Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
FEBỤWARỊ 5-11
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 12:20
Owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ: Ihe e ji amụnye ọkụ n’ụlọ n’oge ochie na-abụkarị ihe ọkụ e ji ụrọ kpụọ a gbanyere mmanụ oliv n’ime ya. Ọ bụ ogho e tinyere n’ihe ọkụ ahụ na-amịta mmanụ na-eme ka ọkụ ahụ na-enwu. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ” nwere ike ịpụta owu na-akwụ anwụrụ ọkụ n’ihi na ọ nyụchabeghị ma ọ bụkwanụ na ọ nyụọla. Amụma e buru n’Aịzaya 42:3 gosiri otú Jizọs ga-esi metere ndị mmadụ ebere; ọ gaghị emenyụ ọkụ na-achọ ịnyụ anyụ, ya bụ, olileanya ikpeazụ nke ndị a na-emegbu emegbu.
FEBỤWARỊ 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 14-15
“Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 14:21
e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị: Naanị akwụkwọ Matiu kwuru gbasara ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị n’ọrụ ebube a. O nwere ike ịbụ na ndị niile e ji ọrụ ebube nye nri n’ụbọchị ahụ ga-akarị puku mmadụ iri na ise.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 15:7
ndị ihu abụọ: Na mbụ, okwu Grik bụ́ hy·po·kri·tesʹ pụtara ndị Grik (ka oge na-aga ndị Rom) na-eme ihe nkiri na-eji ihe buru ibu kpuchie ihu ha ka olu ha nwee ike ịna-adasi ike. E mechara jiri okwu a na-akọwa onye na-ezochi ihe ọ na-eme ma ọ bụ onye ọ bụ, ma ọ bụkwanụ onye na-aghọ aghụghọ. N’amaokwu a, Jizọs kpọrọ ndị ndú okpukpe ndị Juu “ndị ihu abụọ.”—Mat. 6:5, 16.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 15:26
ụmụaka . . . ụmụ nkịta: N’Iwu Mozis, nkịta bụ anụmanụ rụrụ arụ. N’ihi ya, ọtụtụ mgbe, Akwụkwọ Nsọ anaghị ekwu ihe dị mma gbasara ya. (Lev. 11:27; Mat. 7:6; Fil. 3:2; Mkpu. 22:15) Ma, n’ihe Jizọs kwuru n’akwụkwọ Mak (7:27) nakwa n’akwụkwọ Matiu, o ji okwu bụ́ “ụmụ nkịta” ma ọ bụ “nkịta ụlọ” mee ka okwu ya ghara ịgba ndị nụrụ ya agba ná ntị. O nwere ike ịbụ na Jizọs na-ekwu gbasara anụmanụ ndị ha na ndị na-abụghị ndị Juu na-egwuri egwu n’ụlọ. Mgbe o ji ndị Izrel tụnyere “ụmụaka,” jirikwa ndị na-abụghị ndị Juu tụnyere “ụmụ nkịta,” ọ na-egosi na o nwere nke ka ibe ya mkpa. N’ụlọ ụmụaka na nkịta nọ, a na-ebu ụzọ enye ụmụaka nri tupu e nyewe nkịta.
FEBỤWARỊ 19-25
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 16:18
Ị bụ Pita, ọ bụkwa n’oké nkume a: Ihe okwu Grik bụ́ peʹtros pụtara bụ “iberibe nkume ma ọ bụ nkume.” N’ebe a ọ bụ aha mmadụ (Pita), ya bụ, ihe a na-akpọ aha Jizọs gụrụ Saịmọn n’asụsụ Grik. (Jọn 1:42) Okwu Grik ọzọ dị ka ya bụ peʹtra. Ọ pụtara “nkume,” o nwekwara ike ịpụta oké nkume, ma ọ bụ nkume buru ibu. Okwu Grik a dịkwa na Mat. 7:24, 25; 27:60; Luk 6:48; 8:6; Rom 9:33; 1 Kọr. 10:4; na 1 Pita 2:8. O doro anya na Pita ewereghị onwe ya ka nkume Jizọs ga-ewukwasị ọgbakọ ya n’elu ya. Ọ bụ ya mere o ji dee na 1 Pita 2:4-8, na e buru amụma ọtụtụ afọ gara aga na Jizọs, onye Chineke ji aka ya họrọ, bụ “nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala” ọgbakọ ya. Pọl onyeozi kwukwara na Jizọs bụ “ntọala” na “oké nkume ime mmụọ.” (1 Kọr. 3:11; 10:4) N’ihi ya, ihe okwu Jizọs pụtara bụ: ‘Gị, onye m na-akpọ Pita, ya bụ, nkume, amatala onye Kraịst bụ́ “nkume a” bụ n’eziokwu, onye ga-abụ ntọala nke ọgbakọ Ndị Kraịst.’
ọgbakọ: Ebe a bụ ebe mbụ okwu Grik bụ́ ek·kle·siʹa pụtara. E si n’okwu Grik abụọ bụ́ ek, nke pụtara “pụta,” na okwu Grik bụ́ ka·leʹo, nke pụtara “kpọọ” nweta ya. Ọ pụtara ìgwè mmadụ a kpọkọtara otu ebe maka otu ihe. N’amaokwu a, Jizọs na-ebu amụma na a ga-ehiwe ọgbakọ Ndị Kraịst nke ndị e tere mmanụ, ndị a ga-ewu dị ka “nkume dị ndụ” ka ha ghọọ “ụlọ ime mmụọ.” (1 Pita 2:4, 5) Okwu Grik a pụtara ọtụtụ ugboro na Septuagint. Ebe ndị ọ pụtara gosiri na ya na okwu Hibru a sụgharịrị “ọgbakọ” pụtara otu ihe. Ọtụtụ mgbe okwu Hibru a na-apụtakwa ndị niile nọ ná mba Chineke. (Diut. 23:3; 31:30) N’Ọrụ 7:38, a kpọrọ ndị Izrel niile Chineke si n’Ijipt kpọpụta “ọgbakọ.” Otú ahụkwa ka ndị nọ ‘n’ọgbakọ Chineke’ si bụrụ Ndị Kraịst ndị a “kpọpụtara . . . n’ọchịchịrị” na ndị a ‘họpụtara . . . n’ụwa.’—1 Pita 2:9; Jọn 15:19; 1 Kọr. 1:2.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 16:19
mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe: Na Baịbụl, e kwuo na e nyere mmadụ mkpịsị ugodi, ọ pụtara na e nyere onye ahụ ikike ime ihe ụfọdụ. (1 Ihe 9:26, 27; Aịza. 22:20-22) N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ “mkpịsị ugodi” na-anọchikarị anya ikike na ọrụ e nyere mmadụ. Pita ji “mkpịsị ugodi” ndị e nyere ya mee ka ndị Juu, (Ọrụ 2:22-41), ndị Sameria (Ọrụ 8:14-17), na ndị Jentaịl (Ọrụ 10:34-38) nwee ike ịnata mmụọ nsọ Chineke nke ga-eme ka ha nwee ike ịbanye n’Alaeze eluigwe.
FEBỤWARỊ 26–MACH 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 18-19
“Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ime Ka Gị na Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 18:6, 7
nkume igwe nri nke ịnyịnya ibu na-akwagharị: Ma ọ bụ “nnukwu nkume igwe nri.” Na Grik, ọ bụ “nkume igwe nri ịnyịnya ibu.” Nkume a nwere ike ịdị ihe dị ka otu mita na ọkara n’obosara. Otú nkume a si dị arọ mere ka a na-eji ịnyịnya ibu na-akwagharị ya.
ihe ịsụ ngọngọ: E chere na okwu Grik bụ́ skanʹda·lon nke a sụgharịrị ịbụ “ihe ịsụ ngọngọ” pụtara ọnyà. Ụfọdụ na-ekwu na ọ ga-abụ ya bụ osisi ahụ na-adị n’ọnyà a na-etinye ihe ụrà na ya. E mechakwara jiri ya na-akọwa ihe ọ bụla na-anọchi ụzọ, nke nwere ike ime ka mmadụ kpọ ụkwụ n’ihe ma ọ bụ daa. A na-ejikwa ya akọwa ihe ọ bụla mere ka mmadụ kpaa àgwà na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ mee mmehie. Na Matiu 18:8, 9, okwu ọzọ yiri ya bụ́ skan·da·liʹzo, nke a sụgharịrị ịbụ ‘mee ka a sụọ ngọngọ,’ nwekwara ike ịpụta “ghọọ ọnyà; mee ka e mehie.”
nwtsty ihe e ji kọwaa Mat. 18:6
Nkume Igwe Nri
A na-eji nkume igwe nri egweri ọka, na-ejikwa ya egwe mkpụrụ oliv ka ọ gbapụta mmanụ. A na-eji aka akwagharị nkume ndị obere. Ma, ọ bụ anụmanụ na-akwagharị ndị nke buru ibu. Ọ ga-abụ ụdị nnukwu nkume hà otu a ka ndị Filistia manyere Samsịn ka ọ na-akwagharị. (Ikpe 16:21) Ọ bụghị naanị n’Izrel ka e nwere nkume igwe nri ndị anụmanụ na-akwagharị, o juru eju n’ọtụtụ obodo ndị Alaeze Ukwu Rom chịrị.
Aka Nkume Igwe Nri na Nne Nkume Igwe Nri
A na-eji anụmanụ, dị ka ịnyịnya ibu, akwagharị nkume igwe nri buru ibu ka nke a ma e gweriwe ọka ma ọ bụ mkpụrụ oliv. Ụfọdụ aka nkume igwe nri nwere ike iru otu mita na ọkara n’obosara. Nne nkume a na-akwagharị ha n’elu ya na-ebu ibu karịa ya.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 18:9
Gehena: O si n’okwu Hibru bụ́ geh hin·nomʹ, nke pụtara “ndagwurugwu Hinọm.” Ọ dị n’ebe ndịda Jeruselem oge ochie. (Lee Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl isi nke 16, map isiokwu ya bụ “Jeruselem na Ebe Ndị Gbara Ya Gburugburu.”) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ebe ahụ ghọrọ ebe a na-akpọ ihe e kpofuru ekpofu ọkụ. N’ihi ya aha ahụ bụ́ “Gehena” kwesịrị ekwesị maka mbibi ebighị ebi.
nwtstg Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl
Gehena
Ihe a ka a na-akpọ ndagwurugwu Hinọm na Grik. Ọ dị n’ebe ndịda Jeruselem oge ochie. (Jere. 7:31) Baịbụl buru amụma na ọ ga-abụ ebe a na-atụfu ozu. (Jere. 7:32; 19:6) O nweghị ihe gosiri na a na-atụba ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ndị mmadụ ná ndụ na Gehena ka a kpọọ ha ọkụ ma ọ bụkwanụ jiri ya taa ha ahụhụ. N’ihi ya, ebe ahụ abụghị ebe a na-adịghị ahụ anya a nọ na-ata mkpụrụ obi ndị mmadụ ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ. Kama, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwuru na Gehena nọchiri anya “ọnwụ nke abụọ,” nke ndị mmehie ga-anwụ, nke pụtara mbibi ebighị ebi.—Mkpu. 20:14; Mat. 5:22; 10:28.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 18:10
na-ahụ ihu Nna m: Ma ọ bụ ‘na-agakwuru Nna m.’ Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi na-agakwuru Chineke, ọ bụ naanị ha nwere ike ịhụ ihu Chineke.—Ọpụ. 33:20.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 18:22
ugboro iri asaa na asaa: N’asụsụ Grik, ọ bụ “iri asaa ugboro asaa.” Okwu Grik a nwere ike ịpụta “iri asaa e tinyere asaa” (ya bụ, ugboro iri asaa na asaa) ma ọ bụkwanụ “iri asaa ugboro asaa” (ya bụ, ugboro narị anọ na iri itoolu). Ihe a sụgharịrị okwu Hibru bụ́ “ugboro iri asaa na asaa” dị na Jen. 4:24, na Septuagint bụ “ugboro iri asaa na asaa,” nke gosiri na a sụgharịtara ya. N’agbanyeghị otú e si ghọta ya, ikwughachi asaa ugboro ugboro na-apụta “agụta agụta” ma ọ bụ “enweghị ọgwụgwụ.” Mgbe Jizọs gbanwere ugboro asaa ahụ Pita kwuru ka ọ bụrụzie iri asaa na asaa, ihe ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ekwesịghị ịkwụsị ịgbaghara mmadụ mmejọ. Ma, Talmud ndị Babịlọn (Yoma 86b) kwuru ihe dị iche. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ nke mbụ, mejọọ nke abụọ na nke atọ, a ga-agbaghara ya; ma, na nke anọ, a gaghị agbaghara ya.”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 19:7
akwụkwọ nchụpụ: Ma ọ bụ “akwụkwọ ịgba alụkwaghịm.” Ihe mere Iwu ahụ ji kwuo ka nwoke chọrọ ịgba nwunye ya alụkwaghịm dee akwụkwọ iwu kwadoro ma ọ bụ gaa hụ ndị okenye, bụ ka nwoke ahụ jiri ohere ahụ chebara mkpebi a tara akpụ ọ na-achọ ime echiche. E nyere iwu ahụ ka o gbochie ịgba alụkwaghịm ọkụ ọkụ, ma belata mmegide a na-emegide ụmụ nwaanyị. (Diut. 24:1) Ma n’oge Jizọs, ndị ndú okpukpe mere ka ịgba alụkwaghịm dịrị ndị mmadụ mfe. Ọkọ akụkọ ihe ndị mere n’oge ochie bụ́ Josifọs, bụ́ onye Farisii, gbakwara alụkwaghịm. O kwuru na a na-ekwe ka onye chọrọnụ gbaa mmadụ alụkwaghịm “n’ihi ihe ọ bụla (ụmụ nwoke na-emekwa ihe ndị ahụ).”
nwtsty ihe e ji kọwaa Mat. 19:7
Akwụkwọ Ịgba Alụkwaghịm
Ọ ga-abụ na e dere akwụkwọ ịgba alụkwaghịm a n’afọ 71 ma ọ bụ 72 Oge Ndị Kraịst. E dere ya n’asụsụ Arameik. A hụrụ ya n’ebe ugwu nke ọwara Mmiri Murabbaat, ebe mmiri na-adịkwaghị, nke dị n’ọzara Judia. Akwụkwọ ahụ kwuru na n’afọ nke isii ndị Juu nupụụrụ ndị Rom isi, Josef nwa Naqsan, onye bi na Masada, gbara Miriam, nwa Jọnatan onye Hanablata, alụkwaghịm.