Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
NỌVEMBA 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 5-6
“Ndị Anyị na Ha Nọ Karịrị Ndị Ha na Ha Nọ”
it-1 716 ¶4
Ịlaịsha
A Napụtara Ndị Izrel n’Aka Ndị Siria. Mgbe Eze Jehoram na-achị Izrel, ndị Siria kpara nkata ịlụso ndị Izrel ọgụ na mberede. Mana, Ịlaịsha gbaara Eze Jehoram àmà ugboro ugboro banyere nkata ndị Siria na-akpa. Ihe a mere ka nkata Eze Ben-hedad nke Abụọ na ndị Siria ibe ya kpara kụọ afọ n’ala. Ná mmalite, Ben-hedad chere na o nwere otu n’ime ndị agha ya bụ́ sabo. Mana, mgbe ọ matara na ọ bụ Ịlaịsha na-agbarụrụ ya mmiri, o zigara ìgwè ndị agha ya na Dotan, ha ejiri ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa ya gburugburu ka ha nwee ike ijide Ịlaịsha. Ụjọ bịara onye na-ejere Ịlaịsha ozi. Ma, Ịlaịsha rịọrọ Chineke ka o meghee anya onye ahụ na-ejere ya ozi ka ‘ọ hụ na ihe juru n’ebe ahụ bụ́ ugwu ugwu bụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha ndị na-acha ọkụ ọkụ, ndị gbara Ịlaịsha gburugburu.’ Ka ndị agha Siria na-abịaru nso, Ịlaịsha rịọziri Jehova ka o mee ihe dị iche n’ihe ahụ o meere onye na-ejere ya ozi. Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Biko, mee ka ndị a kpuo ìsì.” Ịlaịsha gwaziri ndị Siria, sị: “Soronụ m.” Ma, Ịlaịsha esekpụghị ha n’aka na-aga. Ihe a gosiri na ndị agha ahụ ka na-ahụ ụzọ, mana e nwere ike ịsị na uche ha kpuru ìsì, ya bụ, ha amaghịzi onwe ha. Ha amaghị na ọ bụ Ịlaịsha, onye ha bịara ijide, du ha na-aga. Ha amaghịkwa ebe o du ha na-aga.—2 Eze 6:8-19.
Ị̀ Na-ahụ Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ Ịlaịsha Hụrụ?
Ụjọ atụghị Ịlaịsha n’agbanyeghị na ndị iro gbara ya gburugburu na Dotan. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe siri ike na Jehova ga-anapụta ya. Anyị kwesịkwara inwe ụdị okwukwe ahụ. N’ihi ya, ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịna-enwe okwukwe ma na-akpa àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Luk 11:13; Gal. 5:22, 23.
it-1 343 ¶1
Ikpu Ìsì
Ọ ga-abụ na ìsì ahụ ndị agha Siria kpuru mgbe Ịlaịsha rịọrọ Jehova ka o mee ka ha kpuo ìsì abụghị ìsì nkịtị. Ọ bụrụ na ọ bụ ìsì nkịtị, ọ ga-adị mkpa ka e sekpụrụ ha niile n’aka na-aga. Ma, Baịbụl kwuru na Ịlaịsha gwara ha, sị: “Ebe a abụghị ụzọ. Obodo a abụghịkwa obodo unu na-aga. Soronụ m.” Mgbe otu nwoke aha ya bụ William James na-ekwu banyere ihe a n’akwụkwọ ya a na-akpọ Principles of Psychology (1981, Vol. 1, p. 59), ọ sịrị na nsogbu kacha dị ịtụnanya mmadụ nwere ike inwe n’ụbụrụ bụ na onye ahụ ga na-ahụ ụzọ, mana ụbụrụ ya agaghị na-aghọta ihe ọ na-ahụ. O kwukwara na ihe na-akpata ya abụghị na anya onye ahụ anaghịzi arụ ọrụ. Kama, o bụ n’ihi na ụbụrụ onye ahụ anaghịzi aghọta ihe anya ya na-ahụ. Ọ ga-abụ ụdị ikpu ìsì a ka Jehova wepụrụ n’ụbụrụ ndị agha ahụ mgbe ha ruru Sameria. (2 Eze 6:18-20) Ọ ga-abụkwa ụdị ìsì a ka Jehova mere ka ụmụ nwoke Sọdọm kpuo. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na obi anọghị na-ajọ ha njọ maka na ha ekpuola ìsì. Kama, Baịbụl kwuru na ha nọ na-achọ ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ Lọt.—Jen. 19:11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
5:15, 16—N’ihi gịnị ka Ịlaịsha ji jụ ịnara onyinye Neeman? Ịlaịsha jụrụ onyinye ahụ n’ihi na ọ maara na ọgwụgwọ a gwọrọ Neeman n’ụzọ ọrụ ebube sitere n’ike Jehova, ọ bụghị n’ike nke ya. Ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ya iji ọrụ Chineke nyere ya nweta uru. Ndị na-efe ezi ofufe taa adịghị achọ inweta uru nke onwe ha site n’ozi ha na-ejere Jehova. Ha na-eburu n’obi ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Matiu 10:8.
NỌVEMBA 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 7-8
“Jehova Mere Ihe A Na-atụghị Anya Ya”
it-1 716-717
Ịlaịsha
Ma mgbe e mechara, Ben-hedad nke Abụọ bịaghachiri ka ọ lụso Semeria agha. Na nke ugbu a, ọ bịaghị na mberede. Kama, ọ kwadebere nke ọma bịa nọchibido Sameria. Ihe bịara siere ndị Sameria ike n’oge ahụ nke mere na a gwara eze na otu nwaanyị eriela nwa ya nwoke. Eze Jehoram nwa Ehab, bụ́ “nwa ogbu mmadụ,” ṅụrụ iyi na ọ ga-egburịrị Ịlaịsha. Ma, o mezughị iyi ahụ ọ ṅụrụ n’echeghị echiche. Mgbe Jehoram na osote onyeisi ndị agha ya rutere n’ụlọ Ịlaịsha, o kwuru na ya anaghịzi atụ anya na Jehova ga-enyere ha aka. Ịlaịsha mere ka obi sie eze ike na nri ga-eju ebe niile n’echi ya. Ma, osote onyeisi ndị agha ahụ kwawara Ịlaịsha emo ma kwuo na ihe ahụ agaghị ekwe omume. N’ihi ya, Ịlaịsha gwara ya, sị: “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eri ya.” Jehova mere ka ndị agha Siria nụ oké mkpọtụ n’ebe ha mara ụlọikwuu, ha echee na e nwere ìgwè ndị agha si mba dị iche iche na-abịa ịlụso ha agha. Ha hapụrụ ihe oriri ha niile gbaa ọsọ. Mgbe eze nụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, o nyere osote onyeisi ndị agha ya iwu ka ọ na-elekọta ọnụ ụzọ ámá Sameria. Ma, ndị Izrel agụụ na-agụ ji ụkwụ zọgbuo ya mgbe ha nuuru n’ìgwè na-aga n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu ka ha bukọrọ ihe oriri ha. Ọ hụrụ ihe oriri ahụ, mana o detụghị ya ọnụ.—2 Eze 6:24–7:20.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 195 ¶7
Ọkụ
Ndị Eze Si n’Ezinụlọ Devid. Jehova Chineke mere Devid eze Izrel. Devid dukwara ndị Izrel nke ọma ma mee ihe Chineke gwara ya. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya “ọkụ Izrel.” (2 Sam. 21:17) Mgbe Jehova na Devid na-agba ndụ maka alaeze ya, Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.” (2 Sam. 7:11-16) N’ihi ya, ndị eze niile si n’ezinụlọ Devid, ya bụ, ndị si n’ezinụlọ nwa ya Solomọn, bụụrụ ndị Izrel “ọkụ.”—1 Eze 11:36; 15:4; 2 Eze 8:19; 2 Ihe 21:7.
NỌVEMBA 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 9-10
“Ọ katara Obi, Nwee Obi Ike, Na-anụkwa Ọkụ n’Obi”
Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Jeere Jehova Ozi
E nyere Jihu ọrụ ọ ga-arụ mgbe ihe ọjọọ na-eme ná mba Izrel. Ajọ nwaanyị bụ́ Jezibel, bụ́ nwunye Ehab nwụrụla anwụ, bụrụkwa nne Jehoram, bụ́ eze na-achị mgbe ahụ, na-akpa ajọ ike ná mba ahụ. O mere ka ụmụ Izrel hapụ Jehova fewe Bel, gbuo ndị amụma Chineke, jirikwa ‘iko ọ na-akwa’ na ‘afa ọ na-agba’ mee ka ụmụ Izrel mewe omume ọjọọ. (2 Eze 9:22; 1 Eze 18:4, 13) Jehova kwuru na a ga-ekpochapụ ezinụlọ Ehab, tinyere Jehoram na Jezibel. Ọ bụ Jihu ga-edu ndị ga-eme nke a.
Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Jeere Jehova Ozi
Jihu atụpụrụghị mmadụ abụọ e ziteere ya ọnụ. Ọ gbakwuuru Eze Jehoram na Ehazaya, bụ́ eze Juda, onye ya na Jehoram na-emekọ ihe, ebe onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ụgbọ ịnyịnya nke ya. Jehoram jụrụ Jihu, sị: “Jihu, udo ọ̀ dịkwa?” Ma, Jihu ji iwe zaa ya, sị: “Olee otú udo ga-esi dị ebe ọ bụ na nne gị Jezibel na-akwa iko ma na-agba afa nke ukwuu?” Ihe a Jihu zara menyere ya ụjọ, ya atụgharịa ka ọ gbalaga. Ma, ọ gbalahụlighị Jihu. Jihu mịịrị ụta ya gbaa Jehoram n’azụ, akụ́ ụta ahụ esi ya n’obi mapụta. Jehoram dara n’ụgbọ ịnyịnya ya nwụọ. N’agbanyeghị na Ehazaya jisiri ike gbalaga, Jihu mechara nweta ya ma hụ na e gburu ya.—2 Eze 9:22-24, 27.
Onye ọzọ a ga-egbukwa n’ezinụlọ Ehab bụ ajọ eze nwaanyị bụ́ Jezibel. Jihu kwutere ya mgbe ọ kpọrọ ya “onye a a bụrụ ọnụ.” Mgbe Jihu batara Jezril, ọ hụrụ Jezibel ka o si na windo dị n’ụlọ elu nke dị n’obí eze na-eleda anya n’ala. Jihu nyere ndị na-eje ozi n’obí eze iwu ozugbo ka ha si na windo ahụ tụdata ya. O jizi ịnyịnya ya rịa onye a merụrụla Izrel niile elu. Mgbe Jihu mechara nke a, o bibiri ọtụtụ ndị ọzọ si n’ezinụlọ eze ọjọọ bụ́ Ehab.—2 Eze 9:30-34; 10:1-14.
Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Jeere Jehova Ozi
Ọ bụ eziokwu na Jihu kwafuru ọbara hiri nne, ma, Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ nwoke nwere obi ike, onye napụtara ndị Izrel n’aka ajọ nwaanyị bụ́ Jezibel na ezinụlọ ya. Tupu onye ndú ọ bụla e nwere n’Izrel emelie ihe a o mere, ọ ga-akatarịrị obi, nwee obi ike, na-anụkwa ọkụ n’obi. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl sịrị: “Nke a bụ ọrụ tara akpụ nke e ji ike na nlezianya rụọ nke ọma. Ikekwe, ọ bụrụ na e ji anya ụra rụọ ya, a gaaraghị ekpochapụ ofufe Bel n’Izrel.”
O doro anya na i kweere na ụfọdụ ọrụ Ndị Kraịst nwere taa na-achọ ka ha jiri ụdị obi Jihu ji rụọ ọrụ e nyere ya rụọ nke ha. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a nwaa anyị ka anyị mee ihe Jehova sị anyị emela? Anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa, jiri obi ike jụ ime ihe ahụ. O nweghị ihe anyị ga-ekwe ka o mee ka anyị kwụsị ife Chineke n’ihi na anyị achọghị ka a maa Jehova aka.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jihu Ejiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Jeere Jehova Ozi
O nwere ike ịbụ na Jihu kweere na alaeze Izrel kwesịrị inwe okpukpe nke ya, alaeze Juda enweekwa nke ya, ka alaeze nke ọ bụla nwee ike ịnọrọ onwe ya. Iji nwee ike mezuo nke a, o mere ụdị ihe ndị eze bu ya ụzọ mere, ya bụ, ịhapụ ndị mmadụ ka ha na-efe nwa ehi. Nke a gosiri na o nweghịzi okwukwe na Jehova, bụ́ onye mere ya eze.
Jehova jara Jihu mma n’ihi na ‘o mere nke ọma n’ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. Ma, Jihu “elezighị anya were obi ya dum jee ije n’iwu Jehova bụ́ Chineke Izrel.” (2 Eze 10:30, 31) Nke a nwere ike iju gị anya ma wute gị ma ọ bụrụ na i chechaa ihe ọma niile ahụ Jihu mere. Ma, nke a nwere ihe ọ na-akụziri anyị. Anyị ekwesịtụghị iji adịm ná mma anyị na Jehova gwurie egwu. Anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-eme uche Chineke mgbe niile site n’ịgụ Okwu ya, ịtụgharị uche na ya, na isi n’ala ala obi anyị na-ekpeku Nna anyị nke eluigwe ekpere. Ya mere, ka anyị lezie anya hụ na anyị ji obi anyị dum na-eje ije n’iwu Jehova.—1 Kọr. 10:12.
NỌVEMBA 28–DISEMBA 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 11-12
“Jehova Tara Nwaanyị Ọjọọ Chọrọ Inweta Ihe Na-erughịrị Ya Ahụhụ”
it-1 209
Atalaya
Atalaya mere ka nne ya bụ́ Jezibel. Ọ manyere di ya bụ́ Jehoram ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova mgbe ọ chịrị ndị Izrel afọ asatọ. (1 Eze 21:25; 2 Ihe 21:4-6) Ebe ọzọ Atalaya sikwa mee ka nne ya bụ na ọ kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha n’eleghị anya n’azụ. Mgbe nwa ya nwoke arụrụala aha ya bụ Ehazaya nwụrụ mgbe ọ chịchara otu afọ, Atalaya gburu ụmụ nwoke ndị ọzọ niile si n’ezinụlọ eze, ma e wezụga obere nwata nwoke bụ́ Jehoash. Nnukwu onye nchụàjà na nwunye ya zoro Jehoash ka ọ ghara igbu ya. Nwunye nnukwu onye nchụàjà a bụ nwanne nna Jehoash. Atalaya meziri onwe ya eze nwaanyị, chịakwa afọ isii, malite n’ihe dị ka afọ 905 ruo 899 Tupu Oge Ndị Kraịst. (2 Ihe 22:11, 12) Ụmụ ya ndị nwoke banyere n’ụlọ nsọ Jehova n’ike bukọrọ ihe ndị dị nsọ dị ebe ahụ ma jiri ha na-efe Bel.—2 Ihe 24:7.
it-1 209
Atalaya
Mgbe Jehoash dị afọ asaa, nnukwu onye nchụàjà na-atụ egwu Chineke aha ya bụ Jehoyada kpọpụtara ya n’ebe e zoro ya ma mee ya eze n’ihi na ọ bụ ya ka eze ruuru. Mgbe Atalaya nụrụ ihe a, ọ gbaara gawa n’ụlọ nsọ. Mgbe o ruru ebe ahụ hụ ihe na-emenụ, o tiri mkpu, sị: “Ha agbaala m mgba okpuru! Ha agbaala m mgba okpuru!” Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Jehoyada nyere iwu ka a kpọpụ ya n’ụlọ nsọ ahụ ma gbuo ya n’ebe ịnyịnya si abanye n’ụlọ eze. Ọ dị ka ọ̀ bụ nwaanyị a bụ onye ikpeazụ fọrọ n’ezinụlọ ọjọọ Ehab. (2 Eze 11:1-20; 2 Ihe 22:1–23:21) Baịbụl kwuru na “o nweghị ihe ọ bụla Jehova kwuru, nke Jehova kwuru ga-eme ezinụlọ Ehab, na-agaghị emezu.” N’eziokwu, ha niile mezuchara.—2 Eze 10:10, 11; 1 Eze 21:20-24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jehoash
Ka Jehoash na-erule afọ asaa, Jehoịada Nnukwu Onye Nchụàjà adịla njikere imezu atụmatụ ya bụ́ ịchụtu eze nwanyị ahụ ji aka ike zọrọ ọchịchị na-erughịrị ya. O si n’ebe e zoro nwata ahụ kpọpụta ya ma chie ya eze dị ka onye ọchịchị alaeze ahụ ruru n’aka. Ndị nche obí eze chụpụziri ajọ Eze Nwanyị Atalaịa n’ogige ụlọ nsọ ahụ ma gbuo ya, nke a mere ndị obodo ahụ obi ụtọ ma mee ka obi ruo ha ala. Site n’ihe ha mere, Jehoịada na Jehosheba tụnyere ụtụ dị ukwuu n’iweghachi ezi ofufe n’ala Juda. Ma nke ka mkpa bụ na ha tụnyere ụtụ n’ịhụ na usoro ndị eze si n’eriri Devid, bụ́ nke a ga-esi na ya nweta Mezaịa ahụ, dịgidere.—2 Ndị Eze 11:4-21.
DISEMBA 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 13-15
“Mmadụ Iji Obi Ya Niile Arụ Ọrụ Na-eme Ka A Ga-agọzie Ya”
Ị̀ Na-esosi Kraịst Ike?
11 Iji gosi anyị na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi dị mkpa, cheta otu ihe nke mere ná ndụ Eze Jehoash nke chịrị Izrel. Jehoash beere ákwá bịakwute Ịlaịsha n’ihi na obi ya nọ na-agwa ya na ndị Siria nwere ike imeri Izrel n’agha. Ịlaịsha wee gwa ya ka o si na windo nke chere ihu n’ebe Siria dị gbapụ akụ́, bụ́ nke na-egosi na Jehova ga-enyere ha aka imeri Siria. Nke a kwesịrị ime ka obi sie Jehoash ike. Ịlaịsha wee gwa Jehoash ka o tie akụ́ ndị o ji n’aka n’ala. Jehoash etie ha naanị ugboro atọ. Nke a were Ịlaịsha nnukwu iwe, n’ihi na iti akụ́ ndị ahụ ugboro ise ma ọ bụ isii gaara apụta na ọ “ga na-egbu ndị Siria ruo mgbe ha gwụchara.” N’ihi nke a, Jehoash ga-emeri ha naanị ugboro atọ, ma, ọ gaghị emeri ha nke ọma. Jehoash emerighị ha nke ọma n’ihi na o jighị ịnụ ọkụ n’obi tie akụ́ ndị ahụ n’ala. (2 Eze 13:14-19) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a? Anyị ga-enweta ngọzi Jehova n’ụba naanị ma ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile nakwa ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi.
“Onye Na-akwụ Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ”
Olee ndị Jehova na-akwụ ụgwọ ọrụ? Pọl sịrị na ọ bụ “ndị na-achọsi ya ike.” Otu akwụkwọ na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “na-achọsi ya ike” apụtaghị “ịga chọgharịwa Chineke.” Kama, ọ pụtara mmadụ ịgba mbọ ‘na-efe Chineke.’ Akwụkwọ ọzọ kwuru na okwu Grik a pụtara mmadụ ịgbalịsi ike mee ihe ma legide anya n’ihe ahụ ọ na-eme. N’eziokwu, Jehova na-akwụ ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ụgwọ, bụ́ ndị ji obi ha dum hụ ya n’anya ma na-efe ya.—Matiu 22:37.
Olee ụgwọ ọrụ Jehova ga-akwụ ndị na-efe ya? O kwere ha nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Nkwa ọma a o kwere gosiri na ọ na-emesapụ aka ma hụ anyị n’anya nke ukwuu. (Mkpughe 21:3, 4) O nwedịrị ọtụtụ uru ndị na-achọsi Jehova ike na-erite ugbu a. Mmụọ nsọ Chineke na ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl na-eme ka obi na-atọ ha ụtọ, meekwa ka ndụ ha baa ezigbo uru.—Abụ Ọma 144:15; Matiu 5:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
13:20, 21—Ọrụ ebube a ọ̀ na-akwado ife ihe oyiyi okpukpe ofufe? Ee e, ọ dịghị akwado ya. Bible adịghị egosi na ọ dị mgbe e fere ọkpụkpụ Ịlaịsha ofufe. Ọrụ ebube a sitere n’ike Chineke, dịkwa ka ọrụ ebube nile Ịlaịsha rụrụ mgbe ọ ka dị ndụ.
DISEMBA 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 16-17
“Ndidi Jehova A Gaghị Adịru Mgbe Ebighị Ebi”
it-2 908 ¶5
Shalmaniza
Mgbe O Meriri Izrel. Mgbe Eze Hoshia na-achị Izrel (malite n’ihe dị ka afọ 758 ruo afọ 740 Tupu Oge Ndị Kraịst), Shalmaniza nke Ise chị ndị agha ya bata Palestaịn. Hoshia ghọziri ohu ya, malitekwa ịtụrụ ya ụtụ kwa afọ. (2 Eze 17:1-3) Ma mgbe e mechara, Hoshia kwụsịrị ịtụrụ ya ụtụ ahụ. Shalmaniza chọpụtakwara na Hoshia na eze Ijipt aha ya bụ Soo nọ na-akpara ya nkata ọjọọ. Ihe a mere ka Shalmaniza tụba Hoshia n’ụlọ mkpọrọ ma nọchịbido Sameria ruo afọ atọ. Mgbe afọ atọ ahụ gachara, obodo ahụ e wusiri ike dara. A dọọkwara ndị Izrel n’agha.—2 Eze 17:4-6; 18:9-12; i nwere ike ịtụle Hos. 7:11; Ezik. 23:4-10.
it-1 414-415
Ịdọrọ Ndị Mmadụ n’Agha
Isi ihe mere e ji dọrọ alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu Izrel nakwa alaeze ebo abụọ bụ́ Juda nke dị n’ebe ndịda n’agha bụ n’ihi na ha kwụsịrị ife Jehova ma fewezie chi ụgha dị iche iche. (Diut. 28:15, 62-68; 2 Eze 17:7-18; 21:10-15) Jehova nọgidere na-eziga ndị ozi ya ka ha dọọ ha aka ná ntị, ma, ha ekweghị ege ntị. (2 Eze 17:13) Jeroboam bụ́ eze mbụ chịrị alaeze ebo iri nke Izrel mere ka ndị mmadụ malite ikpere arụsị. O nweghịkwanụ eze ọzọ chịrị ebe ahụ mere ka ikpere arụsị laa kpamkpam. Ụmụnne ha bụ́ alaeze ebo abụọ bụ́ Juda ekweghịkwa ege Jehova ntị. Ha echegharịghịkwa mgbe ha hụrụ na a dọrọla ụmụnne ha ndị Izrel n’agha. (Jere. 3:6-10) E mechara dọrọkwa hanwa n’agha otú a dọọrọ ụmụnne ha. A dọọrọ mba abụọ a n’agha ihe karịrị otu ugboro.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 847
Onye Sameria
Ebe mbụ okwu bụ́ “ndị Sameria” gbara na Baịbụl bụ mgbe e merichara alaeze ebo iri bụ́ Sameria n’afọ 740 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ndị a kpọrọ aha a bụ ndị bi n’alaeze Izrel dị n’ebe ugwu tupu ndị Asiria emerie obodo ahụ. Ndị Asiria mechaziri kpọta ụfọdụ ndị bi n’ebe ndị ọzọ ha na-achị ka ha biri n’ebe ahụ. (2 Eze 17:29) Ọ ga-abụ na ndị Asiria achụpụchaghị ndị Izrel niile bi n’ebe ahụ n’ihi na ihe e kwuru na 2 Ihe E Mere 34:6-9 (i nwekwara ike ịtụle 2 Eze 23:19, 20) gosiri na mgbe Eze Josaya na-achị, e nwere ndị Izrel ka fọrọ n’ebe ahụ. Ka oge na-aga, ndị a kpọwaziri “ndị Sameria” bụ ndị si ma n’ezinụlọ ndị Izrel ahụ fọrọ na Sameria ma n’ezinụlọ ndị ahụ ndị Asiria kpọtara. Ọ pụtakwara na ụfọdụ n’ime ndị a na-akpọ “ndị Sameria” bụ ụmụ ndị Izrel lụrụ ndị ahụ bịara abịa mụtara. Ihe okwu ahụ bụ́ “ndị Sameria” pụtara mechakwara gbanwetụ. Ndị a kpọwaziri “ndị Sameria” bụ ndị na-ekpe otu okpukpe wuru ewu n’ebe ndị dị nso na Shikem oge ochie nakwa na Sameria. Ihe ụfọdụ ha kweere dị ezigbo iche n’ihe ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu kweere.—Jọn 4:9.
DISEMBA 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 18-19
“Otú Ndị Na-emegide Anyị Si Agbalị Ime Ka Anyị Daa Mbà”
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
18:19-21, 25—Hezekaịa ò sooro Ijipt jikọọ aka? Ee e. Ebubo Rabshake bụ ụgha, dịkwa ka nzọrọ ọ zọọrọ na ọ bụ ‘Jehova sịrị’ ya bịa bụ. Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi dabeere kpamkpam na Jehova.
“Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”
Rabshake ji aghụghọ kwuo ihe ga-eme ka ndị Juu malite inwe obi abụọ. Ọ sịrị: “Ọ́ bụghị [Jehova] bụ onye Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu ya nakwa ebe ịchụàjà ya? . . . Ọ bụ Jehova sịrị m, ‘Gbagoo buso ala a agha, laakwa ya n’iyi.’ ” (2 Eze 18:22, 25) Ihe Rabshake kwuru bụ na Jehova agaghị alụrụ ndị ya agha n’ihi na ha mere ihe na-adịghị ya mma. Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Ihe Hezekaya na ndị Juu ndị maliteghachiri ife Jehova na-eme dị Jehova mma.—2 Eze 18:3-7.
Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
14 Eze Asiria na ndị agha ya mara ụlọikwuu ha na Lekish, n’agbata ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem. O si ebe ahụ dunye mmadụ atọ ka ha gaa gwa ndị bi na Jeruselem ka ha chịlie aka elu. Onyeisi ndị ozi ahụ bụ otu nwoke a na-akpọ Rabshake. O ji asụsụ Hibru gwa ndị bi na Jeruselem ka ha ghara ige Eze Hezekaya ntị, kama ka ha rubere ndị Asiria isi. O kwere ha nkwa na eze Asiria ga-akpọga ha n’ala ọzọ ebe ha ga na-ekpori ndụ. Ma, ihe ahụ o kwuru bụ ụgha. (Gụọ 2 Ndị Eze 18:31, 32.) Rabshake kwukwara na ebe ọ bụ na chi mba ndị ọzọ ha meriri echebeghị ndị na-efe ha, na Jehova agaghị anapụtali ndị Juu n’aka ndị Asiria. N’agbanyeghị ụgha ahụ niile ọ ghara, ndị Juu ahụ atụpụrụghị ya ọnụ. Ndị na-efe Jehova na-emekarị otú ahụ taa.—Gụọ 2 Ndị Eze 18:35, 36.
yb74 177 ¶1
Agba nke 2—Jamanị
Ndị uwe ojii nzuzo na-eji ụzọ aghụghọ dị iche iche eme ka anyị bịanye aka n’akwụkwọ na anyị abụghịzi Ndịàmà Jehova. Ma ọtụtụ mgbe, mmadụ bịanyechaa aka n’akwụkwọ a, ha na-ebidokwa tawa onye ahụ ahụhụ karịadị otú ha na-ata ya na mbụ. Ihe Nwanna Karl Kirscht kwuru gosiri na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụ Ndịàmà Jehova ka a kacha jiri aghụghọ mesoo ihe n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche ha nọ. Ndị na-emegide anyị chere na ha ga-esi otú ahụ mee ka anyị bịanye aka n’akwụkwọ na anyị abụghịzi Ndịàmà Jehova. Ha na-agwa anyị mgbe niile ka anyị bịanye aka n’akwụkwọ. Ụfọdụ bịanyere, mana ọtụtụ mgbe, a naghị a tọhapụ ha ruo ihe karịrị otu afọ. N’oge a ka ji ha eji, ndị uwe ojii nzuzo na-emekarị ha akaja, na-akpọ ha ndị ihu abụọ na ndị ụjọ. Tupu a tọhapụ ha, a na-amanyekwa ha ịgafe n’ihu ụmụnna ha ndị nke na-ekweghị abịanye aka n’akwụkwọ iji kwanyere ụmụnna ha ahụ ùgwù.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 155 ¶4
Ihe Ndị E Gwupụtara n’Ala
Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ bụ Adramelek na Shariza bụ́ ụmụ Senakerib eze Asiria gburu Senakerib, nakwa na ọ bụ nwa Senakerib ọzọ aha ya bụ Isa-hadọn nọchịrị ya. (2 Eze 19:36, 37) Ma, otu ihe ndị Babịlọn dere kwuru na n’abalị iri abụọ n’ọnwa Tibet, nwa Senakerib gbara ya mgba okpuru ma gbuo ya. E nwekwara mmadụ abụọ ọzọ kwuru otu ihe ahụ, ya bụ, na ọ bụ naanị otu n’ime ụmụ Senakerib gburu ya. Otu onye bụ Berossus bụ́ onye nchụàjà biri na Babịlọn ihe dị ka afọ 2,300 gara aga, onye nke ọzọ abụrụ Nabonaịdọs bụ́ eze Babịlọn, onye dịrị ndụ ihe dị ka afọ 2,600 gara aga. Ma n’otu ihe odide e gwupụtara na nso nso a, Isa-hadọn, bụ́ onye nọchiri Senakerib, kwuru hoo haa na ụmụnne ya (ya bụ, mmadụ abụọ) gbara nna ha mgba okpuru, gbuo ya ma gbaa ọsọ. Mgbe Philip Biberfeld na-ekwu gbasara ihe a n’akwụkwọ bụ́ Universal Jewish History (1948, Vol. I, p. 27), ọ sịrị: ‘Ihe ahụ Nabonaịdọs na Berossus kwuru abụghị eziokwu. Ọ bụ nke ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu. A chọpụtara na ihe niile Isa-hadọn dere banyere ihe a merenụ ka bụrụ eziokwu karịa ihe ndị Babịlọn dere. Ihe a a chọpụtara dị ezigbote mkpa, ọ ga-enyekwa aka ma e lebawa anya n’ihe ndị ọzọ a chọpụtara n’oge a na-adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru.’
DISEMBA 26–JENỤWARỊ 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 20-21
“Jehova Nyeere Hezekaya Aka n’Ihi Ekpere O Kpere”
E Nye Ụgwọ Ọrụ Maka Okwukwe nke Otu Eze
23 N’ihe dị ka n’oge mbụ Senakerib wakporo Juda, Hezekaịa dara oké ọrịa. Aịsaịa gwara ya na ọ gaje ịnwụ. (Aịsaịa 38:1) O wutere eze ahụ dị afọ 39 nke ukwuu. Nchegbu ya abụghị nanị maka ọdịmma nke ya kamakwa maka ọdịnihu nke ndị ahụ. Jerusalem na Juda nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị Asiria wakporo. Ọ bụrụ na Hezekaịa anwụọ, ònye ga-eduzi agha ahụ? N’oge ahụ, Hezekaịa enweghị nwa nwoke ọ bụla ga-eweghara ịchịisi. N’ekpere sitere n’ala ala obi, Hezekaịa rịọrọ Jehova ka o meere ya ebere.—Aịsaịa 38:2, 3.
Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova
16 Hezekaya mechara rịawa ọrịa, ya afọ obere ka ọ nwụọ. Ọ rịọrọ Jehova ka o cheta otú o si jee ije n’ihu ya. (Gụọ 2 Ndị Eze 20:1-3.) Anyị mụtara na Baịbụl na anyị ekwesịghị ịtụ anya n’oge a ka Chineke rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị ma ọ bụ mee ka anyị dịkwuo ogologo ndụ. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịgwa Jehova n’ekpere otú ahụ Hezekaya gwara ya, sị: ‘M ji eziokwu na obi zuru ezu jee ije n’ihu gị.’ Obi ò siri gị ike na Jehova ga na-elekọta gị mgbe niile, ọ bụrụgodị na ị na-arịa ọrịa?—Ọma 41:3.
Olee Otú Ekpere Pụrụ Isi Nyere M Aka?
N’oge Bible, ụfọdụ ndị ikom nwere okwukwe natara kpọmkwem—ọbụna n’ụzọ ọrụ ebube—azịza nke ekpere ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Hezekaịa matara na ọrịa ọ na-arịa gaje igbu ya, ọ rịọsiri Chineke ike ka ọ napụta ya. Chineke zara ya, sị: “Anụwo m ekpere gị, ahụwo m anya mmiri gị: lee, m na-eme ka ahụ gị dị ike.” (2 Ndị Eze 20:1-6) Chineke mekwara ihe maka ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ na-atụ egwu ya.—1 Samuel 1:1-20; Daniel 10:2-12; Ọrụ 4:24-31; 10:1-7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 240 ¶1
Ihe E Ji Atụ̀ Ihe Iji Mata Ma Ihe Ọ̀ Dị Larịị
E nwere ike iji ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị rụọ ụlọ ka ụlọ ahụ kwụrụ kwem, ma ọ bụkwanụ jiri ya mata ma è kwesịrị ịhapụ ụlọ ka è kwesịrị ịkwatu ya. Jehova kwuru na ọ ‘ga-esetị eriri e ji atụ̀ ihe na Jeruselem, jiri ya tụọ ya otú ahụ o si jiri ya tụọ Sameria, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị tụọ Jeruselem, otú ahụ o si jiri ya tụọ ezinụlọ Ehab.’ Mgbe Chineke tụchara Sameria na ezinụlọ Eze Ehab, ọ chọpụtara na ha na-eme omume ọjọọ, ya bụ, na ụzọ ha akwụghị ọtọ. Ihe a mere ka o bibie ha. Otú ahụkwa ka Chineke ga-esi kpee Jeruselem na ndị ọchịchị ya ikpe iji gbaa arụrụala ha n’anwụ ma bibie obodo ahụ. Ihe a mezuru n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. (2 Eze 21:10-13; 10:11) Jehova si n’ọnụ Aịzaya gwa ndị ahụ na-etu ọnụ na ndị ọchịchị ọjọọ ahụ nọ na Jeruselem na ọdachi ga-adakwasị ha nakwa na ya “ga-eme ka ikpe ziri ezi bụrụ eriri e ji atụ̀ ihe, meekwa ka ezi omume bụrụ ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị.” Ikpe ziri ezi na ezi omume Chineke ga-eji tụọ ha ga-eme ka a mata ndị na-efe ya n’eziokwu, meekwa ka a mata ndị na-anaghị efe ya. Ọ ga-ejizi ya mara ndị ọ ga-echebe na ndị ọ ga-ebibi.—Aịza. 28:14-19.