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ iji nyere ndị mmadụ aka imeziwanye ihe n’akụkụ a. Otú ọ dị, Onye Okike, Onye nyere ụmụ mmadụ ikike ikwu okwu, maara banyere ikwu okwu na izi ihe karịa mmadụ ọ bụla nke na-akụzi nkà ikwu okwu. Ọkpara ọ mụrụ nanị ya sooro ya rụkọọ ọrụ dị ka Onye Ọrụ Bụ́ Ọkà n’imepụta ụbụrụ mmadụ na akụkụ ahụ́ ndị metụtara ikwu okwu, tinyekwara ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya e kere eke.

Mgbe e kesịrị ndị mmụọ ozi, e mesịakwa kee ụmụ mmadụ, Ọkpara ahụ jere ozi dị ka Okwu Chineke, Onye bụ́ isi Chineke sitere n’aka ya nye ha ntụziaka. (Ilu 8:30; Jọn 1:1-3) E zitere Ọkpara ahụ n’ụwa dị ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Banyere ya, ihe ndekọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.” Ndị nụrụ okwu ya gbakwara akaebe, sị: “Ọ dịbeghị mgbe mmadụ ọzọ kwuru okwu otú a.” (Mat. 7:28; Jọn 7:46) Ihe karịrị ugboro 40, n’Oziọma ndị ahụ, a kpọrọ Jizọs Onye Ozizi, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. E nwere ihe dị ukwuu banyere ikwu okwu na izi ihe ndị anyị pụrụ ịmụta n’aka ya.

Bible nwekwara ihe ndekọ banyere otú Jehova Chineke si jiri ndị ikom na ndị inyom a zụlitere n’ụzọ dị iche iche mezuo uche ya. Ụfọdụ n’ime ha ziri ozi ndị dị mkpirikpi ma dị ike. Ọtụtụ ekwughị okwu n’ihu ọtụtụ ndị na-ege ntị, ma ha ji ikwesị ntụkwasị obi kere òkè n’ịgba àmà banyere ezi Chineke ahụ na nzube ya. O doro anya na ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị ndị ọkà okwu dị irè, ma Chineke gọziri mgbalị ha. Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe Bible na-agwa anyị banyere otú ha si jee ozi ha.—Ọma 68:11.

N’ezie, Bible abụghị akwụkwọ ọgụgụ na-akụzi ikwu okwu n’ihu ọha. Ma nye ndị ji nghọta na-agụ ya, o nwere ihe ọmụma bara uru banyere ikwu okwu na izi ihe ndị dị irè. Akwụkwọ a bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-agba mbọ inyekwu ihe ọmụma na-adabere na nke ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya