Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/15 p. 32
  • Ụdị Aha Dị Aṅaa Ka I Nwere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụdị Aha Dị Aṅaa Ka I Nwere?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/15 p. 32

Ụdị Aha Dị Aṅaa Ka I Nwere?

NA BIBLE, mgbe ụfọdụ okwu ahụ bụ́ “aha” na-ezo aka n’ebe omume mmadụ dị. Dị ka ihe atụ, Eze Solomọn nwere amamihe dere, sị: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Eklisiastis 7:1; tụlee Ilu 22:1.) Dị ka okwu Solomọn na-egosi, a dịghị amụkọta mmadụ na ezi aha. Kama nke ahụ, ọ bụ n’oge ndụ ya ka ọ na-enweta omume nwere ezi nzube. Aha ya na-eme ka a mata ya n’ihe banyere àgwà ya, ma ọ̀ na-emesapụ aka ka ọ na-achọ ọdịmma onwe onye nanị, ma ò nwere ọmịiko ka ọ bụ na o nweghị omume enyi, ma ọ̀ dị obi umeala ka ọ na-ebuli onwe ya elu, ọbụna ma bụ onye ezi omume ka ọ bụ onye ajọ omume.

Tụlee Devid. N’oge ọbụbụeze ya, o gosiri onwe ya ịbụ onye siri ike ma na-eguzosi ike. N’otu oge ahụ, Devid jiri obi umeala nakwere ihie ụzọ ya ma chegharịa site ná mmehie ya ndị dị oké njọ. N’inwe ezi ihe kpatara ya, onye amụma Jehova gosiri na Devid bụ “otu nwoke dị ka obi [Chineke] si chọọ.” (1 Samuel 13:14) Devid na-eto eto enweworị ezi aha n’ebe Chineke nọ.

N’ụzọ megidere nke ahụ, Eze Judia bụ́ Jehoram meere onwe ya aha ọjọọ. O chigharịrị ndị ọ na-achị ihu pụọ n’ebe ofufe Jehova dị, ọbụna gbuokwa ụmụnne ya ndị nwoke isii na ụfọdụ n’ime ndị isi nke Juda. N’ikpeazụ, Jehova jiri ọrịa na-egbu mgbu tie Jehoram ihe otiti nke dugara n’ọnwụ ya. Bible na-ekwu na Jehoram ‘lara bụrụ onye a na-achọsighị ike ka ọ dị ndụ,’ ma ọ bụ dị ka Today’s English Version si kwuo ya, “ọ dịghị onye o wutere mgbe ọ nwụrụ.”—2 Ihe E Mere 21:20.

Ụzọ ndụ Devid na Jehoram na-eme ihe atụ ịbụ eziokwu nke ilu Bible bụ́: “Ncheta a na-echeta onye ezi omume bụ ihe ngọzi: ma aha ndị na-emebi iwu ga-ere ure.” (Ilu 10:7) Ya mere onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji nlezianya tụlee ajụjụ bụ́, ‘Ụdị aha dị aṅaa ka m na-eme n’ebe Chineke nọ na n’ebe mmadụ ibe m nọ?’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya