Abụ 145
Ịkwadebe Maka Ozi Ọma
Chi abọọla.
A’yị g’apụwa
K’anyị gaa kwusa’ozi ọma.
Ma ’miri n’eru,
Malitekwa zowa.
Ọ g’adị anyị k’anyị nọrọzie
hiw’ụra.
(KORỌS)
Anyị chet’uru ozi ọma bara,
Kwadebe, kpee ’kpere,
Ọ n’eme k’obi sie any’ike
Ij’ozi ọma.
Ndị ‘mụ’ozi n’eduzikw’anyị.
Jizọs n’eduzi ha.
Ha n’ezigbo enyi só anyị n’aga
G’agb’anyị ume.
A’yị g’enwe
Ezigb’ọṅụ
M’anyị n’echet’ihe ndị a.
Anyị niile ma
Na Jehova n’ahụ
Mbọ anyị dum n’otú anyị si hụ
ya n’anya.
(KORỌS)
Anyị chet’uru ozi ọma bara,
Kwadebe, kpee ’kpere,
Ọ n’eme k’obi sie any’ike
Ij’ozi ọma.
Ndị ‘mụ’ozi n’eduzikw’anyị.
Jizọs n’eduzi ha.
Ha n’ezigbo enyi só anyị n’aga
G’agb’anyị ume.
(Gụọkwa Ekli. 11:4; Mat. 10:5, 7; Luk 10:1; Taị. 2:14.)