Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 9 p. 26-p. 27 para. 1
  • Mgbe Jizọs Na-etolite na Nazaret

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Jizọs Na-etolite na Nazaret
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite nke Ndụ Ezinụlọ Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ọ Nakweere Nduzi Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 9 p. 26-p. 27 para. 1
Mgbe Josef na-akụziri Jizọs ọrụ ịkwá nkà

ISI NKE 9

Mgbe Jizọs Na-etolite na Nazaret

MATIU 13:55, 56 MAK 6:3

  • EZINỤLỌ JOSEF NA MERI EBUO IBU

  • JIZỌS AMỤỌ AKA ỌRỤ

Ọ bụ na Nazaret ka Jizọs nọ tolite. Nazaret bụ obere obodo a na-anaghị anụcha aha ya. Ọ dị na Galili, nke dị ná mgbago mgbago ma e si Judia gawa ya, ná mpaghara ọdịda anyanwụ nke nnukwu mmiri a na-akpọ Oké Osimiri Galili.

Ọ ga-abụ na Jizọs dị afọ abụọ mgbe Josef na Meri si Ijipt kpọta ya ebe a. O yikwara ka ọ̀ bụ sọọsọ nwa ha mụrụla mgbe ahụ. Ma, ka oge na-aga, a mụrụ ụmụnne ya ndị nwoke. Aha ha bụ Jems, Josef, Saịmọn na Judas. Jizọs nwekwara ụmụnne ndị nwaanyị n’ihi na Josef na Meri mechara mụọ ụmụ ndị nwaanyị. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, Jizọs nwere ụmụnne isii ndị ọ tọrọ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị.

Jizọs nwekwara ndị ikwu ndị ọzọ. Anyị ma gbasara Elizabet na nwa ya nwoke Jọn. Isi Nazaret gbadaa Judia ebe Jọn hà bi dị ezigbo anya. Salomi bụ nwanne nne Jizọs. O bi na Galili, bụ́ ebe na-adịchaghị anya n’ebe Jizọs hà bi. Zebedi bụ di Salomi. Ụmụ ha ndị nwoke abụọ bụ Jems na Jọn. Ọ pụtara na Jems na Jọn bụ ụmụ nwanne nne Jizọs. Anyị amaghị ma ha na Jizọs hà kpachiri anya mgbe ha na-eto. Ma, ka oge na-aga, ha na ya ghọrọ ezigbo enyi. Ha abụọ so ná ndịozi ya.

Ezinụlọ Josef nahụ ebukwu ibu. Ọ gbasikwara mbọ ike igboro ha mkpa ha. Ọ bụ ọkwá nkà. Josef zụlitere Jizọs ka nwa nke ya. Ọ bụkwa ya mere e ji akpọ Jizọs “nwa ọkwá nkà.” (Matiu 13:55) Josef kụzikwaara Jizọs ọrụ ịkwa nkà. Jizọs mụtakwara ya nke ọma. O nwedịrị mgbe ndị mmadụ kwuru banyere Jizọs, sị: ‘Onye a bụ ọkwá nkà ahụ.’—Mak 6:3.

Mgbe Josef na Meri na-akụziri ụmụ ha gbasara Chineke

Ofufe Jehova bụ ihe kacha mkpa ná ndụ ndị ezinụlọ Josef. Josef na Meri mere ihe ahụ Chineke kwuru n’Iwu Mozis. Ha kụziiri ụmụ ha ihe ‘mgbe ha nọ ọdụ n’ụlọ ha na mgbe ha na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe ha dina ala nakwa mgbe ha biliri ọtọ.’ (Diuterọnọmi 6:6-9) E nwere ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Nazaret. O dokwara anya na Josef na-akpọ ezinụlọ ya aga efe Chineke n’ebe ahụ. E nwere mgbe e kwuru na Jizọs banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu “dị ka ọ na-emekarị n’ụbọchị izu ike.” (Luk 4:16) Josef na ndị ezinụlọ ya na-agakarịkwa n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem. Ịga ya na-atọkwa ha ụtọ.

  • Ụmụnne Jizọs, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, hà ruru mmadụ ole?

  • Gịnị bụ ọrụ Jizọs mụrụ? Gịnịkwa ka o kwo mụọ ya?

  • Olee ihe dị mkpa Josef kụziiri ezinụlọ ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya