Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MACH 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 20-21
“Onye Ọ Bụla nke Na-achọ Ịbụ Onye Ukwu n’Etiti Unu Aghaghị Ịbụ Onye Na-ejere Unu Ozi”
nwtsty ihe e ji kọwaa Matiu 20:3
Ọma Ahịa
Ụfọdụ ahịa na-adị n’okporo ámá dị ka nke a e sere n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị. Ọtụtụ mgbe, ndị na-ere ahịa na-akpọchi ngwá ahịa ha ụzọ, na-eme ka o siere ndị mmadụ ike ịgafe. Ụfọdụ ihe ndị mmadụ nwere ike ịzụta n’ahịa a bụ ngwá ụlọ, ite, arịa ndị na-ada oké ọnụ e ji glas mee, akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi. Ebe ihe ndị dị ka friji e ji echekwa nri na-adịghị n’oge ochie, ndị mmadụ na-aga ahịa kwa ụbọchị iji zụrụ ihe ndị dị ha mkpa. Onye gara ịzụ ahịa nwere ike ịnọ ebe ahụ nụ akụkọ dị iche iche n’ọnụ ndị na-ere ahịa na ndị ọzọ bịara ahịa. Ụmụaka na-anọkwa n’ahịa egwuri egwu, ndị na-achọ ọrụ na-anọkwa na ya eche ka a kpọọ ha ọrụ. Jizọs nọ n’ọma ahịa gwọọ ndị ọrịa, Pọl eziekwa ndị mmadụ ozi ọma n’ahịa. (Ọrụ 17:17) Ma, ihe Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ dị mpako na-eme n’ahịa dị iche. Ha na-aga ebe ahụ n’ihi na ha chọrọ ka ndị mmadụ hụ ha ma na-ekele ha.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 20:20, 21
nne ụmụ Zebedi: Ya bụ, nne ndịozi Jizọs abụọ bụ́ Jems na Jọn. Akwụkwọ Mak kwuru na ọ bụ Jems na Jọn gakwuuru Jizọs. O doro anya na ọ bụ ha rịọrọ arịrịọ ahụ, ma, ha si n’aka nne ha bụ́ Salomi rịọ Jizọs arịrịọ ahụ. Ọ ga-abụ na nne ha na nne Jizọs bụ nwanne.—Mat. 27:55, 56; Mak 15:40, 41; Jọn 19:25.
otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị: Ọnọdụ abụọ a bụcha ọkwá ukwu. Ma, a na-akwanyere onye nọ n’aka nri ùgwù karịa.—Ọma 110:1; Ọrụ 7:55, 56; Rom 8:34.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 20:26, 28
onye na-eje ozi: Ma ọ bụ “odibo.” Baịbụl na-ejikarị okwu Grik bụ́ di·aʹko·nos akọwa onye ike na-anaghị agwụ iji obi umeala ejere ndị ọzọ ozi. E jikwa ya kọwaa Kraịst (Rom 15:8), ndị ozi Kraịst (1 Kọr. 3:5-7; Kọl. 1:23), ndị ohu na-eje ozi (Fil. 1:1; 1 Tim. 3:8), ndị na-ejere mmadụ ozi n’ụlọ (Jọn 2:5, 9) nakwa ndị ọrụ gọọmenti (Rom 13:4).
ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi: Ma ọ bụ “ọ bụghị ka a gbaara ya odibo, kama ka ọ gbaa odibo.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 21:9
Biko, zọpụta: Na Grik, “Hosanna.” E si n’okwu Hibru pụtara “biko, zọpụta” nweta okwu a. N’amaokwu a, ọ bụ arịrịọ a na-arịọ Chineke maka nzọpụta ma ọ bụ mmeri; o nwekwara ike ịpụta “biko, mee amara zọpụta.” E mechakwara na-ekwu ya n’ekpere, jirikwa ya na-abụ abụ. Okwu a dịkwa n’Abụ Ọma 118:25, nke so n’abụ a na-abụkarị n’oge a na-eme ememme ngabiga. N’ihi ya, ndị mmadụ na-echetakarị okwu ndị a n’oge ememme ngabiga. Otu ụzọ Chineke si zaa arịrịọ a a rịọrọ ka a zọpụta Nwa Devid bụ ịkpọlite ya n’ọnwụ. Na Matiu 21:42, Jizọs n’onwe ya kwuru ihe e dere n’Abụ Ọma 118:22, 23, iji gosi na ọ bụ Mesaya ka ebe ahụ na-ekwu gbasara ya.
Nwa Devid: Okwu a na-egosi ezinụlọ e si mụta Jizọs, na-egosikwa na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.
MACH 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 22-23
“Na-erube Isi n’Iwu Abụọ Kachanụ”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 22:37
obi: Mgbe ọ bụla a na-ekwu banyere obi na-abụghị obi nkịtị, ọ na-apụtakarị ihe mmadụ bụ n’ime. Ma, e kwukọta obi, “mkpụrụ obi” na “uche,” ihe obi na-apụtazi na-abụ ọchịchọ mmadụ, na otú obi dị ya. N’ebe a, okwu atọ a (ya bụ, obi, mkpụrụ obi na uche) pụtara otu ihe. E ji ha mee ka a mata otú ọ dịruru ná mkpa mmadụ iji obi ya niile hụ Chineke n’anya.
mkpụrụ obi: Ma ọ bụ “Mmadụ.”
uche: Ya bụ, ọgụgụ isi. Mmadụ ga-ejirịrị ọgụgụ isi ya mata Chineke ma hụkwa ya n’anya. (Jọn 17:3; Rom 12:1) N’ebe okwu ndị a si na Diut. 6:5, ọ bụ okwu Hibru atọ a sụgharịrị ịbụ ‘obi, mkpụrụ obi, na ike’ dị ebe ahụ. Ma, n’akwụkwọ Matiu, e ji okwu Grik pụtara “uche” dochie “ike.” Ọ ga-abụ na e nwere ụfọdụ ihe mere e ji dee ya okwu dị iche iche. Nke mbụ bụ na ndị Hibru oge ochie enweghị otu okwu ha ji akọwa “uche.” Ọ na-esokarị n’ihe okwu Hibru maka “obi” pụtara. Ọ bụrụ na ọ bụghị uche nkịtị ka a na-ekwu okwu ya, ọ na-apụta ihe niile mmadụ bụ n’ime, dị ka, ihe mmadụ na-eche, mmetụta ọ na-enwe, àgwà ya na ihe ndị na-amasị ya. (Diut. 29:4; Ọma 26:2; 64:6; gụọ ihe ụfọdụ a kọwara banyere obi.) Ọ bụ ihe a mere o ji bụrụ na n’ebe ọ bụla a sụgharịrị okwu Hibru a ka ọ bụrụ “obi,” na Septuagint Grik a na-edekarị ya okwu Grik pụtara “uche.” (Jen. 8:21; 17:17; Ilu 2:10; Aịza. 14:13) Ihe ọzọ nwere ike ime ka Matiu dee okwu Grik maka “uche” n’amaokwu ahụ kama ide “ike” mgbe ọ na-ekwughachi ihe dị na Diut. 6:5, bụ na okwu Hibru a sụgharịrị “ike” nwekwara ike ịpụta ma ike ọkpụkpụ aka ma ike iche echiche mmadụ. Nke ọ bụla ọ bụ, otú ihe okwu Hibru na okwu Grik ndị ahụ pụtara si yie nwere ike inye aka mee ka anyị ghọta ihe mere ndị dere Matiu, Mak, Luk na Jọn edeghị kpọmkwem okwu dị na Diuterọnọmi.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 22:39
Nke abụọ: Na Mat. 22:37, e dere ihe Jizọs zara otu onye Farisii jụrụ ya ajụjụ. Ma mgbe ọ na-aza ya ajụjụ ya, ọ gwakwara ya gbasara iwu nke abụọ (Lev. 19:18), jiri ya na-eme ka a mata na iwu abụọ ahụ nwere njikọ, nakwa na ọ bụ na ha ka Iwu ahụ niile na akwụkwọ Ndị Amụma hiwere isi.—Mat. 22:40.
onye agbata obi: Okwu Grik a sụgharịrị “onye agbata obi” (na Grik, “onye nọ nso”) apụtaghị naanị onye ya na mmadụ bi nso. O nwere ike ịbụ onye ọ bụla ya na mmadụ na-emekọ ihe.—Luk 10:29-37; Rom 13:8-10.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 22:40
Iwu ahụ . . . Ndị Amụma: “Iwu ahụ” bụ ihe ndị e dere malite na Jenesis ruo Diuterọnọmi. “Ndị Amụma” bụ ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma, e kwukọta ha abụọ ọnụ, o nwere ike ịpụta ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Mat. 7:12; 22:40; Luk 16:16.
dabeere: Ihe okwu Grik e si sụgharịta ya pụtara bụ “dabeere n’ihe.” N’amaokwu a, ọ pụtara “ebe ihe hiwere isi.” Ihe Jizọs na-ekwu n’ebe a bụ na ọ bụghị naanị Iwu ahụ nke Iwu Iri ahụ dị n’ime ya, kama, na Akwụkwọ Nsọ Hibru niile hiwere isi n’ịhụnanya.—Rom 13:9.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 22:21
kwụọnụ Siza ihe Siza: Ọ bụ n’amaokwu a nakwa n’ebe ndị ọzọ a kọrọ akụkọ a na Mak 12:17 nakwa na Luk 20:25, bụ naanị ebe ndị Jizọs kwuru banyere eze ukwu Rom. Ihe ndị so ‘n’ihe Siza’ bụ ụgwọ ndị mmadụ na-akwụ ndị ọchịchị maka ihe ndị ha na-arụ n’obodo, nsọpụrụ a na-enye ha, na nrubeisi a na-enye ndị ọchịchị ndị ahụ.—Rom 13:1-7.
kwụọnụ Chineke ihe Chineke: Ihe ndị so na ya bụ mmadụ iji obi ya niile na-efe Chineke, na-ahụ ya n’anya ma na-erubekwara ya isi.—Mat. 4:10; 22:37, 38; Ọrụ 5:29; Rom 14:8.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 23:24
ndị na-azapụ anwụnta ma na-eloda kamel: Anwụnta so n’ihe kacha nta, kamel esoro n’ihe kacha ukwuu n’ime ihe ndị e kere eke na-adịghị ọcha n’anya ụmụ Izrel. (Lev. 11:4, 21-24) Jizọs ji ihe abụọ a mee ihe atụ magburu onwe ya mgbe o kwuru na ndị ndú okpukpe na-azapụ ihe dị ezigbo ntakịrị ka anwụnta ná mmanya ha, ka ọ ghara imerụ ha; ma leghara Iwu ndị dị ezigbo mkpa anya, bụ́ ihe e nwere ike iji tụnyere iloda ihe ha ka kamel.
MACH 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 24
“Nọrọnụ na Nche n’Oge Ikpeazụ A”
it-2- 279 ¶6
Ịhụnanya
Ịhụnanya nke Ndị Ka n’Ọnụ Ọgụgụ Ga-ajụkwa Oyi. Mgbe Jizọs Kraịst na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, ọ gwara ha na ịhụnanya (a·gaʹpe) nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị sịrị na ha kweere na Chineke ga-ajụ oyi. (Mat. 24:3, 12) Pọl onyeozi kwukwara na otu ihe a ga-eji amata oge ahụ dị oké egwu bụ na ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ ego n’anya.” (2 Tim 3:1, 2) Ọ bụ ihe ndị a mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịkpa àgwà ọma, ịhụnanya ha nweburu ejirikwa nke nta nke nta nyụọ ka ọkụ. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya. Ihe ga-enyere anyị aka ịmụtakwu ịhụnanya bụ ịtụgharị uche n’Okwu Chineke, na ikwe ka ọ kpụzie ndụ anyị ka ọ daba n’uche Chineke.—Efe. 4:15, 22-24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 24:8
ihe ụfụ nke nhụjuanya: Okwu Grik a na-ekwu banyere ahụ́ ụfụ nwaanyị na-amụ nwa na-enwe mgbe ọ na-amụ nwa. Ọ bụ eziokwu na n’ebe a, e ji ya na-akọwa ụdị ihe mgbu dị iche iche, dị ka nchekasị, ahụ́ mgbu, na ahụhụ, ma, o nwekwara ike ịbụ na ọ na-ekwu na nsogbu ndị a ga na-akakwu njọ n’oge ndị fọrọnụ tupu oké mkpagbu ahụ e kwuru okwu ya na Mat. 24:21, otú ahụ ọ na-eme nwaanyị ime na-eme.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 24:20
n’oge oyi: Oké mmiri ozuzo, idei mmiri, na oyi na-atụ mgbe ahụ ga-eme ka o sie ike ime njem, ịchọta ihe oriri na ebe obibi.—Ezra 10:9, 13.
n’ụbọchị izu ike: N’ebe ndị dị ka Juda, iwu ndị e nyere banyere Ụbọchị Izu Ike ga-eme ka o siere ndị mmadụ ike ime njem gaa ebe dị anya, ma ọ bụ ibu ibu dị arọ. Ihe ọzọ bụkwa na a na-emechi ọnụ ụzọ ámá obodo n’ụbọchị Izu Ike.—Gụọ Ọrụ 1:12 na sgd-IB isi nke 16A.