OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ì Nwere Ike Ịkọwa Ihe I Kweere?
Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ihe mere i ji kwere na e kere mmadụ eke, gịnị ka ị ga-aza ya? E nwere ihe abụọ ga-enyere gị aka iji obi ike zaa ajụjụ ahụ: Nke mbụ, i kwesịrị ịchọpụta n’onwe gị na e kere mmadụ eke. (Rom 12:1, 2) Nke abụọ bụzi na ị ga-echepụta otú kacha mma ị ga-esi kọwaara ya mmadụ.—Ilu 15:28.
LEENỤ VIDIO NDỊ A ỌKACHAMARA N’IHE GBASARA ỊGBA ỌKPỤKPỤ EKWUO IHE MERE O JI KWERE NA CHINEKE NA ỌKACHAMARA N’IHE GBASARA ỤMỤ ANỤMANỤ EKWUO IHE MERE O JI KWERE NA CHINEKE. HA GA-EME KA Ị MATA IHE MERE NDỊ ỌZỌ JI KWERE NA E KERE MMADỤ EKE. ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị mere Irène Hof Laurenceau ji kwere na e kere mmadụ eke kama ikwere n’evolushọn?
Gịnị mere Yaroslav Dovhanych ji kwere na e kere mmadụ eke kama ikwere n’evolushọn?
Olee otú ị ga-esi kọwaara mmadụ ihe mere i ji kwere na e kere mmadụ eke?
Olee ihe ndị nzukọ Jehova wepụtara n’asụsụ gị ga-enyere gị aka ịchọpụta n’onwe gị na ọ bụ Chineke kere ihe niile, nyekwara gị aka ịkọwara ya ndị ọzọ?