-
Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 25Ozi Alaeze—2013 | Mach
-
-
Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 25
IZU NA-AMALITE NA MACH 25
Abụ nke 76 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 7 ¶1-6 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Luk 4-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Luk 4:22-39 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: A Na-akpọ Ike Ndụ Mmadụ na nke Anụmanụ Mmụọ—td 27B (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Gosiri na A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ?—1 Kọr. 15:3-7 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Eprel. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 25: “Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl.” Ajụjụ na azịza. Mee ihe ngosi abụọ mgbe unu na-atụle paragraf nke 6.
Abụ nke 97 na Ekpere
-
-
Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ BaịbụlOzi Alaeze—2013 | Mach
-
-
3. Olee otú broshọ a si dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?
3 Otú E Si Dee Ya: Anyị na-ede ọtụtụ akwụkwọ anyị otú ọ na-abụ ndị mmadụ were ha gụọ, ha aghọta ihe e kwuru, ghara ichewe ka ndị nkwusa bịa kọwaara ha ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka e si dee broshọ a. Anyị dere ya ka ndị nkwusa jiri ya na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ị chọọ inye ya mmadụ, ọ ga-akacha mma ka gị na ya kwurịta otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ. Paragraf nke ọ bụla dị obere. Gị na onye ị na-ezi ozi ọma nwere ike mụọ ya ọ bụrụgodị na o nwechaghị ohere. Anyị na mmadụ kwesịrị ịmalite n’isiokwu nke mbụ mụwa broshọ ahụ, ma, ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị malite n’isiokwu ọ bụla.
4. Olee otú broshọ a si enyere anyị aka iji Baịbụl na-amụrụ ndị mmadụ ihe?
4 N’ọtụtụ akwụkwọ anyị, ọ na-abụ a gụọ paragraf, a hụ azịza ajụjụ a jụrụ. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka e si dee broshọ a. Ọ bụ Baịbụl ka ị ga-agụ hụ azịza ọtụtụ ajụjụ ndị dị na broshọ a. Ọtụtụ ndị chọrọ ka e jiri Baịbụl na-akụziri ha ihe, ọ bụghị akwụkwọ anyị. N’ihi ya, a ga-eji Baịbụl gụpụta ọtụtụ n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị na ya. Nke a ga-eme ka onye a na-amụrụ Baịbụl ghọta na ihe ọ na-amụ bụ Okwu Chineke.—Aịza. 54:13.
5. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji kwadebe nke ọma tupu anyị agawa ịmụrụ mmadụ broshọ a?
5 A kọwaghị amaokwu Baịbụl niile e dere na broshọ a. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ ka o nyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka ịjụ onye na-amụrụ ya ihe ajụjụ. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ na-amụrụ ya ihe mara otú ọ ga-esi nyere ya aka ka ọ ghọta amaokwu Baịbụl ahụ. N’ihi ya, i kwesịrị ịkwadebe nke ọma tupu gị agawa ịmụrụ mmadụ broshọ a. Anyị ekwesịghị ikwu ọtụtụ okwu mgbe anyị na-amụrụ mmadụ broshọ a. A guọ Baịbụl, anyị kwesịrị ịhapụ onye anyị na-amụrụ ihe ka o jiri aka ya kọwaa amaokwu Baịbụl ahụ. Anyị nwekwara ike ịjụ ya ajụjụ ụfọdụ ga-enyere ya aka ịkọwa amaokwu ahụ. Ihe ndị a ga-enyere ya aka icheta ihe ebe ahụ a gụrụ na-ekwu.—Ọrụ 17:2.
-