-
Otú Jehova Si Aza Ekpere Si n’Ala Ala ObiỤlọ Nche—2008 | Ọktoba 15
-
-
17. Olee ihe oge ya na-agwụnahụ ụmụ mmadụ, oleekwa okwu anyị ga-echeta n’oge na-adịghị anya?
17 Ma anyị maara na agha a ebibeghị. Anyị ga-anọgidekwa na-ekwusa ozi ọma—ọbụna na-ekwusara ya ndị mmegide. (Mat. 24:14, 21) Ma, ohere ndị mmegide a nwere ichegharị ma nweta nzọpụta ga-agwụ n’oge na-adịghị anya. Ido aha Jehova nsọ dị mkpa karịa ịzọpụta ụmụ mmadụ. (Gụọ Ezikiel 38:23.) Mgbe mba dị iche iche ga-ezukọta ibibi ndị Chineke dị ka e buru n’amụma, anyị ga-echeta ihe a ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere: “Biko, ka ihere mee ha, ka obi gharakwa iru ha ala mgbe ọ bụla, ka e mechuo ha ihu, ka ha laakwa n’iyi.”—Ọma 83:17.
18, 19. (a) Gịnị na-echere ndị siri ọnwụ na-enupụrụ ọchịchị Jehova isi? (b) Olee otú ngosi Jehova ga-egosipụta n’oge na-adịghị anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị dị gị?
18 A ga-ala ndị niile siri ọnwụ na-emegide ọchịchị Jehova n’iyi. Okwu Chineke na-agwa anyị na ndị “na-adịghị erube isi n’ozi ọma”—bụ́ ndị a ga-ala n’iyi n’Amagedọn—ga-ezute “mbibi ebighị ebi.” (2 Tesa. 1:7-9) Mbibi a ga-ebibi ha na nzọpụta a ga-azọpụta ndị na-efe Jehova ofufe n’ezie ga-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova bụ naanị ezi Chineke ahụ. N’ụwa ọhụrụ ahụ, a gaghị echefu oké mmeri ahụ echefu. Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ná “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume” ga-amata oké ọrụ ndị Jehova rụrụ. (Ọrụ 24:15) N’ụwa ọhụrụ ahụ, ha ga-ahụ ihe àmà doro anya gosiri na amamihe dị n’irubere ọchịchị Jehova isi. Ndị dị umeala n’obi n’ime ha ga-ekweta ozugbo na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke ahụ.
-
-
“N’ezie, Ihe A Bụ Aha Kacha Nsọ ma Dị Ukwuu Chineke Nwere”Ụlọ Nche—2008 | Ọktoba 15
-
-
“N’ezie, Ihe A Bụ Aha Kacha Nsọ ma Dị Ukwuu Chineke Nwere”
Nicholas Cusa kwuru nke a mgbe ọ na-ekwu okwuchukwu ya n’afọ 1430.a Ọ bụ nwoke nwere mmasị n’ọtụtụ ihe, onye tinyere uche n’ịmụ asụsụ Grik, Hibru, nkà ihe ọmụma, nkà mmụta okpukpe, mgbakọ na mwepụ, na ihe ọmụmụ banyere mbara igwe. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ, o nwere akara mmụta dọktọret n’ihe ọmụmụ banyere iwu ndị Roman Katọlik. N’afọ 1448, a họpụtara ya ịbụ kadinal.
Ihe dị ka narị afọ isi na iri afọ ise gara aga, Nicholas Cusa rụrụ ebe a na-elekọta ndị agadi na Kues, nke a na-akpọ Bernkastel-Kues ugbu a, bụ́ obodo dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri kilomita atọ site ná ndịda obodo Bonn, nke dị na Germany. E jizi ebe ahụ mere ọ́bá akwụkwọ Cusa nke nwere ihe karịrị narị ihe odide atọ na iri. Otu n’ime ha bụ Codex Cusanus 220, bụ́ ebe okwuchukwu ahụ Cusa kwuru n’afọ 1430 dị. N’okwuchukwu ahụ bụ́ In principio erat verbum (Na Mbụ Ka Okwu ahụ Dị), Nicholas Cusa ji okwu bụ́ Iehoua sụgharịa aha Jehova, nke bụ́ otú e si akpọ ya na Latin.b Na peeji nke 56, e dere ihe na-esonụ banyere aha Chineke: “Ọ bụ aha si n’aka Chineke. Ọ bụ Tetragramatọn, ya bụ́, aha nwere mkpụrụ akwụkwọ anọ. . . . N’ezie, ihe a bụ aha kacha nsọ ma dị ukwuu Chineke nwere.” Ihe a Nicholas Cusa kwuru kwadoro eziokwu ahụ bụ́ na aha Chineke dị n’ihe odide mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Ọpụ. 6:3.
Codex a nke dịwara kemgbe mmalite narị afọ nke iri na ise, so n’otu n’ime akwụkwọ ndị kacha ochie ka dịnụ, bụ́ ebe a sụgharịrị Tetragramatọn ahụ ịbụ “Iehoua.” Ihe a e dere ede bụ ihe ọzọ na-agba akaebe na ụdị aha Chineke nke ya na aha ahụ bụ́ “Jehova” yiri, bụ ụzọ e si na-asụgharị aha Chineke kemgbe ụwa.
-