Isi nke 14
Ịdị Ebube nke Ocheeze Eluigwe Jehova
Ọhụụ 2—Mkpughe 4:1–5:14
Isiokwu: Oké ihe omume dị iche iche n’ihu ocheeze ikpe ikpe nke Chineke
Oge mmezu ya: Ọhụụ nke a gosiri ihe ndị na-eme kemgbe 1914 ruo ihe ndị ga-eme mgbe Puku Afọ ahụ gasịrị, mgbe ihe nile ọ bụla e kere eke nke dị n’eluigwe, na n’elu ụwa ga-eto Jehova.—Mkpughe 5:13
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị inwe mmasị dị omimi n’ọhụụ ndị Jọn na-akọrọ anyị?
JỌN malitere ịkọrọ anyị ọhụụ ndị ọzọ na-akpali akpali. N’ime mmụọ, ọ ka nọ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. Ya mere, ihe ndị ọ na-akọwa nwere ihe ndị dị omimi ha pụtara nye anyị, bụ́ ndị na-ebi kpọmkwem n’ime ụbọchị ahụ. Site n’ọhụụ ndị a, Jehova wepụrụ ihe mkpuchi nke na-ekpuchi ihe ndị na-eme eme n’eluigwe, wee gosi anyị otú ya onwe ya si na-ahụ ihe e kpere n’ikpe ndị a gaje imezu n’elu ala. Karịsịa, ma ànyị nwere olileanya eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, ihe ndị e kpughere na-enyere anyị aka ịhụ ọnọdụ anyị ná nzube Jehova. N’ihi nke a, anyị nile kwesịrị ịnọgide na-enwe mmasị dị omimi n’okwu Jọn ahụ bụ: “Ngọzi na-adịrị onye na-agụ, na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya.”—Mkpughe 1:3.
2. Ahụmahụ dị aṅaa ka Jọn nwere ugbu a?
2 Ihe ọzọ Jọn hụrụ karịrị ihe ọ bụla e gosiworo ndị nọ ndụ n’oge a n’ihe nkiri vidio! O dere, sị: “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee hụ, ma lee, ọnụ ụzọ ka o gheworo oghe n’eluigwe, olu mbụ m nụkwara, olu dị ka nke opi na-akpanyerem ụka, otu onye na-asị, Rịgota n’ebe a, m ga-egosikwa gị ihe nile nke na-aghaghị ịpụta mgbe ihe ndị a gasịrị.” (Mkpughe 4:1) N’ime ọhụụ, Jọn banyere n’eluigwe ebe a na-adịghị ahụ anya, ebe Jehova nọ, nke e buliri elu karịa mbara igwe a na-ahụ anya nke mmadụ ndị na-enyocha ime eluigwe nyochaworo, ọbụna karịa ụyọkọ kpakpando ndị mejupụtara eluigwe na ala a na-ahụ anya. Dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’ịbanye n’ọnụ ụzọ e meghere emeghe, a kpọrọ Jọn òkù ikiri onyinyo magburu onwe ya nke eluigwe kachasị eluigwe nile ebe Jehova n’onwe ya na-anọkwasị n’ocheeze. (Abụ Ọma 11:4; Aịsaịa 66:1) Lee nnọọ ihe ùgwù nke a bụ!
3. Gịnị ka olu ahụ ‘nke yiri ụda opi ike’ na-echetara anyị, ònyekwa ka o doro anya na ọ bụ Isi Iyi ya?
3 Bible akọwaghị onyenwe “olu mbụ” nke a. Dị ka olu siri ike nke Jisọs nke a nụrụ tupu oge a, ọ na-adasi ụda ike dị ka opi ike. (Mkpughe 1:10, 11) Ọ na-echetara anyị oké ụda opi nke gbara àmà ọnụnọ Jehova n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 19:18-20) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova bụ Isi Iyi nke ọkpụkpọ òkù a. (Mkpughe 1:1) O meghewo ọnụ ụzọ ahụ ka Jọn, n’ọhụụ, nwee ike ịbata ebe kachasị nsọ n’ókèala nile nke ọbụbụeze Jehova.
Ọnụnọ Dị Ebube nke Jehova
4. (a) Gịnị ka ọhụụ Jọn pụtaara ndị Kraịst e tere mmanụ? (b) Gịnị ka ọ pụtaara ndị olileanya ha bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala?
4 Gịnị ka Jọn hụrụ? Gee ntị ka ọ na-akọrọ anyị oké ahụmahụ ya ugbu a: “Ngwa ngwa e mere m ka m nọọ n’ime mmụọ nsọ: ma lee, e debere ocheeze n’eluigwe, otu onye na-anọkwasịkwa n’ocheeze ahụ.” (Mkpughe 4:2) N’otu ntabi anya, ike ịrụ ọrụ nke Chineke bupụrụ Jọn n’ime mmụọ gaa kpọmkwem n’ebe ocheeze Jehova dị. Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali nye Jọn! N’ebe a, e mere ka ọ hụperetụ eluigwe ahụ na-egbukepụ egbukepụ ebe e debeere ya na ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ “[ihe] nketa nke a na-apụghị imebi, nke a na-adịghị emerụkwa emerụ, nke na-adịghị atalatakwa.” (1 Pita 1:3-5; Ndị Filipaị 3:20) Nye ndị ahụ olileanya ha bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, ọhụụ Jọn nwekwara ihe dị omimi ọ pụtara. Ọ na-enyere ha aka ịghọta ịdị ebube nke ọnụnọ Jehova nakwa nke ndokwa e mere n’eluigwe maka ọchịchị, nke Jehova ji eme ihe n’ikpe mba nile ikpe, e mesịakwa n’ịchị ndụ ndị mmadụ n’elu ala. N’ezie, Jehova bụ Chineke nke na-eme oké nhazi!
5. Ihe dị aṅaa nke bụ ezie ka Jọn hụrụ, nke ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ sere onyinyo ya?
5 Akụkụ dị ukwuu n’ihe Jọn hụrụ n’eluigwe ebe ahụ yiri ihe ndị a na-ahụ n’ụlọ ikwuu ahụ dị n’ọzara. E wuru nke a n’ihe dị ka 1,600 afọ tupu mgbe ahụ dị ka ebe ndị Israel ga-anọ na-efe ezi ofufe. E debere igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’ime Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ nile nke ụlọ ikwuu ahụ, ọ bụkwa site n’elu ihe ọlaedo ahụ siri ike e ji kpuchie Igbe ọgbụgba ndụ ahụ ka Jehova n’onwe ya kwuru okwu. (Ọpụpụ 25:17-22; Ndị Hibru 9:5) N’ihi nke a, ihe mkpuchi nke Igbe ọgbụgba ndụ ahụ nọrọ dị ka ihe atụ nke ocheeze Jehova. Ugbu a, Jọn na-ahụ ihe bụ ezie nke ihe nnọchianya ahụ sere onyinyo ya: Eze Onyenwe anyị Jehova n’onwe ya ka ọ na-anọkwasị n’ocheeze dị oké ebube n’eluigwe!
6. Echiche dị aṅaa banyere Jehova ka Jọn na-enye anyị, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị ekwesị?
6 N’ụzọ na-adịghị ka ndị amụma bu ya ụzọ, bụ́ ndị hụrụ ọhụụ nke ocheeze Jehova, Jọn enyeghị nkọwa zuru ezu banyere Onye Nsọ ahụ nke na-anọkwasị n’elu ya. (Ezikiel 1:26, 27; Daniel 7:9, 10) Ma, Jọn kọọrọ anyị ihe o chere banyere Onye ahụ na-anọkwasị n’ocheeze n’okwu ndị a: “Onye ahụ nke na-anọdụ ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ bụrụ na a na-ele ya anya: eke na ogwurugwu dịkwa ocheeze ahụ gburugburu, yiri emerald ma ọ bụrụ na a na-ele ya anya.” (Mkpughe 4:3) Lee nnọọ ịdị ebube nke na-enweghị atụ ọ bụ! Jọn hụrụ ịma mma dị jụụ, na-egbukepụ egbukepụ, nke yiri nkume ndị dị oké ọnụ ahịa ndị na-egbukepụ egbukepụ, maakwa mma ile anya. Lee nnọọ ka nke a si kwekọọ ná nkọwa Jemes onye na-eso ụzọ nyere Jehova dị ka “Nna nke ìhè”! (Jemes 1:17) N’oge na-adịghị anya ka o desịrị Mkpughe, Jọn n’onwe ya kwuru, sị: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ọchịchịrị ọ bụla dị n’ime ya.” (1 Jọn 1:5) Lee nnọọ Onye dị ebube Jehova bụ n’ezie!
7. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’eziokwu ahụ bụ na e nwere eke na ogwurugwu dị gburugburu ocheeze Jehova?
7 Rịba ama na Jọn hụrụ eke na ogwurugwu gburugburu ocheeze ahụ, nke na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ dị ka emerald. Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ eke na ogwurugwu (irʹis) na-ezo aka n’ihe dị nnọọ gburugburu. A kpọtụrụ eke na ogwurugwu aha nke mbụ na Bible n’ihe banyere oge Noa. Mgbe mmiri nke Iju Mmiri ahụ talatara, Jehova mere ka eke na ogwurugwu pụta n’igwe ojii, ọ kọwakwara ihe o sere onyinyo ya n’okwu ndị a: “Eke na ogwurugwu m ka m tinyeworo n’igwe ojii, ọ ga-aghọkwa ihe ịrịba ama nke ọgbụgba ndụ dị n’etiti mụ na ụwa. M wee cheta ọgbụgba ndụ m, nke dị n’etiti mụ na unu na anụ nile ọ bụla nwere mkpụrụ obi dị ndụ n’ime anụ ahụ nile; mmiri agaghị aghọkwa iju mmiri ọzọ ibibi anụ ahụ nile.” (Jenesis 9:13, 15) Ya mere, gịnị ka ọhụụ eluigwe nke a ga-echetara Jọn? Eke na ogwurugwu ahụ ọ hụrụ aghaghị ichetawororịị ya mkpa nke inwe mmekọrịta udo n’etiti mmadụ na Jehova, dị ka nke òtù Jọn ahụ na-enwe taa. Ọ ga-emekwa ka ọ ghọta ịdị jụụ na udo nke dị n’ebe Jehova nọ, bụ́ ịdị jụụ nke ga-agbasa ruo mmadụ nile na-erube isi mgbe Jehova gbasara ụlọ ikwuu ya n’elu ihe a kpọrọ mmadụ n’ime òtù ụwa ọhụrụ ahụ.—Abụ Ọma 119:165; Ndị Filipaị 4:7; Mkpughe 21:1-4.
Ịmata Ndị 24 Ndị Okenye ahụ Bụ
8. Olee ndị Jọn hụrụ gburugburu ocheeze ahụ, olee ndị kwa ka ndị a sere onyinyo ha?
8 Jọn maara na a họpụtara ndị nchụàjà ije ozi n’ụlọ ikwuu oge ochie ahụ. N’ihi nke a, ihe ọzọ ọ hụrụ pụrụ iju ya anya: “[Iri ocheeze abụọ na anọ] dịkwa ocheeze ahụ gburugburu: m wee hụ [iri ndị okenye abụọ na anọ] ka ha na-anọkwasị n’ocheeze ndị a, ndị e gbokwasịworo uwe ọcha; ahụkwara m okpueze nke ọlaedo n’isi ha.” (Mkpughe 4:4) Ee, kama ịhụ ndị nchụàjà, ọ hụrụ 24 ndị okenye, ndị nọkwasịrị n’ocheeze, kpurukwa okpueze dị ka ndị eze. Olee ndị bụ ndị okenye ndị a? Ọ dịghị ndị ọzọ ha bụ ma ọ bụghị ndị ahụ e tere mmanụ nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ndị a kpọliteworo n’ọnwụ, ha wee na-anọdụ n’ọnọdụ eluigwe ahụ nke Jehova kwere ha nkwa ya. Ànyị si aṅaa mara nke a?
9, 10. Ànyị si aṅaa mara na 24 ndị okenye ndị ahụ nọchiri anya ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọnọdụ ya dị ebube n’eluigwe?
9 Nke mbụ, ha kpu okpueze. Bible na-ekwu banyere ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka ndị na-enweta ‘okpueze na-apụghị ire ure,’ na-enwetakwa ndụ na-agaghị agwụ agwụ—anwụghị anwụ. (1 Ndị Kọrint 9:25; 15:53, 54) Ma ebe 24 ndị okenye ndị a na-anọkwasị n’ocheeze, okpueze ọlaedo ndị ahụ n’ọnọdụ nke a nọchiri anya ike ọchịchị dị ka eze. (Tụlee Mkpughe 6:2; 14:14.) Nke a na-akwado nkwubi okwu ahụ bụ na 24 ndị okenye ndị ahụ nọchiri anya ndị e tere mmanụ na-agbaso nzọụkwụ Jisọs n’ọnọdụ eluigwe ha, n’ihi na Jisọs soro ha banye n’ọgbụgba ndụ ịnọkwasị n’ocheeze n’Alaeze ya. (Luk 22:28-30) Ọ bụ nanị Jisọs na 24 ndị okenye ndị a—ọ gụnyeghịdị ndị mmụọ ozi—ka a kọwara dị ka ndị na-achị achị n’eluigwe n’ihu Jehova.
10 Nke a kwekọrọ ná nkwa Jisọs kwere ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia: “Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-ekwenye ka o soo m nọdụ ala n’ocheeze m.” (Mkpughe 3:21) Ma ọrụ 24 ndị okenye ndị ahụ na-arụ n’eluigwe abụghị nanị ịchị ọchịchị. N’okwu mmeghe nke akwụkwọ Mkpughe, Jọn kwuru banyere Jisọs, sị: “O wee mee ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụàjà nye Chineke na Nna nke ya.” (Mkpughe1:5, 6) Ndị a bụ ndị eze, bụrụkwa ndị nchụàjà. “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya bụrụ eze [otu puku afọ] ahụ.”—Mkpughe 20:6.
11. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na ọnụ ọgụgụ ndị okenye ahụ bụ 24, gịnịkwa ka ọnụ ọgụgụ ahụ na-egosi?
11 Gịnị bụ ihe dị mkpa banyere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 24, nke mere na Jọn hụrụ 24 ndị okenye gburugburu ocheeze ahụ? N’akụkụ dị ukwuu, ndị nchụàjà kwesịrị ntụkwasị obi n’Israel oge ochie sere onyinyo ndị okenye ndị a. Pita onyeozi degaara ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” (1 Pita 2:9) Ọ bụ ihe na-akpali mmasị icheta na e kewara òtù ndị nchụàjà nke mba ndị Juu oge ochie gaa na 24 òtù dị iche iche. E kenyere òtù nke ọ bụla izu ndị ọ ga-eje ozi n’ihu Jehova kwa afọ, nke mere na a na-eje ozi dị nsọ n’akwụsịghị akwụsị. (1 Ihe Emere 24:5-19) N’ihi nke a, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na e nwere 24 ndị okenye e gosiri n’ọhụụ Jọn nke òtù ndị nchụàjà dị n’eluigwe n’ihi na òtù ndị nchụàjà nke a nọgidere na-ejere Jehova ozi, n’akwụsịghị akwụsị. Mgbe ha zuru, a gaje inwe 24 òtù dị iche iche, nke ọ bụla n’ime ha ga-enwe 6,000 ndị nwere mmeri, n’ihi na Mkpughe 14:1-4 na-agwa anyị na 144,000 (24 x 6,000) bụ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ” iso Nwa Atụrụ ahụ bụ́ Jisọs Kraịst guzo n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe. Ebe ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 12 na-egosi nhazi e mere nke ọma n’ihe banyere Chineke, 24 na-eme ka ọ dị okpukpu abụọ—ma ọ bụ mesiwanye ike—nhazi dị otú ahụ.
Àmụ̀mà, Olu, na Égbè Eluigwe
12. Gịnị ọzọ ka Jọn hụrụ, nụkwa, gịnịkwa ka “àmụ̀mà na olu na égbè eluigwe” ndị ahụ na-echetara anyị?
12 Gịnị bụ ihe ọzọ Jọn hụrụ, nụkwa? “Àmụ̀mà na olu na égbè eluigwe na-esikwa n’ocheeze ahụ pụta.” (Mkpughe 4:5a) Lee nnọọ ka nke a si yie ngosipụta ndị ọzọ nke ike eluigwe Jehova! Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova “rịdakwasịrị” Ugwu Saịnaị, Mosis kọrọ, sị: “N’ụbọchị nke atọ, mgbe ọ bụ ụtụtụ, na ọtụtụ égbè eluigwe na àmụ̀mà dị, na igwe ojii dị arọ n’elu ugwu ahụ, na olu opi ike dị ike nke ukwuu; . . . olu opi ike ahụ wee na-adasi ike nke ukwuu, Mosis na-ekwu okwu, Chineke werekwa olu na-aza ya.”—Ọpụpụ 19:16-19.
13. Gịnị ka àmụ̀mà ndị ahụ sitere n’ocheeze Jehova sere onyinyo ha?
13 N’ime ụbọchị Onyenwe anyị, Jehova ga-eme ka a hụ ike ya na ọnụnọ ya n’ụzọ dị oké egwu. Ee e, ọ bụghị site n’àmụ̀mà nkịtị, n’ihi na Jọn na-ahụ ihe àmà. Ya mere, gịnị ka àmụ̀mà ndị ahụ nọchiri anya ha? Otú ọ dị, mgbukepụ nke àmụ̀mà mmiri pụrụ inye ìhè, ma ha pụkwara itigbu mmadụ. Ya mere, àmụ̀mà ndị a si n’ocheeze Jehova na-apụta sere onyinyo mgbukepụ nke ìhè nke ọ nọgideworo na-enye ndị ya, n’ụzọ pụtakwara ìhè ọbụna karị, ozi ikpe ọmụma ya na-ere ka ọkụ.—Tụlee Abụ Ọma 18:14; 144:5, 6; Matiu 4:14-17; 24:27.
14. Olee ụzọ olu dị iche iche siworo dapụta taa?
14 Gịnị banyere olu ndị ahụ? Mgbe Jehova na-arịdata n’Ugwu Saịnaị, otu olu gwara Mosis okwu. (Ọpụpụ 19:19) Olu ndị si n’eluigwe kwupụtara ọtụtụ n’ime iwu na nkwupụta okwu ndị dị n’akwụkwọ Mkpughe. (Mkpughe 4:1; 10:4, 8; 11:12; 12:10; 14:13; 16:1, 17; 18:4; 19:5; 21:3) Taa, Jehova enyewokwa ndị ya iwu, gwakwa ha okwu, na-eme ka nghọta ha nwere banyere amụma na ụkpụrụ Bible dị iche iche dịwanye mma. Ọtụtụ mgbe, e nyewo ihe ọmụma ndị na-enye ìhè ná mgbakọ mba nile, eziokwu Bible ndị dị otú ahụ abụrụwokwa ndị a kpọsara gburugburu ụwa. Pọl onyeozi kwuru banyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma, sị: “N’ụwa nile ka olu ha pụrụ jezuo, ná nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.”—Ndị Rom 10:18.
15. Égbè eluigwe dịgasị aṅaa siworo n’ocheeze ahụ dapụta n’akụkụ nke a nke ụbọchị Onyenwe anyị?
15 Égbè eluigwe na-esochikarị àmụ̀mà. Devid zoro aka n’égbè eluigwe nkịtị dị ka “olu Jehova.” (Abụ Ọma 29:3, 4) Mgbe Jehova lụụrụ Devid agha megide ndị iro ya, e kwuru na égbè eluigwe sitere n’ebe Ọ nọ bịa. (2 Samuel 22:14; Abụ Ọma 18:13) Elaịhu gwara Job na olu Jehova na-ada ka égbè eluigwe, mgbe Ọ na-eme “ihe ukwu, ma anyị amaghị ha.” (Job 37:4, 5) N’ime ụbọchị Onyenwe anyị, Jehova ‘amawo égbè eluigwe,’ na-adọ aka ná ntị banyere oké ọrụ ọ gaje ịrụzu megide ndị iro ya. Ụda égbè eluigwe ihe atụ ndị a adawo, dagharịakwa gburugburu ụwa nile. Ị bụ onye obi ụtọ ma ọ bụrụ na i gewo ntị ná nkwupụta ndị a dị ka égbè eluigwe wee na-eji ire gị na-eme ihe n’ụzọ amamihe n’itinye olu gị n’ụda oké mkpọtụ nke a!—Aịsaịa 50:4, 5; 61:1, 2.
Ọwá nke Ọkụ na Osimiri E Ji Enyo Mee
16. Gịnị ka “ọwá nke ọkụ asaa” ndị ahụ sere onyinyo ha?
16 Gịnị bụ ihe ọzọ Jọn hụrụ? Ọ bụ nke a: “Ọwá nke ọkụ asaa na-enwu n’ihu ocheeze ahụ, nke bụ mmụọ asaa ahụ nke Chineke; ihe dịkwa n’ihu ocheeze ahụ dị ka oké osimiri e ji enyo mee yiri crystal.” (Mkpughe 4:5b, 6a) Jọn kọọrọ anyị n’onwe ya ihe ọwá nke ọkụ asaa ahụ pụtara: “Nke bụ́ mmụọ asaa ahụ nke Chineke.” Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ asaa nọchiri anya ihe zuru ezu n’ihe banyere Chineke; n’ihi ya, ọwá ọkụ asaa ahụ aghaghị ịnọchi anya ozuzu nke ike na-enye ìhè nke mmụọ nsọ. Lee ka òtù Jọn si nwee obi ekele n’oge a na e jiriwo ntụkwasị obi nye ya ìhè nke a, ya na ibu ọrụ nke ime ka o rutere ndị nile nwere agụụ ime mmụọ n’elu ala! Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na kwa afọ, ọtụtụ narị nde magazin Ụlọ Nche anọgidewo na-enye ìhè nke a n’ihe dị ka asụsụ 150!—Abụ Ọma 43:3.
17. Gịnị ka “oké osimiri e ji enyo mee yiri crystal” ahụ nọchiri anya ya?
17 Jọn hụkwara “oké osimiri e ji enyo mee yiri crystal.” Gịnị ka nke a sere onyinyo ya n’ihe banyere ndị ahụ a kpọbatara n’ogige eluigwe nke Jehova? Pọl kwuru banyere ụzọ Jisọs na-esi edo ọgbakọ ya ọcha, “site n’ọsịsa mmiri n’okwu Chineke.” (Ndị Efesọs 5:26) Tupu ọnwụ ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ugbu a unu onwe unu dị ọcha n’ihi okwu nke m gwaworo unu.” (Jọn 15:3) N’ihi nke a, oké osimiri nke a e ji enyo mee nke yiri crystal aghaghị ịnọchi anya Okwu Chineke e dere ede nke na-eme ka mmadụ dị ọcha. Ndị ahụ so n’òtù ndị nchụàjà bụkwa ndị eze, ndị na-abata n’ihu Jehova aghaghị ịbụ ndị e jiri Okwu ya mee ka ha dị ọcha.
Lee—“Ihe Anọ nke Dị Ndụ”!
18. Gịnị ka Jọn hụrụ n’etiti, nakwa gburugburu ocheeze ahụ?
18 Ugbu a, Jọn hụrụ ihe ọzọ. O dere, sị: “Ihe anọ nke dị ndụ nọkwa n’etiti ocheeze ahụ, nọọkwa ocheeze ahụ gburugburu, ndị jupụtara n’anya anya n’ihu na azụ.”—Mkpughe 4:6b.
19. Gịnị ka ihe anọ ndị ahụ dị ndụ sere onyinyo ha, ànyị sikwa aṅaa mara nke a?
19 Gịnị ka ihe okike ndị a sere onyinyo ha? Otu ọhụụ nke onye amụma ọzọ, bụ́ Ezikiel kọrọ banyere ha na-enyere anyị aka ịmata azịza ya. Ezikiel hụrụ ka Jehova nọkwasịrị n’ụgbọ ịnyịnya nke eluigwe, nke ihe e kere eke ndị dị ndụ na-esochi ya, bụ́ ndị nwere àgwà dị iche iche yiri ndị ahụ Jọn kọwara. (Ezikiel 1:5-11, 22-28) Mgbe e mesịrị, Ezikiel hụkwara ụgbọ ịnyịnya ahụ bụ ocheeze ọzọ ka ihe e kere eke ndị dị ndụ na-esokwa ya. Otú ọ dị, n’oge a o zoro aka n’ihe ndị ahụ dị ndụ dị ka ndị cherub. (Ezikiel 10:9-15) Ihe anọ ndị ahụ dị ndụ ndị Jọn hụrụ aghaghị ise onyinyo ọtụtụ ndị cherub nke Chineke—ihe e kere eke ndị nwere ọkwá dị elu ná nzukọ Ya nke ndị bụ mmụọ. Jọn agaghị eche na ọ bụ ihe na-adịghị eme eme ịhụ ndị cherub ka ha nọ Jehova nso otú ahụ, ebe ọ bụ na ná ndokwa ụlọ ikwuu nke oge ochie, e dokwasịrị ndị cherub abụọ e ji ọlaedo mee n’elu ihe mkpuchi nke igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nke nọchiri anya ocheeze Jehova. A na-esite n’etiti ndị cherub abụọ ndị a na-anụ ka olu Jehova na-enye mba ahụ iwu dị iche iche.—Ọpụpụ 25:22; Abụ Ọma 80:1.
20. N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi kwuo na ihe anọ ndị ahụ dị ndụ nọ ‘n’etiti ocheeze ahụ, nọrọkwa ocheeze ahụ gburugburu’?
20 Ihe anọ ndị a dị ndụ nọ ‘n’etiti ocheeze ahụ, nọrọkwa ocheeze ahụ gburugburu.’ Gịnị ka nke a pụtara kpọmkwem? Ọ pụrụ igosi na ha nọ gburugburu ocheeze ahụ n’ụzọ ga-eme ka otu n’ime ha guzoro n’etiti akụkụ nke ọ bụla. Otú a, ndị sụgharịrị Today’s English Version degharịrị asụsụ Grik mbụ ahụ n’ụzọ nke a: “na-agba ocheeze ahụ gburugburu n’akụkụ ya nke ọ bụla.” Ihe ọzọ okwu ahụ pụrụ ịpụta bụ na ihe anọ ahụ dị ndụ nọ kpọmkwem n’etiti eluigwe ebe ocheeze ahụ dị. O yiri ka ọ bụ nke ahụ mere ka The Jerusalem Bible sụgharịa okwu ahụ ịbụ: “n’etiti, na-ezukọta gburugburu ocheeze ahụ n’onwe ya.” Ihe dị mkpa n’ebe a bụ ịdị nso nke ndị cherub ahụ n’ebe ocheeze Jehova dị, nke a pụrụ iji tụnyere ndị cherub ahụ Ezikiel hụrụ n’akụkụ ọ bụla nke ụgbọ ịnyịnya Jehova nke yiri nzukọ. (Ezikiel 1:15-22) Ihe ndị a nile kwekọrọ n’okwu dị n’Abụ Ọma 99:1: “Jehova bụ eze; . . . ọ na-ebi n’etiti cherubim.”
21, 22. (a) Nkọwa dị aṅaa ka Jọn nyere ihe anọ ndị ahụ dị ndụ? (b) Gịnị ka ọdịdị nke ọ bụla n’ime ihe anọ ndị ahụ dị ndụ nọchiri anya ya?
21 Jọn gara n’ihu ịkọ, sị: “Ihe mbụ ahụ nke dị ndụ yiri ọdụm, ihe nke abụọ ahụ nke dị ndụ yikwara nwa ehi, ihe nke atọ ahụ nke dị ndụ nwekwara ihu dị ka nke mmadụ, ihe nke anọ ahụ nke dị ndụ yikwara ugo na-efe efe.” (Mkpughe 4:7) N’ihi gịnị ka ihe anọ ndị a dị ndụ ji dịrịta nnọọ iche iche otú a, otu site n’ibe ya? Ihe àmà gosiri na ihe dị ndụ ndị a ndị dịrịta nnọọ iche iche gosiri àgwà dị iche iche nke Chineke. Nke mbụ, e nwere ọdụm. A na-eji ọdụm eme ihe na Bible dị ka ihe atụ nke obi ike, karịsịa n’ịchụso ikpe ziri ezi na ezi omume. (2 Samuel 17:10; Ilu 28:1) Otú a, ọdụm ahụ nọchiri anya àgwà Chineke nke ikpe ikpe ziri ezi n’obi ike. (Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 89:14) Ihe nke abụọ ahụ nke dị ndụ yiri nwa ehi. Àgwà dị aṅaa ka oké ehi na-echetara gị? Nye ndị Israel, oké ehi bụ ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa n’ihi ike ya. (Ilu 14:4; leekwa Job 39:9-11.) N’ihi nke a, nwa ehi ahụ nọchiri anya ike, ike ịrụ ọrụ nke Jehova na-enye.—Abụ Ọma 62:11; Aịsaịa 40:26.
22 Ihe nke atọ ahụ nke dị ndụ nwere ihu dị ka nke mmadụ. Nke a aghaghị ịnọchi anya ịhụnanya yiri nke Chineke, ebe ọ bụ nanị mmadụ ka e kere n’elu ala n’oyiyi nke Chineke, na-enwe àgwà ahụ na-enweghị atụ nke bụ ịhụnanya. (Jenesis 1:26-28; Matiu 22:36-40; 1 Jọn 4:8, 16) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị cherub na-egosipụta àgwà nke a mgbe ha na-eje ozi gburugburu ocheeze Jehova. Ugbu a, gịnị banyere ihe nke anọ ahụ nke dị ndụ? Nke a yiri ugo na-efe efe. Jehova n’onwe ya dọọrọ uche gaa n’ike dị ukwuu nke ịhụ ụzọ nke ugo nwere: “Anya ya abụọ na-esi n’ebe dị anya legide ya.” (Job 39:29) N’ihi nke a, ugo sere onyinyo amamihe nke na-ahụ ihe n’ebe dị anya. Jehova bụ Isi Iyi nke amamihe. Ndị cherub ya na-egosipụta amamihe Chineke ka ha na-erube isi n’ihe nile o nyere n’iwu.—Ilu 2:6; Jemes 3:17.
Otuto Jehova Adapụta Ụda
23. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na ihe anọ ndị ahụ dị ndụ “jupụtara n’anya anya” sere onyinyo ya, gịnịkwa ka e mesiri ike site n’onwunwe ha nwere nku abụọ ụzọ atọ?
23 Jọn gara n’ihu ná nkọwa ya: “Ihe anọ ahụ nke dị ndụ nwekwara nku isii n’otu n’otu, ha jupụtakwara n’anya anya gburugburu, ya na n’ime: ha adịghị ezu ike ehihie na abalị, na-asị, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahụ dị, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye dịrịị, onye na-adịkwa adị, onye na-abịakwa.” (Mkpughe 4:8) Njupụta dị otú a nke anya na-ezo aka n’ọhụhụ ụzọ zuru ezu nke na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya. Ihe anọ ahụ dị ndụ na-eji ikike ndị a eme ihe n’akwụsịghị akwụsị, ebe ha na-enweghị mkpa ọ bụla nke ihi ụra. Ha na-eṅomi Onye ahụ e dere banyere ya, sị: “N’ihi na Jehova, anya ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe Emere 16:9) Ebe ha nwere ọtụtụ anya otú a, ndị cherub pụrụ ịhụ ihe dị n’ebe ọ bụla. Ọ dịghị ihe ha na-adịghị ahụ. Otú a, a kwadebere ha nke ọma ijere Chineke ozi n’ọrụ ya nke ikpe ikpe. E kwuru banyere ya, sị: “N’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ ezi mmadụ nche.” (Ilu 15:3) N’inwekwa nku abụọ ụzọ atọ—ebe a na-eji ọnụ ọgụgụ ahụ bụ atọ eme ihe na Bible iji mesie ihe ike—ndị cherub ahụ pụrụ ijegharị n’oge dị oké ngwa iziga ozi na imezu ihe Jehova kpere n’ikpe.
24. Olee otú ndị cherub ahụ si eto Jehova, gịnịkwa ka nke a pụtara?
24 Gee ntị! Abụ otuto ndị cherub ahụ na-abụrụ Jehova dị ụtọ, na-akpalikwa akpali: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahụ dị, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye dịrịị, onye na-adịkwa adị, onye na-abịakwa.” Ọzọkwa, atọ na-egosi imesi ihe ike. Ndị cherub ndị ahụ mesiri okwu ike banyere ịdị nsọ nke Jehova Chineke. Ọ bụ Isi Iyi na Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu nke ịdị nsọ. Ọ bụkwa “Eze nke mgbe nile,” nọgidekwa na-abụ “Alfa ahụ na Omega ahụ, onye mbụ na onye ikpeazụ, mmalite na ọgwụgwụ.” (1 Timoti 1:17; Mkpughe 22:13) Ndị cherub ndị ahụ adịghị ezu ike ka ha nọgidere na-akpọsa àgwà Jehova ndị na-enweghị atụ n’ihu ihe nile e kere eke.
25. N’ụzọ dị aṅaa ka ihe ndị ahụ dị ndụ na 24 ndị okenye ahụ si ejikọ aka n’ito Jehova?
25 Eluigwe nke eluigwe nile jupụtara n’ụda nke otuto a na-enye Jehova! Nkọwa Jọn gara n’ihu, sị: “Mgbe ọ bụla ihe anọ ahụ nke dị ndụ ga-enye onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ otuto na nsọpụrụ na ekele, bụ́ onye na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, [iri ndị okenye abụọ na anọ] ahụ ga-ada n’ala n’ihu onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, ha ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ́ onye ahụ nke na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, ha ga-atụdakwa okpueze ha n’ihu ocheeze ahụ, na-asị, Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:9-11) N’ime Akwụkwọ Nsọ dum, nke a bụ otu n’ime nkwupụta kasị ukwuu nke otuto nye Jehova, bụ́ Chineke na Eze Onyenwe anyị!
26. N’ihi gịnị ka 24 ndị okenye ahụ ji tụda okpueze ha n’ala n’ihu Jehova?
26 Iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nwere otu ụdị echiche ahụ Jisọs gosipụtara, ọbụna na-atụda okpueze ha n’ala n’ihu Jehova. Ha adịghị echetatụ n’echiche ibuli onwe ha elu n’ihu Chineke. Ha ji obi umeala ghọta na nanị nzube nke ọbụbụeze ha bụ iwetara ya otuto na nsọpụrụ, dị ka Jisọs na-eme mgbe nile. (Ndị Filipaị 2:5, 6, 9-11) N’idebe onwe ha n’okpuru, ha matara ịdị ala nke ha onwe ha, na-ekwupụtakwa na ịchịisi nke ha dabeere n’ọkaaka nke Jehova. Otú a, ha nwere nkwekọrịta sitere n’ala ala obi nke dị n’etiti ha na ndị cherub na ihe ndị ọzọ e kere eke kwesịrị ntụkwasị obi n’inye Chineke otuto na nsọpụrụ, bụ́ onye kere ihe nile.—Abụ Ọma 150:1-6.
27, 28. (a) Olee otú nkọwa Jọn kọwara ọhụụ nke a kwesịrị isi metụta anyị? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa na-ebilite banyere ihe ndị ọzọ Jọn hụrụ, nụkwa?
27 Olee onye a na-agaghị akpali site n’ịgụ ihe ndekọ Jọn banyere ọhụụ nke a? Ọ dị ebube, ọ dị ukwuu! Ma gịnị ka nke bụ ezie na-aghaghị ịdị ka ya? Ịdị ukwuu nke Jehova n’onwe ya aghaghị ịkpali onye ọ bụla nwere obi nke na-aghọta ihe isonyere ihe anọ ndị ahụ dị ndụ na 24 ndị okenye ndị ahụ n’ito Ya, ma n’ekpere, ma n’ịkpọsa aha Ya n’ihu ọha. Ọ bụ Chineke nke a ka ndị Kraịst nwere ihe ùgwù ịgbara àmà taa. (Aịsaịa 43:10) Cheta na ọhụụ Jọn metụtara ụbọchị Onyenwe anyị, bụ́ nke anyị bi n’ime ya ugbu a. “Mmụọ asaa ahụ” dị njikere mgbe ọ bụla iduzi na iwusi anyị ike. (Ndị Galetia 5:16-18) Okwu Chineke dị adị taa inyere anyị aka ịnọgide n’ịdị nsọ ijere Chineke nke dị nsọ ozi. (1 Pita 1:14-16) N’ezie, obi dị anyị ụtọ ịgụpụta okwu nke amụma nke a. (Mkpughe 1:3) Lee nnọọ ihe mkpali ha na-enye anyị ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova, ịgharakwa ikwe ka ụwa dọpụ uche anyị site n’ịrụsi ọrụ ike na ịkpọsa otuto ya!—1 Jọn 2:15-17.
28 Ka ọ dị ugbu a, Jọn akọwawo ihe ọ hụrụ mgbe a kpọrọ ya isi n’ọnụ ụzọ ahụ ghere oghe bata n’eluigwe. Nke kasị pụta ìhè bụ na ọ kọrọ na Jehova, n’ịdị ebube nile nke ùgwù na nsọpụrụ Ya, na-anọkwasị n’ocheeze eluigwe Ya. Nzukọ kasị nzukọ nile ọ bụla ike gbara ya gburugburu—nke na-egbukepụ egbukepụ n’ịma mma na ikwesị ntụkwasị obi ya. Ụlọikpe nke a nke Chineke amalitewo nnọkọ ya. (Daniel 7:9, 10, 18) E doziwo ọnọdụ maka otu ihe pụrụ iche ime. Gịnị ka ọ bụ, oleekwa otú o si emetụta anyị taa? Ka anyị kirie mgbe ihe omume ahụ na-emeghe!
[Foto dị na peeji nke 75]
[Foto dị na peeji nke 78]