Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JUN 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 15-16
“Jizọs Mezuru Amụma”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 15:24, 29
ha kekwara uwe elu ya: Jọn 19:23, 24 kwuru ihe ụfọdụ Matiu, Mak, na Luk na-ekwughị. O nwere ike ịbụ na ndị agha Rom fere nza iji mata onye ga-ewere ma uwe elu Jizọs ma uwe ime ya; ndị agha ahụ kere uwe elu ya “ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha”; ha achọghị ịdọwa uwe ime ya, n’ihi ya, ha fere nza iji mata onye ga-ewere ya. Nza ahụ ha fere maka uwe Mesaya mezuru amụma dị n’Abụ Ọma 22:18. N’oge ahụ, ndị agha na-achịrịkarị uwe ndị ha chọrọ igbu egbu, n’ihi ya, a na-eyipụ ndị omekome uwe ha, narakwa ha ihe niile ha nwere tupu e gbuo ha. Ha na-eme ihe ndị a iji menyekwuo ha ihere.
na-efufe isi: Ndị mmadụ na-ekwukarị okwu mgbe ha na-efufe isi. Ọ na-egosikarị mkparị, nleli ma ọ bụkwanụ ịkwa emo. Ndị ahụ na-agafe agafe mezuru amụma e buru n’Abụ Ọma 22:7 n’amaghị ama.
nwtsty ihe a kọwara na Mak 15:43
Josef: Otú Matiu, Mak, Luk na Jọn si kọọ ihe dị iche iche gbasara Josef gosiri ụdị mmadụ onye nke ọ bụla n’ime ha bụ. Matiu bụ́ onye ọnaụtụ kwuru na Josef “bara ọgaranya”; Mak bu ndị Rom n’obi dee nke ya. Ọ sịrị na Josef bụ “onye òtù Nzukọ . . . a na-akwanyere ùgwù,” onye na-echere Alaeze Chineke; Luk, bụ́ ọgwọ ọrịa ihe na-emetụ n’ahụ́, kwuru na Josef bụ “ezi mmadụ na nwoke ezi omume,” onye na-akwadoghị ihe ọjọọ òtù Nzukọ ndị Juu chọrọ ime Jizọs. Ọ bụ naanị Jọn kwuru na Josef bụ ‘onye na-eso ụzọ Jizọs na nzuzo n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu.’—Mat. 27:57-60; Mak 15:43-46; Luk 23:50-53; Jọn 19:38-42.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Mak 15:25
oge awa nke atọ: Ya bụ, ihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe a yiri ka ọ̀ dị iche n’ihe e kwuru na Jọn 19:14-16, ebe sịrị na “ọ bụ ihe dị ka awa nke isii” ka Paịlet nyefere Jizọs ka e gbuo ya. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl akọwachaghị ihe mere ebe abụọ a ji kwuo ihe dị iche iche, e nwere ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ichebara echiche. Ọtụtụ ihe Matiu, Mak, Luk na Jọn dere banyere oge ihe dị iche iche ji mee n’ụbọchị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa bụ otu. Ha anọ kwuru na ndị nchụàjà na ndị okenye zụkọtara mgbe chi bọrọ, mechazie kpụrụ Jizọs gawa na nke Gọvanọ Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet. (Mat. 27:1, 2; Mak 15:1; Luk 22:66–23:1; Jọn 18:28) Matiu, Mak, na Luk kwuru na mgbe a kpọgidechara Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ, ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile malite n’oge “awa nke isii ruo n’oge awa nke itoolu.” (Mat. 27:45, 46; Mak 15:33, 34; Luk 23:44) Otu ihe o nwere ike ịbụ ya mere Mak ji dee awa nke atọ, Jọn edee ihe dị ka awa nke isii gbasara mgbe e gburu Jizọs bụ oge e ji pịa ya ụtarị n’ihi na ụfodụ ndị weere ịpịa ụtarị ka ihe so n’ihe ha na-eme onye a na-egbu egbu. Mgbe ụfọtdụ, a na-apịagide onye ahụ ihe pịagbuo ya. Na nke Jizọs, a pịagidere ya ihe ruo mgbe ike gwụchara ya nke na a kpọtara nwoke ọzọ ka o butere ya osisi ịta ahụhụ ya. (Luk 23:26; Jọn 19:17) Ọ bụrụ na e weere ya na ịpịa ụtarị bụ ihe mbụ a na-eme onye a chọrọ igbu egbu, ọ pụtara na oge ụfọdụ gafere tupu a kpọgide Jizọs n’osisi ịta ahụhụ. Iji kwadoo ihe a, Matiu 27:26 na Mak 15:15 kwuru na a pịara Jizọs ihe tupu a kpọgide ya n’osisi. Ihe a gosiri na ndị mmadụ nwere ike ikwu oge dị iche iche e ji gbuo Jizọs n’ihi ihe ha chere gbasara mgbe a malitere igbu ya. Ọ ga-abụ ihe a mere o ji ju Paịlet anya mgbe ọ nụrụ na Jizọs nwụrụ obere oge a kpọgidechara ya n’osisi. (Mak 15:44) Ihe ọzọkwa bụ na ndị so dee Baịbụl na-ekewakarị oge dị n’ụbọchị ụzọ anọ, awa atọ ụzọ anọ, otú ahụ ha sikwa ekewa abalị. Ọ bụ ikewa ụbọchị otú a mere e ji na-ekwukarị banyere awa nke atọ, nke isii, na nke itoolu, ma e si n’oge anyanwụ wara n’ihe dị ka elekere isii nke ụtụtụ gụwa ya. (Mat. 20:1-5; Jọn 4:6; Ọrụ 2:15; 3:1; 10:3, 9, 30) Elekere e ji agụ oge adịghị n’oge ahụ, n’ihi ya, ha na-etinyekarị “ihe dị ka” n’oge ha chọrọ ịkpọ aha, otú ahụ ọ dị na Jọn 19:14. (Mat. 27:46; Luk 23:44; Jọn 4:6; Ọrụ 10:3, 9) Ná nchịkọta, ọ ga-abụ na oge Mak dere e ji gbuo Jizọs bụ oge a malitere ịpịa ya ihe, ma Jọn dere naanị oge a kpọgidere ya n’osisi ịta ahụhụ. Ọ ga-abụ na Mak na Jọn ji otú ahụ ndị oge ahụ si ekewa oge dị n’ụbọchị ụzọ anọ, awa atọ atọ na-akọwa oge e gburu Jizọs, ma, Jọn tinyere okwu bụ́ “ihe dị ka” mgbe ọ na-ekwu nke ya. O nwere ike ịbụ ihe ndị a mere o ji yie ka oge Mak na Jọn kwuru ọ̀ dị iche. Ihe ọzọ anyị ga-aghọta n’ihe a merenụ bụ na ebe ọ bụ na Jọn dere ihe dị iche n’ihe Mak dere mgbe ọtụtụ afọ gachara, o lereghị anya n’ihe Mak dere dee nke ya.
nwtsty ihe a kọwara na Mak 16:8
n’ihi na egwu na-atụ ha: Ebe ngwụcha akwụkwọ Mak n’akwụkwọ ndị kacha ochie e ji dee Baịbụl gosiri na akwụkwọ Mak kwụsịrị na Mak 16:8. Ụfọdụ ndị na-ekwu na akwụkwọ Baịbụl a kwụsịrị n’ike, n’ihi ya, o yighị ka ọ̀ bụ otú Akwụkwọ Mak mbụ mbụ si kwụsị. Ma, isi otú a lee ya anya achịtaghị ájá n’ihi na otú Mak si ede ihe gosiri na ọ bụghị onye ogologo akụkọ. Jerom na Yusebiọs, bụ́ ndị ọkà mmụta dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga kwuru na ihe e ji mechie ebe ngwụcha akwụkwọ Mak n’akwụkwọ ndị kacha ochie e ji dee Baịbụl bụ “n’ihi na egwu na-atụ ha.”
E nwere akwụkwọ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie n’asụsụ Grik nakwa akwụkwọ ndị a sụgharịrị n’asụsụ ọzọ tinyere mmechi dị ogologo ma ọ bụ mmechi dị mkpirikpi ná ngwụcha amaokwu nke asato. Mmechi dị ogologo (nke nwere amaokwu iri na abụọ ndị ọzọ) dị n’akwụkwọ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie a kpọrọ Codex Alexandrinus, Codex Ephraemi Syri rescriptus, na Codex Bezae Cantabrigiensis. E dere akwụkwọ ndị a ihe dị ka otu puku na narị afọ ise gara aga. Mmechi dị ọgologo dịkwa na Baịbụl Latin Vulgate, Curetonian Syriac, na Syriac Peshitta. Ma, ọ dịghị n’akwụkwọ abụọ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie n’asụsụ Grik, ya bụ, Codex Sinaiticus na Codex Vaticanus, bụ́ ndị e dere n’ihe dị ka otu puku na narị afọ isii gara aga. Ha adịghịkwa na Codex Sinaiticus Syriacus e dere n’ihe dị ka otu puku na narị afọ ise ma ọ bụ narị isii gara aga, ọ dịghịkwa n’akwụkwọ mbụ e ji dee Baịbụl n’asụsụ Sahidic nke ndị Copt nke akwụkwọ Mak e dere n’ihe dị ka otu puku na narị afọ ise gara aga. A chọpụtakwara na akwụkwọ kacha ochie e ji dee akwụkwọ Mak n’asụsụ Amenia na Jọjia kwụsịkwara n’amaokwu nke asatọ.
E nwere akwụkwọ ndị e ji dee Baịbụl n’asụsụ Grik nakwa akwụkwọ ndị a sụgharịrị n’asụsụ ndị ọzọ nwere mmechi dị mkpirikpi (naanị ahịrịokwu ole na ole). Akwụkwọ Codex Regius nke e dere n’ihe dị ka otu puku na narị afọ abụọ gara aga nwere mmechi abụọ a, ma ha bu ụzọ dee mmechi nke dị mkpirikpi. Tupu mmechi nke ọ bụla, ha dere na ụfọdụ ndị ọkachamara nọ n’oge ahụ kwetara na mmechi ndị a kwesịrị ịdị ya. Ma ndị sụgharịrị Codex Regius kwuru na o nweghị nke ọ bụla n’ime ha e ji n’aka na ọ dị na Baịbụl mbụ.
MMECHI DỊ MKPIRIKPI
Mmechi dị mkpirikpi e dere ná ngwụcha Mak 16:8 esoghị n’Akwụkwọ Nsọ nke e ji ike mmụọ nsọ dee. Ihe e dere ebe ahụ sịrị:
Ma ha kọọrọ ndị nọ Pita gburugburu ihe niile e nyere n’iwu ná nkenke. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jizọs zipụrụ ha ka ha gaa zisaa ozi banyere nzọpụta ebighị ebi, nke dị nsọ, nke a na-apụghịkwa ibibi ebibi, site n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ.
MMECHI DỊ OGOLOGO
Mmechi dị ogologo e dere ná ngwụcha Mak 16:8 esoghị n’Akwụkwọ Nsọ nke e ji ike mmụọ nsọ dee. Ihe e dere ebe ahụ sịrị:
JUN 11-17
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 1:69
mpi nzọpụta: Ma ọ bụ “onye nzọpụta dị ike.” Na Baịbụl, mpi anụmanụ na-anọchikarị anya ike ma ọ bụ mmeri. (1 Sam. 2:1; Ọma 75:4, 5, 10; 148:14.) Mpi na-anọchikwa anya ndị na-achị achị na ndị eze, ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume. A na-ejikwa mmeri ha meriri atụnyere ịsọ mpi. (Diut. 33:17; Dan. 7:24; 8:2-10, 20-24) N’amaokwu a, ọ bụ Mesaya bụ “mpi nzọpụta” ahụ, n’ihi na ọ bụ onye nzọpụta dị ike, nke nwere ike ịzọ mmadụ ndụ.
nwtsty ihe a kọwara na Luk 1:76
ị ga-ebute ụzọ gaa n’ihu Jehova: Jọn Onye Na-eme Baptizim “ga-ebute ụzọ gaa n’ihu Jehova” n’ihi na ọ bụ ya ga-akwadebere Jizọs ụzọ, bụ́ onye ga-abịa n’aha Nna ya ma nọchite anya ya.—Jọn 5:43; 8:29.
JUN 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 2-3
“Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-agba Mbọ Ka Unu na Jehova Na-adịkwu ná Mma?”
nwtsty ihe a kọwara na Luk 2:41
ndị mụrụ ya na-agakarị: Iwu Mozis ekwughị na ụmụ nwaanyị ga-agarịrị Ememme Ngabiga. Ma, Meri na-eso Josef na-aga Jeruselem kwa afọ maka ememme ahụ. (Ọpụ. 23:17; 34:23) Kwa afọ, ha na-akpọrọ ụmụ ha niile na-eme njem a fọrọ obere ka o ruo narị kilomita atọ, ma ọgịga ma ọlịla.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 2:46, 47
na-ajụ ha ajụjụ: Ihe ndị ahụ nọ na-ege Jizọs ntị mere gosiri na ajụjụ ọ nọ na-ajụ ha abụghị ajụjụ obere nwa na-ajụ iji mata ihe. (Luk 2:47) Okwu Grik a sụgharịrị “na-ajụ . . . ajụjụ” nwere ike ịpụta n’ebe ụfọdụ ụdị ịgba ajụjụ a na-agba mmadụ n’ụlọ ikpe. (Mat. 27:11; Mak 14:60, 61; 15:2, 4; Ọrụ 5:27) Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ụfọdụ ndị isi ndị ndú okpukpe na-anọrọ n’ụlọ nsọ ma e mechaa ememme, na-akụziri ndị mmadụ ihe n’otu n’ime ụzọ mbata sara mbara dị n’ụlọ nsọ ahụ. Ndị mmadụ nwere ike ịnọdụ ala n’akụkụ ụkwụ ha na-ege ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.
nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya: Okwu Grik a sụgharịrị ‘juru anya’ n’ebe a nwere ike ịpụta ihe ịnọ na-eri mmadụ ọnụ.
nwtsty ihe a kọwara na Luk 2:51, 52
nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru: Ma ọ bụ “nọgide n’okpuru ha; nọgide na-erube isi.” Okwu Grik a gosiri na n’agbanyeghị na otú Jizọs si mara Okwu Chineke nke ọma juru ndị ahụ na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ anya, Jizọs sooro ndị mụrụ ya laa ma nọgide na-edo onwe ya n’okpuru ha. Ụdị nrubeisi a karịrị nke nwatakịrị ọ bụla ọzọ; o so n’ihe ndị o mere iji debe ihe niile Iwu Mozis kwuru.—Ọpụ. 20:12; Gal. 4:4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 2:14
ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara: E nwere ike ịsụgharị otú e si dee okwu a n’ụfọdụ akwụkwọ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie ka ọ bụrụ “ka udo dịkwa n’elu ụwa, ka e meere ụmụ mmadụ amara.” Ma otú Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si sụgharịa ya dabara adaba n’ihi na e nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie kwadoro ya. Ihe mmụọ ozi a na-ekwu abụghị na a ga-emere ụmụ mmadụ niile amara n’agbanyeghị otú àgwà ha dị. Kama, ọ na-ekwu banyere ndị Chineke ga-emere amara n’ihi na ha nwere okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ, bụrụkwa ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya.—Gụọ ihe a kọwara gbasara ndị Chineke meere amara n’amaokwu a.
ndị Chineke meere amara: E nwere ike ịsụgharị okwu Grik bụ́ eu·do·kiʹa ka ọ bụrụ “nwere ihu ọma, nabatara, mmasị.” Okwu Grik ọzọ ya na ya yiri bụ́ eu·do·keʹo pụtara na Mat. 3:17; Mak 1:11; nakwa na Luk 3:22 (gụọ ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 3:17; Mak 1:11), ebe Chineke na-agwa Ọkpara ya okwu mgbe o mechara baptizim. Ihe ọ pụtara n’ebe ndị ahụ bụ “ihe gị masịrị m; eji m gị kpọrọ ihe; eji m gị eme ọnụ.” N’ihi ya, okwu bụ́ “ndị Chineke meere amara” (an·throʹpois eu·do·kiʹas) na-ekwu gbasara ndị ihe ha masịrị Chineke. E nwekwara ike ịsụgharị ya “ndị Chineke nabatara; ndị ihe ha na-amasị ya.” Ihe mmụọ ozi a na-ekwu abụghị na Chineke ga-emere ụmụ mmadụ niile amara, kama, ọ na-ekwu na ndị Chineke ga-emere amara bụ ndị nwere okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ, ma ghọọkwa ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, okwu Grik ahụ bụ́ eu·do·kiʹa nwekwara ike ịpụta mmadụ imere ibe ya amara (Rom 10:1; Fil. 1:15), ma, ọtụtụ mgbe a na-eji ya ekwu gbasara amara Chineke, ma ọ bụ ihe dị ya ụtọ, ma ọ bụkwanụ ụzọ ọ kwadoro (Mat. 11:26; Luk 10:21; Efe. 1:5, 9; Fil. 2:13; 2 Tesa. 1:11). Na Septuagint, n’Abụ Ọma 51:18 [50:20, LXX], ọ pụtakwara “amara” nke Chineke.
JUN 25–JULAỊ 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 4-5
“Na-emeri Ọnwụnwa Ka Jizọs”
nwtsty ihe e ji kọwaa Luk 4:9
N’Elu Ihe A Rụbichiri na Mgbidi Ụlọ Nsọ
O nwere ike ịbụ na Setan mere ka Jizọs guzoro “n’elu ihe a rụbichiri [ma ọ bụ ebe “kacha dị elu”] na mgbidi ụlọ nsọ” ma gwa ya ka o si ebe ahụ wụtuo. Ọ dịghị onye maara kpọmkwem ebe ahụ Jizọs guzo. Ebe ọ bụ na okwu a sụgharịrị ịbụ “ụlọ nsọ” n’amaokwu a nwere ike ịpụta ụlọ nsọ ahụ niile, ọ ga-abụ na ebe Jizọs kwụ bụ n’ebe a e dere (1) na vidio e ji kọwaa Luk 4:9, nke gosiri otú ụlọ nsọ ahụ dị. O doro anya na ọ bụrụ na Jizọs esi n’elu nke ọ bụla n’ime ebe ndị a wụtuo, ọ ga-anwụ ozugbo, ọ gwụkwala ma Jehova ò chebere ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 4:17
akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaya onye amụma: Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịzaya nwere ibé iri na asaa a dụkọtara ọnụ, ha niile dị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mịta asaa na ọkara n’ogologo, nweekwa nkebi iri ise na anọ. O nwere ike ịbụ na akwụkwọ mpịakọta a na-agụ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret hakwa otú a n’ogologo. Ebe ọ bụ na akwụkwọ mpịakọta enweghị isiakwụkwọ na amaokwu n’oge ahụ, Jizọs chọrọ ebe ọ ga-agụ achọ tupu ya enweta ya. Ma, ebe ọ bụ na ọ chọtara ebe e dere amụma ndị ahụ, o gosiri na ọ ma Okwu Chineke nke ọma.
nwtsty ihe a kọwara na Luk 4:25
ruo afọ atọ na ọnwa isii: Ná 1 Ndị Eze 18:1, Ịlaịja kwuru na oké ọkọchị ahụ ga-agwụ “n’afọ nke atọ.” Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe Jizọs kwuru megidere ihe a Ịlaịja kwuru ná Ndị Eze nke Mbụ. Ma, ihe Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ekwu abụghị na oké ọkọchị ahụ erughị afọ atọ. Okwu bụ́ “n’afọ nke atọ” gosiri na oké ọkọchị ahụ malitere n’oge ahụ Ịlaịja gwara Ehab na a ga-enwe oké ọkọchị. (1 Eze 17:1) O yikarịrị ka ọ̀ bụ n’oge ọkọchị ka ọ gwara Ehab ihe ahụ. Ọkọchị ha na-eru ọnwa isii, ma ọ ga-abụ na ọkọchị nke afọ ahụ nọfere otú ahụ. Ihe ọzọ bụ na ọkọchị ahụ akwụsịghị ozugbo ahụ Ịlaịja gara hụ Ehab ọzọ “n’afọ nke atọ,” kama, ọ kwụsịrị mgbe Ịlaịja na ndị amụma Bel machara aka n’Ugwu Kamel. (1 Eze 18:18-45) N’ihi ya, ihe Jizọs kwuru banyere oge ihe a mere n’amaokwu a nakwa ihe yiri ya Jems nwanne ya nwoke kwuru na Jems 5:17, dabara n’ihe e kwuru ná 1 Ndị Eze 18:1.