-
‘Unu Ekekọtala Onwe Unu n’Ụzọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’Ụlọ Nche—2003 | Ọktoba 15
-
-
‘Unu Ekekọtala Onwe Unu n’Ụzọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’
DỊ KA ị pụrụ ịhụ n’ebe a, ahụ́ erughị nnọọ kamel na oké ehi ndị ahụ na-akọ ugbo ala. Yok ahụ e ji kekọta ha—nke e bu anụmanụ abụọ ha nhata ma nwee ume ha nhata n’uche mee—na-eme ka anụmanụ abụọ ahụ na-ahụsi anya. N’inwe nchegbu banyere ọdịmma nke ụdị anụmanụ ndị ahụ e ji akọ ugbo, Chineke gwara ndị Izrel, sị: “Ejikọtala ehi na ịnyịnya ibu ịdọ ihe e ji egwu ala ubi.” (Deuterọnọmi 22:10) Otu ụkpụrụ ahụ ga-emetụtakwa oké ehi na kamel.
Dị ka ọ na-adịkarị, onye ọrụ ugbo agaghị eme ka anụmanụ ya nwee ihe isi ike dị otú ahụ. Ma ọ bụrụ na o nweghị oké ehi abụọ, ọ pụrụ ijikọta anụmanụ abụọ o nwere. Eleghị anya, ọ bụ ihe onye ọrụ ugbo nke narị afọ nke 19 nọ n’ihe osise a kpebiri ime. N’ihi na ha abụọ ahaghị nhata n’ibu na n’ịdị arọ, anụmanụ nke na-adịghị ike karị ga na-agbalịsi ike ime ka ya na nke ahụ dị ike na-aga ụkwụ na ụkwụ, anụmanụ nke dịkwa ike karị ga na-arụ ọrụ ka ukwuu.
Pọl onyeozi ji ihe atụ nke ikekọta ihe n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ kụziere anyị ihe dị mkpa. “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ,” ka o dere. “N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?” (2 Ndị Kọrint 6:14) Olee otú Onye Kraịst pụrụ isi bụrụ onye e kekọtara n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ?
Otu ụzọ ga-abụ ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ahọrọ onye òtù ọlụlụ nke ya na ya na-enweghị otu nkwenkwe. Ụdị nkekọ ahụ ga-eme ka ahụ́ ghara iru ha abụọ ala, di na nwunye ahụ agaghị adị na-enwe nkwekọrịta n’okwu ndị bụ́ isi.
Mgbe Jehova malitere alụmdi na nwunye, o nyere nwunye ọrụ dị ka “onye inyeaka.” (Jenesis 2:18) N’otu aka ahụ, site n’ọnụ Malakaị onye amụma, Chineke zoro aka n’ebe nwanyị nọ dị ka “nwanyị e jikọtara gị na ya.” (Malakaị 2:14) Onye Okike anyị chọrọ ka ndị lụrụ di na nwunye na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ụzọ ime mmụọ, na-ebukọ ibu ha ọnụ ma na-erite uru si na ya apụta n’ụzọ ha nhata.
Site n’ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị,” Onye Kraịst na-egosi na ya na-akwanyere ndụmọdụ Nna anyị nke eluigwe ùgwù. (1 Ndị Kọrint 7:39) Nke a na-atọ ntọala maka alụmdi na nwunye dị n’otu, bụ́ nke pụrụ iwetara Chineke otuto na nsọpụrụ ka di na nwunye ahụ na-ejere ya ozi dị ka ‘ezigbo ndị so ya nyara yok’ n’echiche pụrụ iche.—Ndị Filipaị 4:3.
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?Ụlọ Nche—2003 | Ọktoba 15
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?
Ọbụna n’ụwa a nọ ná nsogbu, ị pụrụ inweta obi ụtọ site n’ezi ihe ọmụma nke Bible banyere Chineke, Alaeze ya, na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, biko detara Ndịàmà Jehova akwụkwọ na P.M.B. 1090, Benin City 300001, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 2.
-