Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jizọs Ejiri Osisi Fig Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Inwe Okwukwe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ele osisi fig ahụ Jizọs mere ka ọ kpọnwụọ

      ISI NKE 105

      Jizọs Ejiri Osisi Fig Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Inwe Okwukwe

      MATIU 21:19-27 MAK 11:19-33 LUK 20:1-8

      • JIZỌS EJIRI OSISI FIG KPỌNWỤRỤ AKPỌNWỤ KỤZIERE ANYỊ INWE OKWUKWE

      • A JỤRỤ JIZỌS ONYE NYERE YA IKIKE

      Mgbe Jizọs si na Jeruselem pụọ n’ehihie Mọnde, ọ laghachiri na Betani. Betani dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Ugwu Oliv. Ọ ga-abụ na o hiri n’ụlọ ndị enyi ya bụ́ Lazarọs, Meri, na Mata.

      Ugbu a, chi ụtụtụ nke abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan abọọla. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọkwa n’ụzọ ugbu a na-alaghachi Jeruselem. Nke ahụ ga-abụ nke ikpeazụ ọ ga-aga ebe ahụ. Ọ bụkwa ụbọchị ikpeazụ ọ ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma tupu ya emee Ememme Ngabiga, malite Ncheta Ọnwụ ya, ndị mmadụ ekpee ya ikpe ma gbuo ya.

      Mgbe ha si Betani pụta, ma si n’Ugwu Oliv na-aga Jeruselem, Pita hụrụ osisi ahụ Jizọs bụrụ ọnụ n’ụtụtụ ụnyaahụ. Ọ gwara Jizọs, sị, “Rabaị, lee! osisi fig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụwo.”—Mak 11:21.

      Gịnị mere Jizọs ji mee ka osisi fig ahụ kpọnwụọ? Jizọs sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, a sị nnọọ na unu nwere okwukwe ma ghara inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe m mere osisi fig a, kama, ọ bụrụ na unu asị ugwu a, ‘Ka e bulie gị tụba gị n’oké osimiri,’ ọ ga-eme. Ihe niile unu na-arịọ n’ekpere ma nwee okwukwe, unu ga-enweta ha.” (Matiu 21:21, 22) Ọ bụ ụdị ihe a ka Jizọs kwuru na mbụ, nke bụ́ na okwukwe nwere ike ime ka ugwu si n’ebe ọ dị gaa ebe ọzọ.—Matiu 17:20.

      Jizọs ji osisi fig ahụ o mere ka ọ kpọnwụọ kụziere anyị na anyị kwesịrị inwe okwukwe na Chineke. Jizọs kwuru, sị: “Ihe niile nke unu na-ekpe n’ekpere ma na-arịọ n’arịrịọ, nweenụ okwukwe na unu anatachaworị ha, unu ga-enwetakwa ha.” (Mak 11:24) Ihe a Jizọs kụziri bụ ihe dị ezigbo mkpa ndị na-eso ụzọ ya niile kwesịrị ịmụta. Ndị ọ kacha dị mkpa bụ ndịozi ya n’ihi ọnwụnwa tara akpụ na-aga ịbịara ha n’oge na-adịghị anya. Ma, e nwere ihe ọzọ osisi fig ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ na-akụziri anyị banyere okwukwe.

      Otú ahụ osisi fig ahụ si yie ihe nwere mkpụrụ ma o nweghị mkpụrụ bụ otú mba Izrel si yie ndị nwere okwukwe na Chineke ma ha enweghị okwukwe. Ndị Izrel na Chineke gbara ndụ. I leekwa ha anya, ị ga-eche na ha na-edebe Iwu Chineke. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ha enweghị okwukwe, e nweghịkwa mkpụrụ dị mma ha mịrị. Ha jụdịrị Ọkpara Chineke. Ihe mere Jizọs ji mee ka osisi fig ahụ na-amịghị mkpụrụ kpọnwụọ bụ iji gosi ihe ga-emecha mee mba Izrel, bụ́ mba na-enweghị okwukwe, nke na-amịghịkwa mkpụrụ.

      Mgbe obere oge gachara, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya batara na Jeruselem. Dị ka Jizọs na-emekarị, ọ gara n’ụlọ nsọ malite ịkụzi ihe. Ọ ga-abụ na ndị isi nchụàjà na ndị okenye chetara ihe Jizọs mere ndị na-agbanwe ego n’ụbọchị bọtara ụbọchị ahụ, nke mere ha ji bịa jụọ ya, sị: “Olee ikike i ji eme ihe ndị a? ma ọ bụ ònye nyere gị ikike a ime ihe ndị a?”—Mak 11:28.

      Jizọs gwara ha, sị: “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Zaanụ m ya, m ga-agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a. Baptizim Jọn mere, ò si n’eluigwe ka ò si n’aka mmadụ? Zaanụ m ya.” Ọ bụzi ndị isi nchụàjà na ndị okenye ga-aza ya ajụjụ. Ndị isi nchụàjà na ndị okenye gbara izu n’etiti onwe ha ka ha mara ihe ha ga-aza Jizọs. Ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere unu ekwereghị ya?’ Ma ànyị ga-anwa anwa sị, ‘O si n’aka mmadụ’?” Ihe mere na ha azaghị na o si n’aka mmadụ bụ na ha na-atụ ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ egwu, ‘n’ihi na ìgwè mmadụ ahụ weere ya na Jọn bụ onye amụma.’—Mak 11:29-32.

      Ndị ahụ na-emegide Jizọs amaghị ihe ha ga-aza. N’ihi ya, ha sịrị Jizọs: “Anyị amaghị,” Jizọs asịkwanụ ha: “M gaghịkwa agwa unu ikike m ji eme ihe ndị a.”—Mak 11:33.

      • Gịnị mere abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan ji bụrụ ụbọchị pụrụ iche?

      • Gịnị ka Jizọs ji osisi fig ahụ o mere ka ọ kpọnwụọ kụzie?

      • Olee otú Jizọs si mee ka ọnụ mechie ndị jụrụ ya ikike o ji arụ ọrụ?

  • Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe ndị ọrụ ubi vaịn na-egbu ọkpara onye nwe ubi vaịn

      ISI NKE 106

      Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn

      MATIU 21:28-46 MAK 12:1-12 LUK 20:9-19

      • IHE ATỤ JIZỌS MERE GBASARA ỤMỤ NDỊ IKOM ABỤỌ

      • IHE ATỤ JIZỌS MERE GBASARA NDỊ ỌRỤ UBI VAỊN

      Ozugbo Jizọs mechara ka ọnụ mechie ndị isi nchụàjà na ndị okenye ahụ nọ n’ụlọ nsọ, bụ́ ndị jụrụ ya onye nyere ya ikike o ji arụ ọrụ, o meere ha ihe atụ gosiri ụdị ndị ha bụ.

      Ọ gwara ha, sị: “Otu nwoke nwere ụmụ abụọ. Mgbe ọ gakwuuru onye nke mbụ, ọ sịrị, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ taa n’ubi vaịn m.’ Onye nke a sịrị, ‘Agaghị m aga.’ E mesịa, ọ kwara ụta wee gaa. Mgbe ọ bịakwutere onye nke abụọ, gwa ya otu ihe ahụ, onye nke a zara, sị, ‘M ga-aga, nna m,’ ma ọ gaghị. Ònye n’ime ha abụọ mere uche nna ya?” (Matiu 21:28-31, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e bipụtara n’afọ 2013) À na-ajụkwa ajụ? Ọ bụ onye nke mbụ ahụ n’ihi na o mechara mee ihe nna ya kwuru.

      Jizọs gwara ndị ahụ na-emegide ya, sị: “N’ezie, ana m asị unu na ndị ọnaụtụ na ụmụ nwaanyị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’alaeze Chineke.” Ndị ọnaụtụ na ndị akwụna bu ụzọ jụ ife Chineke. Ma, ha mere ka nwa mbụ ahụ. Ha chegharịrị, ma bido ife Chineke. Ma, ndị isi nchụàjà ahụ na ndị okenye ahụ dị ka nwa nke abụọ ahụ. Ha na-ekwu na ha na-efe Chineke, ma otu abụghị n’ezi. Jizọs gwara ha, sị: “Jọn [Onye Na-eme Baptizim] bịakwutere unu, na-egosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekwereghị ya. Otú ọ dị, ndị ọnaụtụ na ụmụ nwaanyị akwụna kweere ya, ma unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu hụrụ nke a, unu akwaghị ụta n’ikpeazụ ka unu wee kwere ya.”—Matiu 21:31, 32.

      Jizọs mekwaara ha ihe atụ ọzọ. Na nke ugbu a, o gosiri na ndị ndú okpukpe medịrị ihe karịrị ịghara ife Chineke njọ. Ha bụ nnọọ ndị ọjọọ. Jizọs kwuru, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn, gbaakwa ya ogige gburugburu, ma gwuo olulu nke mmanya si n’ebe nzọchapụta mmanya ga na-agbanye, wuokwa ụlọ elu, ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gawa mba ọzọ. Mgbe oge ruru, o zipụrụ otu ohu ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ, ka o wee nata ndị ọrụ ubi ahụ ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ubi vaịn ahụ. Ma ha jidere ya, tikasịa ya ahụ́ ma hapụ ya ka ọ lawa n’enyeghị ya ihe ọ bụla. O zipụkwara ohu ọzọ ka ọ gakwuru ha; ha kụkwara nke ahụ ihe n’isi ma menye ya ihere. O wee ziga onye ọzọ, ha gbukwara onye nke ahụ; o zigakwara ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị ha tikasịrị ụfọdụ n’ime ha ahụ́, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha.”—Mak 12:1-5.

      Ndị Jizọs na-agwa okwu, hà ghọtara ihe ihe atụ a pụtara? Ha nwere ike icheta okwu Aịzaya onye amụma ji katọọ ụmụ Izrel. Ọ sịrị: “Ụlọ Izrel bụ ubi vaịn Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị Juda bụkwa ubi nke na-eme ya obi ụtọ. O wee na-atụ anya ikpe ziri ezi, ma, lee! ọ bụ mmebi iwu ka ọ hụrụ.” (Aịzaya 5:7) Ihe atụ a Jizọs mere yiri nke Aịzaya mere. Onye nwe ubi vaịn ahụ bụ Jehova. Ubi vaịn ahụ bụ mba Izrel. Jehova ji Iwu o nyere ha chebe ha dị ka ubi vaịn a gbara ogige. Jehova zigara ndị amụma ya ka ha kụziere ndị ya ihe ma mee ka ha mịa ezi mkpụrụ.

      Ma, “ndị ọrụ ubi” ahụ mekpọrọ ụfọdụ “ndị ohu” e ziteere ha ọnụ, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha. Jizọs kwuru, sị: “[Onye nwe ubi vaịn ahụ] ka nwere otu onye ọzọ, bụ́ ọkpara ọ hụrụ n’anya. N’ikpeazụ, o zipụrụ ya ka ọ gakwuru ha, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ Ma ndị ọrụ ubi ahụ kwurịtara n’etiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye ga-eketa ubi a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ihe nketa a ga-abụkwa nke anyị.’ Ha wee jide ya gbuo.”—Mak 12:6-8.

      Jizọs jụziri ndị ndú okpukpe ahụ, sị: “Gịnị ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme?” (Mak 12:9) Ha zara ya, sị: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọjọọ, ọ ga-abịa bibie ha ajọ mbibi, ọ ga-enyefekwa ubi vaịn ahụ n’aka ndị ọzọ bụ́ ndị ọrụ ubi, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ya ruru.”—Matiu 21:41.

      Ha amaghị mgbe ha ji jiri aka ha maa onwe ha ikpe n’ihi na ha so ná “ndị ọrụ ubi” ahụ na-arụrụ Jehova ọrụ ‘n’ubi vaịn’ ya, nke bụ́ mba Izrel. Otu n’ime ihe ndị Jehova chọrọ n’aka ndị ọrụ ubi ya bụ ka ha nwee okwukwe n’Ọkpara ya, bụ́ Mesaya ahụ. Jizọs legidere ndị ndú okpukpe ahụ anya wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, ‘Nkume ahụ nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ọ bụ ya ghọrọ nkume isi nkuku bụ́ isi. Ihe a si n’aka Jehova, ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?” (Mak 12:10, 11) Jizọs meziri ka ihe ọ na-ekwu doo ha anya. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ ya mere m ji asị unu, a ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.”—Matiu 21:43.

      Ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà ghọtara na Jizọs “bu ha n’obi mee ihe atụ ahụ.” (Luk 20:19) N’ihi ya, ha chọsikwuru ike igbu “onye nketa” ahụ, ya bụ, Jizọs. Ma, ha achọghị igbu Jizọs ozugbo ahụ n’ihi na ha na-atụ ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ egwu, n’ihi na ha weere Jizọs ka onye amụma.

      • Ole ndị ka ụmụ ndị ikom abụọ Jizọs ji mee ihe atụ nọchiri anya ha?

      • N’ihe atụ nke abụọ Jizọs mere, ònye ka nwoke ahụ “kọrọ ubi vaịn” nọchiri anya ya? Gịnị ka “ubi vaịn” ahụ nọchiri anya ya? Ole ndị ka “ndị ọrụ ubi” ahụ nọchiri anya ha? Ole ndị ka “ndị ohu” ahụ nọchiri anya ha? Ònye ka “onye ga-eketa ubi” ahụ nọchiri anya ya?

      • Olee ihe a ga-eme “ndị ọrụ ubi” ahụ?

  • Otu Eze Agwa Ohu Ya Ka Ọ Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Oriri Agbamakwụkwọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Eze ahụ na-ekwu ka a tụpụ nwoke na-eyighị uwe agbamakwụkwọ bịa oriri agbamakwụkwọ n’èzí

      ISI NKE 107

      Otu Eze Agwa Ohu Ya Ka Ọ Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Oriri Agbamakwụkwọ

      MATIU 22:1-14

      • IHE ATỤ JIZỌS MERE GBASARA ORIRI AGBAMAKWỤKWỌ

      Mgbe oge Jizọs ga-ejecha ozi ya ruwere, o mekwuru ihe atụ ndị ọzọ iji gbaa ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà n’anwụ. N’ihi ya, ha chọrọ igbu ya. (Luk 20:19) Ma, Jizọs agbachabeghị ha n’anwụ. O mere ihe atụ ọzọ. Ọ sịrị:

      “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke, bụ́ eze, nke meere nwa ya nwoke oriri alụmdi na nwunye. O wee zipụ ndị ohu ya ka ha gaa kpọọ ndị a kpọrọ òkù ịbịa oriri alụmdi na nwunye ahụ, ma ha ekweghị ịbịa.” (Matiu 22:2, 3) Ihe Jizọs ji malite ihe atụ a o mere bụ “Alaeze eluigwe.” N’ihi ya, “eze” ahụ o kwuru okwu ya enweghị onye ọzọ ọ ga-abụ ma ọ́ bụghị Jehova Chineke. Ònyekwanụ bụ nwa ya nwoke ahụ? Ole ndị bụ ndị a kpọrọ òkù ịbịa oriri alụmdi na nwunye ahụ? Azịza ha araghị ahụ́. Nwa eze ahụ bụ Ọkpara Jehova. Ọ bụkwa ya na-eme ihe atụ a. Ndị a kpọrọ òkù bụ ndị ga-eso Ọkpara Jehova chịa n’Alaeze eluigwe.

      Ole ndị e bu ụzọ kpọọ òkù ahụ? Ọ dị mma, ole ndị Jizọs na ndịozi ya nọ na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke? Ọ bụ ndị Juu. (Matiu 10:6, 7; 15:24) Ha kwetara ịna-edebe Iwu ha na Chineke ji gbaa ndụ n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ha si otú ahụ bụrụ ndị mbụ nwere olileanya ịghọ “alaeze nke ndị nchụàjà.” (Ọpụpụ 19:5-8) Ma, olee mgbe a ga-akpọ ha ka ha bịa “oriri alụmdi na nwunye ahụ”? Ọ bụ n’afọ 29, bụ́ mgbe Jizọs malitere ikwusa ozi ọma Alaeze eluigwe.

      Olee otú ọtụtụ ndị Izrel si zaa òkù ahụ a kpọrọ ha? Jizọs sịrị na ‘ha ekweghị abịa.’ Ọtụtụ n’ime ndị ndú okpukpe na ndị ọzọ ekwetaghị na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, bụ́ onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ Eze.

      Ma, Jizọs kwuru na ndị Juu ka nwere ohere ịbịa oriri ahụ. Ọ sịrị: “[Eze ahụ] zipụkwara ndị ohu ya ndị ọzọ, sị, ‘Gwanụ ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị: “Lee! Akwadebewo m nri ehihie m, e gbuwo oké ehi na anụ m ndị mara abụba, a kwadebewokwa ihe niile. Bịanụ n’oriri alụmdi na nwunye a.”’ Ma ha ejighị ya kpọrọ ihe, ha wee gawa, otu onye n’ubi ya, onye ọzọ n’ahịa ya; ma ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbuo ha.” (Matiu 22:4-6) Ihe a Jizọs kwuru dabara n’ihe ga-eme ozugbo a malitere inwe ọgbakọ Ndị Kraịst. N’oge ahụ, ndị Juu ka nwere ohere iketa Alaeze eluigwe, ma ọtụtụ n’ime ha ekweghị aza òkù ahụ a kpọrọ ha. Ha medịrị ụfọdụ n’ime ndị “eze” ahụ dunyere ka ha kpọọ ha òkù, ihe ihere.—Ọrụ Ndịozi 4:13-18; 7:54, 58.

      Gịnị ga-eme ndị Juu ebe ọ bụ na ha azaghị òkù ahụ a kpọrọ ha? Jizọs kwuru, sị: “Eze ahụ were iwe wee ziga ụsụụ ndị agha ya ma bibie ndị ahụ na-egbu ọchụ, gbaakwa obodo ha ọkụ.” (Matiu 22:7) Ihe a Jizọs kwuru mezuru n’afọ 70, mgbe ndị Rom bibiri “obodo ha” bụ́ Jeruselem.

      Ebe ha na-ekweghị aza òkù ahụ a kpọrọ ha, ọ̀ pụtara na enwezighị ndị ọzọ a ga-akpọ? Jizọs ekwughị otú ahụ. Kama, ọ sịrị: “[Eze ahụ] wee sị ndị ohu ya, ‘N’ezie, a kwadebewo oriri alụmdi na nwunye a, ma ndị a kpọrọ òkù erughị eru. Ya mere, gaanụ n’okporo ụzọ ndị e si apụ n’obodo, kpọọkwanụ onye ọ bụla unu hụrụ ka ọ bịa oriri alụmdi na nwunye a.’ Ya mere, ndị ohu ahụ gara n’okporo ụzọ wee kpọkọọ ndị niile ha hụrụ, ma ndị ọjọọ ma ndị ọma; ọnụ ụlọ e ji eme ememme agbamakwụkwọ ahụ wee jupụta ná ndị nọ na-eri ihe na tebụl.”—Matiu 22:8-10.

      Anyị kwesịrị iburu n’obi na Pita onyeozi ga-emecha nyewere ndị Jentaịl aka ka ha bụrụ ezigbo Ndị Kraịst. Ndị Jentaịl bụ ndị na-abụghị ndị Juu ma ọ bụ ndị na-esoghị ndị Juu na-ekpe okpukpe ha. N’afọ 36, onyeisi ndị agha Rom aha ya bụ Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya natara mmụọ nsọ Chineke, si otú ahụ soro ná ndị ga-eketa Alaeze eluigwe Jizọs kwuru okwu ya.—Ọrụ Ndịozi 10:1, 34-48.

      Jizọs kwuru na ọ bụghị mmadụ niile bịara oriri agbamakwụkwọ ahụ ga-adị “eze ahụ” mma. O kwuru, sị: “Mgbe eze ahụ batara inyocha ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe alụmdi na nwunye. O wee sị ya, ‘Enyi, olee otú i si bata n’ebe a n’eyighị uwe alụmdi na nwunye?’ O nyeghị ya ọnụ okwu. Mgbe ahụ, eze ahụ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị, ‘Keenụ ya agbụ ụkwụ na aka ma tụpụ ya n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.’ N’ihi na ndị a kpọrọ òkù dị ọtụtụ, ma ole na ole ka a họọrọ.”—Matiu 22:11-14.

      O nwere ike ndị ndú okpukpe ahụ aghọtaghị ihe ihe niile Jizọs kwuru pụtara ma ọ bụkwanụ otú o si gbasa ha. Ma, obi adịghị ha mma. Ha kpebisikwuru ike na ha ga-egbufu onye a na-emechu ha ihu.

      • N’ihe atụ Jizọs mere, ònye bụ “eze ahụ”? Ònye bụ “nwa ya nwoke”? Ole ndị e bu ụzọ kpọọ ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ ahụ?

      • Olee mgbe e bidoro ịkpọ ndị Juu, oleekwa ndị e mechara kpọwa?

      • Jizọs kwuru na ndị a kpọrọ òkù dị ọtụtụ, ma ole na ole ka a họọrọ. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

  • Otú Jizọs Si Mee Ka Mbọ A Gbara Ijide Ya Kụọ Afọ n’Ala
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Jizọs weliri mkpụrụ ego ma jiri ya zaa ndị Farisii ajụjụ ha ji aghụghọ jụọ ya

      ISI NKE 108

      Otú Jizọs Si Mee Ka Mbọ A Gbara Ijide Ya Kụọ Afọ n’Ala

      MATIU 22:15-40 MAK 12:13-34 LUK 20:20-40

      • KWỤỌNỤ SIZA IHE SIZA

      • À GA-ALỤ DI NA NWUNYE N’OGE MBILITE N’ỌNWỤ?

      • IWU KACHANỤ

      Iwe juru ndị iro Jizọs obi. Ọ dịbeghị anya o mere ihe atụ o ji gosi na ha bụ ndị ọjọọ. N’ihi ya, ndị Farisii kpara nkata ka ha jide ya. Ha chọrọ ka o kwuo ihe ga-eme ka ha jide ya kpọgara ya gọvanọ ha bụ́ onye Rom. Ha kwụdịrị ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ha ụgwọ ka ha chọta ihe ha ga-eji jide Jizọs.—Luk 6:7.

      Ha jụrụ Jizọs, sị: “Onye Ozizi, anyị maara na ị na-ekwu okwu ma na-ezi ihe n’ụzọ ziri ezi, ị dịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke n’eziokwu: Iwu ọ̀ kwadoro ka anyị na-akwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya?” (Luk 20:21, 22) Jizọs ekweghị ka mma elu ọnụ a ha jara ya megharịa ya anya n’ihi na ọ ma na o sighị ha n’obi, marakwa na ha ji aghụghọ chọọ itinye ya ná nsogbu. Ọ bụrụ na ọ sị ha, ‘Mba, ọ dịghị mma ị na-akwụ ụtụ isi,’ ha nwere ike ibo ya ebubo na ọ na-agba ọchịchị Rom mgba okpuru. Ọ bụrụkwa na ọ sị ha, ‘Ee, kwụọnụ ụtụ isi,’ ndị obi na-adịghị mma na ndị Rom na-achị ha nwere ike ịghọtahie ya ma mesie ya ike. Ebe ọ dị otú ahụ, olee otú Jizọs si zaa ha ajụjụ a?

      Jizọs gwara ha, sị: “Gịnị mere unu ji na-ele m ule, ndị ihu abụọ? Gosinụ m mkpụrụ ego e ji atụ ụtụ isi.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego dinarịọs. O wee jụọ ha, sị: “Ihe a ọ̀ bụ onyinyo onye na aha onye?” Ha sịrị ya: “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ, Jizọs sịrị ha: “Ya mere, kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Matiu 22:18-21.

      Ihe a Jizọs kwuru tụrụ ha n’anya. Ha si ebe ahụ pụọ n’ihi na o mere ka ọnụ mechie ha. Ma, chi ejibeghị n’ụbọchị ahụ, n’ihi ya, ha kpawakwara nkata otú ha ga-esi nweta Jizọs. Mgbe nkata ndị Farisii kpara kụchara afọ n’ala, ndị isi nke òtù ọzọ e nwere n’okpukpe ndị Juu bịakwutere ya. Ha bụ ndị Sadusii.

      Ndị Sadusii ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Ma, ha bịara jụọ Jizọs ajụjụ gbasara mbilite n’ọnwụ na mmadụ ịlụ nwunye nwanne ya ma nwanne ya nwụọ. Ha jụrụ ya, sị: “Onye Ozizi, Mozis sịrị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’amụtaghị ụmụ, nwanne ya nwoke aghaghị ịkpọrọ nwunye ya lụwa wee mụtara nwanne ya nwoke nwa.’ Ma e nwere ụmụnne asaa n’etiti anyị; nke mbụ lụrụ nwunye ma nwụọ, ebe ọ na-amụtaghị nwa, ọ hapụụrụ nwanne ya nwoke nwunye ya. Otú ahụ ka o mekwara onye nke abụọ, meekwa onye nke atọ, ruo mgbe o mechara mmadụ asaa ahụ niile. N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụrụ. Ya mere, ná mbilite n’ọnwụ, ònye n’ime mmadụ asaa ahụ ka ọ ga-abụ nwunye ya? Ebe ọ bụ na ha niile lụrụ ya.”—Matiu 22:24-28.

      Ebe ọ bụ na ndị Sadusii kwetara n’akwụkwọ ndị Mozis dere, Jizọs ji ya zaa ha ajụjụ a. Ọ gwara ha, sị: “Ọ́ bụghị n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ike nke Chineke mere unu ji ehie ụzọ? N’ihi na mgbe ha ga-esi ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ndị ikom agaghị alụ nwunye, a gaghịkwa eke ndị inyom di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe. Ma banyere ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a ga-akpọlite, ọ̀ bụ na unu agụghị n’akwụkwọ Mozis, n’ihe e dere banyere osisi ogwu ahụ, otú Chineke si gwa ya, sị, ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb’? Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ Chineke ndị dị ndụ. Unu na-ehie ụzọ nke ukwuu.” (Mak 12:24-27; Ọpụpụ 3:1-6) Ihe a ọ zara ha juru ìgwè mmadụ ahụ anya.

      Jizọs emeela ka ọnụ mechie ma ndị Farisii ma ndị Sadusii. N’ihi ya, ha bịakọtara ọnụ ka ha nwalekwuo ya. Otu n’ime ha, bụ́ odeakwụkwọ, jụrụ ya, sị: “Onye Ozizi, olee iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ?”—Matiu 22:36.

      Jizọs zara ya, sị: “Nke mbụ bụ, ‘Nụrụ, Izrel, Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova, jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke abụọ bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu nke ka ndị a ukwuu.”—Mak 12:29-31.

      Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, odeakwụkwọ ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, ihe i kwuru bụ eziokwu, ‘Ọ bụ Otu, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ọ bụghị ya’; mmadụ ijikwa obi ya dum na nghọta ya dum na ike ya dum hụ ya n’anya nakwa mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya dị ka onwe ya dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa àjà nkịtị na àjà a na-esurecha n’ọkụ.” Mgbe Jizọs hụrụ na ọ zara dị ka onye maara ihe, ọ sịrị ya: “Ị nọghị alaeze Chineke ebe dị anya.”—Mak 12:32-34.

      Kemgbe abalị atọ, (ya bụ abalị itoolu, abalị iri, na abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan), Jizọs nọ na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ. Ụfọdụ ndị, dị ka odeakwụkwọ a, ji obi ụtọ gee ya ntị. Ma, ndị ndú okpukpe emeghị otú ahụ. Ha enweghịzi obi ike “ịjụ ya ajụjụ.”

      • Olee nkata ndị Farisii kpara iji jide Jizọs? Oleekwa otú Jizọs si mee ka nkata ahụ kụọ afọ n’ala?

      • Mgbe ndị Sadusii gbara mbọ ijide Jizọs, olee otú Jizọs si mee ka ha ghara inweta ya?

      • Mgbe Jizọs na-aza odeakwụkwọ ahụ ajụjụ, gịnị ka o kwuru na ọ dị ezigbo mkpa?

  • Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Jizọs agbaa ndị na-emegide ya n’anwụ

      ISI NKE 109

      Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

      MATIU 22:41–23:24 MAK 12:35-40 LUK 20:41-47

      • NWA ÒNYE KA KRAỊST BỤ?

      • JIZỌS AGBAA NDỊ IHU ABỤỌ NA-EMEGIDE YA N’ANWỤ

      Ndị na-emegide Jizọs emebilighị aha ya ma ọ bụ mee ka o kwuo ihe ha ga-eji jide ya ma nyefee ya n’aka ndị Rom. (Luk 20:20) Ma, mgbe ha na Jizọs ka nọ n’ụlọ nsọ ahụ n’abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan, Jizọs meziri ka egwú dagharịa ma mee ka ha mata onye ọ bụ. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu chere banyere Kraịst? Nwa ònye ka ọ bụ?” (Matiu 22:42) Ndị Juu niile ma na Kraịst ma ọ bụ Mesaya ga-esi n’agbụrụ Devid. N’ihi ya, ha sịrị ya na ọ bụ nwa Devid.—Matiu 9:27; 12:23; Jọn 7:42.

      Jizọs jụrụ ha, sị: “Oleezi otú o si bụrụ na Devid si n’ike mmụọ nsọ kpọọ ya ‘Onyenwe m,’ sị, ‘Jehova gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị”’? Ya mere, ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe m,’ olee otú o si bụrụ nwa ya?”—Matiu 22:43-45.

      Ndị Farisii azaghị Jizọs ajụjụ a n’ihi na ha na-atụ anya na a ga-enwe otu onye si n’agbụrụ Devid nke ga-anapụta ha n’aka ndị Rom na-achị ha. Jizọs ji ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 110:1, 2 mee ka ha mata na Mesaya ahụ abụghị naanị mmadụ nkịtị na-achị achị. Ọ bụ Onyenwe Devid. Ọ bụrụkwa na ọ nọdụ ala n’aka nri Chineke, ọ ga-eji ike Chineke nyere ya rụwa ọrụ. Ihe a Jizọs kwuru enyeghị ha ọnụ okwu.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs na ndị ọzọ nọ na-ege Jizọs ntị kemgbe. N’ihi ya, Jizọs gwara ha okwu ma dọọ ha aka ná ntị gbasara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. Ọ sịrị ha: “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii anọdụwo n’oche Mozis” ka ha kụzie Iwu Chineke. Jizọs gwaziri ha, sị: “Ihe niile ha na-agwa unu, meenụ ha, debekwanụ ha, kama unu emela ihe ha na-eme, n’ihi na ha na-ekwu ma ha adịghị eme.”—Matiu 23:2, 3.

      Jizọs kwuru ihe ha na-eme nke gosiri na ha bụ ndị ihu abụọ. Ọ sịrị: “Ha na-eme ka mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị ha na-eyi dị ka ihe nchebe bukwuo ibu.” Ndị Juu ụfọdụ na-eyi obere mkpọ̀ ha tinyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ n’egedege ihu ha ma ọ bụ n’aka ha. Ma, ndị Farisii na-eme ka nke ha bukwuo ibu ka ọ́ dị ka hà ji Iwu Chineke kpọrọ ihe. Ha “na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha sakwuo mbara.” Ụmụ Izrel na-adụnye ihe n’ọnụ ọnụ uwe mwụda ha. Ma, ndị Farisii na-eme ka ọnụ ọnụ uwe ha gbadaa karịa nke ndị ọzọ. (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40) Ihe mere ha ji eme ihe niile a bụ “ka ndị mmadụ hụ ha.”—Matiu 23:5.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs nwedịrị ike chọwa ka a na-anụ aha ha. N’ihi ya, Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.” Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi na-ele onwe ha anya ma na-akpa àgwà? Jizọs gwara ha, sị: “Onye kasị ukwuu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Matiu 23:8-12.

      Jizọs kwuziri na ahụhụ na-aga ịdịrị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ. O kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu ndị mmadụ; n’ihi na unu onwe unu adịghị abanye, unu adịghịkwa ekwe ka ndị chọrọ ịbanye banye.”—Matiu 23:13.

      Jizọs katọrọ ndị Farisii n’ihi na ha ejighị ihe Jehova weere ka ihe ka mkpa kpọrọ ihe. Ihe gosiri na ha ejighị ya kpọrọ ihe bụ ụdị ókè na-enweghị isi ha na-akpa. Dị ka ihe atụ, ha na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ejiri ụlọ nsọ ṅụọ iyi, ọ dịghị ihe ọ bụ; ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ejiri ọlaedo dị n’ụlọ nsọ ṅụọ iyi, iwu ji ya.” Ihe a ha kwuru gosiri na ha kpuru ìsì n’ihi na ha ji ọlaedo dị n’ụlọ nsọ kpọrọ ihe karịa ụlọ nsọ ahụ a na-anọ efe Jehova. Ha na-elegharakwa “ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.”—Matiu 23:16, 23; Luk 11:42.

      Jizọs kpọrọ ndị Farisii “ndị ndú kpuru ìsì, ndị na-azapụ anwụnta ma na-eloda kamel!” (Matiu 23:24) Ha na-azapụ anwụnta ná mmanya ha n’ihi na e weere anwụnta ka ihe na-adịghị ọcha. Ma, otú ha si eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya yiri iloda kamel. Kamel bụkwa anụ na-adịghị ọcha, ma ha na-eloda ya n’ihi na ọ ka buo ibu.—Levitikọs 11:4, 21-24.

      • Mgbe Jizọs jụrụ ndị Farisii ajụjụ gbasara ihe Devid kwuru nke e dere n’Abụ Ọma 110, gịnị mere ha ji gba ya nkịtị?

      • Gịnị mere ndị Farisii ji eme ka mkpọ̀ ha ji etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ bukwuo ibu, na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe mwụda ha gbadaa agbada karịa nke ndị ọzọ?

      • Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

  • Ụbọchị Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụlọ Nsọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Jizọs na-ele nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ na-atụnye mkpụrụ ego abụọ n’igbe dị n’ụlọ nsọ

      ISI NKE 110

      Ụbọchị Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụlọ Nsọ

      MATIU 23:25–24:2 MAK 12:41–13:2 LUK 21:1-6

      • JIZỌS AKATỌKWUO NDỊ NDÚ OKPUKPE

      • A GA-EBIBI ỤLỌ NSỌ AHỤ

      • NWAANYỊ DI YA NWỤRỤ NKE DARA OGBENYE ATỤNYE OBERE MKPỤRỤ EGO ABỤỌ

      Na nke ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụlọ nsọ, ọ gara n’ihu ịgba ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’anwụ, na-akpọ ha ndị ihu abụọ n’ihu ọha. Ọ gwara ha, sị: “Unu na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha, ma ime ha jupụtara n’ihe e bukọọrọ n’ike na imefe ihe ókè. Ndị Farisii kpuru ìsì, burunụ ụzọ mee ka ime iko na ime efere dị ọcha, ka azụ ya wee dị ọcha.” (Matiu 23:25, 26) Ọ bụ eziokwu na ndị Farisii na-asa anya na mmiri edebe Iwu ndị kwuru gbasara mmadụ ịdị ọcha iji fee ofufe na mmadụ ịdị ọcha n’elu ahụ́, ha na-eleghara ụdị mmadụ ha bụ anya. Ha achọghịkwa ime ka obi ha dị ọcha.

      Ihe ọzọ gosiri na ha bụ ndị ihu abụọ bụ na ha na-ewu ili ndị amụma ma na-achọ ha mma. Ma Jizọs gwara ha na ha “bụ ụmụ nke ndị gburu ndị amụma.” (Matiu 23:31) Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ mbọ ndị ha gbara ka ha gbuo Jizọs.—Jọn 5:18; 7:1, 25.

      Jizọs gwaziri ha ihe na-aga ime ha ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. Ọ sịrị ha: “Agwọ, ụmụ ajụala, olee otú unu ga-esi gbanahụ ikpe Gehena?” (Matiu 23:33) Gehena pụtara Ndagwurugwu Hinọm. Ndagwurugwu a dị nso na Jeruselem. Ọ bụkwa ebe a na-akpọ ihe ndị e kpofuru ekpofu ọkụ. Ọ na-anọchi anya mbibi ebighị ebi a ga-ebibi ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-achọghị ichegharị.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-abụ “ndị amụma na ndị maara ihe na ndị na-ezi ihe n’ihu ọha.” Ha ga-esi otú a nọchite anya Jizọs. Olee otú ndị ndú okpukpe ga-esi kpasoo ha àgwà. Jizọs gwara ha, sị: “Ụfọdụ n’ime [ndị na-eso ụzọ m] ka unu ga-egbu, kpọgidekwa ha n’osisi, ụfọdụ n’ime ha ka unu ga-apịakwa ihe n’ụlọ nzukọ unu, kpagbuokwa ha site n’obodo ruo n’obodo; ka ọbara ezi omume dum a wụfuru n’ụwa wee dị n’isi unu, malite n’ọbara onye ezi omume bụ́ Ebel ruo n’ọbara Zekaraya . . . onye unu gburu.” Ọ gwakwara ha, sị: “N’ezie, ana m asị unu, ihe ndị a niile ga-abịakwasị ọgbọ a.” (Matiu 23:34-36) Ihe a Jizọs kwuru mechara mee n’afọ 70 mgbe ndị agha Rom bibiri Jeruselem ma gbuo ọtụtụ puku ndị Juu.

      Obi adịghị Jizọs mma mgbe ọ na-eche banyere ihe ọjọọ a nke na-aga ime ndị Juu. N’ihi ya, o kwuru, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya. Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:37, 38) Ndị nụrụ ihe a Jizọs kwuru ga na-eche “ụlọ” Jizọs na-ekwu okwu ya. Ọ̀ ga-abụ ụlọ nsọ ahụ mara mma dị na Jeruselem, nke ndị mmadụ nwere ike ịna-eche na Chineke na-echebe?

      Jizọs kwuziri, sị: “Ana m asị unu, unu agaghị ahụ m ma ọlị malite ugbu a ruo mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ!’” (Matiu 23:39) Ihe a Jizọs kwuru si n’Abụ Ọma 118:26. Ebe ahụ, sịrị: “Ka Onye na-abịa n’aha Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi; anyị esiwo n’ụlọ Jehova gọzie unu.” O doro anya na e bibihaala ụlọ nsọ ahụ, e nwekwaghị onye nwere ike ịbịa na ya n’aha Chineke.

      Jizọs gaziri n’ebe e dowegasịrị igbe onyinye n’ụlọ nsọ ahụ. Ndị mmadụ na-esi n’obere oghere ndị dị n’elu igbe ndị ahụ atụnye ego. Jizọs hụrụ ndị Juu ka ha na-atụnye onyinye ha, hụkwa ndị bara ọgaranya ka ha “na-atụnye ọtụtụ mkpụrụ ego.” Jizọs hụziri ka otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye tụnyere “obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.” (Mak 12:41, 42) Jizọs ma na onyinye nwaanyị a nyere mere ka obi tọọ Chineke ụtọ.

      Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha: “N’ezie, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ihe ndị niile ahụ na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego tụnyere.” Olee otú o si tụnye ihe karịa ndị ahụ niile? Jizọs kwuru, sị: “Ha niile tụnyere ihe site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, ihe dum o ji biri, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.” (Mak 12:43, 44) Otú nwaanyị a si eche echiche na otú o si eme ihe dị nnọọ iche n’otú ndị ndú okpukpe ahụ si eche echiche na otú ha si eme ihe.

      Ka abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan ji nwayọọ nwayọọ na-agwụ, Jizọs si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ. Ihe a bụ nke ikpeazụ ụkwụ ya kpara n’ụlọ nsọ ahụ. Ka ha na-apụ, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya, sị: “Onye Ozizi, ị̀ hụkwara ụdị nkume ndị a na ụdị ụlọ ndị a?” (Mak 13:1) N’eziokwu, nkume ụfọdụ e ji rụọ ụlọ nsọ ahụ buru ezigbo ibu. O so n’ihe ndị mere ụlọ nsọ ahụ ji sie ezigbo ike ma yie ihe na-enweghị ike ịda ada. N’ihi ya, ọ ga-eju onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs anya mgbe Jizọs gwara ya, sị: “Ị̀ hụrụ nnukwu ụlọ ndị a? A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya ma ọlị n’ebe a n’akwatughị ya.”—Mak 13:2.

      Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, ya na ndịozi ya gafere Ndagwurugwu Kidrọn ma rịgoro n’elu Ugwu Oliv. E nwere mgbe ya na mmadụ anọ n’ime ndịozi ya nọ. Aha ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn. Ha nwere ike isi n’ebe ahụ ha nọ n’ugwu ahụ na-ekiri ọmarịcha ụlọ nsọ ahụ.

      • Olee ihe Jizọs mere n’ụbọchị ikpeazụ ọ nọrọ n’ụlọ nsọ ahụ?

      • Gịnị ka Jizọs kwuru ga-eme ụlọ nsọ ahụ?

      • Gịnị mere Jizọs ji kwuo na nwaanyị ahụ di ya nwụrụ tụnyere ihe karịa ndị bara ọgaranya?

  • Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Jizọs na-aza ndịozi ya anọ ajụjụ ha jụrụ ya

      ISI NKE 111

      Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama

      MATIU 24:3-51 MAK 13:3-37 LUK 21:7-38

      • NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS ANỌ AJỤỌ YA MAKA IHE ỊRỊBA AMA

      • OTÚ HA SI MEZUO N’OGE NDỊOZI NA OTÚ HA SI EMEZU N’OGE A

      • ANYỊ GA-AMỤRỤ ANYA

      Ụbọchị ahụ bụ ehihie Tuzdee, abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan. Chi jikwa nwayọọ na-eji. Ihe ọzọkwa bụ na ọ fọrọ abalị ole na ole ka Jizọs jechaa ozi ya n’ụwa. Kemgbe ụtụtụ, Jizọs nọ na-ezi ihe n’ụlọ nsọ. Mgbe chi jiri, o si na Jeruselem pụọ gaa hie ụra ebe ọzọ. Ma, ndị mmadụ nwere nnọọ mmasị ịnụ ihe ọ na-ezi, n’ihi ya, ha ‘na-abịakwute ya n’ụlọ nsọ n’isi ụtụtụ ịnụrụ okwu ya.’ (Luk 21:37, 38) Ugbu a, Jizọs agazighị apụta n’ụlọ nsọ. Ya na ndịozi ya anọ nọzi n’Ugwu Oliv. Aha ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn.

      Mmadụ anọ a bịakwutere Jizọs iche. Ihe mere ha ji bịakwute ya bụ na ha na-echegbu onwe ha banyere ụlọ nsọ ahụ Jizọs ka kwupụrụ okwu ya na a gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya. Ma, ha ka nwere ọtụtụ ihe na-echegbu ha. Jizọs agwabuola ha, sị: “Dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.” (Luk 12:40) Ọ gwakwara ha banyere “ụbọchị ahụ mgbe a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ.” (Luk 17:30) Ò nwere otú ihe ndị ahụ ọ gwara ha si gbasa ihe ndị o kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ? Ndịozi ya chọrọ ịma ihe ihe ndị ahụ o kwuru pụtara. N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?”—Matiu 24:3.

      O nwere ike ịbụ na ihe ha bu n’obi jụọ ajụjụ a bụ maka mbibi Jizọs kwuru a ga-ebibi ụlọ nsọ ahụ ha na-ahụ anya. Ha jụkwara Jizọs banyere oge ọnụnọ ya. Ọ ga-abụ na ha chetara ihe atụ Jizọs mere banyere “otu nwoke nke si n’ezinụlọ eze” bụ́ onye ‘jere n’ala dị anya ka ọ gaa nweta ike ọchịchị ma lọta.’ (Luk 19:11, 12) Ihe ikpeazụ ha nọ na-eche bụ ihe ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe a’ pụtara.

      Jizọs gwara ha ihe àmà ndị ha ga-eji amata mgbe a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ma, ọ gwakwara ha ihe àmà ọzọ. Ihe àmà a ga-enyere ndị ga-abụ Ndị Kraịst n’ọdịnihu aka ịmata na ha nọ n’oge “ọnụnọ” Kraịst, nyekwara ha aka ịmata na oge Chineke ga-ebibi ụwa Setan eruwela.

      Ka afọ na-aga, ndịozi Jizọs ji anya ha hụ ka ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma na-emezu. Ọtụtụ n’ime ha malitere imezu n’ihu ha. N’ihi ya, ihe mere mgbe afọ iri atọ na asaa gachara, ya bụ n’afọ 70, emeghị Ndị Kraịst mụ anya n’oge ahụ na mberede. Ọ bụ n’afọ ahụ ka e bibiri obodo ndị Juu na ụlọ nsọ ha. Ma, ọ bụghị ihe niile Jizọs buru n’amụma mezuru n’afọ 70 ma ọ bụ tupu mgbe ahụ. N’ihi ya, olee ihe ndị a ga-eji ama oge ọnụnọ ya, ya bụ, oge ọ ga-anọ n’ocheeze na-achị n’Alaeze Chineke? Jizọs gwara ndịozi ya azịza ya.

      Jizọs kwuru na ‘a ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha’ nakwa na “mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha.” (Matiu 24:6, 7) O kwukwara na ‘a ga-enwe oké ala ọma jijiji, nakwa na ọrịa na-efe efe na ụkọ nri ga-adị n’ebe dị iche iche.’ (Luk 21:11) Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo unu.” (Luk 21:12) Ndị amụma ụgha ga-ebili, ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị. Mmebi iwu ga-aba ụba, ọtụtụ ndị agaghịkwa ahụ ibe ha n’anya. Jizọs kwukwara na ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’—Matiu 24:14.

      Ụfọdụ amụma ndị ahụ Jizọs buru mezuru tupu ndị Rom ebibie Jeruselem nakwa n’oge ha na-ebibi ya. Ma, ọ̀ ga-abụ na Jizọs bu n’obi na amụma ndị ahụ ga-emezu nke ugboro abụọ ya karịa otú o si mezuo na nke mbụ ya? Ị̀ na-ahụ ihe ndị na-egosi na amụma ndị ahụ na-emezu n’oge anyị a karịa otú ha mezuru n’oge gara aga?

      Otu ihe ọzọ Jizọs kwuru a ga-eji mara oge ọnụnọ ya bụ na a ga-enwe “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Matiu 24:15) N’afọ 66, ihe arụ a bụ ndị agha Rom bú ọkọlọtọ arụsị ha ma ‘maa ụlọikwuu’ gburugburu Jeruselem. Ha kụtukwara ebe ụfọdụ ná mgbidi ya. (Luk 21:20) N’ihi ya, ‘ihe arụ a’ nọ n’ebe ọ na-ekwesịghị ịnọ, ya bụ, n’ebe ndị Juu weere na ọ bụ “ebe nsọ.”

      Jizọs kwukwara, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” Ndị Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70. Mbibi a e bibiri ‘obodo nsọ’ ndị Juu na ụlọ nsọ ya, bụ oké mkpagbu. E gbukwara ọtụtụ puku ndị Juu n’oge ahụ. (Matiu 4:5; 24:21) E bibitụbeghị Jeruselem otú ahụ e si bibie ya, ndị Juu ahụtụbeghị ụdị mbibi a. O mere ka a kwụsị otú ndị Juu si na-efe ofufe kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ebe ọ dị otú ahụ, ebelebe ga-egbu mgbe amụma a Jizọs buru ga-emezu nke nnukwu ya.

      IHE GA-EME KA HA NWEE OBI IKE MGBE IHE NDỊ AHỤ GA-EMEZU

      Jizọs agwachabeghị ndịozi ya ihe ndị a ga-eji mara oge ọnụnọ ya na oge Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’ụwa. N’ihi ya, ọ gwara ha ka ha zere ‘Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha.’ Jizọs kwuru na ha ga-achọ ‘iduhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.’ (Matiu 24:24) Ma a gaghị eduhie ndị a họọrọ. A ga na-ahụ ndị bụ́ Kraịst ụgha anya mgbe ha ga-apụta, ma a gaghị ahụ Jizọs anya n’oge ọnụnọ ya.

      Jizọs kwuru na n’oge Chineke ga-ebibi ụwa Setan a, a ga-enwe oké mkpagbu karịrị nke e nwere n’oge ndị Juu. Ọ sịrị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ike nke eluigwe maa jijiji.” (Matiu 24:29) Ndịozi ahụ Jizọs gwara ihe a aghọtachaghị otú ihe ndị ahụ ga-esi eme. Ma, ihe ndị ahụ ga-adị egwu.

      Olee otú ihe ndị ahụ dị egwu ga-emenụ ga-esi akpa ndị mmadụ aka? Ihe Jizọs kwuru zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi; n’ihi na a ga-eme ka ike nke eluigwe maa jijiji.” (Luk 21:26) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na oge ahụ bụ oge ihe ga-akacha siere ndị mmadụ ike kemgbe ndị mmadụ malitere ịdị ndụ n’ụwa.

      Jizọs mere ka ndịozi ya ghọta na ọ bụghị mmadụ niile ga-akwa ákwá mgbe ‘Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ike na ebube dị ukwuu.’ Ihe a ọ gwara ha gbara ha ume. (Matiu 24:30) Ọ gwaburu ha na Chineke ga-eme ihe “n’ihi ndị a họọrọ.” (Matiu 24:22) N’ihi ya, olee ihe ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime n’ihi ihe ndị ahụ dị egwu Jizọs kwuru ga-emenụ? Ọ gwara ha, sị: “Mgbe ihe ndị a niile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:28.

      Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị ga-anọ ndụ mgbe ihe ndị ahụ ga na-eme, ga-esi mara na ọgwụgwụ eruola nso? Jizọs gwara ha otú ha ga-esi mara. O ji osisi fig meere ha ihe atụ. Ọ sịrị: “Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee na-epupụta akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. Otú ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ. N’ezie, ana m asị unu na ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.”—Matiu 24:32-34.

      Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ahụ ka ọtụtụ ihe àmà ndị ahụ na-emezu, ha ga-ama n’ọgwụgwụ dị nso. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ga-anọ ndụ n’oge ahụ, sị:

      “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara. N’ihi na dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:36-39) Jizọs na-echetara ndị ọ na-agwa okwu banyere Iju Mmiri ụbọchị Noa, bụ́ nke kpara ike dị egwu n’ụwa niile.

      O doro anya na ndịozi ahụ ha na Jizọs nọ n’Ugwu Oliv ghọtara na ha kwesịrị ịmụrụ anya. Jizọs gwara ha, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:34-36.

      Jizọs ji ihe a ọ gwara ndịozi ya mee ka ha matakwuo na ihe ndị a o kwuru ga-emenụ agaghị eme naanị otu ebe. O kwughị na ha ga-eme naanị n’ihe dị ka afọ iri abụọ ma ọ bụ afọ iri atọ o kwuchara ha. O kwukwanụghị na ha ga-eme naanị na Jeruselem ma ọ bụ n’obodo ndị Juu. Kama, o kwuru na ha “ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile.”

      Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịmụrụ anya ma dị njikere. O meere ha ihe atụ ọzọ iji mesie ihe a o kwuru ike. Ọ sịrị: “Maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa, ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya. N’ihi nke a, unu onwe unu, dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:43, 44.

      Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ihe mere ha kwesịrị iji nwee olileanya. O mere ka obi sie ha ike na mgbe amụma ndị o buru ga-emezu, a ga-enwe “ohu” mụ anya ma na-arụsi ọrụ ike. Jizọs ji ihe ndịozi ya ma nke ọma mee ka ha ghọta ihe ọ na-ekwu. Ọ sịrị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.” Ma, ọ bụrụ na “ohu” ahụ echewe ihe ọjọọ n’obi ya ma malite imekpọ ndị ohu ibe ya ọnụ, nna ya ukwu ‘ga-enye ya oké ahụhụ.’—Matiu 24:45-51; tụlee Luk 12:45, 46.

      Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ga-echewe ihe ọjọọ n’obi ha. Oleezi ihe Jizọs chọrọ iji ihe a o kwuru kụziere ndị na-eso ụzọ ya? Ọ chọrọ ka ha mụrụ anya ma na-arụsi ọrụ ike. N’ihi ya, o meere ha ihe atụ ọzọ ka ha ghọta ihe ọ na-ekwu.

      • Gịnị mere ndịozi Jizọs ji jụọ ya gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu? Gịnịkwa ka ha bu n’obi jụọ ya ajụjụ ahụ?

      • Olee mgbe amụma ndị Jizọs buru malitere imezu? Oleekwa otú ha si mezuo?

      • Olee ihe ụfọdụ a ga-eji mata oge ọnụnọ Kraịst?

      • Olee otú “ihe arụ” ahụ Jizọs kwuru okwu ya si pụta? Oleekwa ihe ndị mere mgbe ọ pụtara?

      • Olee ihe ndị mmadụ ga-eme mgbe ha hụrụ ka amụma ndị ahụ Jizọs buru na-emezu?

      • Olee ihe atụ Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya nke nyeere ha aka ịmata na ọgwụgwụ dị nso?

      • Gịnị na-egosi na amụma ndị Jizọs buru ga-emezu n’ụwa niile?

      • Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ga-anọ ndụ n’oge ọgwụgwụ a?

  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ndị a bụ ụmụ agbọghọ ise na-amaghị nwoke, bụ́ ndị nwere uche, ka ha bu oriọna ha nke na-enwu enwu

      ISI NKE 112

      Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya

      MATIU 25:1-13

      • IHE ATỤ JIZỌS MERE BANYERE ỤMỤ AGBỌGHỌ IRI NA-AMAGHỊ NWOKE

      Jizọs ka nọkwa na-aza ndịozi ya ajụjụ ha jụrụ ya gbasara ihe àmà ndị a ga-eji ama oge ọnụnọ ya na ọgwụgwụ usoro ihe a. N’ihi ya, iji zakwuo ha ajụjụ ahụ, o meere ha ihe atụ ọzọ ga-abara ha uru. Ọ bụ ndị ga-anọ ndụ n’oge ọnụnọ ya ga-ahụ mgbe ihe atụ a ga-emezu.

      Otú o si bido ihe atụ ahụ bụ: “Alaeze eluigwe ga-adị ka ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke ndị buuru oriọna ha gaa izute nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Mmadụ ise n’ime ha dị nzuzu, ma ise nwere uche.”—Matiu 25:1, 2.

      Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na e kee ndị na-eso ụzọ ya ga-eketa Alaeze eluigwe ụzọ abụọ, otu ụzọ ga-abụ ndị nzuzu, ndị nke ọzọ abụrụ ndị nwere uche. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na a bịa n’ihe gbasara Alaeze eluigwe, onye nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya ga-eji aka ya họrọ ma ọ̀ ga-amụrụ anya ma ọ bụ na ọ gaghị amụrụ anya. Ma, obi siri Jizọs ike na onye nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwesịli ntụkwasị obi ma nweta ngọzi ndị Nna ya kwere ha ná nkwa.

      N’ihe atụ ahụ, ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke pụtara ka ha zute nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, nakwa ka ha soro ya n’ahịrị gaa oriri agbamakwụkwọ ya. Mgbe o rutere, ha ga-amụnye oriọna ha ka e jiri ha na-ahụ ụzọ ma na-aga ebe ha na-aga. Ha ga-esi otú ahụ kwanyere ya ùgwù ka ọ kpọ nwunye ya na-aga ebe e doziiri nwunye ya. Ma, gịnị ka ụmụ agbọghọ iri ahụ mere tupu nwoke ahụ erute?

      Jizọs kwuru ihe ha mere. Ọ sịrị: “Ndị nzuzu ahụ buuru oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọ bụla, ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ ha gbanyere n’ihe ha ji agbanye mmanụ, jirikwa oriọna ha. Mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-egbu oge, ha niile hulatara isi wee malite ihi ụra.” (Matiu 25:3-5) Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịaghị mgbe ha tụrụ anya ya. Ọ dị ka ò gburu ezigbo oge mere ụra ji buru ụmụ agbọghọ niile ahụ. O nwere ike ịbụ na ndịozi Jizọs chetara ihe ọ kọọrọ ha banyere otu nwoke si n’ezinụlọ eze, nke gara n’ala dị anya ka ọ gaa nweta ikike ọchịchị ma ‘mechaa lọta mgbe o nwetara ike ọchịchị ahụ.’—Luk 19:11-15.

      N’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke, o kwuru ihe mere mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ mechara rute. Jizọs sịrị: “N’etiti abalị, e tiri mkpu, sị, ‘Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala! Pụtanụ ka unu zute ya.’” (Matiu 25:6) Oleezi ihe ụmụ agbọghọ ahụ mere? Hà kwadoro akwado ma mụrụ anya?

      Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ, ụmụ agbọghọ ahụ niile na-amaghị nwoke biliri wee dozie oriọna ha. Ndị nzuzu ahụ gwara ndị ahụ nwere uche, sị, ‘Nyetụnụ anyị mmanụ unu, n’ihi na oriọna anyị agawala ịnyụ.’ Ndị ahụ nwere uche gwara ha, sị, ‘Ma eleghị anya, ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama nke ahụ, gakwurunụ ndị na-ere ya zụrụ nke unu.’”—Matiu 25:7-9.

      O doro anya na ise ndị nzuzu ahụ amụghị anya, ha akwadoghị akwado maka izute nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ha enweghị mmanụ ga-ezuru ha n’oriọna ha. N’ihi ya, ha kwesịrị ịga zụta nke ga-ezuru ha. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ha na-aga ịzụta mmanụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere, ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ ndị dị njikere, sooro ya banye n’oriri alụmdi na nwunye ahụ; e wee mechie ụzọ. N’ikpeazụ, ndị fọdụrụ n’ime ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bịakwara, sị, ‘Nna anyị ukwu, nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ!’ O wee zaa, sị, ‘Ana m agwa unu eziokwu, amaghị m unu.’” (Matiu 25:10-12) Ọ dị nnọọ mwute na a jụrụ ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ise ahụ n’ihi na ha adịghị njikere ma mụrụ anya ruo ọgwụgwụ.

      Ndịozi Jizọs ghọtara na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ o kwuru okwu ya bụ yanwa n’onwe ya. Jizọs jibu onwe ya tụnyere nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. (Luk 5:34, 35) Gịnịkwanụ gbasara ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke nwere uche? Mgbe Jizọs na-ekwu banyere “ìgwè atụrụ nta,” bụ́ ndị ga-eketa Alaeze eluigwe, o kwuru, sị: “Keenụ ájị̀ n’úkwù, ka oriọna unu na-enwukwa enwu.” (Luk 12:32, 35) N’ihi ya, n’ihe atụ a Jizọs mere banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke, ndịozi ya ga-aghọta na ọ na-ekwu banyere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka hanwa. Oleezi ihe Jizọs ji ihe atụ a na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya?

      Ihe niile Jizọs ji ihe atụ a kụziere ndị na-eso ụzọ ya doro nnọọ anya. Mgbe Jizọs na-emechi ihe atụ ahụ, ọ gwara ha ihe ọ chọrọ ka ha mụta na ya. Ọ sịrị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.”—Matiu 25:13.

      O doro anya na Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha “na-eche nche” n’oge ọnụnọ ya. Jizọs na-abịa, n’ihi ya, ha kwesịrị ịdị njikere ma mụrụ anya ka ụmụ agbọghọ ise ndị ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ ndị nwere uche. Nke a ga-eme ka ha ghara ileghara olileanya magburu onwe ya ha nwere anya, meekwa ka ngọzi Chineke ghara ịkwa ha.

      • Olee otú ụmụ agbọghọ ise ahụ nwere uche si dị iche n’ụmụ agbọghọ ndị nke ahụ dị nzuzu ma a bịa n’ihe gbasara ịmụrụ anya na ịdị njikere?

      • Ònye bụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ? Ole ndị bụ ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke?

      • Olee ihe Jizọs na-akụziri anyị n’ihe atụ o mere banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke?

  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe onye ohu na-eli ego e nyere ya n’ala

      ISI NKE 113

      Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ

      MATIU 25:14-30

      • JIZỌS EMEERE NDỊOZI YA IHE ATỤ BANYERE TALENT

      Mgbe Jizọs na ndịozi ya anọ ka nọ n’Ugwu Oliv, o meere ha ihe atụ ọzọ. Ụbọchị ole na ole tupu ụbọchị ahụ, bụ́ mgbe ọ nọ na Jeriko, o mere ihe atụ gbasara mkpụrụ ego maịna iji gosi na mgbe Alaeze Chineke ga-abịa ka dị ezigbo anya. Ihe atụ ọ na-aga ime ugbu a yiri nke mkpụrụ ego maịna ahụ. O so n’ihe o ji zaa ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ ha jụrụ ya banyere oge ọnụnọ ya na ọgwụgwụ usoro ihe a. Ihe atụ a mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta na ha kwesịrị ịdị uchu n’ọrụ o nyere ha.

      Jizọs malitere ihe atụ ahụ, sị: “Ọ dị nnọọ ka mgbe nwoke nke na-achọ ije mba ọzọ kpọkọtara ndị ohu ya ma nyefee ha ihe ndị o nwere.” (Matiu 25:14) Jizọs ejiribuola onwe ya tụnyere nwoke gara n’ala dị anya “ka ọ gaa nweta ike ọchịchị ma lọta.” N’ihi ya, ndịozi ya ghọtara na ọ bụ Jizọs bụ “nwoke” ahụ ọ na-ekwu okwu ya n’ihe atụ nke ugbu a.—Luk 19:12.

      Tupu nwoke ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ a ejee mba ọzọ, o nyefere ndị ohu ya ihe ndị o nwere. N’afọ atọ na ọkara Jizọs jere ozi n’ụwa, o ji ya kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme otú ahụ. Ugbu a ọ na-alaghachi eluigwe, obi siri ya ike na ha ga-anọgide na-eme ihe ndị ọ kụziiri ha.—Matiu 10:7; Luk 10:1, 8, 9; tụlee Jọn 4:38; 14:12.

      N’ihe atụ a, olee otú nwoke ahụ si kee ihe ndị o nwere? Jizọs kwuru otú o si kee ya. Ọ sịrị: “O nyere otu onye talent ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu, onye ọ bụla dị ka ike ya hà, o wee jee mba ọzọ.” (Matiu 25:15) Olee ihe ndị ohu ahụ ga-eji ihe e nyere ha mee? Hà ga-eji ya zụọrọ nna ha ukwu ahịa ma ritere ya uru? Jizọs gwara ndịozi ya, sị:

      “Ozugbo ahụ, onye natara talent ise gara jiri ya zụọ ahịa ma rite ise ọzọ n’uru. Otú ahụkwa, onye natara abụọ ritere abụọ ọzọ n’uru. Ma onye natara naanị otu gara gwuo ala zoo ego ọlaọcha nke nna ya ukwu.” (Matiu 25:16-18) Olee ihe ga-eme mgbe nna ha ukwu ga-alọta?

      Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha wee mee mpịazi.” (Matiu 25:19) Ndị ohu ya abụọ zụụrụ nna ha ukwu ahịa otú ha nwere ike, “onye ọ bụla dị ka ike ya hà.” Ha abụọ dị ike ọrụ ma jiri talent ahụ e nyere ha rite uru. Onye nke e nyere talent ise ritere talent ise n’uru. Onye nke e nyere talent abụọ ritekwara talent abụọ n’uru. (N’oge ahụ, ọ ga-ewe onye ọrụ afọ iri na itoolu iji rụta ego ole ya na otu talent hà.) Ihe nna ha ukwu gwara ohu ya nke mbụ ka ọ gwakwara ohu ya nke abụọ. Ọ sịrị onye nke ọ bụla n’ime ha: “I mere nke ọma, ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi! I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.”—Matiu 25:21.

      1. Ebe onye ohu na-eli ego e nyere ya n’ala; 2. Ebe a tụpụrụ ohu ahụ n’èzí gbara ọchịchịrị

      Ma egwú dagharịrị mgbe e rutere n’ohu ahụ e nyere otu talent. Ohu ahụ gwara nna ya ukwu, sị: “Nna m ukwu, amaara m na ị bụ onye aka ike, nke na-aghọrọ mkpụrụ n’ebe ọ na-akụghị mkpụrụ, onye na-ekpokọtakwa mkpụrụ n’ebe ọ na-afụchaghị mkpụrụ. Ya mere, atụrụ m egwu, m wee gaa zoo talent gị n’ala. Wekwara ihe gị.” (Matiu 25:24, 25) Ohu a etinyedịghị ego ahụ n’ụlọ akụ̀ ka nna ya ukwu nwetatụ uru. Ọ chọtụdịghị ihe ga-abara nna ya ukwu uru.

      N’ihi ya, nna ya ukwu kpọrọ ya “ajọ ohu dị umengwụ.” A naara ya talent ahụ e nyere ya, were nye ohu ga-eji ya zụọ ahịa. Nna ya ukwu kwuziri, sị: “Onye ọ bụla nke nwere, a ga-enyekwu ya, ọ ga-enwekwa ihe n’ụba; ma onye nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o nwere.”—Matiu 25:26, 29.

      Ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa ozi ọma

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs enweela ọtụtụ ihe ha ga-eche gbasara ha. Ihe atụ a Jizọs mere sokwa na ha. Ihe atụ a mere ka ha ghọta na ihe Jizọs na-enyefe ha, ya bụ, ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, dị ezigbo mkpa. Ọ chọkwara ka ha dị uchu n’ọrụ a. Jizọs enweghị mgbe ọ tụrụ anya na ihe onye ọ bụla ga-arụ n’ọrụ a o nyere ha ga-aha nhata. Dị ka ihe atụ a o mere na-egosi, onye ọ bụla kwesịrị ime “dị ka ike ya hà.” Ma nke a apụtaghị na obi ga-adị Jizọs mma ma mmadụ dịrị “umengwụ” ma ghara ime ike ya niile iji ritere Nna ya ukwu uru.

      Ọ ga-abụ na obi tọrọ ndịozi Jizọs ezigbo ụtọ mgbe Jizọs gwara ha okwu a kasiri ha obi. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla nke nwere, a ga-enyekwu ya.”

      • N’ihe atụ Jizọs mere banyere talent ndị ahụ, ònye bụ nna ukwu ahụ, ole ndị bụ ndị ohu ahụ?

      • Gịnị na gịnị ka Jizọs ji ihe atụ a kụziere ndị na-eso ụzọ ya?

  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe ndị si mba niile na-eleli anya elu ma na-eche ka Jizọs kpee ha ikpe

      ISI NKE 114

      Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe

      MATIU 25:31-46

      • JIZỌS EMEE IHE ATỤ GBASARA ATỤRỤ NA EWU

      Jizọs ka mepụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke na ihe atụ banyere talent. Olee ihe ikpeazụ ọ gwara ndịozi ya iji zaa ha ajụjụ ha jụrụ ya gbasara ihe a ga-eji ama oge ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a? Ihe ikpeazụ o ji zaa ha ajụjụ ha bụ imere ha ihe atụ banyere atụrụ na ewu.

      Otú a ka Jizọs si malite ihe atụ ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube.” (Matiu 25:31) Jizọs ji ihe a o kwuru gosi na ọ bụ ya bụ isi n’ihe atụ a. Ọ na-akpọkarị onwe ya “Nwa nke mmadụ.”—Matiu 8:20; 9:6; 20:18, 28.

      Ebe Jizọs nọ n’ocheeze ya dị́ ebube na-ekpe ndị mmadụ ikpe na ha bụ atụrụ

      Olee mgbe ihe atụ a ga-emezu? Ọ bụ mgbe Jizọs “ga-abịa n’ebube ya,” ya na ndị mmụọ ozi ya, ma nọkwasị “n’ocheeze ya dị ebube.” Jizọs ekwubuola na ‘Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu,’ ya na ndị mmụọ ozi ya. Olee mgbe ọ ga-abịa? Jizọs sịrị na ọ bụ “ozugbo mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gasịrị.” (Matiu 24:29-31; Mak 13:26, 27; Luk 21:27) N’ihi ya, ihe atụ a ga-emezu n’ọdịnihu, mgbe Jizọs ga-abịa n’ebube ya. Olee ihe ọ ga-eme ma ọ bịa?

      Jizọs kwuru, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa . . . , a ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Ọ ga-edebe atụrụ n’aka nri ya, ma debe ewu n’aka ekpe ya.”—Matiu 25:31-33.

      Jizọs kwuru banyere ndị ahụ bụ́ atụrụ ọ ga-edebe n’aka nri ya, sị: “Mgbe ahụ, eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, ‘Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.’” (Matiu 25:34) Gịnị mere Eze ahụ ga-eji meere ndị a bụ́ atụrụ ihe ọma dị otú a?

      Eze ahụ kwuru, sị: “Agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe ka m rie; akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee nye m ihe ka m ṅụọ. Abụ m onye ọbịa, unu wee nabata m nke ọma; agba m ọtọ, unu wee yiwe m uwe. Adara m ọrịa, unu wee lekọta m. Anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu wee bịakwute m.” Mgbe ndị a bụ́ atụrụ, ya bụ, “ndị ezi omume,” jụrụ ya otú ha si meere ya ihe ọma ndị ahụ, ọ zara ha, sị: “Ihe niile unu meere otu n’ime ndị kasị nta n’ime ụmụnna m ndị a, ọ bụ m ka unu meere ya.” (Matiu 25:35, 36, 40, 46) Ọ bụghị n’eluigwe ka ha nọ meere ụmụnna Kraịst ihe ọma ndị ahụ n’ihi na e nweghị ndị ọrịa ma ọ bụ ndị agụụ na-agụ n’eluigwe. Ọ bụ n’ụwa ebe a ka ha meere ya ụmụnna Kraịst.

      Ndị ajọ omume a mara ikpe na ha bụ ewu

      Oleekwanụ gbasara ndị ahụ bụ́ ewu nọ n’aka ekpe ya? Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ, [Eze ahụ] ga-asị ndị nọ n’aka ekpe ya, ‘Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị a bụrụ ọnụ, banyenụ n’ọkụ ebighị ebi nke a kwadebeere Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. N’ihi na agụụ gụrụ m, ma ọ dịghị ihe unu nyere m ka m rie, akpịrị kpọkwara m nkụ, ma ọ dịghị ihe unu nyere m ka m ṅụọ. Abụ m onye ọbịa, ma unu anabataghị m nke ọma; agba m ọtọ, ma unu eyiweghị m uwe; arịara m ọrịa, nọrọkwa n’ụlọ mkpọrọ, ma unu elekọtaghị m.’” (Matiu 25:41-43) Ikpe a a mara ndị bụ́ ewu kwesịrị ekwesị n’ihi na ha emereghị ụmụnna Kraịst nọ n’ụwa ihe ọma, bụ́kwanụ ihe ha kwesịrị imere ha.

      Ndịozi ahụ ghọtara na mgbe a ga-ekpe ikpe a, e nwere ndị ga-eketa ndụ ebighị ebi, nweekwa ndị ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi. Jizọs gwara ha, sị: “Mgbe ahụ, [Eze ahụ ga-asị ndị bụ́ ewu], ‘N’ezie, ana m asị unu, ebe unu na-emeghịrị ya otu n’ime ndị a kasị nta, unu emeghịrị m ya.’ Ndị a ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi, ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:45, 46.

      Ihe Jizọs zara ndịozi ya n’ajụjụ ha jụrụ ya mere ka ha nwee ọtụtụ ihe ha ga-echebara echiche. Ọ ga-emekwa ka ha lebara otú ha si akpa àgwà anya.

      • N’ihe atụ Jizọs mere gbasara atụrụ na ewu, ònye bụ “eze ahụ”? Olee mgbe ihe atụ a ga-emezu?

      • Gịnị mere na Jizọs agaghị ama ndị bụ́ atụrụ ikpe?

      • Olee ihe mere a ga-eji kpee ụfọdụ ndị ikpe na ha bụ ewu? Olee ihe ga-eme ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya