Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 4 p. 16-p. 17 para. 3
  • Meri Dị Ime ma Ọ Lụbeghị Di

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Meri Dị Ime ma Ọ Lụbeghị Di
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Dị Ime, ma Ọ Lụbeghị Di
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Nọ Na-eche ‘Ihe Ihe Ndị ahụ Pụtara’
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 4 p. 16-p. 17 para. 3
Ebe Meri na-agwa Josef na ya dị ime

ISI NKE 4

Meri Dị Ime ma Ọ Lụbeghị Di

MATIU 1:18-25 LUK 1:56

  • JOSEF AMATA NA MERI DỊ IME

  • MERI AGHỌỌ NWUNYE JOSEF

Meri dị ime ọnwa anọ ugbu a. Ọ̀ kwa i chetara na ọ gara nọnyere onye ikwu ya bụ́ Elizabet n’ebe ugwu Judia mgbe ọ ka dị ime ọhụrụ? Ma ugbu a, Meri alọghachila Nazaret. Afọ ime ya apụtawakwala. Obere oge ndị ọzọ ga-amata na ọ dị ime. Chegodi otú ọnọdụ ya a ga-esi na-eche ya uche.

Ihe kacha enye ya nsogbu n’obi bụ na Josef onye ọkwá nkà ekwela ya nkwa ọlụlụ. Meri makwa ihe Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru a ga-eme nwaanyị ọ bụla gara ya na nwoke ọzọ enwee mmekọahụ mgbe e kwerela ya nkwa ọlụlụ. Iwu ahụ kwuru na a ga-eji nkume tụgbuo nwaanyị ahụ. (Diuterọnọmi 22:23, 24) Ọ bụ eziokwu na Meri na nwoke ọzọ enweghị mmekọahụ, ihe na-enye ya nsogbu n’obi bụ otú ọ ga-esi kọwaara Josef otú o si dịrị ime, nakwa ihe nwere ike ime.

Meri anọghị ya kemgbe ọnwa atọ, ọ ga na-agụsikwa Josef agụụ ike ịhụ ya. Mgbe ha hụrụ, Meri gwara Josef na ya dị ime. Ọ gbalịrị ime ka Josef ghọta na ọ bụ n’ike mmụọ nsọ Chineke ka ya dị ime. Ma, o siiri Josef ike ịghọta ihe Meri na-ekwu, siekwara ya ike ikweta.

Josef ma na Meri bụ ezigbo nwaanyị nwere aha ọma. Josef hụkwara Meri n’anya. Ma, n’agbanyeghị ihe niile Meri gwara ya, ọ ka chere na o nweghị otú ọzọ Meri ga-esi dịrị ime ma ọ́ bụghị na nwoke ọzọ tụwara ya ime ahụ. Ọ chọghị ka e jiri nkume tụgbuo Meri ma ọ bụ menye ya ihere n’ihu ọha. N’ihi ya, o kpebiri ịgba ya alụkwaghịm na nzuzo. N’oge ahụ, a na-ele ndị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ anya ka ndị lụrụla alụ. Iji gbubie nkwa ọlụlụ, ndị ahụ kwere onwe ha nkwa ga-agba alụkwaghịm.

Mgbe mmụọ ozi Jehova bịakwutere Josef ná nrọ

Mgbe Josef nọ na-eche ihe a niile, ụra buuru ya. Mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya ná nrọ sị ya: “Atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka ọ dị ime ahụ ọ dị. Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụ ya Jizọs, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.”—Matiu 1:20, 21.

Mgbe Josef tetara, obi dị ya ụtọ na otú Meri si dịrị ime edoola ya anya. O gbughị oge ime ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya. Ọ kpọọrọ Meri laa n’ụlọ ya. Ihe a o mere dị ka agbamakwụkwọ. O gosiri ọha mmadụ na ya na Meri aghọọla di na nwunye. Mana, Josef na Meri enweghị mmekọahụ n’oge niile ọ dị ime Jizọs.

Mgbe Meri nọ n’elu ịnyịnya ibu, Josef atụkwasị ibu ha n’elu ya

Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara, Josef na Meri, onye dịzi ime ọmụmụ ugbu a, na-akwado isi Nazaret mee njem. Olee ebe ha na-achọ ịga ugbu a ime Meri ruwerela ọmụmụ?

  • Mgbe Josef matara na Meri dị ime, gịnị ka o chere, n’ihi gịnịkwa?

  • Olee otú o si bụrụ na Josef nwere ike ịgba Meri alụkwaghịm ebe ọ bụ na ha alụbeghị?

  • Gịnị ka Josef mere nke gosiri ndị mmadụ na ya na Meri aghọọla di na nwunye?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya