Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
EPREL 22–28
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1197-1198
Ereghị Ure
Ọ bụghị naanị na a ga-akpọlite ndị ga-eso Jizọs chịa otú ahụ a kpọlitere Jizọs, ha abụrụ ndị mmụọ ga-adị ndụ ebighị ebi, kama, ha ga-adị ndụ anwụghị anwụ na ereghị ure. Ebe ọ bụ na ha ejirila ndụ ha jeere Chineke ozi ma rubere ya isi ruo mgbe ha nwụrụ, a ga-akpọlite ha, ha enwee ahụ́ mmụọ na-anaghị ere ure, dị ka Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:42-54. Na ha ga-adị ndụ anwụghị anwụ pụtara na ndụ ha enweghị ọgwụgwụ. A gaghị ebibili ya ebibi. Ahụ́ na-anaghị ere ure ha ga-enweta pụtara na Chineke ga-enye ha ụdị ahụ́ na-enweghị ike imebi emebi ma ọ bụ laa n’iyi. E nwekwara ike ikwu na Chineke ga-enye ha ikike ịdịrị ndụ na-aga n’onwe ha, n’achọghị enyemaka ọ bụla. Ha agaghị adị ka ihe ndị ọzọ Chineke na-enye ndụ. Ihe a gosiri na Chineke tụkwasịrị ha obi n’ụzọ pụrụ iche. Onyinye a Chineke ga-enye ha apụtaghị na ha ga na-emezi ihe masịrị ha. Kama, ha ka ga na-erubere Chineke isi otú ahụ Onyeisi ha bụ́ Jizọs ka na-erubekwara Nna ha bụ́ Jehova isi.—1 Kọr. 15:23-28.
EPREL 29–MEE 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ KỌRỊNT 1-3
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w16.04 32
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị bụ “ihe àmà” na “akara” Chineke na-enye Ndị Kraịst e tere mmanụ?—2 Kọr. 1:21, 22.
▪ Ihe Àmà: Otu akwụkwọ kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “ihe àmà” ná 2 Ndị Kọrịnt 1:22 bụ okwu a na-ekwukarị “n’ikpe nakwa n’azụmahịa.” Ọ na-apụtakarị “ụgwọ a kwụnyere maka ihe iji gosi na a ga-azụ ihe ahụ nakwa na o kwesịghị ka e resi ya onye ọzọ ebe ọ bụ na a kwụnyela ụgwọ maka ihe ahụ.” 2 Ndị Kọrịnt 5:1-5 mere ka anyị mata na ụgwọ zuru ezu ma ọ bụ ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ndị e tere mmanụ bụ inye ha ahụ́ na-agaghị ere ure n’eluigwe. Ndụ anwụghị anwụ Chineke ga-enye ha sokwa n’ụgwọ ọrụ ahụ.—1 Kọr. 15:48-54.
Na Grik a na-asụ taa, e nwere okwu yiri ya a na-ejikarị ekwu banyere mgbaaka e ji ekwe nkwa ọlụlụ. Ọ dabakwara adaba iji ya kọwaa nkwa e kwere ndị ga-eso bụrụ nwunye ihe atụ Kraịst ga-alụ.—2 Kọr. 11:2; Mkpu. 21:2, 9.
▪ Akara: N’oge gara aga, a na-aka ihe akara iji gosi onye nwe ya, iji gosi na ihe bụ eziokwu ma ọ bụkwanụ na e nwere nkwekọrịta. A bịa ná ndị e tere mmanụ, “akara” Chineke ji mmụọ nsọ ya kaa ha gosiri na ha bụzi nke ya. (Efe. 1:13, 14) Ma, e nwere ike iwepụ akara ahụ. Mana, mgbe a ga-eme ka ọ dịgide bụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka onye e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi nwụọ ma ọ bụkwanụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka oké mkpagbu malite.—Efe. 4:30; Mkpu. 7:2-4.