OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jehova Hụrụ Ndị Na-adị Ọcha n’Anya
“Kwọọ aka gị. Na-edebe ọnụ ụlọ gị ọcha. Na-aza ụlọ gị. Na-ekpofu unyi.” Ọtụtụ ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha ka ha na-eme ọcha. Ma, ọ bụ Jehova na-akụziri mmadụ niile ịdị ọcha. (Ọpụ. 30:18-20; Diut. 23:14; 2 Kọr. 7:1) Ọ bụrụ na anyị edebe ahụ́ anyị na ihe ndị anyị nwere ọcha, anyị na-asọpụrụ Jehova. (1 Pita 1:14-16) Oleekwanụ maka ụlọ anyị na gburugburu ya? Ndị mmadụ na-atụsasị ihe aghara aghara, ma n’okporo ụzọ ma n’ebe ndị ọzọ. Ma Ndị Kraịst na-eme ike ha niile iji debe ụwa a ọcha. (Ọma 115:16; Mkpu. 11:18) Ụmụ obere ihe ndị anyị na-eme, dị ka, ịtụfu akwụkwọ swiit, chịngọm, ma ọ bụ kom kom, nwere ike igosi otú anyị si ele ịdị ọcha anya. N’ihe ọ bụla anyị na-eme, ka anyị gbalịa “na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.”—2 Kọr. 6:3, 4.
LEENỤ VIDIO BỤ́ CHINEKE HỤRỤ NDỊ NA-ADỊ ỌCHA N’ANYA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike ikwu mere na ha anaghị edebe ihe ndị ha nwere ọcha?
Olee otú Iwu Mozis si gosi otú Jehova si ele ịdị ọcha anya?
Olee otú anyị nwere ike isi mee ka e too Jehova n’ekwughị okwu ọ bụla?
Olee otú m nwere ike isi na-adị ọcha otú Jehova chọrọ ná ndụ m na-ebi?