Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/1 p. 8-13
  • ‘Tụkwasị Obi Gị’ N’ụlọukwu Chineke!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Tụkwasị Obi Gị’ N’ụlọukwu Chineke!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Wughachi Ụlọukwu Ahụ
  • Òtù Ndị Nchụàjà na Onyeisi
  • Ala Ahụ
  • Olee Mgbe A Ga-emezu Ọhụụ Ahụ?
  • Ọhụụ ahụ Elekwasị Anya n’Ụbọchị Anyị
  • ‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • “Ụlọukwu” ahụ na “Onyeisi” ahụ Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Iwu Gbasara Ụlọ Nsọ A”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/1 p. 8-13

‘Tụkwasị Obi Gị’ N’ụlọukwu Chineke!

“Nwa nke mmadụ, . . . tụkwasịkwa obi gị n’ihe nile Mụ onwe m na-eme ka ị hụ; . . . gosi ụlọ Israel ihe nile nke gị onwe gị na-ahụ.”—EZIKIEL 40:4.

1. N’ọnọdụ dị aṅaa ka ndị Chineke họpụtara chọtara onwe ha na 593 T.O.A.?

AFỌ ahụ bụ 593 T.O.A., afọ nke 14 a chụpụrụ Israel gaa n’ala ọzọ. Nye ndị Juu bi na Babilọn, ala nna ha ha hụrụ n’anya aghaghị iyiworị ihe dị anya n’ezie. Mgbe ihe ka ọtụtụ n’ime ha hụrụ Jerusalem anya ikpeazụ, ọ nọ na-agba ọkụ, a kwaturu oké mgbidi ya, ihe owuwu ya mara oké mma bụ mkpọmkpọ ebe. A kụrisịwo ụlọukwu Jehova—nke nwere mgbe ọ bụ ebube obodo ahụ, ebe bụ́ isi maka ofufe dị ọcha n’ụwa nile. Ugbu a ihe ka ukwuu ná nchụpụ a chụpụrụ Israel gaa n’ala ọzọ ka dị n’ihu. Ọ ga-ewe afọ 56 tupu mgbapụta ahụ e kwere ná nkwa eruo.—Jeremaịa 29:10.

2. N’ihi gịnị ka icheta ụlọukwu Chineke dị na Jerusalem ga-ejiworị wute Ezikiel?

2 Ọ ghaghị iwuteworị onye amụma ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ Ezikiel iche echiche banyere ụlọukwu Chineke ịbụ mkpọmkpọ ebe ọtụtụ narị kilomita site n’ebe ahụ, ebe tọgbọrọ n’efu nke anụ ọhịa na-agagharị. (Jeremaịa 9:11) Nna ya, bụ́ Buzi, ejewo ozi n’ebe ahụ dị ka onye nchụàjà. (Ezikiel 1:3) Ezikiel gaara enwekwa otu ihe ùgwù ahụ, ma a dọrọwo ya n’agha ya na ndị isi Jerusalem na 617 T.O.A., mgbe ọ ka na-eto eto. Ugbu a ọ dị ihe dị ka afọ 50, ikekwe Ezikiel maara na ya agaghị ahụ Jerusalem anya ọzọ ma ọ bụkwanụ kere òkè ọ bụla n’iwughachi ụlọukwu ya. Mgbe ahụ, cheedị oké ihe ọ na-aghaghị ịbụworo Ezikiel ịhụ ọhụụ nke ụlọukwu dị ebube!

3. (a) Gịnị bụ nzube nke ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu ahụ? (b) Gịnị bụ akụkụ anọ bụ́ isi nke ọhụụ ahụ?

3 Ọhụụ a sara mbara, nke jupụtara isiakwụkwọ itoolu n’akwụkwọ Ezikiel, kwere ndị Judia a dọọrọ n’agha nkwa na-ewusi okwukwe ike. A ga-eweghachi ofufe dị ọcha! N’ọtụtụ narị afọ gafeworonụ kemgbe ahụ, ọbụna ruo n’ụbọchị anyị, ọhụụ a anọwo na-abụ ihe agbamume nye ndị hụrụ Jehova n’anya. N’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị tụlee ihe ọhụụ amụma Ezikiel pụtaara ụmụ Israel ahụ a dọọrọ n’agha. O nwere akụkụ anọ bụ́ isi: ụlọukwu, ndị nchụàjà, onyeisi, na ala ahụ.

E Wughachi Ụlọukwu Ahụ

4. Olee ebe a kpọọrọ Ezikiel gaa ná mmalite nke ọhụụ ya, gịnị ka ọ hụrụ n’ebe ahụ, onye dugharịkwara ya?

4 Nke mbụ, a kpọọrọ Ezikiel gaa “n’ugwu dị elu nke ukwuu.” Site n’elu ugwu ahụ otu ụlọukwu buru ibu dị n’ebe ndịda, dị ka obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu. Otu mmụọ ozi, nke “dị ka ọla si dị n’ile ya anya,” dugharịrị onye amụma ahụ nke ọma gburugburu ebe ahụ. (Ezikiel 40:2, 3) Ka ọhụụ ahụ na-aga n’ihu, Ezikiel hụrụ ka mmụọ ozi ahụ ji nlezianya na-atụ ọnụ ụzọ ámá atọ ha nhata nke ụlọukwu ahụ tinyere ime ụlọ ha, ogige dị n’èzí, ogige dị n’ime, ime ụlọ, ebe ịchụàjà, na ebe nsọ nke ụlọukwu ahụ ya na Ebe Nsọ na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.

5. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka Jehova nyere Ezikiel? (b) Gịnị bụ “ozu nile nke ndị eze ha” nke a na-aghaghị iwepụ n’ụlọukwu ahụ, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị mkpa?

5 E mesịa, Jehova n’onwe ya pụtaziri n’ọhụụ ahụ. Ọ banyere n’ụlọukwu ahụ ma mesie Ezikiel obi ike na Ya ga-ebi n’ebe ahụ. Ma O kwuru ka e mee ka ụlọ Ya dị ọcha, na-asị: “Ugbu a ka ha wezụga ịkwa iko ha na ozu nile nke ndị eze ha n’ebe dị anya n’ebe M nọ, M ga-ebikwa n’etiti ha ruo mgbe ebighị ebi.” (Ezikiel 43:2-4, 7, 9) Dị ka ihe àmà na-egosi, “ozu nile nke ndị eze ha” ndị a zoro aka n’ebe arụsị dị. Ndị ọchịchị na ụmụ mmadụ na-enupụ isi nke Jerusalem ejiriwo arụsị metọọ ụlọukwu Chineke, n’ihi ya jiri ha mere ndị eze. (Tụlee Emọs 5:26.) Kama ịbụ chi ma ọ bụ eze ndị dị ndụ, ndị a bụ ihe ndị nwụrụ anwụ, ruru unyi n’anya Jehova. A ghaghị iwepụ ha.—Levitikọs 26:30; Jeremaịa 16:18.

6. Gịnị ka ịtụ ụlọukwu ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ pụtara?

6 Gịnị bụ isi ihe dị n’akụkụ a nke ọhụụ ahụ? O mesiri ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi ike banyere mweghachi zuru ezu nke ofufe dị ọcha n’ụlọukwu Chineke. Ọzọkwa, ịtụ ụlọukwu ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nyere mmesi obi ike sitere n’aka Chineke na ọhụụ ahụ aghaghị nnọọ imezu. (Tụlee Jeremaịa 31:39, 40; Zekaraịa 2:2-8.) A ga-ekpochapụ ikpere arụsị nile. Jehova ga-agọzikwa ụlọ ya ọzọ.

Òtù Ndị Nchụàjà na Onyeisi

7. Ihe ọmụma dị aṅaa ka e nyere banyere ndị Livaị na ndị nchụàjà?

7 A ga-asachakwa, ma ọ bụ nụchaa, òtù ndị nchụàjà. A ga-abara ndị Livaị mba maka ịdaba n’ikpere arụsị, ebe a ga-aja ụmụ Zedọk bụ́ ndị nchụàjà mma ma kwụọ ha ụgwọ ọrụ maka ịnọgide na-adị ọcha.a N’agbanyeghị nke ahụ, òtù abụọ ahụ ga-enwe ọnọdụ ije ozi n’ụlọ Chineke e wughachiri—n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, na-adabere n’ikwesị ntụkwasị obi ha n’otu n’otu. Ọzọkwa, Jehova nyere iwu, sị: “Ọ bụkwa ndị m ka ha ga-ezi ihe dị iche n’etiti ihe nsọ na ihe na-adịghị nsọ, ọ bụkwa ihe dị iche n’etiti ihe dị ọcha na ihe rụrụ arụ ka ha ga-eme ka ha mara.” (Ezikiel 44:10-16, 23) Ya mere a ga-eweghachi òtù ndị nchụàjà, a ga-enyekwa ntachi obi ndị nchụàjà ji ikwesị ntụkwasị obi tachie, ụgwọ ọrụ.

8. (a) Olee ndị bụ ndị isi Israel oge ochie? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka onyeisi ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel si na-arụ ọrụ n’ofufe dị ọcha?

8 Ọhụụ ahụ na-ezokwa aka n’otu onye a kpọrọ onyeisi. Kemgbe oge Mosis, mba ahụ enwewo ndị isi. Okwu Hibru maka onyeisi, bụ́ na·siʼʹ, pụrụ izo aka n’onyeisi ezinụlọ, ebo, ma ọ bụ ọbụna mba. N’ọhụụ Ezikiel, a baara ndị ọchịchị Israel mba dị ka otu ìgwè maka imegbu ndị obodo ahụ, gbaakwa ha ume ịkwụwa aka ọtọ na ikpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ ezie na o soghị ná ndị nchụàjà, onyeisi ahụ na-arụ ọrụ n’ụzọ pụtara ìhè n’ofufe dị ọcha. Ọ na-abanye ma na-apụ n’ogige dị n’èzí ya na ebo ndị na-abụghị ndị nchụàjà, na-anọdụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ọwụwa Anyanwụ, na-ewetakwa ụfọdụ n’ime àjà ahụ ka ndị ahụ chụọ. (Ezikiel 44:2, 3; 45:8-12, 17) Ọhụụ ahụ si otú a mesie ndị obodo Ezikiel obi ike na a ga-eji ndị ndú bụ́ ezi ndị nlereanya gọzie mba ahụ e weghachiri, bụ́ ndị ikom ga-akwado òtù ndị nchụàjà n’ịhazi ndị Chineke ma bụrụ ezi ndị nlereanya n’ihe ime mmụọ.

Ala Ahụ

9. (a) Olee otú a ga-esi kee ala ahụ, ma olee ndị na-agaghị eketa? (b) Gịnị bụ òkè nsọ ahụ, gịnịkwa dị na ya?

9 N’ikpeazụ, ọhụụ Ezikiel gụnyere ịhụ ala Israel dum anya. A ga-eke ya eke, na-enwe òkè maka ebo ọ bụla. Onyeisi ahụ ga-eketakwa. Otú ọ dị, ndị nchụàjà agaghị eketa, n’ihi na Jehova kwuru, sị, “Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.” (Ezikiel 44:10, 28; Ọnụ Ọgụgụ 18:20) Ọhụụ ahụ gosiri na òkè ala nke onyeisi ahụ ga-adị n’akụkụ abụọ nke ógbè pụrụ iche a kpọrọ òkè nsọ. Nke a bụ ibe ala nwere akụkụ anọ hà nhata nke e kere ụzọ atọ—nke elu elu maka ndị Livaị chegharịrịnụ, nke etiti maka ndị nchụàjà, nke ala ala kwa maka obodo ahụ na ala ya na-emepụta ihe. Ụlọukwu Jehova ga-adị n’ala nke ndị nchụàjà, n’etiti òkè nsọ ahụ nwere akụkụ anọ hà nhata.—Ezikiel 45:1-7.

10. Gịnị ka amụma banyere ike ala ahụ pụtara nye ndị Judia kwesịrị ntụkwasị obi nọ ná ndọrọ n’agha?

10 Lee otú ihe a nile na-aghaghị isiworị gbaa ndị ahụ a dọọrọ n’agha ume! E mesiri ezinụlọ ọ bụla obi ike na ha ga-enwe ihe nketa n’ala ahụ. (Tụlee Maịka 4:4.) Ofufe dị ọcha ga-enwe ọnọdụ dị elu, nke bụ́ isi n’ebe ahụ. Rịbakwa ama n’ọhụụ Ezikiel na onyeisi ahụ, dị ka ndị nchụàjà, ga-ebi n’ala nke ndị obodo nyere n’onyinye. (Ezikiel 45:16) Ya mere n’ala ahụ e weghachiri, ndị ahụ gaje ịtụnye ụtụ n’ọrụ nke ndị Jehova họpụtara idu ndú, na-akwado ha site irube isi ná ntụzi ha. N’ozuzu, ala a bụ ihe atụ nke nhazi, mmekọ ihe ọnụ, na ịnọ ná nchebe.

11, 12. (a) Olee otú Jehova si emesi ndị ya obi ike n’ụzọ amụma na ya ga-agọzi ala nna ha e weghachiri? (b) Gịnị ka osisi ndị ahụ dị n’ikpere osimiri na-ese onyinyo ya?

11 Jehova ọ̀ ga-agọzi ala ha? Amụma ahụ ji nkọwa na-enye obi ụtọ zaa ajụjụ a. Mmiri iyi si n’ụlọukwu ahụ na-erupụta, na-abasawanye ka ọ na-aga, na-aghọ osimiri mgbe ọ na-abanyela n’Osimiri Nwụrụ Anwụ. N’ebe ahụ, o mere ka mmiri na-adịghị ndụ dịghachi ndụ, ọrụ ịkụ azụ̀ na-agakwa n’ihu n’ogologo akụkụ ya nile. N’ikpere osimiri ahụ e nwere ọtụtụ osisi na-amị mkpụrụ oge nile n’afọ, na-enye ihe oriri na ọgwụgwọ.—Ezikiel 47:1-12.

12 Nye ndị ahụ a dọọrọ n’agha, nkwa a kwupụtaghachiri ma kwadoo amụma mweghachi ndị e buru na mbụ ndị ha ji kpọrọ oké ihe. Ihe karịrị otu ugboro, ndị amụma Jehova e nyere ike mmụọ nsọ ejiriwo okwu ndị na-akọwa ọnọdụ paradaịs kọwaa Israel e weghachiri, nke e bijughachiri. Ógbè ndị tọgbọrọ chakoo ijupụtaghachi n’ihe ndị dị ndụ anọwo na-abụ okwu amụma a na-ekwughachi ugboro ugboro. (Aịsaịa 35:1, 6, 7; 51:3; Ezikiel 36:35; 37:1-14) Ya mere ndị ahụ pụrụ ịtụ anya na ngọzi Jehova ndị na-enye ndụ ga na-erupụta dị ka osimiri site n’ụlọukwu ahụ e wughachiri. N’ihi ya, mba nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ ga-adịghachi ndụ. A ga-eji ndị ikom a ma ama ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe—ndị ikom bụ́ ndị ezi omume na ndị guzosiri ike dị ka osisi ndị ahụ dị n’ikpere mmiri ahụ a hụrụ n’ọhụụ, ndị ikom ga-ebute ụzọ n’iwughachi ala e bibiri ebibi, gọzie ndị ahụ e weghachiri. Aịsaịa dekwara banyere “osisi oak nke ezi omume” ndị ‘ga-ewughachi ebe nile nke bụ́ mkpọmkpọ ebe site na mgbe ebighị ebi gara aga.’—Aịsaịa 61:3, 4.

Olee Mgbe A Ga-emezu Ọhụụ Ahụ?

13. (a) N’echiche dị aṅaa ka Jehova ji “osisi oak nke ezi omume” gọzie ndị ya e weghachiri? (b) Olee otú e si mezuo amụma banyere Osimiri Nwụrụ Anwụ?

13 Ndị ahụ a dọọrọ n’agha na-alọtanụ hà nwere ndakpọ olileanya? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe fọdụrụnụ e weghachiri laghachiri n’ala nna ha ha hụrụ n’anya na 537 T.O.A. Ka oge na-aga, n’okpuru nduzi nke “osisi oak nke ezi omume” ndị a—dị ka odeakwụkwọ bụ́ Ezra, ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa, na Onyeisi Nchụàjà bụ́ Joshua—e wughachiri ebe nile ahụ bụ́ mkpọmkpọ ebe site na mgbe ebighị ebi gara aga. Ndị isi, dị ka ihe atụ Nehemaịa na Zerubabel, ji ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ chịa n’ala ahụ. E wughachiri ụlọukwu Jehova, ndokwa ya nile maka ndụ—ngọzi nke ịdị ndụ kwekọrọ n’ọgbụgba ndụ ya—malitekwara irupụta ọzọ. (Deuterọnọmi 30:19; Aịsaịa 48:17-20) Otu ngọzi bụ ihe ọmụma. A kpọghachiri òtù ndị nchụàjà n’ọrụ ha, ndị nchụàjà kụzikwaara ndị ahụ ihe n’Iwu ahụ. (Malakaị 2:7) N’ihi ya, ndị ahụ dịghachiri ndụ n’ụzọ ime mmụọ, ha ghọghachikwara ndị ohu Jehova na-amị mkpụrụ, dị ka e sere onyinyo ya n’Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ ịbụ nke a gwọrọ na ịkpalite ọrụ ịkụ azụ̀ na-arụpụta ihe.

14. N’ihi gịnị ka a ga-eji nwee mmezu nke amụma Ezikiel n’ụzọ karịrị ihe mere mgbe ndị Juu sisịrị ná ndọrọ n’agha na Babilọn lọta?

14 Ihe omume ndị a hà agwụla mmezu nke ọhụụ Ezikiel? Ee e; e gosiri ihe ka nnọọ ukwuu. Tụlee: A pụghị n’ezie iwu ụlọukwu ahụ Ezikiel hụrụ dị ka e si kọwaa ya. N’eziokwu, ndị Juu ji ọhụụ ahụ kpọrọ ihe, ọbụna ha kọwakwara ihe ụfọdụ dị na ya n’ụzọ nkịtị.b Otú ọ dị, ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ bubigara ibu ókè nke na ọ gaghị aba ọbụna n’elu Ugwu Moraịa, bụ́ ebe ụlọukwu mbụ ahụ dịbu. Ọzọkwa, ụlọukwu Ezikiel adịghị n’ime obodo ahụ kama n’ebe dịtụ anya n’ibe ala dịpụrụ iche, ebe e wuru ụlọukwu nke abụọ ahụ n’ebe nke mbụ dịbu, n’ime obodo Jerusalem. (Ezra 1:1, 2) Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe ọ bụla osimiri nkịtị siri n’ụlọukwu Jerusalem rupụta. Ya mere Israel oge ochie hụrụ nanị ntakịrị mmezu nke amụma Ezikiel. Nke a na-apụta na ọhụụ a aghaghị inwe mmezu ime mmụọ, nke ka ukwuu.

15. (a) Olee mgbe ụlọukwu ime mmụọ nke Jehova malitere ịrụ ọrụ? (b) Gịnị na-egosi na e mezughị ọhụụ Ezikiel n’oge Kraịst dịrị ndụ n’ụwa?

15 N’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ịchọ mmezu bụ́ isi nke ọhụụ Ezikiel n’oké ụlọukwu ime mmụọ nke Jehova, bụ́ nke Pọl onyeozi tụlere n’ụzọ sara mbara n’akwụkwọ Ndị Hibru. Ụlọukwu ahụ malitere ịrụ ọrụ mgbe e tere Jisọs Kraịst mmanụ dị ka Onyeisi Nchụàjà ya na 29 O.A. Ma è mezuru ọhụụ Ezikiel n’oge Jisọs? Dị ka ihe àmà gosiri, e mezughị ya. Jisọs, dị ka Onyeisi Nchụàjà, mezuru ihe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ nọchitere anya ya n’ụzọ amụma site na baptism ya, ọnwụ ịchụ àjà ya, na mbanye ọ banyere n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, n’eluigwe kpọmkwem. (Ndị Hibru 9:24) Otú ọ dị, n’ụzọ na-akpali mmasị, ọhụụ Ezikiel ekwughị otu mkpụrụ ihe banyere onyeisi nchụàjà ma ọ bụ Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ya mere o yighị ka ọhụụ a ọ na-ezo aka na narị afọ mbụ O.A. Mgbe ahụ, olee oge ọ na-ekwu banyere ya?

16. Ebe a nọ hụ ọhụụ Ezikiel na-echetara anyị banyere amụma ọzọ dị aṅaa, oleekwa otú nke a si enyere anyị aka ịmata oge mmezu bụ́ isi nke ọhụụ Ezikiel?

16 Iji zaa ya, ka anyị gaghachi n’ọhụụ ahụ kpọmkwem. Ezikiel dere, sị: “N’ọhụụ dị iche iche nke Chineke ka O mere ka m bata n’ala Israel, Ọ dọba m n’ugwu dị elu nke ukwuu, nke ihe dị ka obodo a na-ewu ewu dị n’elu ya n’akụkụ Ndịda.” (Ezikiel 40:2) Ebe a nọ hụ ọhụụ a, “n’ugwu dị elu nke ukwuu,” na-echetara anyị Maịka 4:1: “Ọ ga-erukwa, n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ugwu ahụ elu karịa ugwu nta nile; ndị dị iche iche ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.” Olee mgbe amụma a ga-emezu? Maịka 4:5 na-egosi na nke a ga-amalite mgbe mba nile ka na-efe chi ụgha dị iche iche. N’ezie, ọ bụwo n’oge anyị, “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” ka e buliworo ofufe dị ọcha elu, weghachi ya n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị ná ndụ nke ndị ohu Chineke.

17. Olee otú amụma dị na Malakaị 3:1-5 si enyere anyị aka ịmata mgbe e kpochasịrị ụlọukwu ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel?

17 Gịnị mere ka mweghachi a kwe omume? Cheta, n’ihe omume kasị dị ịrịba ama n’ọhụụ Ezikiel, Jehova bịara n’ụlọukwu ahụ ma kwusie ike ka e kpochapụ ikpere arụsị n’ụlọ ya. Olee mgbe e kpochasịrị ụlọukwu ime mmụọ nke Chineke? Na Malakaị 3:1-5, Jehova buru amụma banyere oge ya na “Onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ Jisọs Kraịst, “ga-abịaru ụlọukwu Ya.” Ime gịnị? “Ya onwe ya [ga-adị] ka ọkụ onye nnụcha ihe na dị ka nchà nke ọsụ ákwà.” Nnụcha a malitere n’oge Agha Ụwa Mbụ. Gịnị si na ya pụta? Jehova ebiriwo n’ụlọ ya ma gọzie ala ime mmụọ nke ndị ya malite na 1919 gaa n’ihu. (Aịsaịa 66:8) Mgbe ahụ, anyị pụrụ ikwubi na amụma Ezikiel banyere ụlọukwu na-enwe mmezu dị mkpa na mgbe ikpeazụ.

18. Olee mgbe ọhụụ banyere ụlọukwu ahụ ga-enwe mmezu ikpeazụ ya?

18 Dị ka amụma mweghachi ndị ọzọ, ọhụụ Ezikiel nwere mmezu ọzọ, nke ikpeazụ, na Paradaịs. Ọ bụ nanị n’oge ahụ ka ihe a kpọrọ mmadụ obi ha ziri ezi ga-enweta uru nile nke ndokwa ụlọukwu nke Chineke. Mgbe ahụ Kraịst ga-eji uru nke àjà mgbapụta ya mee ihe, ya na òtù ndị nchụàjà ya nke eluigwe dị 144,000. A ga-ebuli ụmụ mmadụ nile na-erube isi nọ n’okpuru ịchịisi Kraịst gaa n’izu okè. (Mkpughe 20:5, 6) Otú ọ dị, Paradaịs apụghị ịbụ oge bụ́ isi maka mmezu nke ọhụụ Ezikiel. N’ihi gịnị?

Ọhụụ ahụ Elekwasị Anya n’Ụbọchị Anyị

19, 20. N’ihi gịnị ka mmezu bụ́ isi nke ọhụụ ahụ na-aghaghị iji bụrụ n’oge a, n’abụghịkwa na Paradaịs?

19 Ezikiel hụrụ ụlọukwu nke ọ dị mkpa ka e kpochapụ ikpere arụsị na ịkwa iko ime mmụọ n’ime ya. (Ezikiel 43:7-9) Nke a n’ezie apụghị ịbụ maka ofufe Jehova n’ime Paradaịs. Ọzọkwa, ndị nchụàjà ahụ a hụrụ n’ọhụụ ahụ na-ese onyinyo òtù ndị nchụàjà ahụ e tere mmanụ mgbe ha ka nọ n’ụwa, ọ bụghị mgbe ha bilitesịworo n’ọnwụ gaa n’eluigwe ma ọ bụ n’oge Narị Afọ Iri ahụ. N’ihi gịnị? Rịba ama na e gosiri ndị nchụàjà ahụ dị ka ndị na-eje ozi n’ogige dị n’ime. Isiokwu ndị pụtaworo n’Ụlọ Nche ndị bu ụzọ egosiwo na ogige a na-ese onyinyo ọnọdụ ime mmụọ pụrụ iche nke ndị nchụàjà nọ n’okpuru nke Kraịst mgbe ha ka nọ n’ụwa.c Rịbakwa ama na ọhụụ ahụ na-emesi ezughị okè nke ndị nchụàjà ahụ ike. A gwara ha ka ha chụọ àjà maka mmehie ha. A na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịghọ ndị na-adịghị ọcha—n’ụzọ ime mmụọ na omume. Ya mere ha adịghị ese onyinyo ndị e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite, bụ́ ndị Pọl onyeozi dere banyere ha, sị: “A ga-afụ opi, a ga-emekwa ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’apụghị ire ure.” (1 Ndị Kọrint 15:52; Ezikiel 44:21, 22, 25, 27, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ndị nchụàjà ahụ a hụrụ n’ọhụụ ahụ so ndị mmadụ na-emekọ ihe, na-ejekwara ha ozi kpọmkwem. Nke a agaghị adị otú a na Paradaịs, mgbe òtù ndị nchụàjà ahụ ga-anọ n’eluigwe. Ya mere, ọhụụ ahụ na-ese onyinyo dị mma nke ụzọ ndị ahụ e tere mmanụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ si arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya taa n’elu ala.—Mkpughe 7:9; Ezikiel 42:14.

20 Ya mere ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu ahụ na-egosi mmetụta ndị dị mma nke nsacha ime mmụọ nke na-emezu taa. Ma gịnị ka nke ahụ pụtara nye gị? Nke a abụghị ma ọlị nkà mmụta okpukpe na-agbasaghị gị. Ọhụụ a nwere mmetụta dị ukwuu n’ofufe ị na-efe nanị otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, kwa ụbọchị. N’isiokwu anyị na-esonụ, anyị ga-ahụ otú o si nwee.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Nke a pụrụ imetụworị Ezikiel n’ahụ, n’ihi na e kwuru na ya onwe ya si n’ezinụlọ Zedọk bụ́ ndị nchụàjà.

b  Dị ka ihe atụ, Mishnah oge ochie na-enye echiche na n’ime ụlọukwu ahụ e wughachiri, na e wuru ebe ịchụàjà, ibo ọnụ ụzọ abụọ nke ụlọukwu ahụ, na ebe ndị a na-esi nri ikwekọ n’ọhụụ Ezikiel.

c  Lee Ụlọ Nche, July 1, 1996, peji nke 16; August 1, 1973, peji nke 248-249.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị bụ mmezu mbụ nke ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu ahụ na òtù ndị nchụàjà ya?

◻ Olee otú ọhụụ Ezikiel banyere nkenye nke ala ahụ si nwee mmezu mbụ?

◻ Ná mweghachi nke Israel oge ochie, olee ndị rụrụ ọrụ dị ka ndị isi kwesịrị ntụkwasị obi, olee ndị rụkwara ọrụ dị ka “osisi oak nke ezi omume”?

◻ N’ihi gịnị ka ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu na-aghaghị iji nwee mmezu ya bụ́ isi na mgbe ikpeazụ ndị a?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya