Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
SEPTEMBA 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 7-8
“Onye Nchụàjà Dị Ka Melkizedek Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
it-2 366
Melkizedek
Melkizedek bụ eze Selem oge ochie, bụrụkwa “onye nchụàjà nke Jehova Chineke bụ́ Onye Kasị Elu.” (Jen. 14:18, 22) Ọ bụ ya bụ onye mbụ Baịbụl kwuru na ọ bụ onye nchụàjà. Ọ bụ onye nchụàjà tupu afọ 1933 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ebe Melkizedek bụ eze Selem, nke pụtara “Udo,” Pọl onyeozi kpọrọ ya “Eze Udo,” kpọọkwa ya “Eze nke Ezi Omume,” n’ihi aha ya. (Hib. 7:1, 2) E kwuru na ọ bụ na Selem oge ochie ka e si nweta obodo Jeruselem. Ọ bụkwa na Selem ka e si nweta aha ahụ bụ́ Jeruselem, nke a na-akpọ “Selem” mgbe ụfọdụ.—Ọma 76:2.
Mgbe Ebram (ya bụ, Ebreham) merichara Kedọlaoma na ndị eze so ya, ọ gbadatara na Ndagwurugwu Sheve ma ọ bụ “Ndagwurugwu eze.” Mgbe o ruru ebe ahụ, Melkizedek wepụtara “achịcha na mmanya” ma gọzie Ebreham, sị: “Ka Chineke bụ́ Onye Kasị Elu, Onye kere eluigwe na ụwa, gọzie Ebram; ka Chineke bụ́ Onye Kasị Elu bụrụkwa onye a gọziri agọzi, bụ́ onye nyefere ndị na-emegbu gị n’aka gị!” Mgbe ọ gọzichara Ebreham, Ebreham nyere ya “otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile,” ya bụ, “ihe ndị kasị mma a kwatara n’agha” n’aka ndị eze ahụ o busoro agha.—Jen. 14:17-20; Hib. 7:4.
it-2 367 ¶4
Melkizedek
Olee otú o si bụrụ na Melkizedek enweghị ‘ụbọchị ọ malitere ma ọ bụ oge ndụ ya gwụrụ’?
Pọl kwuru otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ gbasara Melkizedek. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ onye na-enweghị nna, onye na-enweghị nne, onye na-enweghị usoro ọmụmụ, bụrụkwa onye na-enweghị ụbọchị ọ malitere ma ọ bụ oge ndụ ya gwụrụ, ma ebe e mere ka ọ dị ka Ọkpara Chineke, ọ bụ onye nchụàjà mgbe niile.” (Hib. 7:3) A mụrụ Melkizedek otú e si mụọ ndị ọzọ, ya emechaakwa nwụọ. Ma, a maghị aha nne na nna ya, e kwughịkwa ihe ọ bụla gbasara usoro ọmụmụ ya ma ọ bụ ụmụ ya, Baịbụl ekwughịkwa ihe ọ bụla gbasara ụbọchị ọ malitere ma ọ bụ oge ndụ ya gwụrụ. N’ihi ya, ọ dabara adaba iji Melkizedek tụnyere Jizọs Kraịst, bụ́ onye ga-abụ onye nchụàjà mgbe niile. O nweghị onye ọ bụla e kwuru na ọ bụ ya bu Melkizedek ụzọ bụrụ onye nchụàjà, o nweghịkwa onye nọchiri ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jizọs. O nweghị onye dị ka ya bu ya ụzọ bụrụ onye nchụàjà. Baịbụl kwukwara na o nweghị onye ga-anọchi ya. Ihe ọzọkwa bụ na n’agbanyeghị na a mụrụ Jizọs n’ebo Juda, n’ezinụlọ Eze Devid, e nweghị ihe gbasara ezinụlọ a mụrụ ya na ọbụbụ ọ bụ onye nchụàjà, ọ bụghịkwa n’ihi ezinụlọ a mụrụ ya mere o ji bụrụ eze na onye nchụàjà. Ihe mere o ji bụrụ ya bụ n’ihi na Jehova ṅụụrụ ya iyi na ọ ga-abụ ya.
it-2 366
Melkizedek
Kraịst Ga-abụ Onye Nchụàjà Dị Ka Melkizedek. N’otu n’ime amụma ndị bụ́ isi e buru banyere Mesaya, Jehova ṅụụrụ “Onyenwe” Devid iyi, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi!” (Ọma 110:1, 4) Amụma a e si n’ike mmụọ nsọ buo banyere Mesaya mere ka Ndị Hibru mata na onye ga-abụ Mesaya ga-abụ ma eze ma onye nchụàjà. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Hibru, o mere ka obi sie ha ike na onye ahụ e buru n’amụma bụ “Jizọs, onye ghọworo nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.”—Hib. 6:20; 5:10.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 523 ¶5
Ọgbụgba Ndụ
Olee otú ọgbụgba ndụ Iwu ahụ si bụrụ “ihe oge ya gafeworo”?
Ma, e nwere ike ikwu na ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ghọrọ “ihe oge ya gafeworo” mgbe Chineke si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaya kwuo na a ga-enwe ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Jere. 31:31-34; Hib. 8:13) N’afọ 33, ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ kagburu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ (Kọl. 2:14), ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ anọchie ya.—Hib. 7:12; 9:15; Ọrụ 2:1-4.
SEPTEMBA 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 9-10
“Onyinyo nke Ihe Ọma Ndị Gaje Ịbịa”
it-1 862 ¶1
Mgbaghara
N’iwu Chineke nyere ụmụ Izrel banyere ịgbaghara onye mejọrọ Chineke ma ọ bụ mmadụ ibe ya, onye ahụ ga-eme ihe Iwu ahụ kwuru iji mezie ihe o mejọrọ. Ọtụtụ mgbe, onye ahụ ga-ejikwa ọbara chụọrọ Jehova àjà. (Lev. 5:5–6:7) Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Ee, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji ọbara eme ka ihe niile dị ọcha dị ka Iwu ahụ si dị, ọ gwụla ma à wụsịrị ọbara, a gaghị enwe mgbaghara ọ bụla.” (Hib. 9:22) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọbara ụmụ anụmanụ enweghị ike iwepụ mmehie mmadụ ma mee ka o nwee akọnuche dị nnọọ ọcha. (Hib. 10:1-4; 9:9, 13, 14) Ma, iwu ọhụrụ ahụ e buru n’amụma mere ka o kwe omume ịgbaghara mmehie kpamkpam n’ihi àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. (Jere. 31:33, 34; Mat. 26:28; 1 Kọr. 11:25; Efe. 1:7) Ọbụna mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji ọgwụgwọ ọ gwọrọ otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ gosi na ya nwere ikike ịgbaghara mmehie.—Mat. 9:2-7.
it-2 602-603
Izu Okè
Imezu Iwu Mozis. Ihe ndị so n’Iwu Chineke si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel bụ na a ga na-enwe ndị nchụàjà, nakwa na a ga na-achụ ụmụ anụmanụ n’àjà. Ọ bụ eziokwu na Iwu ahụ si n’aka Chineke, zuokwa okè, Pọl onyeozi gosiri na ma Iwu ahụ ma ndị nchụàjà ya emelighị ka ndị nọ n’okpuru ya zuo okè. (Hib. 7:11, 19; 10:1) Kama Iwu ahụ ime ka ndị nọ n’okpuru ya nwere onwe ha n’aka mmehie na ọnwụ, o mere ka mmehie pụtakwuo ìhè. (Rom 3:20; 7:7-13) Ndokwa ndị a niile Chineke mere rụzuru ihe Chineke chọrọ ka ha rụzuo; Iwu ahụ rụrụ ọrụ dị ka “onye nduzi” nke duuru ndi mmadụ gakwuru Kraịst, si otú ahụ ghọọ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Gal. 3:19-25; Hib. 10:1) Ma, mgbe Pol na-ekwu gbasara “ihe Iwu ahụ na-apụghị ime, ebe o sitere n’anụ ahụ́” (Rom 8:3), o nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ na nnukwu onye nchụàjà bụ́ onye Juu (onye a họpụtara n’okpuru Iwu ahụ ka ọ na-ahụ gbasara àjà ndị a na-achụ, onye na-ejikwa ọbara e ji chụọ àjà abanye n’Ebe Kasị Nsọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie) enweghị ike “ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu” dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 7:11, 18-28. Ọ bụ eziokwu na àjà ụmụ Erọn na-achụ ziri ezi n’anya Chineke, ma o meghị ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha ná mmehie. Ọ bụ ihe a ka Pọl na-ekwu mgbe o kwuru na àjà mkpuchi mmehie ndị a na-achụ enweghị ike “ime ka ndị na-abịaru nso zuo okè,” ya bụ, ime ka ha nwee akọnuche zuru okè. (Hib. 10:1-4; tụlee Hib. 9:9) Nnukwu onye nchụàjà ahụ enweghị ike inye ihe mgbapụta ga-eme ka ndị nọ n’okpuru Iwu ahụ nwere onwe ha kpamkpam ná mmehie. Ọ bụ naanị ọrụ nchụàjà Jizọs na-arụ na àjà ọ chụrụ ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha ná mmehie.—Hib. 9:14; 10:12-22.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 249-250
Baptizim
Luk kwuru na Jizọs nọ na-ekpe ekpere mgbe e mere ya baptizim. (Luk 3:21) Ihe ọzọkwa bụ na onye dere Ndị Hibru kwuru na mgbe Jizọs “bịara n’ụwa” (ya bụ, n’oge ahụ ọ gara ka e mee ya baptizim, ya ebidozie ozi ya. Ọ bụghị mgbe a mụrụ ya ọhụrụ ọ na-enweghị ike ịgụ ma ọ bụ ikwu ihe ndị ahụ o kwuru n’ekpere ahụ) o kwuru ihe dị n’Abụ Ọma 40:6-8, sị (LXX): “Ị chọghị àjà na onyinye, kama ị kwadebeere m ahụ́. . . . Lee! Abịawo m ime uche gị, Chineke, (e dere ihe banyere m n’akwụkwọ mpịakọta).” (Hib. 10:5-9) Jizọs si n’ọmụmụ bụrụ onye Juu, bụ́ mba ha na Chineke gbara ọgbụgba ndụ, ya bụ, ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ọpụ. 19:5-8; Gal. 4:4) N’ihi ya, Jizọs na Chineke agbaala ndụ tupu ya abịa ka Jọn mee ya baptizim. Ihe Jizọs na-eme n’oge ahụ karịrị ihe Iwu ahụ chọrọ n’aka ya. Ọ nọ na-eche onwe ya n’ihu Nna ya Jehova ime “uche” Nna ya iji gosi na ya ga-eji ahụ́ ya a ‘kwadebere’ chụọ àjà ma mee ka a gharazie iji ụmụ anụmanụ na-achụ àjà dị ka Iwu ahụ kwuru. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Site ‘n’uche’ ahụ nke o kwuru okwu ya, e dowo anyị nsọ site n’àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro.” (Hib. 10:10) Ihe sokwa n’uche Nna Jizọs bụ ka Jizọs rụọ ọrụ ndị metụtara Alaeze ahụ. Jizọs wepụtakwara onwe ya ịrụ ọrụ a. (Luk 4:43; 17:20, 21) Jehova nabatara mwepụta a Jizọs wepụtara onwe ya ịrụrụ ya ọrụ. Ọ bụ ya mere o ji jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ ma kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”—Mak 1:9-11; Luk 3:21-23; Mat. 3:13-17.
SEPTEMBA 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 11
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 804 ¶5
Okwukwe
Ndị Nwere Okwukwe n’Oge Ochie. Onye nke ọ bụla n’ime “oké ìgwè ndị àmà” ahụ Pọl kwuru banyere ha (Hib. 12:1) nwere ezigbo ihe mere o ji nwee okwukwe. Dị ka ihe atụ, o doro anya na Ebel ma na Chineke kwere nkwa banyere “mkpụrụ” nke ga-egwepịa “agwọ ahụ” isi. Ọ hụkwara ihe ndị gosiri na ihe ahụ Jehova kwuru n’ogige Iden na ọ ga-eme nne na nna ya na-eme. Mgbe a chụpụru Adam na Iv n’ogige Iden, ọsụsọ gbara ha n’ihu tupu ha erie nri n’ihi na a bụrụ ala ọnụ, ya ana-emepụtazi ogwu na uke. Ọ ga-abụkwa na Ebel chọpụtara na Iv na-enwe agụụ maka di ya nakwa na di ya na-achị ya. O dokwara anya na Ebel nụrụ ka nne ya kwuru gbasara ihe mgbu ọ na-enwe n’ịmụ nwa. Ihe ọzọkwa bụ na n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ogige Iden ahụ, e nwere ndị cherọb nọchiri ya, nweekwa mma agha na-egbukepụ ọkụ na-echigharị onwe ya. (Jen. 3:14-19, 24) Ihe ndị a niile bụ “ihe àmà doro anya” nke mere ka obi sie Ebel ike na nnapụta ga-esi n’aka ‘mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.’ N’ihi ya, okwukwe mere ka ọ “chụọrọ Chineke àjà,” nke ji okpukpu okpukpu kara nke Ken mma.—Hib. 11:1, 4.
SEPTEMBA 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 12-13
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w89 12/15 22 ¶10
Na-achụ Àjà Ndị Na-amasị Jehova
10 Ya mere, ọ dị ndị Hibru ahụ mkpa izere ịbụ ndị ‘e jiri ozizi dị iche iche nke sikwa n’ebe ọzọ pụta nke na-ekpe okpukpe ndị Juu bufuo.’ (Ndị Galetia 5:1-6) Ọ bụghị site n’ozizi ndị dị otú ahụ, kama ‘site n’amara Chineke ka a na-eme ka obi guzosie ike’ iji wee guzosie ike n’eziokwu ahụ. O doro anya na ụfọdụ arụwo ụka banyere nri na ịchụ àjà dị iche iche, n’ihi na Pọl kwuru na e meghị ka obi sie ike ‘n’ihe oriri, nke ọ dịghị mgbe ha baara ndị jegharịrị n’ime ha uru.’ Abamuru dị iche iche nke ime mmụọ na-esite ná nsọpụrụ Chineke na igosi ekele maka ihe mgbapụta ahụ, ọ bụghị site ná nchegbu na-ezighị ezi banyere iri ụdị nri ụfọdụ na ido ụbọchị ndị pụrụ iche nsọ. (Ndị Rom 14:5-9) E wezụga nke ahụ, àjà Kraịst mere ka ọchụchụ àjà nke ndị Livaị ghara ịdị irè.—Ndị Hibru 9:9-14; 10:5-10.
SEPTEMBA 30–ỌKTOBA 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEMS 1-2
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 253-254
Ìhè
Jehova bụ “Nna nke ìhè eluigwe.” (Jems 1:17) Ọ bụghị naanị na ọ bụ ya bụ “Onye mere ka e nwee anyanwụ nke na-enye ìhè n’ehihie, meekwa ka e nwee ụkpụrụ nke na-achị ọnwa na kpakpando ndị na-enye ìhè n’abalị,” (Jere. 31:35) kama, ọ bụ ya na-eme ka ìhè nwuoro anyị n’ụzọ ime mmụọ. (2 Kọr. 4:6) Iwu ya, mkpebi ikpe ya, na okwu ya bụ ìhè maka ndị niile kwere ka ha na-edu ha. (Ọma 43:3; 119:105; Ilu 6:23; Aịza. 51:4) Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ìhè si n’ebe ị nọ ka anyị pụrụ iji hụ ìhè.” (Ọma 36:9; tụlee Ọma 27:1; 43:3.) Ìhè anyanwụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-enwusi ike malite mgbe chi na-abọ ruo “mgbe chi bọchara.” Otú ahụ ka Chineke na-ejikwa nwayọọ nwayọọ eme ka ìhè na-enwusikwu ike n’ụzọ ndị ezi omume. (Ilu 4:18) Ije ije n’ìhè Jehova pụtara ịna-eme ihe Jehova kwuru. (Aịza. 2:3-5) Ma, ọ bụrụ na mmadụ ana-ele ihe anya otú na-adịghị mma ma ọ bụ buru atụmatụ ọjọọ n’obi, onye ahụ nọ n’oké ọchịchịrị ime mmụọ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anya gị dị njọ, ahụ́ gị dum ga-agba ọchịchịrị. Ọ bụrụ n’ezie na ìhè nke dị n’ime gị bụ ọchịchịrị, lee ka ọchịchịrị ahụ si dị ukwuu!”—Mat. 6:23; tụlee Diut. 15:9; 28:54-57; Ilu 28:22; 2 Pita 2:14.
it-2 222 ¶4
Iwu
“Iwu nke Eze Nyere.” Iwu a a kpọrọ “iwu nke eze nyere” bụ iwu a kacha mara amara na nke kacha mkpa n’ime iwu ndị ọzọ niile eze nwere ike inye ndị ọ na-achị nke ga-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. (Jems 2:8) Ihe bụ́ isi n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ bụ ịhụnanya, ya bụ, “hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị” (nke bụ́, Iwu nke eze nyere) bụkwa iwu nke abụọ n’ime iwu ahụ. Ọ bụ na ya ka Iwu ahụ dum na akwụkwọ Ndị Amụma dabeere. (Matiu 22:37-40) Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst anọghị n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahu, ma a bịa n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha na-erube isi n’Iwu nke eze nyere, ya bụ, n’iwu nke Eze bụ́ Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst nyere.