Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
EPREL 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 26
“Otú Ememme Ngabiga na Ncheta Ọnwụ Jizọs Si Yie na Otú Ha Si Dị Iche”
nwtsty ihe e ji kọwaa Matiu 26:17-20
Nri Ememme Ngabiga
Ihe ndị e ji eme Ememme Ngabiga bụ: nwa atụrụ a hụrụ n’ọkụ (agaghị agbaji ọkpụkpụ ya ọ bụla) (1); achịcha na-ekoghị eko (2); na akwụkwọ nri na-elu ilu (3). (Ọpụ. 12:5, 8; Ọnụ Ọgụ. 9:11) Akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah kwuru na akwụkwọ nri ndị ahụ na-elu ilu nwere ike ịbụ lettuce, chicory, pepperwort, endive na dandelion. Ha chetaara ndị Izrel ụdị ahụhụ ha tara mgbe ha na-agba ohu n’Ijipt. Jizọs kwuru na achịcha ahụ na-ekoghị eko nọchiri anya ahụ́ ya zuru okè. (Mat. 26:26) Na Baịbụl, Pọl onyeozi kpọrọ Jizọs “nwa atụrụ ememme ngabiga.” (1 Kọr. 5:7) N’oge Jizọs dị ndụ n’ụwa, ebidola iji mmanya (4) na-eme Ememme Ngabiga. Jizọs nyekwara ndịozi ya mmanya ma sị ha na ọ nọchiri anya ọbara ya nke a gaje ịwụpụ maka mgbaghara mmehie.—Mat. 26:27, 28.
nwtsty ihe a kọwara na Mat. 26:26
pụtara: Okwu Grik e dere ebe a bụ e·stinʹ (ọ pụtara, “bụ”). Ma n’amaokwu a, ọ pụtara “nọchiri anya.” Ọ ga-abụrịrị na ọ bụ otú a ka ndịozi Jizọs si ghọta ya, ebe ọ bụ na Jizọs nọ ebe ahụ, ahụ́ ya ezuokwa okè, achịcha ahụ ha ga-ata adịrịkwa ebe ahụ. N’ihi ya, achịcha ahụ enweghị otú ọ ga-esi bụrụ anụ ahụ́ Jizọs. Na Matiu 12:7, ebe otu okwu Grik a pụtakwara, ọtụtụ Baịbụl sụgharịrị ya “pụtara.”
nwtsty ihe a kọwara na Mat. 26:28
ọbara nke ọgbụgba ndụ: Ọ bụ àjà Jizọs chụrụ mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke Jehova na Ndị Kraịst e tere mmanụ gbara dị irè. (Hib. 8:10) Mozis bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. O kwukwara ihe a Jizọs kwuru mgbe ọ na-agwa ndị Izrel gbasara ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ụbọchị ha na Jehova gbara ndụ n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụ. 24:8; Hib. 9:19-21) Otú ahụ ọbara ụmụ oké ehi na ọbara ewu si mee ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ dị irè n’etiti Chineke na mba Izrel ka ọbara Jizọs sikwa mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Jehova na mba Izrel ime mmụọ gbara dị irè. Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè na Pentikọst afọ 33.—Hib. 9:14, 15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Mat. 26:17
N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko: Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko na-amalite na Naịsan 15, ya bụ, ụbọchị na-esote ụbọchị Ememme Ngabiga (Naịsan 14). A na-eme ya ụbọchị asaa. (Gụọ sgd isi nke 19.) Ma n’oge Jizọs, ndị mmadụ bịara were Ememme Ngabiga na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ka otu ememme. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, ha na-ewere ya na Naịsan 14 na abalị asaa na-eso ya bụcha oge Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. (Luk 22:1) N’amaokwu a, e nwere ike ịsụgharị “N’ụbọchị nke mbụ nke” ka ọ bụrụ “Tupu ụbọchị nke.” (Tụlee Jọn 1:15, 30, bụ́ ebe a sụgharịrị okwu Grik pụtara “mbụ” [proʹtos], ịbụ “tupu.” Ihe e dere ebe ahụ bụ, “ọ dị adị tupu [proʹtos] mụ onwe m.”) N’ihi ya, ma okwu Grik a ma omenala ndị Juu ga-enyere anyị aka ịghọta na ọ bụ na Naịsan 13 ka ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya ajụjụ ahụ. N’ehihie Naịsan 13, ndị na-eso ụzọ Jizọs kwadebere maka Ememme Ngabiga ahụ, nke ha na ya mechara mee “mgbe o ruru ná mgbede” ụbọchị ahụ bụ́ mmalite nke Naịsan 14.—Mak 14:16, 17.
nwtsty ihe a kọwara na Mat. 26:39
ka iko a gabiga m: Na Baịbụl, “iko” na-anọchikarị anya uche Chineke, ma ọ bụ “ọrụ dịịrị” mmadụ ịrụ. (Mat. 20:22) O doro anya na ihe mere Jizọs ji kwuo ka “iko” a gabiga ya bụ na ọ na-ewute ya na ọnwụ ya ga-eme ka a kọchaa Chineke, n’ihi ebubo a na-ebo ya na ọ na-ekwulu Chineke, na-agbakwa ọchịchị mgba okpuru.
EPREL 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 27-28
“Gaanụ Mee Ndị Mmadụ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ. N’ihi Gịnị, n’Ebee, Otú Ole?”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 28:19
mee . . . ndị na-eso ụzọ: E nwere ike ịsụgharị okwu Grik bụ ma·the·teuʹo ka ọ bụrụ “kụzie,” ya bụ, ịkụziri mmadụ ihe, buru n’obi ka ọ ghọọ nwa akwụkwọ ma ọ bụ onye na-eso ụzọ. (Tulee Mat. 13:52, ebe a sụgharịrị ya ịbụ “e ziri” ihe.) Okwu bụ́ ‘na-eme baptizim’ na “na-ezi” na-egosi ihe ndị so n’iwu ahụ bụ ‘mee ndị na-eso ụzọ.’
ndị mba niile: Na Grik ọ pụtara “mba niile,” ma, n’amaokwu a ihe o pụtara bụ ndị si ná mba niile. Ebe ọ bụ na okwu Grik a sụgharịrị “ha” n’okwu bụ́ na-eme ha baptizim na-ekwu gbasara ndị mmadụ n’otu n’otu, ọ bụghị “mba niile,” iwu a Jizọs nyere ka e zie “ndị mba niile” ozi ọma bụ iwu ọhụrụ. Akwụkwọ Nsọ gosiri na tupu Jizọs ebido ije ozi ya n’ụwa, ndị Izrel na-anabata ndị Jentaịl ma ha bịa ife Jehova n’ụlọ nsọ. (1 Eze 8:41-43) Ma, iwu a Jizọs nyeziri na-egosi na o chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya jiri ozi ọma ahụ gakwuru ndị na-abụghị ndị Juu. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs gaa mee ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ n’ebe niile n’ụwa.—Mat. 10:1, 5-7; Mkpu. 7:9; Mat. 24:14.
nwtsty ihe a kọwara na Mat. 28:20
Na-ezi ha: Okwu Grik a sụgharịrị “na-ezi ha” pụtakwara ịkụzi ihe, ịkọwa ihe na ikwu ihe otú ọ ga-edo anya ma gosikwa ihe àmà ga-akwado ihe a na-ekwu. (Gụọ ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 3:1; 4:23.) Ịkụziri ndị mmadụ ka ha debe ihe niile Jizọs nyere n’iwu abụghị ihe a ga-eme otu mgbe kwụsị. A ga na-akụziri ha ihe Jizọs kwuru, na-egosi ha otú ha ga-esi na-eme ya nakwa otú ha ga-esi na-eme ka Jizọs.—Jọn 13:17; Efe. 4:21; 1 Pita 2:21.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 27:51
ákwà mgbochi: Ọ bụ ákwà mara ezigbo mma e ji kewaa Ebe Kasị Nsọ na Ebe Nsọ n’ụlọ nsọ. Akụkọ ihe mere eme ndị Juu gosiri na ákwà mgbochi a na-anyị arụ, na-adịkwa ihe dị ka mịta iri na asatọ n’ogologo, mịta itoolu n’obosara, na ihe dị ka inch atọ n’ikputu. Jehova dọwara ákwà mgbochi ahụ abụọ iji gosi ọnụma ya megide ndị gburu nwa ya. O gosikwara na o megheela oghere ka e si n’ụwa gaa eluigwe.—Hib. 10:19, 20.
ebe nsọ: Okwu Grik bụ́ na·osʹ a sụgharịrị ebe nsọ n’amaokwu a pụtara ụlọ dị n’etiti ụlọ nsọ, nke Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ dị n’ime ya.
nwtsty ihe a kọwara na Mat. 28:7
kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya na e mewo ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie: Ọ bụghị naanị na ọ bụ ụmụ nwaanyị ndị a ka mmụọ ozi ahụ bu ụzọ gwa na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, kama, ọ bụkwa ha ka ọ gwara ka ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ banyere ya. (Mat. 28:2, 5, 7) Otu omenala ndị Juu Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, kwuru na a gaghị anabata nwaanyị ịgba akaebe n’ụlọikpe. Mmụọ ozi Jehova kwanyeere ụmụ nwaanyị ndị a ùgwù ma dunye ha ozi a na-eme obi ụtọ.
EPREL 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 1-2
“A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”
nwtsty ihe a kọwara na Mak 2:9
Olee nke ka mfe: Ọ ga-adị mfe mmadụ ịsị na ya nwere ike ịgbaghara mmehie, ebe ọ bụ na o nweghị ihe a na-ahụ anya ga-egosi na o nwere ike ime ya. Ma mgbe Jizọs sịrị nwoke ahụ, Bilie . . . gawa ije, ọ ga-arụrịrị ọrụ ebube iji gosi na ya nwere ikike ịgbaghara mmehie. Ihe amaokwu a kwuru na ihe e kwuru n’Aịzaya 33:24 gosiri na ọ bụ mmehie mere anyị ji na-arịa ọrịa.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 1:11
otu olu si n’eluigwe kwuo, sị: Ihe a bụ nke mbụ n’ime ebe atọ e dere na Jehova n’onwe ya si n’eluigwe gwa ndị mmadụ okwu n’akwụkwọ Mak na Jọn.—Mak 9:7; Jọn 12:28.
Ị bụ Ọkpara m: Mgbe Jizọs bụ mmụọ n’eluigwe, ọ bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 3:16) Mgbe a mụrụ ya n’ụwa, ọ bụ “nwa Chineke” otú ahụ Adam bụbu. (Luk 1:35; 3:38) O doro anya na Chineke chọrọ ka anyị mata ihe karịrị naanị onye Jizọs bụ n’amaokwu a. Ihe a o kwuru na mmụọ nsọ o mere ka ọ dakwasị ya gosiri na o jirila mmụọ nsọ ‘mụọ Jizọs ọzọ,’ nakwa na ọ ga-alaghachi n’eluigwe. O gosikwara na o jirila mmụọ nsọ họpụta ya ka ọ bụrụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà.—Tụlee Jọn 3:3-6; 6:51; Luk 1:31-33; Hib. 2:17; 5:1, 4-10; 7:1-3.
ihe gị masịrị m: Ma ọ bụ “ihe gị dị mụ mma.” Otu okwu a dịkwa na Mat. 12:18, ebe e kwughachiri ihe dị n’Aịzaya 42:1 gbasara Mesaya ahụ ma ọ bụ Kraịst. Mmụọ nsọ ahụ Chineke mere ka ọ dakwasị Jizọs na ihe a o kwuru gbasara Ọkpara ya mere ka o doo anya na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.—Mat. 3:17; 12:18.
nwtsty ihe a kọwara na Mak 2:28
Onyenwe ụbọchị izu ike: Jizọs na-ekwu gbasara onwe ya n’ebe a (Mat. 12:8; Luk 6:5), na-egosi na o nwere ikike ịrụ ọrụ Nna ya nke eluigwe nyere ya n’Ụbọchị Izu Ike. (Tụlee Jọn 5:19; 10:37, 38.) Ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike ka Jizọs rụrụ ọrụ ebube ya ụfọdụ dere ude dị ka ịgwọ ndị ọrịa. (Luk 13:10-13; Jọn 5:5-9; 9:1-14) N’eziokwu, ọrụ ebube ya ndị a gosiri na ọ ga-agwọ ọrịa dị iche iche n’Alaeze ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị anyị ka anyị na-ezu ike n’ụbọchị izu ike.—Hib. 10:1.
EPREL 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 3-4
“Ịgwọ Ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 3:5
n’iwe, o wutere ya nke ukwuu: Ọ bụ naanị Mak dere gbasara otú obi dị Jizọs mgbe ọ hụrụ na ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ ndị ihe na-adịghị emetụ n’obi. (Mat. 12:13; Luk 6:10) O nwere ike ịbụ Pita bụ́ nwoke na-ekwukarị otú obi dị ya kọọrọ Mak otú obi dị Jizọs mgbe ihe e kwuru n’amaokwu a na-eme.—Lee vidio “Ihe Akwụkwọ Mak Na-ekwu.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 3:29
na-ekwulu mmụọ nsọ: Nkwulu pụtara ikwu okwu ọjọọ, ikwutọ ma ọ bụ ikwu okwu mkparị gbasara Chineke ma ọ bụ ihe ndị dị nsọ. Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ na-esi n’aka Chineke, mmadụ ịkpachara anya na-emegide ya ma ọ bụ jụ ikweta n’ọrụ ọ na-arụ bụ ikwulu Chineke. Ihe a kọrọ na Mat. 12:24, 28 na Mak 3:22, gosiri na ndị ndú okpukpe ndị Juu hụrụ ka Jizọs ji ike mmụọ nsọ Chineke rụọ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, ma ha jụrụ ya, na-ekwu na ọ bụ ike Setan bụ́ Ekwensu ka Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ.
onye ikpe mmehie mara ruo mgbe ebighị ebi: Ọ ga-abụ na e ji okwu a na-akọwa mmehie a kpachaara anya mee nke Chineke na-agaghị agbaghara ruo mgbe ebighị ebi; o nweghị àjà a ga-achụ iji kwụọ ụgwọ mmehie a.—Gụọ ihe ụfọdụ a kọwara banyere na-ekwulu mmụọ nsọ n’amaokwu a na Mat. 12:31, bụ́ ebe ọzọ okwu a pụtara.
EPREL 30–MEE 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 5-6
“Jizọs Nwere Ikike Ịkpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ”
nwtsty ihe a kọwara na Mak 5:39
ọ nwụbeghị, kama ọ na-ehi ụra: Na Baịbụl, a na-ejikarị ọnwụ atụnyere ụra. (Ọma 13:3; Jọn 11:11-14; Ọrụ 7:60; 1 Kọr. 7:39; 15:51; 1 Tesa. 4:13) Ọ bụ mgbe Jizọs na-aga ịkpọlite nwata nwaanyị a n’ọnwụ ka o kwuru ihe a. Ọ nwere ike ịbụ na o kwuru ihe a iji gosi na e nwere ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọnwụ otú ahụ ndị mmadụ si akpọte onye nọ n’ụra. Jizọs nwetara ikike o ji kpọlite nwata nwaanyị ahụ n’aka Nna ya, “bụ́ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịghị adị dị ka à ga-asị na ha dị.”—Rom 4:17.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Mak 5:19
kọọkwara ha: Ọ na-abụ Jizọs gwọọ mmadụ, ya agwa onye ahụ ka ọ ghara ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ya (Mak 1:44; 3:12; 7:36), ma, ọ gwara nwoke a ka ọ kọọrọ ndị ikwu ya ihe merenụ. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji mee ya bụ na a gwala ya ka o si n’ógbè ahụ pụọ, n’ihi ya, ọ gaghịzi ekwusali ozi ọma n’ebe ahụ n’onwe ya. O nwekwara ike ịbụ ka o nye aka kụghasịa akụkọ ọjọọ ndị e nwere ike ịna-akọ banyere ya kemgbe ahụ ọrụ ebube ya mere ka ìgwè ézì nwụọ.
nwtsty ihe a kọwara na Mak 6:11
tichapụnụ ájá dị n’okpuru ụkwụ unu: Ime ihe a gosiri na Chineke agaghị ajụta ọbara ndị ahụ jụrụ ige ntị n’aka ndị na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na ọ bụzi Chineke ga-ekpe ha ikpe. E kwukwara ụdị ihe a na Matiu 10:14 na Luk 9:5. Mak tinyekwara okwu bụ́ “ka ọ bụrụ àmà nye ha,” Luk etinye “ka ọ bụrụ àmà megide ha” na nke ha. Pọl na Banabas mere ihe a n’Antiọk nke Pisidia (Ọrụ 13:51). Pọl mekwara ihe yiri ya na Kọrịnt mgbe o fechara uwe ya, kọwaakwa ihe ọ pụtara, sị: “Ka ọbara unu dị unu n’isi. Aka m dị ọcha.” (Ọrụ 18:6) Ọ ga-abụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ahụtụla ka ndị ọzọ na-eme ụdị ihe a. Ndị Juu na-eme nsọ nsọ gaa n’obodo ndị Jentaịl, ha na-etichapụ ájá dị n’akpụkpọ ụkwụ ha tupu ha abanyeghachi n’obodo ndị Juu, n’ihi na ha weere ya ka ihe rụrụ arụ. O doro anya na ihe a abụghị ihe Jizọs bụ n’obi nye ndị na-eso ụzọ ya iwu a.