Ndị Bụ́ Di—Nakwerenụ Ịbụisi Kraịst
“Isi nke nwoke ọ bụla bụ Kraịst ahụ.”—1 NDỊ KỌRINT 11:3.
1, 2. (a) Olee ihe a ga-eji mara di na-arụ ọrụ ya nke ọma? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịghọta na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye?
OLEE ihe ị ga-eji mara di na-arụ ọrụ ya nke ọma? Ọ̀ bụ ọgụgụ isi ya ka ọ̀ bụ ike ọkpụkpụ aka ya? Ọ̀ bụ ego ole o nwere ike ịkpata? Ka ọ̀ bụ karịsịa otú o si eji ịhụnanya na obiọma emeso nwunye ya na ụmụ ya ihe? A bịa na nke ikpeazụ n’ihe ndị ahụ e kwuru, ọtụtụ ndị bụ́ di anaghị eme nke ọma, n’ihi na ha na-ekwe ka mmụọ nke ụwa na echiche mmadụ na-achịkwa ihe ha na-eme. N’ihi gịnị? Ihe kasị akpata ya bụ na ha anaghị anabata nduzi nke Onye malitere alụmdi na nwunye—bụ́ Onye ‘wuru ọgịrịga ahụ O wepụtara n’ahụ́ nwoke ahụ dị ka ụlọ ka ọ ghọọ nwanyị, O mee ka ọ bịakwute mmadụ ahụ’—ha anaghịkwa agbaso nduzi ya ná ndụ ha.— Jenesis 2:21-24.
2 Jizọs Kraịst kwughachiri ihe a Bible kwuru banyere otú alụmdi na nwunye si malite, gwa ndị na-akatọ ya n’oge ya, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị wee sị, ‘N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo [n’alụmdi na nwunye] mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:4-6) Nke bụ́ eziokwu bụ na isi ihe ga-eme ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma bụ ịghọta na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye nakwa na ihe ịga nke ọma nke alụmdi na nwunye dabeere n’itinye ntụziaka ndị dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ọrụ.
Isi Ihe Ga-enyere Di Aka Ịrụ Ọrụ Ya nke Ọma
3, 4. (a) Olee ihe mere Jizọs ji ghọta alụmdi na nwunye nke ọma? (b) Olee ndị bụ́ nwunye ihe atụ Jizọs, oleekwa otú ndị bụ́ di kwesịrị isi na-emeso nwunye ha ihe?
3 Ihe ga-enyere di aka ịrụ ọrụ ya nke ọma bụ ịmụ ihe Jizọs kwuru na ime ihe ndị O mere. Jizọs ghọtara nnọọ alụmdi na nwunye nke ọma, n’ihi na ọ nọ mgbe e kere mmadụ abụọ mbụ na mgbe e jikọtara ha dị ka di na nwunye. Jehova Chineke gwara ya, sị: ‘Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị.’ (Jenesis 1:26) Ee, Onye Chineke na-agwa okwu ahụ bụ Onye Ya Onwe Ya kere tupu Ya ekee onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ bụ́ onye mesịrị ‘nọrọ n’akụkụ ya, dị ka onye ọkà.’ (Ilu 8:22-30) Onye a bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” Ọ bụ “mmalite nke ihe Chineke kere,” n’ihi na e keela ya tupu e kee eluigwe na ala nkịtị.—Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14.
4 A kpọrọ Jizọs “Nwa Atụrụ Chineke,” a kpọkwara ya di n’ụzọ ihe atụ. Ọ dị mgbe otu mmụọ ozi kwuru, sị: “Bịa ebe a, m ga-egosi gị nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” (Jọn 1:29; Mkpughe 21:9) Oleezi onye bụ́ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, ya bụ nwunye ya? “Nwunye Nwa Atụrụ ahụ” bụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe. (Mkpughe 14:1, 3) N’ihi ya, otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe ya na ha nọ n’ụwa bụ ihe atụ nke otú ndị bụ́ di ga-esi na-emeso nwunye ha ihe.
5. Olee ndị Jizọs bụụrụ ihe nlereanya?
5 Ee, Bible kwuru na Jizọs bụ ihe nlereanya nye ụmụazụ ya nile, n’ihi na o kwuru, sị: “Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọukwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe nlereanya nye ụmụ nwoke karịsịa. Bible kwuru, sị: “Isi nke nwoke ọ bụla bụ Kraịst ahụ; n’aka nke ọzọ isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Ebe ọ bụ na Kraịst bụ isi nke nwoke, ndị bụ́ di kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya ya. N’ihi ya, a ghaghị ịgbaso ụkpụrụ ịbụisi ahụ ma ọ bụrụ na ezinụlọ ga-aga nke ọma ma nwee obi ụtọ. Iji mezuo nke ahụ, ọ dị mkpa ka ndị bụ́ di jiri ụdị ịhụnanya ahụ Jizọs ji na-emeso nwunye ihe atụ ya, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, ihe na-emesokwa nwunye ha.
Otú A Ga-esi Dozie Nsogbu Ndị Bilitere n’Alụmdi na Nwunye
6. Olee otú ndị bụ́ di kwesịrị isi soro nwunye ha na-ebi?
6 N’ụwa nke oge a jupụtara ná nsogbu, ọ dị ndị bụ́ di mkpa karịsịa iṅomi ihe nlereanya Jizọs n’inwe ndidi, ịhụnanya, na ịkwụsi ike n’ịgbaso ụkpụrụ ezi omume. (2 Timoti 3:1-5) Bible kwuru banyere ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ, sị: “Unu ndị bụ́ di, nọgidenụ soro [ndị nwunye unu] na-ebi n’otu ụzọ ahụ dị ka ihe ọmụma si dị.” (1 Pita 3:7) Ee, ndị bụ́ di kwesịrị iji amamihe dozie nsogbu ndị bilitere n’alụmdi na nwunye ha, dị nnọọ ka Jizọs ji amamihe merie nsogbu dị iche iche. Ọ tara ahụhụ karịa mmadụ ọ bụla ọzọ, ma ọ maara na ọ bụ Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ajọ ụwa a kpatara ha. (Jọn 14:30; Ndị Efesọs 6:12) Ọ dịghị nsogbu juru Jizọs anya, n’ihi ya kwa, “mkpagbu n’anụ ahụ́” dakwasịrị di na nwunye ekwesịghị iju ha anya. Bible dọrọ aka ná ntị na ndị lụrụ di na nwunye ga-atụ anya inweta mkpagbu ndị dị otú ahụ.—1 Ndị Kọrint 7:28.
7, 8. (a) Olee ihe iso ndị nwunye na-ebi dị ka ihe ọmụma si dị gụnyere? (b) N’ihi gịnị ka ndị di kwesịrị iji na-asọpụrụ nwunye ha?
7 Bible kwuru na ndị bụ́ di kwesịrị iso nwunye ha na-ebi “dị ka ihe ọmụma si dị, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike, ihe bụ́ nwanyị.” (1 Pita 3:7) Kama iji aka ike na-achị nwunye ya, dị ka Bible buru n’amụma na ọtụtụ ụmụ nwoke ga na-eme, di nke na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ga na-asọpụrụ nwunye ya. (Jenesis 3:16) O kwesịrị ịdị na-emeso ya ihe dị ka arịa dị oké ọnụ ahịa, ghara inwe mgbe ọ ga-eji ikike ya karịrị nke nwunye ya merụọ ya ahụ́. Kama nke ahụ, ọ ga na-echebara mmetụta ya echiche, na-asọpụrụ ya ma na-akwanyere ya ùgwù mgbe nile.
8 N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ndị bụ́ di ịdị na-asọpụrụ nwunye ha? Bible na-aza, sị: “Ebe unu so ha bụrụ ndị nketa nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke ndụ, ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Ndị bụ́ di kwesịrị ịma na Jehova anatụghị ele nwoke na-efe Ya anya dị ka onye dị elu karịa nwanyị na-efekwa ya. Chineke ga-enyekwa ụmụ nwanyị mere ihe dị ya mma otu ndụ ebighị ebi ahụ ọ ga-enye ndị nwoke—ọtụtụ n’ime ha ga-adịdị ndụ n’eluigwe, bụ́ ebe ‘a na-enweghị nwoke ma ọ bụ nwanyị.’ (Ndị Galeshia 3:28) Ya mere, ndị bụ́ di kwesịrị icheta na ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi mmadụ na-eme ka ọ bụrụ onye dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Ọ bụghị ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwanyị, di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ ọbụna nwatakịrị.—1 Ndị Kọrint 4:2.
9. (a) Dị ka Pita si kwuo, olee ihe mere ndị bụ́ di kwesịrị iji na-asọpụrụ nwunye ha? (b) Olee otú Jizọs si sọpụrụ ụmụ nwanyị?
9 Pita onyeozi ji okwu mmechi ya nke bụ́ “ka e wee ghara igbochi ekpere unu” gosi mkpa ọ dị di ịsọpụrụ nwunye ya. Ọ ga-abụ nnọọ ihe jọgburu onwe ya ma ọ bụrụ na e gbochie ekpere mmadụ! Di asọpụrụghị nwunye ya nwedịrị ike ime ka Chineke gharakwa ịnụ ekpere ya, dị ka Chineke na-anụghị nke ndị ohu ya nke oge ochie bụ́ ndị leghaara iwu ya anya. (Abụ Ákwá 3:43, 44) Ọ ga-abụrụ Ndị Kraịst bụ́ nwoke amamihe—ma ndị lụrụ nwanyị ma ndị ka na-achọ ịlụ alụ—ịmụ otú Jizọs si kwanyere ụmụ nwanyị ùgwù. Jizọs kwere ka ụmụ nwanyị soro ya na-agagharị ka ọ na-eje ozi ya, o mesokwara ha omume obiọma ma sọpụrụ ha. N’otu oge, Jizọs budị ụzọ kpugheere ụmụ nwanyị otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, gwazie ha ka ha gaa gwa ya ndị nwoke!—Matiu 28:1, 8-10; Luk 8:1-3.
Onye Setịpụụrụ Nnọọ Ndị Di Ihe Nlereanya
10, 11. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị ndị bụ́ di mkpa karịsịa ịmụ ihe nlereanya Jizọs? (b) Olee otú ndị bụ́ di kwesịrị isi hụ nwunye ha n’anya?
10 Dị ka anyị kwurula na mbụ, Bible ji mmekọrịta dị n’etiti nwoke na nwunye ya tụnyere mmekọrịta dị n’etiti Kraịst na “nwanyị [ọ] na-alụ ọhụrụ,” nke bụ́ ọgbakọ nke ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ. Bible kwuru, sị: “Di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” (Ndị Efesọs 5:23) Okwu ndị a kwesịrị ịkpali ndị bụ́ di ịtụle otú Jizọs si duo ụmụazụ ya. Ọ bụ nanị mgbe ndị bụ́ di tụlere nke ahụ ka ha ga-enwe ike ịgbasochi ihe nlereanya Jizọs anya ma duo nwunye ha, hụ ha n’anya, lekọtakwa ha otú ahụ Kraịst meere ọgbakọ ya.
11 Bible na-agba Ndị Kraịst ume, sị: “Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Ndị Efesọs 5:25) N’isi nke anọ nke akwụkwọ Ndị Efesọs, a kpọrọ “ọgbakọ ahụ” “ahụ́ nke Kraịst ahụ.” Ahụ́ ihe atụ a nwere ma ndị nwoke ma ndị nwanyị na ya, ha nile sokwa na-eme ka ahụ́ ahụ na-arụ ọrụ nke ọma. O doro anya na ọ bụ Jịzọs bụ “isi nke ahụ́ ahụ, bụ́ ọgbakọ ahụ.”—Ndị Efesọs 4:12; Ndị Kọlọsi 1:18; 1 Ndị Kọrint 12:12, 13, 27.
12. Olee otú Jizọs si gosipụta ịhụnanya maka ahụ́ ihe atụ ya?
12 Jizọs gosiri ịhụnanya ya maka ahụ́ ihe atụ ya, “bụ́ ọgbakọ ahụ,” karịsịa site n’otú o si rụọ ọrụ maka ọdịmma nke ndị ga-eso na ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ike gwụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha, sị: “Bịanụ nanị unu n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma zurutụ ike.” (Mak 6:31) Mgbe otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu banyere ihe ndị Jizọs mere awa ole na ole tupu a kpọgbuo ya, o dere, sị: “Jizọs, ebe ọ hụrụ ndị nke ya [ya bụ, ndị so n’ahụ́ ihe atụ ya] . . . n’anya, hụrụ ha n’anya ruo n’ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Jizọs setịpụụrụ ndị bụ́ di n’otú ha ga-esi na-emeso nwunye ha ihe!
13. Olee otú a dụrụ ndị bụ́ di ọdụ ka ha si na-ahụ nwunye ha n’anya?
13 Pọl onyeozi gara n’ihu na-akọwa ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ ndị bụ́ di ma nye ha ndụmọdụ, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị nwoke kpọtụworo ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya, dị ka Kraịst ahụ na-emekwara ọgbakọ ahụ.” Paul kwukwara, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya.”—Ndị Efesọs 5:28, 29, 33.
14. Olee otú di si emeso ahụ́ ya na-ezughị okè ihe, oleekwa ihe nke ahụ na-egosi banyere otú o kwesịrị isi na-emeso nwunye ya ihe?
14 Cheedị echiche banyere okwu ndị ahụ Pọl kwuru. Ọ̀ dị mgbe nwoke isi zuru okè ga-ama ụma merụọ onwe ya ahụ́? Mgbe nwoke kpọbiri ụkwụ, ọ̀ na-eti ụkwụ ya ihe n’ihi ọ chọrọ ịkwatu ya? Mbanụ! Di ọ̀ na-emechu onwe ya ihu n’ihu ndị enyi ya ma ọ bụ jiri emezighị emezi nke ya onwe ya na-agba asịrị? Mba! N’ihi gịnịzi ka ọ ga-eji jiri ire ya, ma ọ bụ aka ya, tie nwunye ya ihe ma o mejọọ ihe? Ndị bụ́ di ekwesịghị ịdị na-eche nanị banyere ọdịmma nke onwe ha, kama ha kwesịkwara ịdị na-eche banyere ọdịmma nwunye ha.—1 Ndị Kọrint 10:24; 13:5.
15. (a) Olee ihe Jizọs mere mgbe adịghị ike nke ndị na-eso ụzọ ya pụtara ìhè? (b) Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya a o setịpụrụ?
15 Tụlee otú Jizọs si chebara ndị na-eso ụzọ ya echiche n’abalị ikpeazụ tupu ọnwụ ya, bụ́ mgbe adịghị ike ha dị ka ụmụ mmadụ pụtara ìhè. N’agbanyeghị na ọ rịọrọ ha arịrịọ ugboro ugboro ka ha kpee ekpere, ha rahụrụ ụra ugboro atọ n’ogige Getsemeni. Na mberede, ndị ikom ji ngwá ọgụ gbara ha gburugburu. Jizọs jụrụ ndị ikom ahụ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Mgbe ha zara ya, sị: “Jizọs onye Nazaret,” o kwuru, sị: “Ọ bụ m.” Ebe ọ maara na ‘oge awa nke ọnwụ ya eruola,’ o kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.” Jizọs chebaara ọdịmma nke ndị na-eso ụzọ ya—ndị so na nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ—echiche mgbe nile, o mekwara ndokwa ka a hapụ ha. Ọ bụrụ na ndị bụ́ di amụọ otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe, ha ga-ahụ ọtụtụ ụkpụrụ ndị ga-egosi ha otú ha kwesịrị isi na-emeso nwunye ha ihe.—Jọn 18:1-9; Mak 14:34-37, 41.
Ịhụnanya Jizọs Ekpughị Ìsì
16. Olee mmetụta Jizọs nwere maka Mata, n’agbanyeghị ya, olee otú o si gbazie ya?
16 Bible kwuru, sị: “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwanyị na Lazarọs [bụ́ ndị na-akpọkarị ya òkù ịbịa n’ụlọ ha] n’anya.” (Jọn 11:5) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs alaghị azụ n’ịdụ Mata ọdụ mgbe o tinyebigara uche ókè ná nri ọ na-esi nke na o nwechaghị ohere ige ntị ná ntụziaka Jizọs nọ na-enye. Jizọs kwuru, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu ma na-esogbu onwe gị banyere ọtụtụ ihe. Ma, ihe ole na ole, ma ọ bụ nanị otu ihe, dị mkpa.” (Luk 10:41, 42) O doro anya na nchegbu Mata hụrụ na Jizọs nwere maka ya nyeere Mata aka ịnabata ndụmọdụ ya. Ndị bụ́ di kwesịkwara ịdị na-eji obiọma na ịhụnanya emeso nwunye ha ihe, na-eji nlezianya ahọrọ okwu ndị ha na-agwa ha. Ma, mgbe ọ dị mkpa ka ndị bụ́ di gbazie nwunye ha, ha kwesịrị ịgwa nwunye ha eziokwu dị ka Jizọs mere.
17, 18. (a) Olee otú Pita si baara Jizọs mba, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ka a gbazie echiche Pita? (b) Olee ọrụ dịịrị di?
17 N’oge ọzọ, Jizọs kọwaara ndịozi ya na ya aghaghị ịga Jeruselem, bụ́ ebe ọ ga-enweta mkpagbu n’aka “ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, a ga-egbukwa ya, n’ụbọchị nke atọ a ga-akpọlitekwa ya.” Mgbe Jizọs kwuru otú ahụ, Pita kpọpụrụ ya n’akụkụ wee bido ịbara ya mba, na-asị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” O doro anya na Pita kwere ka ọmịiko kpuchie ya anya. Ọ dị mkpa ka a gbazie echiche ya. N’ihi ya, Jizọs gwara ya, sị: “Gaa n’azụ m, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Matiu 16:21-23.
18 Jizọs ka kwupụrụ ihe bụ́ uche Chineke—nke bụ́ na ọ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, e gbuokwa ya. (Abụ Ọma 16:10; Aịsaịa 53:12) N’ihi ya, Pita ekwesịghị ịbawara ya mba. Ee, ọ dị mkpa ka a gbazie nnọọ Pita, dịkwa ka ọ na-adị anyị mgbe ụfọdụ. Dị ka onyeisi ezinụlọ, e nyere di ikike, ọ bụkwa ọrụ dịịrị ya, ịgbazi ndị ezinụlọ ya, nke gụnyere nwunye ya. Ọ bụ ezie na o nwere ike ịdị mkpa ka ọ gwa nwunye ya ihe ọ na-aghaghị ime, o kwesịrị ịdị na-eji obiọma na ịhụnanya agbazi ya. Ya mere, dị nnọọ ka Jizọs nyeere Pita aka ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi, o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka ndị bụ́ di meere nwunye ha otu ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdị mkpa ka di jiri obiọma gwa nwunye ya ebe ndị o kwesịrị imezi ihe ma ọ bụrụ na ejiji ya ma ọ bụ otú o si etecha ntecha ekwekọchakwaghị n’ụkpụrụ imeru ihe n’ókè nke Akwụkwọ Nsọ na-agba ume ka anyị na-agbaso.—1 Pita 3:3-5.
Ọ Dị Mkpa Ka Ndị Di Na-enwe Ndidi
19, 20. (a) Olee nsogbu bilitere n’etiti ndịozi Jizọs, oleekwa ihe Jizọs mere maka ya? (b) Ihe ahụ Jizọs mere ọ̀ rụpụtara ezi ihe?
19 Ọ bụrụ na ọ dị àgwà ọjọọ ọ dị mkpa ka e lebara anya, ndị di ekwesịghị iche na mgbalị ha ji ezi obi mee iwepụ àgwà ọjọọ ahụ ga-aga nke ọma ozugbo. Jizọs nọgidere na-agbalị ịgbazi àgwà nke ndịozi ya. Dị ka ihe atụ, mmụọ ịma aka nke dịbu adị n’etiti ha pụtara ìhè ọzọ n’ọgwụgwụ nke ozi Jizọs. Ha rụrụ ụka banyere onye o yiri ka ọ̀ bụ ya kasị ukwuu n’etiti ha. (Mak 9:33-37; 10:35-45) Oge na-adịghị anya ka ha rụsịrị ụka ahụ nke ugboro abụọ, Jizọs mere ndokwa ka nanị ya na ha mee Ememe Ngabiga ikpeazụ ya. N’ụbọchị ahụ, ọ dịghị otu onye n’ime ha sịrị ka ọ rụọrọ ndị ibe ya ọrụ dị ala a na-arụ n’obodo ha nke bụ́ ịsa ụkwụ ha uzuzu metọrọ. Jizọs sara ha ụkwụ ahụ. Mgbe ọ sasịrị ha ụkwụ, ọ sịrị ha: “M na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ.”—Jọn 13:2-15.
20 Ndị di dị umeala n’obi ka Jizọs yikarịrị ka hà ga-enweta nkwado nke nwunye ha. Ma ọ chọrọ ndidi. Ka chi jitụkwuru n’otu abalị Ememe Ngabiga ahụ, ndịozi ahụ rụrịtakwara ụka ọzọ banyere onye n’ime ha o yiri ka ọ̀ bụ ya kasị ukwuu. (Luk 22:24) Ọ na-ewekarị oge tupu e nyere mmadụ aka ịgbanwe àgwà ya, ọ na-emekwa ya obere obere. Ma, ọ na-eme nnọọ obi ụtọ mgbe ọ rụpụtara ezi ihe, dị ka o mesịrị rụpụta n’ebe ndịozi ahụ nọ!
21. N’ihi nsogbu ndị e nwere taa, olee ihe a na-agba ndị bụ́ di ume icheta na ime?
21 Taa, alụmdi na nwunye nọ n’ụdị nsogbu ọ na-anọtụbeghị mbụ. Ọtụtụ ndị anakwaghị eji nkwa alụmdi na nwunye ha akpọrọ ihe. N’ihi ya, ndị bụ́ di, cheenụ echiche banyere otú alụmdi na nwunye si malite. Chetanụ na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye, na ọ bụkwa Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, chepụtara ma hiwe ya. O nyere anyị Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ịbụrụ anyị, ọ bụghị nanị Onye Mgbapụta—Onye Nzọpụta—kamakwa, ihe nlereanya nke ndị bụ́ di ga-eṅomi.—Matiu 20:28; Jọn 3:29; 1 Pita 2:21.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mata otú alụmdi na nwunye si malite?
• Olee ụzọ ndị a gbara ndị bụ́ di ume ka ha si gosi ịhụnanya maka nwunye ha?
• Olee ụzọ ndị Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị gosiri otú di na-eṅomi Kraịst kwesịrị isi na-edu nwunye ya?
[Foto dị na peeji nke 14]
N’ihi gịnị ka ndị bụ́ di kwesịrị iji mụọ ihe nlereanya nke otú Jizọs si mesoo ụmụ nwanyị ihe?
[Foto dị na peeji nke 15]
Jizọs chebaara ndị na-eso ụzọ ya echiche mgbe ike gwụrụ ha
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị bụ́ di kwesịrị iji obiọma na okwu ndị e ji nlezianya họrọ na-adụ nwunye ha ọdụ