Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lffi isi 2 nọmba nke 1-5
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Malite Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Malite Ịmụ Baịbụl
  • Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ihe Mere Anyị Ga-eji Nwee Olileanya n’Afọ 2023—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ihe Ga-eme Ka I Nwee Olileanya n’Afọ 2024—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Malite Ịmụ Baịbụl
lffi isi 2 nọmba nke 1-5
Isi nke 2. Ebe anwụ na-acha n’otu ugbo ọka wit buru ezigbo ibu.

ISI NKE 02

Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

N’ebe niile n’ụwa, ndị mmadụ na-enwe nsogbu ndị na-eme ka obi na-ajọ ha njọ, ha ana-echegbu onwe ha, obi ana-agbawakwa ha. Ụdị ihe a ò metụla gị? O nwere ike ịbụ na ọrịa na-echi gị ọnụ n’ala ma ọ bụkwanụ na onye gị na ya dị n’ezigbo mma nwụrụ. Ihe a nwere ike mee ka ị na-eche, sị, ‘Ihe ọ̀ ga-emecha dị mma?’ Ihe Baịbụl zara n’ajụjụ a ga-eme ka obi ruo gị ala.

1. Olee otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya?

Baịbụl na-agwa anyị ihe mere nsogbu ji ju ebe niile. Ọ na-agwakwa anyị na nsogbu ndị a agaghị adịte aka nakwa na ha ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Baịbụl kwere nkwa na ‘ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu nakwa na anyị ga-enwe olileanya.’ (Gụọ Jeremaya 29:11, 12.) Nkwa ndị a na-eme ka anyị na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, obi esiekwa anyị ike na anyị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

2. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu?

Baịbụl kwuru na n’ọdịnihu, “ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.” (Gụọ Mkpughe 21:4.) Nsogbu ndị na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ agaghịzi adị, ma ịda ogbenye ma mmegbu ma ọrịa ma ọnwụ. Baịbụl kwukwara na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.

3. Gịnị ka ị ga-eme ka obi sie gị ike na ihe ndị a Baịbụl kwuru ga-eme?

Ọtụtụ ndị na-atụ anya ka ihe ọma meere ha, ma, obi anaghị esi ha ike na ihe ndị ahụ ga-emecha meere ha. Ma, ihe ndị a Baịbụl kwuru ga-emerịrị. Obi ga-esi anyị ike na ha ga-emezu ma ọ bụrụ na anyị “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 17:11) Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-enwe ike iji aka gị kpebie ma ị̀ ga-ekweta na ihe ndị o kwuru gbasara ọdịnihu ga-eme n’eziokwu.

MỤTAKWUO IHE

Chebara ụfọdụ n’ime ihe ndị Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu echiche. Chọpụta otú ihe ndị o kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu si enyere ndị mmadụ aka n’oge a.

Foto dị iche iche na-egosi otú ihe dịịrị ndị mmadụ n’ụwa ugbu a na otú Baịbụl kwere nkwa ihe ga-adịrị ha n’ọdịnihu. E kwuru ihe e sere na foto ndị ahụ n’okpuru ebe a.

4. Baịbụl kwere nkwa na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu ọ bụla

Legodị ụfọdụ n’ime nkwa ndị Baịbụl kwere. Olee ndị nke kacha amasị gị? Maka gịnị?

Gụọnụ amaokwu Baịbụl ndị e dere ná ngwụcha nkwa ndị e depụtara ebe a, lebakwanụ anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị a hà mere ka i nwee olileanya? Ì chere na ha ga-abara ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị uru?

Weregodị ya na i bi n’ụwa ebe

A NA-ENWEGHỊ . . .

ONYE Ọ BỤLA . . .

  • onye ihe na-egbu mgbu, onye ya na nká na-alụ, ma ọ bụ onye ga-anwụ anwụ.—Aịzaya 25:8.

  • ga-ahụ ndị ya nwụrụ anwụ mgbe a ga-akpọlite ha, ha adịrị ndụ ọzọ n’ụwa.—Jọn 5:28, 29.

  • onye na-arịa ọrịa ma ọ bụ onye nwere nkwarụ. —Aịzaya 33:24; 35:5, 6.

  • ga-agbasi ike ka okorobịa. —Job 33:25.

  • onye a ga-ekpe ikpe mkpegbu. —Aịzaya 32:16, 17.

  • ga-enweju nri enweju, nwee ụlọ dị mma, nweekwa ezigbo ọrụ.—Abụ Ọma 72:16; Aịzaya 65:21, 22.

  • onye agha kpataara nsogbu. —Abụ Ọma 46:9.

  • ga-ebi n’udo mgbe niile. —Abụ Ọma 37:11.

  • onye obi na-anaghị ezu ike n’ihi ihe ndị mere ya n’oge gara aga. —Aịzaya 65:17.

  • ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị nsogbu ọ bụla.—Abụ Ọma 37:29.

Otu nwatakịrị nwoke na-arịabu ọrịa gbakere ma makụọ mama ya. Otu agadi nwoke ghọrọ okorobịa ma jiri wilbaro buru mkpụrụ osisi dị iche iche na-aga. Ụmụaka abụọ agụụ na-agụgbu, ha ana-agbakwa ohu, na-adọzi okooko osisi, na-agbakwa bọl. Otu nwaanyị ike ụwa gwụrụ, ya anọrọ ọdụ n’ala, mechara bilie ọtọ ma na-achị ọchị.

5. Uru nkwa ndị a Baịbụl kwere bara

Ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha ma ọ bụ na-ewe iwe n’ihi nsogbu ndị ha na-enwe. Ụfọdụ na-agbalịsi ike ka ha kwụsị nsogbu ndị a. Chọpụta otú nkwa Baịbụl kwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu si abara ndị mmadụ uru taa. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDIO: M Chọburu Ime Ka A Kwụsị Ikpe Ikpe Na-ezighị Ezi (4:07)

Foto dị iche iche si na vidio bụ́ ‘M Chọburu Ime Ka A Kwụsị Ikpe Ikpe Na-ezighị Ezi.’ 1. Ebe Rafika na ndị agbụrụ ha na-aghọ ogho mgbe ọ bụ nwata. 2. Ebe obi na-atọ Rafika ụtọ oge mbụ ọ gara mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova ma hụ ka agbụrụ dị iche iche na-emekọ ihe ọnụ.
  • Na vidio a, olee ihe nọ na-enye Rafika nsogbu n’obi?

  • Ọ bụ eziokwu na ihe ahụ nọ na-enye ya nsogbu n’obi akwụsịghị, olee otú Baịbụl si nyere ya aka?

Baịbụl kwuru na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ihe a o kwuru na-enyere anyị aka ka obi ghara ịna-ajọ anyị njọ, na-emekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị n’ihi nsogbu ndị na-abịara anyị. Gụọnụ Ilu 17:22 na Ndị Rom 12:12. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na nkwa Baịbụl kwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu ga-eme ka ndụ gị ka mma ugbu a? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu emekataghị mee.

  • Gịnị mere o ji dị mma ka i leruo anya chọpụta nke bụ́ eziokwu?

NCHỊKỌTA

Baịbụl kwere nkwa na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Nkwa a na-eme ka anyị nwee olileanya, na-emekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịma gbasara nkwa dị iche iche Chineke kwere anyị?

  • Olee ihe Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu?

  • Ọ bụrụ na ị mara na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, olee otú ọ ga-esi baara gị uru ugbu a?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta otú inwe olileanya nwere ike isi nyere gị aka ma nsogbu bịara gị.

“Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?” (Teta!, Mee 8, 2004)

Chọpụta otú olileanya anyị nwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu nwere ike isi nyere ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala aka.

“Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma Ọ Bụrụ na M Na-arịa Ọrịa Na-anaghị Ala Ala?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Ka ị na-ele vidio egwú a, were ya na gị na ezinụlọ gị nọ na-enwe obi ụtọ na Paradaịs ahụ Baịbụl kwuru na ọ ga-adị n’ọdịnihu.

Chetụgodi Oge Ahụ (3:37)

Otu nwoke nọ na-agba mbọ ka ihe gbanwee n’obodo ha. Gụọ gbasara otú ndụ ya si gbanwee mgbe ọ mụtara ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu.

“O Doola M Anya na Agaghị M Agbanweli Ụwa A” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2013)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya