-
Jizọs Akụzie Ịdị Umeala n’Obi n’Ememme Ngabiga Ikpeazụ YaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 116
Jizọs Akụzie Ịdị Umeala n’Obi n’Ememme Ngabiga Ikpeazụ Ya
MATIU 26:20 MAK 14:17 LUK 22:14-18 JỌN 13:1-17
JIZỌS NA NDỊOZI YA ERIE NRI EMEMME NGABIGA IKPEAZỤ YA
Ọ SARA ỤKWỤ NDỊOZI YA MA JIRI YA KỤZIERE HA ỊDỊ UMEALA N’OBI
Pita na Jọn erutela Jeruselem ịkwadebe ihe maka Ememme Ngabiga, bụ́ ihe Jizọs gwara ha mee. Jizọs na ndịozi ya iri ndị ọzọ mechara gawa Jeruselem. Oge ahụ bụ ehihie, anyanwụ jikwa nwayọọ nwayọọ na-ada. Jizọs na ndịozi ya si n’Ugwu Oliv ahụ ha nọ na-agbatu. Nke a bụ nke ikpeazụ ọ ga-anọ n’elu ugwu ahụ n’ehihie na-ahụ ụlọ nsọ ahụ tupu a kpọlite ya n’ọnwụ.
Obere oge, Jizọs na ndịozi ya rutere Jeruselem ma gawa n’ụlọ ha ga-anọ eme Ememme Ngabiga. Ha gbagooro n’otu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu. Mgbe ha rutere, ha hụrụ na e dozichaala ihe niile ha ga-eji mee ememme a. Jizọs nọ na-atụsi anya ememme a ike. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndịozi ya, sị: “Ọ gụsiwo m agụụ ike iso unu rie nri ememme ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.”—Luk 22:15.
Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ndị Juu malitere ibugharị iko mmanya ole na ole ka ndị na-eri nri Ememme Ngabiga ṅụọ. N’ihi ya, mgbe Jizọs narachaara otu n’ime iko mmanya ahụ, o kelere Chineke ma sị: “Naranụ nke a ma bugharịa ya n’etiti onwe unu; n’ihi na ana m asị unu, site ugbu a gaa n’ihu, m gaghị aṅụ ihe si n’osisi vaịn ọzọ ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.” (Luk 22:17, 18) Ihe a o kwuru ga-eme ka ndịozi ya mara na oge ọnwụ ya dị nso.
Mgbe ha nọ na-eri nri Ememme Ngabiga ahụ, Jizọs mere ihe ndịozi ya na-atụghị anya ya. Jizọs biliri ọtọ, yipụ uwe elu ya ma were ákwà e ji ehicha ahụ́. Ọ gbanyere mmiri n’efere dị ebe ahụ. N’oge ahụ, ọ bụ onye nwe ụlọ na-asa ụkwụ ndị ọbịa ya ma ọ bụkwanụ ya edunye ohu ya ka o mee otú ahụ. (Luk 7:44) Ma na nke ugbu a, e nweghị onye nwe ụlọ. N’ihi ya, Jizọs ji aka ya saa ndịozi ya ụkwụ. Ihe a o mere bụ ihe otu n’ime ndịozi ya kwesịrị iwepụta onwe ya mee, ma o nweghị onye n’ime ha mere ya. Ọ̀ ga-abụ na ha ka na-azọ onye kacha ukwu n’ime ha? N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, ihere mere ha na Jizọs bịara na-asa ha ụkwụ.
Mgbe Jizọs bịara ịsa Pita ụkwụ, Pita ekweghị. Ọ sịrị Jizọs: “N’ezie, ị gaghị asa m ụkwụ ma ọlị.” Jizọs gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na mụ asaghị gị ụkwụ, o nweghị ihe jikọrọ mụ na gị.” Pita gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị ụkwụ m, kamakwa aka m na isi m.” Ihe Jizọs kwuziri juru Pita anya. Ọ sịrị ya: “Onye sara ahụ́, ọ dịghị mkpa ịsa ya ebe ọzọ ma e wezụga ụkwụ ya, ma ahụ́ ya dum dị ọcha. Unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu niile.”—Jọn 13:8-10.
Jizọs sara ụkwụ ndịozi ya iri na abụọ, ma nke Judas Iskarịọt. Mgbe Jizọs yirichara uwe elu ya ma nọdụ ala ọzọ na tebụl, ọ jụrụ ndịozi ya ahụ, sị: “Ùnu maara ihe m meere unu? Unu na-akpọ m, ‘Onye Ozizi,’ na, ‘Onyenwe anyị,’ ihe unu na-akpọ m zikwara ezi, n’ihi na ọ bụ ihe m bụ. Ya mere, ọ bụrụ na mụ onwe m sara unu ụkwụ, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwe unu na Onye Ozizi, unu kwesịkwara ịsarịta ibe unu ụkwụ. N’ihi na m na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu. N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, ohu adịghị aka nna ya ukwu, onye ozi adịghịkwa aka onye zitere ya. Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.”—Jọn 13:12-17.
Ihe a Jizọs ji kụziere ndịozi ya ịdị umeala n’obi magburu onwe ya. Ndịozi Jizọs ekwesịghị ịna-achọ ọkwá, na-eche na ha dị mkpa, nakwa na ndị ọzọ kwesịrị ijere ha ozi. Kama, ha kwesịrị iṅomi Jizọs n’iji obi umeala na-ejere ndị ọzọ ozi n’akpaghị ókè, ọ bụghị ịsa ndị ọzọ ụkwụ iji mezuo iwu.
-
-
Nri Anyasị nke Onyenwe AnyịJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 117
Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
MATIU 26:21-29 MAK 14:18-25 LUK 22:19-23 JỌN 13:18-30
JIZỌS EMEE KA AMATA NA JUDAS BỤ SABO
JIZỌS AMALITE NCHETA ỌNWỤ YA
Jizọs sara ndịozi ya ụkwụ ná mgbede ụbọchị ahụ, si otú ahụ kụziere ha ịdị umeala n’obi. Mgbe ha richara nri Ememme Ngabiga, Jizọs kwuru ihe dị n’amụma Devid buru. Ọ sịrị: “Onye mụ na ya dịkwa ná mma, onye m tụkwasịrị obi, onye na-eri nri m, atụgharịwo megide m.” O kwuziri, sị: “Otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”—Abụ Ọma 41:9; Jọn 13:18, 21.
Ndịozi Jizọs lerịtara onwe ha anya, onye ọ bụla n’ime ha ajụọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?” Judas Iskarịọt sodị jụọ. Pita gwara Jọn, bụ́ onye nọkwutere Jizọs, ka ọ jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya. N’ihi ya, Jọn dabeere n’obi Jizọs ma jụọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka ọ bụ?”—Matiu 26:22; Jọn 13:25.
Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye achịcha a m na-esuru.” Jizọs weziiri achịcha, suru ya n’efere dị na tebụl ma nye ya Judas. Jizọs kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ na-aga ịnwụ, dị nnọọ ka e dere banyere ya, ma ahụhụ ga-adịrị onye a ga-esi n’aka ya rara Nwa nke mmadụ nye! Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya.” (Jọn 13:26; Matiu 26:24) Setan banyeziri n’ime Judas. Ebe Judas Iskarịọt dị mbụ na-arụrụ aka, ọ hapụziri onwe ya ka Ekwensu jiri ya kwara ngwá ọrụ. O si otú ahụ bụrụ “nwa mbibi ahụ.”—Jọn 6:64, 70; 12:4; 17:12.
Jizọs gwara Judas, sị: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” Ndịozi Jizọs ndị ọzọ chere na ebe ọ bụ Judas na-eji igbe ego, na Jizọs na-agwa ya, sị: “‘Zụta ihe ndị dị anyị mkpa maka ememme a,’ ma ọ bụ na o kwesịrị inye ndị ogbenye ihe.” (Jọn 13:27-30) Ma, Judas pụrụ ka ọ gaa rara Jizọs nye.
N’otu mgbede ahụ ha riri nri Ememme Ngabiga, Jizọs malitere nri ọhụrụ. O weere otu ogbe achịcha, kpee ekpere, nyawaa ya ma nye ya ndịozi ya ka ha rie. Ọ gwara ha, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ndịozi Jizọs bugharịrị achịcha ahụ n’etiti onwe ha ma rie ya.
Mgbe ha richara achịcha ahụ, Jizọs buuru iko mmanya, kpee ekpere n’elu ya ma bunye ya ndịozi ya. Ha niile ṅụrụ ya. Jizọs kwuru gbasara iko mmanya ahụ, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.”—Luk 22:20.
Ihe a bụ otú Jizọs si malite ime Ncheta Ọnwụ ya, bụ́ ihe ndị na-eso ụzọ ya ga na-eme kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Ọ ga na-echetara ha ihe Jizọs na Nna ya mere iji napụta ndị na-efe Chineke ná mmehie na ọnwụ. Ncheta Ọnwụ Jizọs bara uru karịa Ememme Ngabiga ndị Juu n’ihi na o mere ka a mara otú Jehova ga-esi gbapụta ụmụ mmadụ ndị kweere na ya.
Jizọs sịrị na a ga-awụpụ ọbara ya “n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.” Ndị ga-eso ná ndị a ga-agbaghara mmehie ha bụ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ndị ọzọ ga-ekwesịkwa ntụkwasị obi. Ha ga-eso ya chịa n’Alaeze Nna ya.—Matiu 26:28, 29.
-
-
Ndịozi Jizọs Arụọ Ụka Gbasara Onye Kacha Ukwuu n’Ime HaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 118
Ndịozi Jizọs Arụọ Ụka Gbasara Onye Kacha Ukwuu n’Ime Ha
MATIU 26:31-35 MAK 14:27-31 LUK 22:24-38 JỌN 13:31-38
JIZỌS ENYE NDỊOZI YA NDỤMỌDỤ GBASARA ỊZỌ ỌKWÁ
JIZỌS EBUO AMỤMA NA PITA GA-AGỌNAHỤ YA
ỊHỤNANYA KA A GA-EJI AMA NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS
Ná mgbede ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọ, ọ sara ha ukwu iji kụziere ha ka ha na-adị umeala n’obi. Gịnị mere ihe a o mere ji daba adaba? Ọ bụ n’ihi ihe ndịozi ya mere. Ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ma, ha ka na-arụ ụka n’etiti onwe ha onye ọ bụ n’ime ha kacha ukwuu. (Mak 9:33, 34; 10:35-37) Ha rụrịtakwara ụka ahụ ọzọ ná mgbede a.
Baịbụl sịrị: “Esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitekwara n’etiti [ndịozi Jizọs] banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” (Luk 22:24) Ọ ga-abụ na o wutere Jizọs ịhụ ka ha na-ese okwu ọzọ maka ihe a na-enweghị isi. Gịnị ka Jizọs mere?
Jizọs abaraghị ndịozi ya mba maka àgwà a ha kpara. Kama, o ji ndidi soro ha kwurịta okwu. Ọ sịrị ha: “Ndị eze nke ndị mba ọzọ na-eme ka à ga-asị na ọ bụ ha nwe ha, a na-akpọkwa ndị na-achị ha Ndị Ome Mma. Ma unu onwe unu agaghị adị otú ahụ. . . . N’ihi na olee onye ka ukwuu, ọ̀ bụ onye nọ na-eri ihe na tebụl ka ọ̀ bụ onye na-eje ozi?” O chetaziiri ha ihe yanwa na-eme, nke ọ chọrọ ka ha na-eme. Ọ sịrị ha: “Ma anọ m n’etiti unu dị ka onye na-eje ozi.”—Luk 22:25-27.
N’agbanyeghị na e nwere ebe ndịozi Jizọs na-anaghị emecha nke ọma, ha ahapụghị Jizọs ọbụna n’oge dị iche iche ọnwụnwa bịaara ya. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ.” (Luk 22:29) Ha niile akwụsịghị iso ụzọ Jizọs. Jizọs ji ndụ ya na ha gbara mee ka obi sie ha ike na ya na ha ga-anọ n’Alaeze eluigwe ma soro ya na-achị.
N’agbanyeghị na ndịozi Jizọs nwere olileanya na ha ga-eso Jizọs na-achị, ha ka bụ mmadụ, bụrụkwa ndị na-ezughị okè. Jizọs gwara ha, sị: “Setan achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit.” Ọ na-abụ a na-ayọcha ọka wit, ya ana-agbasasị. (Luk 22:31) Jizọs gwakwara ha, sị: “Unu niile ga-asụ ngọngọ n’ihi m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị, ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’”—Matiu 26:31; Zekaraya 13:7.
Pita turu ọnụ, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile asụọ ngọngọ n’ihi gị, m gaghị asụ ngọngọ ma ọlị!” (Matiu 26:33) Jizọs gwara Pita na tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ n’abalị ahụ, ọ ga-agọnahụ ya. Jizọs kwukwara, sị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32) N’agbanyeghị ihe a Jizọs gwara Pita, Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, agaghị m agọnahụ gị ma ọlị.” (Matiu 26:35) Ndịozi ndị ọzọ kwukwara otu ihe ahụ.
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ na unu ga-anọkwu obere oge. Unu ga-achọ m; dị nnọọ ka m gwara ndị Juu, sị, ‘Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga,’ otú ahụ ka m na-agwakwa unu ugbu a.” Ọ gwaziri ha, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:33-35.
Mgbe Jizọs kwuru na ya na ha ga-anọkwu obere oge, Pita jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-aga?” Jizọs zara ya, sị: “Ị pụghị iso m ugbu a gaa ebe m na-aga, kama ị ga-eso m ma e mesịa.” Ihe a Jizọs kwuru gbagwojuru Pita anya, ya ajụọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, gịnị mere na apụghị m iso gị ugbu a? M ga-atọgbọ mkpụrụ obi m n’ihi gị.”—Jọn 13:36, 37.
Jizọs chetaziiri ndịozi ya ihe ọ gwara ha mgbe o zipụrụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma na Galili n’ejighị akpa ego na akpa nri. (Matiu 10:5, 9, 10) Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ dịghị ihe kọrọ unu, ka ọ̀ dị?” Ha zara ya, sị: “Ee e!” Ma, oleekwanụ ihe ha ga-eme n’ụbọchị ndị na-abịa abịa? Jizọs gwara ha, sị: “Ka onye nwere obere akpa ego were ya, ka onye nwere obere akpa nri were ya; ka onye na-enweghịkwa mma agha ree uwe elu ya zụrụ otu. N’ihi na ana m asị unu na ihe a e dere aghaghị imezu n’ebe m nọ, ya bụ, ‘a gụnyere ya ná ndị na-emebi iwu.’ N’ihi na ihe e dere banyere m na-emezu.”—Luk 22:35-37.
Ihe Jizọs na-ekwu okwu ya bụ gbasara oge a ga-akpọgide ya na ndị mmehie n’osisi ịta ahụhụ. E mechaa, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara ndị na-eso ụzọ ya. Ha chere na ha dị njikere maka ihe ga-abịara ha. N’ihi ya, ha gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, lee! anyị ji mma agha abụọ.” Jizọs sịrị ha: “O zuola.” (Luk 22:38) N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eji mma agha abụọ a kụziere ha ihe ọzọ dị mkpa.
-
-
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na NdụJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 119
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
JIZỌS NA-AGA ỊKWADEBERE NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA EBE
O KWERE HA NKWA IZITERE HA IHE INYE AKA
NNA JIZỌS KA YA UKWU
Jizọs na ndịozi ya ka nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu mgbe ha richara nri ncheta ọnwụ ya. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Nweenụ okwukwe n’ebe Chineke nọ, nweekwanụ okwukwe n’ebe mụ onwe m nọ.”—Jọn 13:36; 14:1.
Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ihe mere na obi ekwesịghị ịlọ ha mmiri ma ya laghachi n’eluigwe. Ọ sịrị ha: “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị. . . . Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.” Ma, ndịozi ya aghọtaghị na ihe ọ na-ekwu bụ na ọ ga-alaghachi n’eluigwe. N’ihi ya, Tọmọs jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga. Olee otú anyị si mara ụzọ ya?”—Jọn 14:2-5.
Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.” Ọ bụ naanị ikwere na Jizọs na n’ihe ọ kụziri nakwa ibi ndụ otú Jizọs biri ga-eme ka mmadụ bata n’ụlọ Nna ya dị n’eluigwe. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 14:6.
Mgbe Filip nụrụ ihe a Jizọs kwuru, ọ gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ, o zuwokwara anyị.” O nwere ike ịbụ na Filip chọrọ ịhụ Chineke n’ọhụụ otú ahụ Mozis, Ịlaịja, na Aịzaya hụrụ ya. Ma, ndịozi Jizọs ahụla ihe ka ọhụụ ndị ahụ. Jizọs gwara Filip, sị: “Mụ na unu ànyị anọwo ogologo oge há otú a, ma, ị mabeghị m, Filip? Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” Jizọs na-akpa nnọọ àgwà ka Nna ya. N’ihi ya, mmadụ na Jizọs ịnọ, onye ahụ a na-ahụ otú o si akpa àgwà, yiri ịhụ otú Nna ya si akpa àgwà. Ma, Nna Jizọs ka Jizọs ukwuu. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Adịghị m ekwu ihe m na-agwa unu n’echiche nke onwe m.” (Jọn 14:8-10) Ndịozi Jizọs si otú ahụ ghọta na ihe niile Jizọs na-akụzi si n’aka Nna ya.
Ndịozi Jizọs ahụla ebe Jizọs rụrụ ọrụ ebube, nụkwa ka ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ma ugbu a, Jizọs na-agwa ha, sị: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, onye ahụ ga-arụkwa ọrụ m na-arụ; ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a.” (Jọn 14:12) Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ha ga-arụ ọrụ ebube karịa ya. Kama, ihe okwu ya pụtara bụ na ha ga-ekwusa ozi ọma ọtụtụ afọ karịa ya, gaa ọtụtụ ebe kwusaa ya, ziekwa ọtụtụ ndị ozi ọma karịa mmadụ ole yanwa ziri ozi ọma.
Jizọs ịlaghachi n’eluigwe agaghị eme ka ndịozi ya nọrọ naanị ha, n’ihi na Jizọs kwere ha nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” Jizọs gwakwara ha, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ.” (Jọn 14:14, 16, 17) Jizọs si otú a mee ka obi sie ha ike na ha ga-enweta ihe ọzọ ga-enyere ha aka, ya bụ, mmụọ nsọ. Ihe a Jizọs gwara ha mezuru n’ụbọchị Pentikọst.
Jizọs gwara ha, sị: “N’oge na-adịghị anya, ụwa agaghịkwa ahụ m ọzọ, kama unu ga-ahụ m, n’ihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.” (Jọn 14:19) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ ga-eme ka ha hụ ya ma a kpọlitechaa ya n’ọnwụ. E mechaa, ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha bụrụ mmụọ ma soro ya biri n’eluigwe.
Jizọs kwuziri, sị: “Onye nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-edebe ha, ọ bụ onye ahụ hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya, m ga-ahụkwa ya n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.” Mgbe Jizọs kwuru ihe a, onyeozi ya aha ya bụ Judas, onye a na-akpọkwa Tadiọs, jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji chọọ igosi anyị onwe gị nke ọma, ọ bụghị igosi ya ụwa?” Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya . . . Onye na-ahụghị m n’anya adịghị edebe okwu m.” (Jọn 14:21-24) Ndị ụwa adịghị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha ewereghị Jizọs ka ụzọ, eziokwu, na ndụ.
Ebe ọ bụ na Jizọs na-alaghachi eluigwe, olee otú ndị na-eso ụzọ ya ga-esi cheta ihe niile ọ kụziiri ha? Jizọs gwara ha, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.” Ndịozi Jizọs ejirila anya ha hụ ike mmụọ nsọ na-akpa. N’ihi ya, ihe a ọ gwara ha kasiri ha obi. Jizọs gwakwara ha, sị: “M na-ahapụrụ unu udo, m na-enye unu udo m. . . . Ka obi ghara ịlọ unu mmiri, unu atụkwala egwu.” (Jọn 14:26, 27) Obi ekwesịghị ịlọ ndị na-eso ụzọ Jizọs mmiri n’ihi na Nna Jizọs ga na-eduzi ha ma na-echebe ha.
N’oge na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-ahụ ihe na-egosi na Chineke na-echebe ha. Jizọs kwuru, sị: “Onye na-achị ụwa na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.” (Jọn 14:30) Ekwensu banyere n’ime Judas ma jiri ya kwara ngwá ọrụ. Ma, Jizọs enweghị mmehie nke Ekwensu ga-agbakwasị ụkwụ na ya mee ka o mehie Chineke. Ekwensu agaghịkwa emeli ka Jizọs tọ n’ili. N’ihi gịnị? Jizọs kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị na ya ‘na-eme ihe Nna ya nyere ya n’iwu ka ya mee.’ Obi siri ya ike na Nna ya ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Jọn 14:31.
-
-
Ịbụ Alaka Na-amị Mkpụrụ na Ịbụ Ndị Enyi JizọsJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 120
Ịbụ Alaka Na-amị Mkpụrụ na Ịbụ Ndị Enyi Jizọs
EZI OSISI VAỊN AHỤ NA ALAKA YA
OTÚ MMADỤ GA-ESI NỌGIDE N’ỊHỤNANYA JIZỌS
Jizọs nọ na-agba ndịozi ya ume kemgbe ha na ya na-akparịta ụka. Ugbu a, chi ejimiela, o nwedịrị ike ịbụ n’ime ime abalị. Jizọs meziiri ha otu ihe atụ. Ọ sịrị:
“Abụ m ezi osisi vaịn, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya.” (Jọn 15:1) Ihe atụ a Jizọs mere yiri ihe Jehova kwuru banyere ụmụ Izrel ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Jehova kpọrọ ha vaịn ya. (Jeremaya 2:21; Hosia 10:1, 2) Ma, Jehova agala ịjụ ha. (Matiu 23:37, 38) N’ihi ya, Jizọs na-ekwu banyere vaịn ọzọ. Ọ bụ ya bụ vaịn ahụ Nna ya kụrụ kemgbe afọ 29 o ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ. Ma Jizọs kwuru ihe gosiri na ọ bụghị naanị ya ka osisi vaịn ahụ nọchiri anya ya. Ọ sịrị:
“[Nna m] na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ. . . . Dị nnọọ ka alaka ahụ na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya ma ọ bụrụ na ọ dịgideghị n’osisi vaịn ahụ, otú ahụkwa ka unu na-apụghị ịmị mkpụrụ, ma ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m. Abụ m osisi vaịn ahụ, unu bụ alaka ya.”—Jọn 15:2-5.
Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ọ laghachi eluigwe, ọ ga-ezitere ha ihe inyeaka. Ihe inyeaka ahụ bụ mmụọ nsọ. Mgbe ụbọchị iri ise na otu gachara, bụ́ mgbe a wụsara ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ mmụọ nsọ, ha ghọrọ alaka osisi vaịn ahụ. “Alaka” niile ahụ ga-anọgiderịrị n’ime Jizọs. N’ihi gịnị?
Jizọs kwuru, sị: “Onye nọgidere n’ime m, mụ onwe m anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu; n’ihi na e wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” “Alaka” osisi ndị ahụ ma ọ bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-amị mkpụrụ dị ukwuu. Nke a pụtara na ha ga na-akpa àgwà otú Jizọs si akpa, na-agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke, ma na-eme ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Gịnịkwanụ ga-eme onye na-anọgideghị n’ime Jizọs, ma ghara ịmị mkpụrụ? Jizọs kwuru banyere onye dị otú ahụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, a na-atụpụ ya dị ka alaka.” Gịnịkwanụ banyere onye nọgidere n’ime Jizọs? Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’ime m, okwu m adịgidekwa n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ, ọ ga-emekwara unu.”—Jọn 15:5-7.
Jizọs kwughachiri ihe o kwuburu, ya bụ, idebe ihe ndị o nyere n’iwu. (Jọn 14:15, 21) O kwuru ụzọ kacha mkpa ndị na-eso ụzọ ya ga-esi egosi na ha na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debere ihe Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” Ma, ọ bụghị naanị ịhụ Jehova Chineke na Ọkpara ya n’anya ka a chọrọ ka ha na-eme. Jizọs gwara ha, sị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya. Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.”—Jọn 15:10-14.
N’awa ole na ole Jizọs kwuchara ihe a, ọ ga-eme ihe gosiri na ya hụrụ ha n’anya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ na ọ ga-anwụ n’ihi ndị niile nwere okwukwe na ya. Nke a ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mụta ịhụ ibe ha n’anya otú ahụ Jizọs si hụ ha n’anya. Jizọs agwabuola ha na ọ bụ ụdị ịhụnanya ahụ ka a ga-eji mara ha. Ọ sịrị ha: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.
Ndịozi Jizọs kwesịrị iburu n’obi na Jizọs na-akpọ ha “ndị enyi m.” O kwuru ihe mere ha ji bụrụ ndị enyi ya. Ọ sịrị: “Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” O nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ na Jizọs ịbụ enyi, onye ahụ amara ihe ndị Chineke kụziiri Jizọs. Ma ka ha na Jizọs nwee ike ịnọgide na-abụ enyi, ha ‘ga-anọgide na-amị mkpụrụ.’ Jizọs kwuru uru ịna-amị mkpụrụ ga-abara ha. Ọ sịrị: “Nna m [ga-enye] unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.”—Jọn 15:15, 16.
Ịhụnanya a ndị a bụ́ “alaka” Jizọs ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ibe ha ga-enyere ha aka idi ihe na-aga ịbịara ha. Ọ gwara ha na ụwa ga-akpọ ha asị. Ma, ọ gwara ha okwu na-akasi obi. Ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị. A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa, . . . ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.”—Jọn 15:18, 19.
Jizọs kwukwara ihe ọzọ ga-eme ka ụwa kpọọ ha asị. Ọ sịrị: “Ha ga-eme unu ihe ndị a niile n’ihi aha m, n’ihi na ha amaghị onye ahụ nke zitere m.” Jizọs kwuru na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ ga-ama ndị kpọrọ ya asị ikpe. Ọ sịrị: “A sị na mụ arụghị ọrụ ndị ahụ n’etiti ha, bụ́ nke onye ọ bụla ọzọ na-arụghị, ha agaraghị enwe mmehie; ma ugbu a, ha ahụwo m, kpọọkwa mụ na Nna m asị.” Asị ha kpọrọ Jizọs mezuru amụma dị na Baịbụl.—Jọn 15:21, 24, 25; Abụ Ọma 35:19; 69:4.
Jizọs kwere ha nkwa ọzọ na ọ ga-ezitere ha ihe inyeaka, ya bụ, mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ a bụ maka ndị niile kweere na Jizọs. Ọ ga-enyere ha aka ịmị mkpụrụ na ‘ịgba àmà.’—Jọn 15:27.
-
-
“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 121
“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”
N’OGE NA-ADỊGHỊ ANYA, NDỊOZI JIZỌS AGAGHỊZI AHỤ YA
UJU NDỊOZI JIZỌS NA-ERU GA-AGHỌ ỌṄỤ
Jizọs na ndịozi ya ejikerela ịpụ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu, bụ́ ebe ha nọ rie nri Ememme Ngabiga. Ebe ọ bụ na Jizọs agwala ha ọtụtụ ihe ha ga-eme, ọ gwara ha, sị: “Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee ghara ịsụ ngọngọ.” Gịnị mere ihe a ọ gwara ha ji kwesị ekwesị? Ọ bụ n’ihi ihe a ọ na-aga ikwu. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ga-achụpụ unu n’ụlọ nzukọ. N’eziokwu, oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ya jeere Chineke ozi dị nsọ.”—Jọn 16:1, 2.
Ihe a Jizọs gwara ndịozi ya nwere ike ịna-ewute ha. Ọ bụ eziokwu na Jizọs agwabuola ha na ụwa ga-akpọ ha asị, o nwebeghị mgbe ọ gwara ha na a ga-egbu ha. Gịnị mere na ọ gwaghị ha ya kemgbe? Jizọs sịrị: “Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ, n’ihi na mụ na unu nọ.” (Jọn 16:4) Ugbu a, ọ na-agwa ha ya tupu ya ahapụ ha laa eluigwe. Ihe a ọ gwara ha ga-enyere ha aka ka ha ghara ịsụ ngọngọ mgbe e mechara.
Jizọs gwakwara ha, sị: “M na-alakwuru onye zitere m, ma ọ dịghị otu onye n’ime unu na-ajụ m, sị, ‘Olee ebe ị na-aga?’” Ha ajụbuola Jizọs ná mmalite mgbede ụbọchị ahụ ebe ọ na-aga. (Jọn 13:36; 14:5; 16:5) Ihe Jizọs kwuru banyere mkpagbu a ga-akpagbu ha mere ka ahụ́ nwụọ ha, nke na ha na-eruzi uju. Nke a mere ka ha ghara ịjụkwu ya ajụjụ gbasara ebube ọ ga-emecha nweta ma ọ bụkwanụ uru ebube a ga-abara ndị na-efe Chineke. Jizọs chọpụtara ihe ha na ya na-alụ. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “N’ihi na agwawo m unu ihe ndị a, obi unu ejupụtawo n’iru uju.”—Jọn 16:6.
Jizọs gwaziri ha, sị: “Ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji na-ala. N’ihi na ọ bụrụ na mụ alaghị, ihe inyeaka ahụ agaghị abịakwute unu ma ọlị; ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya.” (Jọn 16:7) Ọ gwụla ma Jizọs ọ̀ nwụrụ ma laghachi eluigwe ka ndị na-eso ụzọ ya ga-eji nweta mmụọ nsọ. Jizọs nwere ike izigara ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ ka ọ na-enyere ha aka n’agbanyeghị ebe ọ bụla ha nọ.
Mmụọ nsọ ahụ ‘ga-enye ụwa ihe àmà doro anya banyere mmehie na ezi omume na banyere ikpe.’ (Jọn 16:8) Mmụọ nsọ a ga-agba ndị nọ n’ụwa n’anwụ na ha enweghị okwukwe n’Ọkpara Chineke. Jizọs ịlaghachi eluigwe ga-eme ka o doo onye ukwu na onye nta anya na ọ bụ onye ezi omume. Ọ ga-egosikwa ihe mere e kwesịrị iji maa Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” ikpe ọnwụ.—Jọn 16:11.
Jizọs gwakwara ndịozi ya, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.” Mgbe ọ ga-awụkwasị ha mmụọ nsọ, mmụọ nsọ ahụ ga-enyere ha aka ịghọta “eziokwu niile.” Ịghọta eziokwu a ga-enyere ha aka ịna-akpa àgwà ziri ezi.—Jọn 16:12, 13.
Jizọs kwuru ihe ọzọ nke gbagwojuru ndịozi ya anya. Ọ sịrị ha: “N’oge na-adịghị anya, unu agakwaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m.” Ha jụrịtara onwe ha ihe Jizọs bu n’obi kwuo ihe a. Mgbe Jizọs chọpụtara na ha chọrọ ịjụ ya ajụjụ banyere ihe a o kwuru, ọ gwara ha, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, unu ga-akwa ákwá ma tie mkpu arịrị, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ; unu ga-eru uju, ma a ga-eme ka iru uju unu ghọọ ọṅụ.” (Jọn 16:16, 20) Mgbe e gburu Jizọs n’ehihie echi ya, ndị ndú okpukpe ṅụrịrị ọṅụ, ma ndị na-eso ụzọ Jizọs ruru uju. Ma iru uju ha ghọrọ ọṅụ mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ha ṅụrịkwuru ọṅụ mgbe ọ wụkwasịrị ha mmụọ nsọ.
Jizọs ji ọnọdụ ndịozi ya nọ na ya tụnyere nwaanyị ime na-eme. Ọ sịrị: “Mgbe nwaanyị na-amụ nwa, ọ na-ahụju anya, n’ihi na oge awa ya eruwo; ma mgbe ọ mụpụtara nwa ahụ, ọ dịghị echeta ahụhụ ahụ ọzọ n’ihi ọṅụ o nwere na ọ mụwo mmadụ n’ụwa.” Jizọs gwara ha okwu gbara ha ume. Ọ sịrị ha: “Unu onwe unu, n’ezie, na-eru uju ugbu a; ma m ga-ahụ unu ọzọ, obi unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, ọ dịghịkwa onye ga-anapụ unu ọṅụ unu.”—Jọn 16:21, 22.
Ndịozi Jizọs arịọtụbeghị Chineke ihe n’aha Jizọs. Ma ugbu a, Jizọs gwara ha, sị: “N’ụbọchị ahụ, unu ga-arịọ [Nna m] ihe n’aha m.” Gịnị mere ha ga-eji arịọ ihe n’aha ya? Ọ̀ bụ maka na Chineke achọghị ịnụ arịrịọ ha? Mba. Jizọs gwara ha, sị: “Nna m n’onwe ya hụrụ unu n’anya nke ukwuu, n’ihi na unu hụrụ m n’anya nke ukwuu . . . dị ka onye nnọchiteanya nke Nna m.”—Jọn 16:26, 27.
Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs gwara ndịozi ya mere ka obi sie ha ike ịgwa ya, sị: “Anyị ji nke a kwere na i si n’ebe Chineke nọ bịa.” Ma, ihe na-aga ime n’oge na-adịghị anya ga-eme ka a mata ma hà ji obi ha niile kwere n’ihe a ha kwuru. Jizọs gwara ha ihe na-aga ime mgbe ahụ. O kwuru, sị: “Lee! Oge awa na-abịa, n’ezie, ọ bịawo, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ga-ahapụkwa naanị m.” Ma, ihe ọ gwara ha mere ka obi sie ha ike. Ọ gwara ha, sị: “Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee site na mụ nwee udo. N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:30-33) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ ga-anọnyere ha. Obi siri ya ike na ọ bụrụ na ndịozi ya ejisie ike na-eme uche Chineke n’agbanyeghị mbọ niile Setan na-agba ka ha kwụsị ime uche Chineke, ha ga-emeri ụwa, otú yanwa meriri.
-
-
Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’EluJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 122
Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’Elu
URU ỊMATA CHINEKE NA ỌKPARA YA BARA
OTÚ JEHOVA, JIZỌS, NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA SI BỤRỤ OTU
Jizọs hụrụ ndịozi ya n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji mee ka ha mara ihe ndị na-aga ime ha maka na ọ ma na oge ọ ga-ahapụ ha dị nso. Mgbe o mechara ka ha mara ihe ndị ahụ, o leliri anya n’eluigwe kpegara Nna ya ekpere, sị: “Mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube, ebe i nyere ya ikike n’ebe anụ ahụ́ niile dị, ka o wee nye ndị ahụ niile i nyere ya ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:1, 2.
N’eziokwu, Jizọs ghọtara na ihe kacha mkpa bụ ime ka Chineke dị ebube. Ma ndụ ebighị ebi ahụ Jizọs kwuru okwu ya bụ ihe na-akasi ndịozi ya obi. Ebe ọ bụ na e nyela Jizọs “ikike n’ebe anụ ahụ́ niile dị,” o nwere ike ime ka àjà ahụ ọ ga-eji ndụ ya chụọ baara mmadụ niile uru. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka ọ ga-abara uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị Jizọs ga-eme ka àjà ọ chụrụ baara uru bụ ndị ga-eme ihe ọzọ ọ na-aga ikwu. Jizọs sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
Mmadụ ga-amatarịrị Chineke na Ọkpara ya nke ọma, ya na ha adịrị n’ezigbo mma. Ọ ga na-ele ihe anya otú ha si ele ihe anya. Ọ ga na-akpaso ndị ọzọ àgwà otú ha si akpaso ha àgwà. Ọ ga-aghọtakwa na ụmụ mmadụ ime ka Chineke nwee ebube dị mkpa karịa inweta ndụ ebighị ebi. Mgbe Jizọs kwuchara otú mmadụ ga-esi enweta ndụ ebighị ebi, ọ laghachiziri n’ihe ka mkpa ọ na-ekwu. Ọ sịrị:
“Emewo m ka ị dị ebube n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ. Ya mere, ugbu a, Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.” (Jọn 17:4, 5) N’eziokwu, Jizọs chọrọ ka Chineke kpọlite ya n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe nwee ebube ahụ o nweburu.
Ma, Jizọs echefubeghị ihe ndị ọ rụrụ n’ozi o jere n’ụwa. O kpere ekpere, sị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m. Ha bụ nke gị, i nyekwara m ha, ha edebewokwa okwu gị.” (Jọn 17:6) Ihe Jizọs mere n’ozi ọma ya abụghị naanị ịkpọ Chineke aha ya bụ́ Jehova, o nyekwaara ndịozi ya aka ka ha mara ihe mere o ji aza aha ahụ. Aha Chineke na-eme ka anyị mata ụdị onye Chineke bụ na otú o si emeso ụmụ mmadụ ihe.
Ndịozi Jizọs amarala onye Jehova bụ, mara ihe Ọkpara ya na-arụ, marakwa ihe ndị Jizọs kụziiri ha. Jizọs medaziri obi gwa Chineke, sị: “Enyewo m ha okwu i nyere m, ha anatawokwa ya, ha amarawokwa n’ezie na m bịara dị ka onye nnọchiteanya gị, ha ekwerewokwa na ọ bụ gị zitere m.”—Jọn 17:8.
Jizọs kwuziri ihe dị iche n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na ndị ụwa. Ọ sịrị: “M na-arịọ arịrịọ banyere ha; m na-arịọ, ọ bụghị banyere ụwa, kama banyere ndị i nyere m; n’ihi na ha bụ nke gị . . . Nna dị nsọ, chee ha nche n’ihi aha gị nke i nyere m, ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị bụ otu. . . . M na-eche ha nche n’ihi aha gị nke i nyere m; edebewokwa m ha, ọ dịghịkwa otu n’ime ha e bibiri ma e wezụga nwa mbibi ahụ.” Nwa mbibi ahụ bụ Judas Iskarịọt, onye pụrụla ịga kpọta ndị ga-ejide Jizọs.—Jọn 17:9-12.
Jizọs kwuru na ụwa kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya asị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gwara Chineke, sị: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:14-16) Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ụwa. Ụwa Jizọs kwuru okwu ya ebe a bụ ụmụ mmadụ Setan na-achị. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs agaghị na-eme ka ndị ụwa ma ọ bụ soro ha na-akpa àgwà ọjọọ ha na-akpa. Olee otú ha ga-esi ghara ịna-eme ka ndị ụwa?
Ha ga-adịrịrị nsọ, bụrụ ndị e wepụtara iche ijere Chineke ozi. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eme ihe ndị ha mụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa ihe Jizọs kụziiri ha. Jizọs kpere ekpere, sị: “Jiri eziokwu doo ha nsọ; okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ka oge na-aga, Chineke ga-enye ụfọdụ n’ime ndịozi Jizọs mmụọ nsọ ka ha dee akwụkwọ ndị ga-eso ‘n’eziokwu’ ahụ ga-enyere mmadụ aka ya adị nsọ.
Ma, ndị ọzọ ga-emecha mụta “eziokwu” ahụ. N’ihi ya, Jizọs kpere ekpere, sị: “Ọ bụghị naanị banyere ndị a, [ya bụ, ndịozi iri na otu ahụ ha na ya nọ] kamakwa banyere ndị nwere okwukwe n’ebe m nọ site n’okwu ha.” Gịnị ka Jizọs kpegaara Chineke ekpere banyere ndị niile na-eso ụzọ ya? Jizọs sịrị: “Ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka anyị na ha wee dị n’otu.” (Jọn 17:20, 21) Jizọs na Nna ya abụghị otu onye. Otú ha si bụrụ otu bụ na ha anaghị eme ihe iche iche. Ekpere Jizọs bụ ka ndị na-eso ụzọ ya bụrụ otu, ya bụ, ka ha na-emekọ ihe ọnụ.
Obere oge tupu Jizọs ekpewe ekpere a, ọ gwara Pita na ndịozi ya ndị ọzọ na ọ na-aga ịkwadebere ha ebe n’eluigwe. (Jọn 14:2, 3) Jizọs kwughachiri banyere ya n’ekpere, sị: “Nna, banyere ihe i nyere m, ọ dị m ka ya bụrụ na ha onwe ha ga-eso m nọrọ n’ebe m nọ, ka ha wee hụ ebube i nyere m, n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa.” (Jọn 17:24) Jizọs ji ihe a o kwuru gosi na ogologo oge gara aga, tupudị Adam na Iv amụta ụmụ, Chineke hụrụ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’anya. Ọkpara ya a mechara bụrụ Jizọs Kraịst.
Mgbe Jizọs na-emechi ekpere ya, o kwuru okwu ọzọ banyere aha Nna ya na otú Chineke si hụ ndịozi ya na ndị ọzọ ga-amụta “eziokwu” ahụ n’anya. Ọ sịrị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:26.
-
-
Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya nke UkwuuJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 123
Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya nke Ukwuu
MATIU 26:30, 36-46 MAK 14:26, 32-42 LUK 22:39-46 JỌN 18:1
MGBE JIZỌS NỌ N’OGIGE GETSEMENI
ỌSỤSỌ YA DỊ KA ỌBARA NKE NA-ATAPỤSỊ N’ALA
Mgbe Jizọs na ndịozi ya kpechara ekpere, ya na ha bụrụ abụ ma gaa n’Ugwu Oliv. (Mak 14:26) Ha gawara n’ogige a na-akpọ Getsemeni, bụ́ ebe ọ na-agakarị. Ogige a dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem.
Ozugbo ha ruru n’ogige a mara mma osisi oliv juru, Jizọs hapụrụ ndịozi ya asatọ ma baa n’ime ogige a. O nwere ike ịbụ na ọ hapụrụ ha ná mbata ogige a n’ihi na ọ sịrị ha: “Nọdụnụ ala n’ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ wee kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ ndịozi ya atọ aha ha bụ Pita, Jems, na Jọn baa n’ime ogige ahụ. O bidoro ichegbu onwe ya nke ukwuu ma gwa ha, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ. Nọrọnụ n’ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”—Matiu 26:36-38.
Mgbe Jizọs gatụkwuru n’ihu, “ọ dara n’ala wee malite ikpe ekpere.” Gịnịkwanụ ka ọ na-arịọ Chineke ka o meere ya n’oge a? Ọ sịrị Chineke: “Nna, ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ; wepụ iko a n’ebe m nọ. Ma ọ bụghị ihe m chọrọ, kama ihe ị chọrọ.” (Mak 14:35, 36) Olee ihe okwu Jizọs pụtara? Ọ̀ chọrọ ịgbara àjà Chineke chọrọ ka o jiri ndụ ya chụọ ọsọ, bụ́ ihe a ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ? Mba.
Jizọs anọrọla n’eluigwe hụ otú ndị Rom si emekpọ ndị ha na-egbu ọnụ. Ugbu a ọ bụ mmadụ, o nwere obi ọmịiko, ihe na-emetụkwa ya n’ahụ́. N’ihi ya, ọ naghị agụsi ya agụụ ike ka mgbe a ga-ata ya ahụhụ ruwe eruwe. Ma, ihe kacha eme ka ọ na-echegbu onwe ya bụ na ọ ma na ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ka onye omekome nwere ike ime ka a kọchaa aha Nna ya. N’awa ole na ole, a ga-akpọgide ya n’osisi ka à ga-asị na ọ bụ onye na-ekwulu Chineke.
Mgbe Jizọs kpechara ekpere ruo ogologo oge, ọ laghachiri ebe ndịozi ya atọ ahụ nọ ma hụ na ha na-ehi ụra. Ọ gwara Pita, sị: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ruo ọbụna otu awa? Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” Jizọs ghọtara na ike gwụchara ndịozi ya ahụ nakwa na chi ejimiela. N’ihi ya, o kwuru, sị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Matiu 26:40, 41.
Jizọs gaghachiri ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere ma rịọ Chineke ka o wepụrụ ya “iko a.” Mgbe ọ laghachiri ebe ahụ ndịozi ya atọ nọ, ọ hụrụ ha ọzọ ka ha na-ehi ụra mgbe ha kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka ha ghara ịdaba n’ọnwụnwa. Mgbe Jizọs gwara ha okwu, “ha amaghị ihe ha ga-aza ya.” (Mak 14:40) Jizọs gaghachikwara ebe ọ na-ekpe ekpere ma gbuo ikpere n’ala kpee ekpere.
Jizọs na-echegbu onwe ya nke ukwuu otú ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ka onye omekome ga-esi mee ka a kọchaa aha Nna ya. Jehova nọ na-anụ ekpere Ọkpara ya. N’ihi ya, o nwere mgbe o ruru, ya ezite mmụọ ozi ya ka o mee ka Jizọs dị ike. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs akwụsịghị ikpegara Nna ya ekpere. Ọ nọ “na-ekpesi ekpere ike karị.” Jizọs na-echegbu onwe ya nke ukwuu. Ihe dị ya n’aka abụghị obere ihe. Ndụ ebighị ebi nke ya na nke ụmụ mmadụ ndị kweere na Chineke dị ya n’aka. Ihe ndị a mere ka ‘ọsụsọ ya dịrị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.’—Luk 22:44.
Mgbe Jizọs gaghachiri na nke ugboro atọ ya n’ebe ahụ ndịozi ya nọ, ọ hụkwara ha ka ha na-ehi ụra. Ọ sịrị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezu ike! Lee! Oge awa ahụ eruwo nso ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. Bilienụ, ka anyị pụọ. Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.”—Matiu 26:45, 46.
-
-
A Raara Kraịst Nye ma Jide YaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 124
A Raara Kraịst Nye ma Jide Ya
MATIU 26:47-56 MAK 14:43-52 LUK 22:47-53 JỌN 18:2-12
JUDAS ARARA JIZỌS NYE N’OGIGE GETSEMENI
PITA EBEPỤ NTỊ OTU NWOKE
E JIDERE JIZỌS
Ọ gafeela etiti abalị. Ndị isi nchụàjà ekwetala ịkwụ Judas mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ka ọ rara Jizọs nye. N’ihi ya, Judas kpọ ìgwè ndị isi nchụàjà na ndị Farisii bịa ka ha jide Jizọs. Ndị ọzọ Judas kpọ bịa bụ ụfọdụ ndị agha Rom ji ngwá ọgụ, na ọchịagha ha.
O nwere ike ịbụ ozugbo Jizọs mechara ka Judas pụọ n’oge ha na-eri nri Ememme Ngabiga, ka Judas gakwuuru ndị isi nchụàjà. (Jọn 13:27) Ndị isi nchụàjà ahụ kpọkọtara ma ndị agha ha ma ndị ọrụ nche ha gaa ijide Jizọs. Ọ ga-abụ na ebe mbụ Judas kpọ ha gaa bụ n’ọnụ ụlọ dị n’elu, bụ́ ebe Jizọs na ndịozi ya nọ mee Ememme Ngabiga. Ma ugbu a, Judas na ndị ha na ya so agafeela Ndagwurugwu Kidrọn ma tinye isi n’ụzọ e si aga ogige Getsemeni. Ha ji ma ngwá ọgụ ma oriọna ma ọwa bịa. Ha kpebisiri ike ijide Jizọs.
Obi siri Judas ike na ya ma ebe ha ga-achọta Jizọs mgbe o du ìgwè mmadụ ahụ na-aga n’Ugwu Oliv. N’izu gara aga tupu mgbe ahụ, Jizọs na ndịozi ya na-esi Betani aga Jeruselem, sikwa Jeruselem lọta. N’oge a niile, ha na-akwụsịkarị n’ogige Getsemeni. Ma ugbu a, chi ejiela, ọchịchịrị gbakwara n’okpuru osisi oliv ndị dị ebe ahụ. O nwere ike ịbụ na Jizọs nọ n’okpuru osisi oliv ndị ahụ. N’ihi ya, olee otú ndị agha ahụ ga-esi amata Jizọs, ebe o nwere ike ịbụ na ha ahụtụbeghị ya? Ka ha nwee ike ịmata ya, ha na Judas kwekọrịtara na ọ ga-enye ha ihe àmà ha ga-eji mata onye bụ́ Jizọs. Ọ gwara ha, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya; jidenụ ya, leziekwanụ anya kpụrụ ya gawa.”—Mak 14:44.
Mgbe Judas kpọ ìgwè mmadụ ahụ na-abanye n’ogige Getsemeni, ọ hụrụ Jizọs na ndịozi ya. Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ gakwuuru Jizọs ma kelee ya, sị: “Ndeewo, Rabaị!” Judas jizi nwayọọ susuo ya ọnụ. Jizọs jụrụ ya, sị: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?” (Matiu 26:49, 50) Jizọs ji aka ya zaa ajụjụ a ọ jụrụ ya. Ọ sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ na-arara Nwa nke mmadụ nye?” (Luk 22:48) Mgbe Jizọs gwachara Judas ihe a, ọ hapụrụ Judas gwawazie ndị ọzọ okwu.
Jizọs gakwuuru ndị ahụ ji oriọna na ọwa ma jụọ ha, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha zara ya, sị: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.” Jizọs katara obi, sị ha: “Ọ bụ m.” (Jọn 18:4, 5) Ìgwè mmadụ ahụ atụghị anya na Jizọs ga-akatali ụdị obi ahụ, n’ihi ya, ha lara azụ ma daa n’ala.
Jizọs ejighị ohere ahụ gbaa ọsọ, kama, ọ jụrụ ha ọzọ onye ha na-achọ. Mgbe ha kwuru ọzọ na ọ bụ “Jizọs onye Nazaret,” Jizọs gwara ha, sị: “Agwara m unu na ọ bụ m. Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.” N’agbanyeghị na Jizọs nọ ná nsogbu mgbe ahụ, o chetara ihe o kwuburu nke bụ na ọ gaghị atụfu onye ọ bụla n’ime ndịozi ya. (Jọn 6:39; 17:12) Jizọs chebere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, enweghịkwa otu n’ime ha funahụrụ ya “ma e wezụga nwa mbibi ahụ,” ya bụ, Judas. (Jọn 18:7-9) N’ihi ya, Jizọs kwuru ka a hapụ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi.
Mgbe ndị agha ahụ biliri gawa n’ebe Jizọs nọ, ndịozi ya ghọtara ihe a na-achọ ime ya. N’ihi ya, ha jụrụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị gbuo ha mma agha?” (Luk 22:49) Tupu Jizọs azaa ha ya, Pita amịrịla otu n’ime mma agha abụọ ha ji gbuo ya Malkọs, bụ́ ohu nnukwu onye nchụàjà, ma bepụ ya ntị aka nri.
Jizọs bitụrụ ntị Malkọs aka, gwọọ ya. Mgbe ọ gwọchara ya, ọ kụziiri ndịozi ya ihe dị ezigbo mkpa. O nyere Pita iwu, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” Jizọs esighị ọnwụ ka a ghara ijide ya n’ihi na o kwuru, sị: “Olee otú Akwụkwọ Nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ihe ga-esi otú a mee?” (Matiu 26:52, 54) O kwukwara, sị: “Iko nke Nna m nyere m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ijisi ike ṅụọ ya?” (Jọn 18:11) Jizọs chọrọ ka uche Chineke mezuo n’ebe ọ nọ, ọ bụrụgodị na ọ ga-anwụ.
Jizọs jụrụ ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m dị ka ùnu bịara ijide onye na-apụnara mmadụ ihe? M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ, na-ezi ihe, ma unu ejideghị m. Ma ihe a dum mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”—Matiu 26:55, 56.
Ndị agha ahụ, ọchịagha ha, na ndị ọrụ nche ndị Juu jidere Jizọs kee ya agbụ. Mgbe ndịozi Jizọs hụrụ ihe a, ha gbara ọsọ. Ma, “otu nwa okorobịa” so ìgwè mmadụ ahụ na-aga ka o nwee ike iso Jizọs. Ọ ga-abụ na nwa okorobịa ahụ bụ Mak onye na-eso ụzọ Jizọs. (Mak 14:51) Ìgwè mmadụ ahụ matara onye ọ bụ ma chọọ ijide ya. N’ihi ya, ọ hapụụrụ ha uwe linin ya, gbara ahụ́ ọtọ gbalaga.
-
-
A Kpọọrọ Jizọs Gakwuru Anas, Mechaa Kpọrọ Ya Gakwuru KeyafasJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 125
A Kpọọrọ Jizọs Gakwuru Anas, Mechaa Kpọrọ Ya Gakwuru Keyafas
MATIU 26:57-68 MAK 14:53-65 LUK 22:54, 63-65 JỌN 18:13, 14, 19-24
A KPỌỌRỌ JIZỌS GAKWURU ANAS, ONYE BỤBU NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ
IKPE NA-EKWESỊGHỊ EKWESỊ NDỊ SANHEDRIN KPERE JIZỌS
Ozugbo e kechara Jizọs agbụ ka onye omekome, a kpọọrọ ya gakwuru Anas. Anas bụ nnukwu onye nchụàjà n’oge Jizọs dị obere, bụ́ mgbe o mere ihe juru ndị nkụzi nọ n’ụlọ nsọ anya. (Luk 2:42, 47) Ụfọdụ ụmụ Anas mechara bụrụ nnukwu ndị nchụàjà. Ma ugbu a, ọ bụ ọgọ ya nwoke aha ya bụ Keyafas bụ nnukwu onye nchụàjà.
Mgbe Jizọs ka nọ na nke Anas, Keyafas kpọkọtara ndị Sanhedrin. Ha dị mmadụ iri asaa na otu. Ndị so na ha bụ nnukwu onye nchụàjà na ndị bụtụrụla nnukwu ndị nchụàjà.
Anas jụrụ Jizọs ajụjụ “banyere ndị na-eso ụzọ ya na ozizi ya.” Jizọs zara ya, sị: “Agwara m ụwa okwu n’ihu ọha. M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ, bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọta; ọ dịghịkwa ihe m kwuru na nzuzo. Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ? Jụọ ndị nụrụ ihe m gwara ha.”—Jọn 18:19-21.
Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, otu n’ime ndị ọrụ nche mara ya ụra ma baara ya mba, sị: “Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si aza onyeisi nchụàjà?” Ebe Jizọs ma na o nweghị ihe ya mere, ọ jụrụ ya, sị: “Ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ m kwuru, gbaa akaebe na o nwere ihe ọjọọ m kwuru; ma ọ bụrụ na ihe m kwuru ziri ezi, gịnị mere i ji tie m ihe?” (Jọn 18:22, 23) Anas nyeziri iwu ka a kpọga Jizọs na nke ọgọ ya nwoke, bụ́ Keyafas.
Ka ọ dị ugbu a, ndị niile nọ na Sanhedrin ezukọtala, ya bụ, nnukwu onye nchụàjà, ndị okenye, na ndị odeakwụkwọ. Ha zukọtara na nke Keyafas. Iwu akwadoghị ka ha kpee mmadụ ikpe n’abalị ụbọchị Ememme Ngabiga. Ma nke a emeghị ka ha ghara ikpe Jizọs ikpe.
Ọtụtụ n’ime ndị Sanhedrin a zukọtaranụ ka ha kpee Jizọs ikpe kpọrọ ya asị. Mgbe Jizọs kpọlitechara Lazarọs n’ọnwụ, ha kpebiri na Jizọs ga-anwụ. (Jọn 11:47-53) Ụbọchị ole na ole gara aga, ndị ndú okpukpe gbara izu ijide Jizọs ma gbuo ya. (Matiu 26:3, 4) Nke a gosiri na tupudị ha ebido ikpe Jizọs ikpe, ha amaala ya ikpe ọnwụ n’obi ha.
E wezụga izukọta kpee Jizọs ikpe n’oge iwu na-akwadoghị, ndị isi nchụàjà na ndị Sanhedrin ndị ọzọ nọ na-achọ ndị ga-agbagide Jizọs akaebe ụgha ka ha nwee ike ịma ya ikpe. Ha chọtara ọtụtụ ndị akaebe. Ma, akaebe ha ekwekọrịtaghị. N’ikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara kwuo, sị: “Anyị nụrụ ka ọ na-asị, ‘M ga-akwatu ụlọ nsọ a nke e ji aka mee, n’ime ụbọchị atọ, m ga-ewu ọzọ nke a na-ejighị aka mee.’” (Mak 14:58) Ma, ihe ha abụọ kwuru abụchaghị otu.
Keyafas jụrụ Jizọs, sị: “Ó nweghị ihe ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu n’akaebe a ndị a na-agbagide gị?” (Mak 14:60) O nweghị ihe Jizọs kwuru n’akaebe ụgha a a na-agbagide ya, bụ́kwanụ nke ndị na-agba ya na-ekwekọrịtaghị. N’ihi ya, Keyafas si ụzọ ọzọ mee ka Jizọs kwuo okwu.
Keyafas ma na ndị Juu anaghị achọ iji anya ahụ onye ọ bụla kwuru na ya bụ Ọkpara Chineke. N’oge Jizọs kwuru na Chineke bụ Nna ya, ndị Juu chọrọ igbu ya maka na ha chere na ọ “na-eme ka ya na Chineke hara.” (Jọn 5:17, 18; 10:31-39) Ebe Keyafas ma ihe ndị a, o ji akọ jụọ Jizọs, sị: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke!” (Matiu 26:63) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs ekwubuola ihe ndị gosiri na o kwetara na ya bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 3:18; 5:25; 11:4) Ọ bụrụ na o kwughị ya ugbu a, e nwere ike iche na ọ na-agọ agọ na ya abụghị Ọkpara Chineke nakwa na ya abụghị Kraịst. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ m; unu onwe unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”—Mak 14:62.
Ozugbo Jizọs kwuru ihe a, Keyafas dọwara uwe ya ma kwuo, sị: “O kwuluwo Chineke! Ọ̀ ka dị anyị mkpa ịchọ ndị akaebe? Lee! Ugbu a, unu anụwo nkwulu ahụ. Gịnị bụ uche unu?” Ndị Sanhedrin maziri ya ikpe arụrụala. Ha zara, sị: “O kwesịrị ọnwụ.”—Matiu 26:65, 66.
Ha malitere ịkwa Jizọs emo na ịkụ ya ihe. Ndị ọzọ mara ya ụra ma bụọ ya asọ mmiri n’ihu. Mgbe ha kpuchichara ya ihu ma maa ya ụra, ha jụrụ ya, sị: “Buo amụma. Ọ̀ bụ onye tiri gị ihe?” (Luk 22:64) Onye a ha na-akparị ma na-ekpe ikpe abalị a iwu na-akwadoghị, bụdị Ọkpara Chineke.
-
-
Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ KeyafasJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
ISI NKE 126
Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas
MATIU 26:69-75 MAK 14:66-72 LUK 22:54-62 JỌN 18:15-18, 25-27
PITA AGỌNAHỤ JIZỌS
Ozugbo e jidechara Jizọs n’ogige Getsemeni, ụjọ jidere ndịozi ya, ha ahapụ ya gbaa ọsọ. Ma, mmadụ abụọ n’ime ha gbatụrụ kwụsị. Otu n’ime ha bụ Pita. Onye nke ọzọ nwere ike ịbụ Jọn onyeozi. (Jọn 18:15; 19:35; 21:24) Ha nwere ike ịchụkwute Jizọs ka a kpọ ya na-aga n’ụlọ Anas. Mgbe Anas sịrị ka a kpọgara Jizọs Nnukwu Onye Nchụàjà, bụ́ Keyafas, Pita na Jọn nọ n’ebe dịtụ anya na-eso ha. O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ ha na e nwere ike ijide ha. Ha chọkwara ịma ihe a ga-eme Nna ha ukwu.
Nnukwu onye nchụàjà ma onye Jọn bụ. Ọ bụ ya mere Jọn ji nwee ike ịbanye na mbara èzí ya. Pita guzo n’èzí, n’ọnụ ụzọ, ruo mgbe Jọn bịara gwa nwa agbọghọ na-eche ọnụ ụzọ nche ka o kwe ka Pita bata. Nwa agbọghọ ahụ kpọbataziri Pita.
Oyi nọ na-atụ n’abalị ahụ. N’ihi ya, ndị nọ na mbara èzí Keyafas kwanyere ọkụ na-anya. Pita so ha na-anya ọkụ ma na-eche ka ọ hụ “ihe ga-emesị mee” n’ikpe a na-ekpe Jizọs. (Matiu 26:58) Ugbu a Pita nọ ebe ọkụ dị, nwa agbọghọ ahụ kpọbatara ya leruru ya anya wee jụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ na ị bụghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” (Jọn 18:17) Ndị ọzọ matakwara Pita ma gwa ya na ya na Jizọs na-anọ.—Matiu 26:69, 71-73; Mak 14:70.
Ihe a ha kwuru were Pita ezigbo iwe n’ihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ya. Ọ gadịrị nọrọ n’ime ọnụ ụlọ mbata. Pita gọrọ na ya na Jizọs anaghị anọ. O nwedịrị mgbe o kwuru, sị: “Amaghị m onye ọ bụ, aghọtaghịkwa m ihe ị na-ekwu.” (Mak 14:67, 68) Pita malitere “ịdụ ikwu na ịṅụ iyi.” Ọ chọrọ iji iyi a ọ ṅụrụ gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu nakwa ka ihe ọjọọ mee ya ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu.—Matiu 26:74.
N’oge niile ahụ ihe a na-eme, a nọ na-ekpe Jizọs ikpe. O nwere ike ịbụ na ebe a nọ na-ekpe ya ikpe bụ n’ụlọ Keyafas nke dị n’elu. Pita na ndị ọzọ nọ́ n’ala nwere ike ịna-ahụ ka ndị akaebe na-abanye ma na-apụta.
Olu okwu Pita gosiri na ọ bụ onye Galili. N’ihi ya, agọ ahụ ọ na-agọ bụ ụgha. Ihe ọzọ bụ na otu n’ime ndị nọ ebe ahụ bụ onye ikwu Malkọs ahụ o bepụrụ ntị. N’ihi ya, ọ jụrụ Pita, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?” Mgbe Pita gọrọ agọ na nke ugboro atọ a, oké ọkpa kwara, otú ahụ Jizọs kwuru.—Jọn 13:38; 18:26, 27.
N’oge ahụ, Jizọs tụgharịrị legide Pita anya. Ọ ga-abụ na Jizọs nọ na veranda chere ihu na mbara èzí Keyafas. Ọ ga-abụkwa na anya ahụ Jizọs lere Pita wutere Pita nke ukwuu. O chetara ihe Jizọs gwara ya awa ole na ole tupu mgbe ahụ, n’oge ha nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu. Chegodị otú obi dị Pita mgbe anya bịara doo ya. Ọ pụrụ n’èzí ma bee ezigbo ákwá.—Luk 22:61, 62.
Olee otú Pita si gọnahụ Nna ya ukwuu, ebe o chere na okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ? Ndị mmadụ hụrụ eziokwu ma kpuchie ya. Ha na-emezi Jizọs ka onye omekome. Ugbu a Pita kwesịrị ịgbachitere nwoke a aka ya dị ọcha, bụ́ Onye nwere “okwu nke ndụ ebighị ebi,” ka ọ gọnahụrụ ya.”—Jọn 6:68.
Ihe a mere Pita na-akụziri anyị na onye okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ nwere ike ịda ma ọ bụrụ na o jikereghị ejikere maka ọnwụnwa ọ na-atụghị anya ya nke nwere ike ịbịara ya. Ka ndị ohu Chineke niile si n’ihe a mere Pita mụta ihe.
-