Imeri Setan na Ọrụ Ya Nile
“Ya mere doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—JEMES 4:7.
1. Olee otú ‘aka onye mmehie’ siworo metụta ihe a kpọrọ mmadụ taa?
JOB kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “E nyewo ụwa n’aka onye mmehie.” (Job 9:24) Ugbu a anyị na-echekwa ihu oge kasị dị oké egwu n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị a bụ “mgbe ikpeazụ” nke ọchịchị mmụọ ọjọọ nke Setan n’elu ụwa. Ọ bụghị ihe ijuanya na, ná mkpali Setan, ‘ndị ajọ mmadụ na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.’ (2 Timoti 3:1, 13) Ọzọkwa, mkpagbu, ikpe na-ezighị ezi, obi ọjọọ, mpụ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, ọrịa na-adịghị ala ala, ihe mgbu nke ịka nká, ndakpọ mmetụta uche—ndị a na ihe ndị ọzọ pụrụ ịdị na-anyịgbu anyị.
2. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nagide mwakwasị nile nke Setan taa?
2 Onye iro ukwu ahụ, Setan bụ́ Ekwensu, na-eme mwakwasị dị ukwuu n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ na karịsịa, n’ahụ ezi ndị na-efe Chineke ofufe. Ihe mgbaru ọsọ ya bụ ichigharị ndị nile pụrụ iguzosi ike n’ezi ihe megide Chineke ma dọkpụrụ ha gaa ná mbibi tinyere onwe ya na ndị mmụọ ọjọọ ya. Otú ọ dị, a na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị atachie obi ná nguzosi ike n’ezi ihe, Ekwensu ga-agbapụ n’ebe anyị nọ. Dị ka Jisọs, anyị pụrụ ‘ịmụta nrubeisi’ nye Chineke site n’ihe ndị anyị na-ata ahụhụ ha, sitekwa n’amara Ya, anyị pụrụ inweta ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 5:7, 8; Jemes 4:7; 1 Pita 5:8-10.
3, 4. (a) Ule ndị dị aṅaa sitere n’èzí ka Pọl gbara mgba megide? (b) Gịnị bụ nchegbu Pọl dị ka onye Kraịst bụ́ okenye?
3 E lekwara Pọl onyeozi ule n’ọtụtụ ụzọ. N’ikwupụta iru eru ya nile dị ka onye na-ejere Kraịst ozi, o dere, sị: “Mụ onwe m na-eje karị; ana m adọgbubiga onwe m ókè n’ọrụ karị, ana m anọbiga ókè n’ụlọ mkpọrọ karị, a na-apịa m ụtarị nke ukwuu hie nne, anọ m n’ọnụ ọnwụ ọtụtụ mgbe. Ugbo ise ka ndị Juu pịara m [ube ụtarị iri anọ e wepụrụ otu]. Ugbo atọ ka a pịara m ụtarị, otu ugbo ka a tụrụ m nkume, ugbo atọ ka ụgbọ m nọ n’ime ya kpuru, otu ụbọchị abalị na ehihie ka m nọworo n’ime ogbu mmiri; n’ije ọtụtụ mgbe, n’ize ndụ site n’osimiri, n’ize ndụ site ná ndị na-apụnara mmadụ ihe, n’ize ndụ site ná ndị mba nke m, n’ize ndụ site ná ndị mba ọzọ, n’ize ndụ n’ime obodo, n’ize ndụ n’ime ọhịa, n’ize ndụ n’ime oké osimiri, n’ize ndụ n’etiti ụmụnna ụgha; n’ịdọgbu onwe m n’ọrụ na ịhụju anya, n’ịmụ anya ọtụtụ mgbe, n’oké agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, n’obubu ọnụ ọtụtụ mgbe, n’oyi na ịgba ọtọ.
4 “N’agụghị ihe dị n’èzí, ihe ahụ dị nke na-anyịgbu m kwa ụbọchị, bụ́ nchegbu m na-echegbu onwe m banyere nzukọ Kraịst nile. Ònye na-adịghị ike, nke mụ onwe m na-esoghị ya n’adịghị ike? ònye ka a na-eme ka ọ ma n’ọnyà, nke mụ onwe m na-ereghị ọkụ n’ihi ya?” (2 Ndị Kọrint 11:23-29) Otú a, Pọl guzosiri ike n’ezi ihe mgbe ọ na-eche mkpagbu na ule ndị sitere n’èzí ihu, dịkwa ka onye Kraịst bụ́ okenye, o nwere nchegbu dị omimi banyere ịgba ụmụnna nwoke na nwanyị dara mbà n’ọgbakọ ume, na-enyere ha aka iguzosi ike n’ezi ihe. Lee ezi ihe nlereanya nke ahụ bụụrụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye taa!
Iguzosi Ike n’Ezi Ihe n’Okpuru Mkpagbu
5. Gịnị bụ azịza dịịrị mkpagbu pụtara ìhè?
5 Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa ka Setan ji akwatu nguzosi ike n’ezi ihe? Dị ka e gosipụtara n’elu, otu n’ime atụmatụ kasị ize ndụ nke Setan bụ mkpagbu pụtara ìhè, ma e nwere azịza. Ndị Efesọs 6:10, 11 na-adụ anyị ọdụ, sị: “Meenụ onwe unu ka unu dị ike n’ime Onyenwe anyị, ya na n’ime ịdị ike nke ike ya. Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.”
6. Olee ụzọ a pụrụ isi gosipụta na Ndịàmà Jehova aghọwo ndị “na-emeribiga ókè”?
6 Ọtụtụ mgbe na mgbe ikpeazụ ndị a, ọ dịwo mkpa ka Ndịàmà Jehova na-anagide ule dị iche iche. Otú a, anyị pụrụ isoro Pọl kwuo, sị: “N’ihe ndị a nile anyị na-emeribiga ókè site n’aka Onye ahụ Nke hụrụ anyị n’anya.” (Ndị Rom 8:37) A nwapụtawo nke a site n’ihe ndekọ nke nguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ nke Germany, Austria, Poland, na Yugoslavia n’oge ọchịchị Nazi n’agbata 1933 na 1945, n’okpuru ọchịchị mmegbu nke Kọmunist n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’agbata 1945 na 1989, nakwa n’oge mkpagbu ndị ahụ tiwapụrụ n’akụkụ dị iche iche nke Africa na Latin America n’oge na-adịchabeghị anya.
7. Ihe nlereanya dịgasị aṅaa na-akpali akpali ka a kọrọ akụkọ ha site n’Etiopịa?
7 Ndịàmà Jehova nọ n’Etiopịa nyere ihe atụ na-akpali akpali banyere nguzosi ike n’ezi ihe n’agbata 1974 na 1991. Otu n’ime ndị njide ahụ ji ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpọrọ ihe gwara otu nwanna a tụrụ mkpọrọ, sị: “Ọ ka mma ịtọhapụ ọdụm nọ n’ogige ụmụ anụmanụ kama ikwe ka unu nwere onwe unu ọzọ!” Ndị mkpagbu obi ọjọọ a mekpara ndị ohu Jehova ahụ, mgbe afọ ụfọdụ gasịkwara otu ụlọ ikpe mkpegharị ikpe nyere iwu ka e gbuo ha. A dọsara ozu nke otu nwanna n’ebe ọha na eze ga-ahụ ya dị ka ihe atụ ịdọ aka ná ntị. Ụlọ ikpe nke nwere obi sara mbara tọhapụrụ ụmụnna ndị ọzọ ndị tinyere akwụkwọ maka ikpegharị ikpe ọnwụ ahụ, ụfọdụ n’ime ‘ndị mmeri’ a kwesịrị ntụkwasị obi keere òkè n’ihe omume Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” e mere n’Addis Ababa ná mmalite afọ 1994.a—Jọn 16:33; tụlee 1 Ndị Kọrint 4:9.
8. Olee otú Setan siworo gbalịa iji “nhichapụ agbụrụ” mere ihe mgbakwasị ụkwụ?
8 Setan adawo n’iji mwakpo n’ike mebie nguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụnna nwoke na nwanyị na-anọgidesi ike n’ihe. Ya mere, olee nzupụta ndị ọzọ ọ na-eji eme ihe? Mkpughe 12:12 na-ekwu banyere mgbe ikpeazụ ndị a, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Ebe ọ daworo n’ikpochapụ ndị Chineke na-anọgidesi ike n’ihe site ná mkpagbu, n’iwe ya ọ na-agbalị igbukpọ ụba mmadụ nile, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na o bu n’uche ibibikọta ndị Jehova tinyere ndị ọzọ. Otú a e mewo ihe a kpọrọ nhichapụ agbụrụ n’ọtụtụ akụkụ nke ebe bụbu Yugoslavia, a nwawokwa igbukpọ agbụrụ dị iche iche na Liberia, Burundi, na Rwanda.
9. N’ihi gịnị ka akọ dị iche iche nke Setan ji eme ihe ji adakarị? Nye ihe atụ.
9 Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ụkpụrụ ime ihe Setan na-aghọ ya ahịa, n’ihi na mkpagbu Setan na-eme ka ndị obi ha ziri ezi ghọta na nanị olileanya ha nwere dabeere n’Alaeze Chineke, nke Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa. (Matiu 12:21) N’ezie, ndị nwere mmasị naenuga n’Alaeze ahụ! Dị ka ihe atụ, na Bosnia na Herzegovina ọgba aghara tisasịworo, n’Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs nke e mere na March 26, 1994, 1,307 bịara, na-eji 291 karịa nke afọ gara aga. E nwere ndekọ ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ na Sarajevo (414), Zenica (223), Tuzla (339), Banja Luka (255), na nnukwu obodo ndị ọzọ. Na Croatia dịdebere ha e nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 8,326 mmadụ ndị bịaranụ. Ime ihe ike na-ewere ọnọdụ gburugburu ha egbochighị Ndịàmà Jehova nọ n’ala ndị ahụ irube isi n’iwu ahụ bụ́ “na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe Ọ ga-abịa.”—1 Ndị Kọrint 11:26.
Na Rwanda Ọgba Aghara Tisasịworo
10, 11. (a) Gịnị werewooro ọnọdụ n’ebe ahụ a na-akpọ Rwanda ndị Kraịst? (b) Olee otú ndị ozi ala ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi siworo kwupụta echiche onwe ha?
10 Na 1993, Rwanda, nke nwere 2,080 ndị nkwusa Alaeze, nwere 4,075 ndị bịara Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke,” e mekwara 230 baptism. N’ime ndị a, 142 tinyere akwụkwọ ozi ọsụ ụzọ inyeaka ozugbo. Ọmụmụ Bible ebe obibi a na-eduzi rịrị elu ruo 7,655 na 1994—o doro anya na Setan enweghị mmasị n’ịrị elu ahụ! Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mba ahụ na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst, a malitere mgbukpọrịta nke agbụrụ na ibe ya. Akwụkwọ akụkọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano kwetara, sị: “Nke a bụ mgbukpọ nke onye hụrụ ibe ya gbuo, nke ọ bụ ihe mwute ikwu na ọbụna aka ndị Katọlik dị na ya.” Ihe dị ka ọkara nde ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka nwụrụ, ihe dịkwa ka nde abụọ bụ ndị a gbawara aka ebe obibi ma ọ bụ a manyere ịgbapụ. N’ijigide nnọpụiche ndị Kraịst ha nke emeghị ihe ike, Ndịàmà Jehova gbalịrị ịnọkọ ọnụ. E gburu ọtụtụ narị ụmụnna anyị nwoke na nwanyị. Ma n’otu ọgbakọ nwere 65 ndị nkwusa Alaeze, bụ́ ebe e gburu mmadụ 13, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ rịrị elu ruo 170 ka ọ na-erule August 1993. Ngwongwo inyeaka sitere n’aka Ndịàmà bi n’ala ndị ọzọ so ná ndị mbụ bịarutere n’ebe ahụ. Ekpere anyị na-arịgo n’eluigwe n’ihi ndị lanarịrịnụ.—Ndị Rom 12:12; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:1, 2; Ndị Hibru 10:23-25.
11 N’etiti ihe ụjọ ahụ nile, ndị ozi ala ọzọ atọ nọ na Rwanda gbapụrụ. Ha na-ede, sị: “Anyị ghọtara na ụmụnna anyị gburugburu ụwa anagidewo ọnọdụ ndị yiri nke ahụ ma ọ bụ ndị ka njọ, anyị makwaara na ha nile bụ akụkụ ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. Ma, mgbe o metụtara mmadụ, ọ na-eme ka onye ahụ ghọta ihe ndị bụ eziokwu, na-emekwa ka mmadụ ghọta ịdị oké ọnụ ahịa nke ndụ. Akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ enwewo ịdị mkpa ọhụrụ nye anyị, anyị na-elepụ anya n’ọdịnihu n’oge mgbe ihe mbụ nile na-agaghị abatakwa n’uche. Ka ọ dị ugbu a, anyị chọrọ ịnọgide jiri ọrụ n’aka n’ozi Jehova.”
Ndị Ntorobịa Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe
12, 13. (a) Ụzọ iguzosi ike n’ezi ihe dị aṅaa ka otu onye na-eto eto gbasoro? (b) Olee ebe ka ndị anyị na-eto eto pụrụ ịchọta agbamume taa?
12 Jisọs gosiri na ndị ndị òtù ezinụlọ ha chụpụrụ n’ihi eziokwu ahụ ga-abụ ndị a kwụghachiri ụgwọ ‘otu narị otu narị.’ (Mak 10:29, 30) Nke a bụ eziokwu n’ọnọdụ Entellia, bụ́ nwata nwanyị dị afọ iri bi n’ebe ugwu Africa, onye hụrụ aha Chineke—bụ́ Jehova—n’anya ozugbo ọ nụrụ banyere ya. O sooro Ndịàmà Jehova mụọ ihe ma jiri 90 minit jee nzukọ ma jiri otu oge ahụ lọghachi n’ije ụkwụ, ọ bụ ezie na ezinụlọ ya nke na-emegide ya na-agbachigidekarị ya ụzọ n’èzí mgbe ọ lọtara. Mgbe ọ dị afọ 13, ọ malitere ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mmegide ezinụlọ ya kawanyere njọ. Otu ụbọchị ndị ikwu ya kere ya agbụ aka na ụkwụ ma mee ka o dinara n’anwụ na-agbakasị ahụ ruo hour asaa, na-awụsa ya mmiri ruru unyi site n’oge ruo n’oge. Ha tikasịrị ya ahụ, na-ebibi otu anya ya, n’ikpeazụ ha chụpụkwara ya n’ụlọ. Otú ọ dị, ọ chọtara ọrụ n’otu ụlọ ọgwụ ma mesịa ruo eru dị ka nọọsụ. Mgbe ọ dị afọ 20, e mere ya baptism, o wee debanye aha ozugbo dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka. N’ịbụ ndị a kpaliri site n’iguzosi ike n’ezi ihe ya, ezinụlọ ya anabataghachiwo ya n’ụlọ ha, mmadụ itoolu n’ime ha anakwerewo ọmụmụ Bible ebe obibi.
13 Entellia nwetara agbamume dị ukwuu site n’Abụ Ọma nke 116, karịsịa amaokwu nke 1-4, bụ́ nke ọ gụworo ọtụtụ mgbe: “Ahụrụ m Jehova n’anya, n’ihi na Ọ na-anụ olu m, bụ́ arịrịọ amara m nile. N’ihi na Ọ tọwo ntị Ya n’ala n’ebe m nọ, ogologo ụbọchị nile nke ndụ m ka m ga-akpọkukwa Ya. Ụdọ nile nke ọnwụ gbara m gburugburu, ebe nile dị mkpà nke [Sheol, NW] chọtara m: ahụhụ na iru újú ka m na-ahụ. M wee kpọkuo aha Jehova; sị, Biko, Jehova, mee ka mkpụrụ obi m wepụga onwe ya.” Jehova na-aza ekpere ndị dị otú ahụ!
14. Olee otú ndị Poland bụ́ Ndịàmà siworo gosipụta iguzosi ike n’ezi ihe pụrụ iche?
14 Dị ka n’ụbọchị Jisọs, ọtụtụ mgbe Setan ejiwo ịnụbiga ọkụ n’obi ókè nke okpukpe mee ihe ifesa ikuku n’ọkụ nile nke mkpagbu—ma o nwebeghị ihe ịga nke ọma. Ihe nlereanya nke ụmụnna anyị nọ na Poland pụrụ iche, dị ka a kọwara n’akwụkwọ 1994 Yearbook of Jehovah’s Witnesses. Ọbụna a chọrọ ka ndị na-eto eto gosipụta onwe ha ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Na 1946 otu n’ime ndị dị otú ahụ bụ otu nwata nwanyị dị afọ 15 bụ́ onye a gwara, sị: “Nanị mee akara obe nke ndị Katọlik. Ọ bụrụ na i meghị ya otu mgbọ égbè na-echere gị!” N’iguzosi ike n’ezi ihe, a kpụbara ya n’ime ọhịa, mekpaa ya ahụ nke ukwuu, ma gbagbuo ya.—Tụlee Matiu 4:9, 10.
Nzupụta Aghụghọ Ndị Ọzọ nke Setan
15, 16. (a) Gịnị bụ ụkpụrụ mmụọ ọjọọ Setan, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi guzogide ya? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị mkpa ka ndị anyị na-eto eto nwee ihe mkpọbi ụkwụ?
15 Ụkpụrụ mmụọ ọjọọ nke Setan bụ n’ezie “ọchịchị ma ọ bụ mbibi”! O nwere ọtụtụ ajọ ngwá agha ná nkwakọba ya. Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ịgba mgba anyị abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide ịbụ ndị isi nile, imegide ịchịisi nile, imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe. N’ihi nke a chịlienụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide ndị iro unu n’ajọ ụbọchị, na iguzo, ebe unu rụpụtaworo ihe nile.” (Ndị Efesọs 6:12, 13) Ọchịchọ ịhụ ihe onwunwe n’anya, ntụrụndụ na atụmatụ rụrụ arụ, egwú Setan, nrụgide ndị ọgbọ n’ụlọ akwụkwọ, ịnụ ọgwụ ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya ókè—nke ọ bụla n’ime ndị a pụrụ ibibi ndụ anyị. Ya mere, onyeozi ahụ gara n’ihu ịdụ ọdụ, sị: “Tụkwasị ihe nile ndị a welienụ ọta nke bụ okwukwe, nke unu ga-apụ imenyụ akụ́ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ n’ime ya.”—Ndị Efesọs 6:16.
16 Nke a yiri ka ọ dị mkpa karịsịa n’oge a n’ihi egwú rụrụ arụ nke Setan ji na-awụju n’ụwa nke oge a. N’ọnọdụ ụfọdụ e nwere njikọ dị n’etiti ya na ofufe Setan kpọmkwem. Otu akụkọ ozi sitere n’ụlọ ọrụ sheriff nke San Diego County (U.S.A.) kwuru, sị: “Anyị nwere ihe ngosi n’ebe a ebe òtù egwú ahụ mere ka 15,000 ụmụaka na-agụ ‘Nates’—ya bụ, ịsụgharị Setan isi.” A kọwawo ofufe Setan dị ka oghere nke ndị ntorobịa ụfọdụ na-adaba “n’ihi na ha anọwo na-akpagharị n’enweghị olileanya, n’iwe, na nanị ha.” Unu ndị na-eto eto n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọ dịghị mkpa ka unu kpọbie ụkwụ! Jehova na-enye unu ihe agha ime mmụọ ka akụ́ ụta nile nke Setan ghara ịgbata unu.—Abụ Ọma 16:8, 9.
17. Olee otú a pụrụ isi merie nkụda mmụọ nke mmetụta uche?
17 A haziri akụ́ ụta nile na-enwu ọkụ nke Setan imetụta uche. Site ná nrụgide nile nke ndụ, dị ka ọrịa anụ ahụ ma ọ bụ ọnọdụ nkụda mmụọ dị omimi, onye iro anyị pụrụ ime ka ụfọdụ ndị nwee mmetụta nke abaghị n’ihe. Mmadụ pụrụ inwe nkụda aka n’ihi enweghị ike itinye ọtụtụ hour n’ozi Chineke ma ọ bụ n’ihi ejeghị ụfọdụ n’ime nzukọ nile nke ọgbakọ. Nlekọta ịhụnanya nke ndị okenye na ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ọzọ nwere obi ọma pụrụ inye aka imeri ajọ ọnọdụ uche ndị siri ike. Na-echeta mgbe nile na Jehova hụrụ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’anya. (1 Jọn 4:16, 19) Abụ Ọma 55:22 na-ekwu, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”
18. Megide nzupụta Setan ndị dị aṅaa ka ụfọdụ na-agba mgba ha?
18 ‘Nzupụta’ aghụghọ nile nke Setan apụtawo n’ụdị ọzọ n’oge na-adịbeghị anya. N’ala ụfọdụ ọtụtụ ndị toworo eto enwewo mwabata nke echiche ndị na-enye nghọta siri ike na n’oge ha bụ ụmụaka e metọrọ ha n’ụzọ obi ọjọọ site n’ịrọ òtù Setan. Olee ebe echiche ndị dị otú ahụ na-esi abịa? N’agbanyeghị nnyocha sara mbara e mere, echiche ndị ọkachamara ụwa dị iche iche nke ukwuu. Ụfọdụ na-ele echiche ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe ncheta mere eme, ndị ọzọ dị ka echiche efu—ma eleghị anya bụrụ nke ọgwụgwọ ọnọdụ uche a na-enyo enyo kpaliri—ndị ọzọkwa dị ka ụdị ịmụ anya arọ nrọ nke mmetụta ọjọọ e nwere na nwata kpatara.
19. (a) Echiche ndị dị aṅaa ka Job gbasoro mgba? (b) Olee ụzọ ndị okenye pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Elaịhu?
19 Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị na ohu Chineke bụ́ Job gbara mgba megide “echiche mgbakasị ahụ” (NW) nke Setan nyere site n’ọnụ Elifaz na Zofa. (Job 4:13-18; 20:2, 3) Job si otú a nweta “mkpasu iwe,” nke kpataara ya ikere òkè ‘n’okwu sihiere ụzọ’ banyere “ihe egwu” ndị na-akpagbu uche ya. (Job 6:2-4; 30:15, 16) Elaịhu gere Job ntị n’ekwughị okwu ma jiri ezi obi nyere ya aka ịhụ echiche Jehova nke jupụtara n’amamihe n’okwu ahụ. N’otu aka ahụ taa, ndị okenye nwere nghọta na-egosi na ha na-elekọta ndị nọ ná mkpagbu site n’ịghara ịtụkwasịkwuru ndị dị otú ahụ “mbigide aka.” Kama nke ahụ, dị ka Elaịhu, ha na-eji ndidi gee ha ntị n’olu ma mgbe ahụ jiri mmanụ na-adajụ ahụ nke Okwu Chineke mee ihe. (Job 33:1-3, 7; Jemes 5:13-15) Ya mere onye ọ bụla ajọ ọnọdụ uche nyere mmetụta uche ya nsogbu, ma ò mere eme ma ọ bụ na o meghị, ma ọ bụ onye ‘e menyere ụjọ site ná nrọ na site n’ọhụụ’ dị ka e mere Job, pụrụ ịchọta nkasi obi Akwụkwọ Nsọ naadajụ ahụ n’ime ọgbakọ.—Job 7:14; Jemes 4:7.
20. Olee ụzọ a pụrụ isi nyere ndị Kraịst nọ n’iru újú aka ijigide nguzo ime mmụọ ha?
20 Ka ọ dị ugbu a onye Kraịst pụrụ ijide n’aka na, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, aka Setan dị n’echiche ọjọọ ndị a. Ọ bụrụ na ụfọdụ nọ n’ọgbakọ na-ata ahụhụ n’ụzọ dị otú a, ọ bụ amamihe ha ịhụ echiche uche dị otú ahụ na-eyi egwu dị ka mgbalị sitere kpọmkwem n’aka Setan ịkpaghasị nguzo ime mmụọ ha. Ha nwere mkpa nke nkwado ndidi na nke nghọta Akwụkwọ Nsọ. Site n’iji ekpere chigharịkwute Jehova na site n’irite uru n’ọzụzụ atụrụ ime mmụọ, ndị na-enwe mkpagbu ga-ewepụta onwe ha ịnata ọkịka nke ike. (Aịsaịa 32:2; 2 Ndị Kọrint 4:7, 8) Ha ga-esi otú a nwee ike ịtachi obi n’ikwesị ntụkwasị obi na ịjụ inye ohere ka mwabata echiche ọjọọ metụta udo nke ọgbakọ. (Jemes 3:17, 18) Ee, ha ga-enwe ike iguzogide Ekwensu, na-egosipụta ụdị mmụọ ahụ nke Jisọs gosipụtara mgbe ọ sịrị: “Laba, Setan.”—Matiu 4:10; Jemes 4:7.
21. Olee ụzọ Akwụkwọ Nsọ si adọ aka ná ntị banyere ụzọ aghụghọ nile nke Setan?
21 Anyị maara na nzube Setan bụ isi n’otu ụzọ mebie uche anyị, dị ka Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị ná 2 Ndị Kọrint 11:3: “Ana m atụ egwu, ma o nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.” Mbibi oge ugbu a nke anụ ahụ nile, ma ọ bụ ọha mmadụ nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, na-echetara anyị banyere ọnọdụ rụrụ arụ nke “ndị dike” gwara ọgwa bụ́ ndị rụrụ arụ ma na-eme ihe ike kpatara n’ụbọchị Noa. (Jenesis 6:4, 12, 13; Luk 17:26) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Setan na-ahọrọ iji omume aghụghọ na akọ na-eme ihe ịwụpụ iwe ya, karịsịa megide ndị Chineke.—1 Pita 5:8; Mkpughe 12:17.
22. Mgbe Setan na-agaghị anọkwa, ngọzi ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịtụ anya ha?
22 A kpọtụghịdị Setan aha n’isiakwụkwọ ndị ikpeazụ nke akwụkwọ Bible bụ́ Job. Ịma aka mmebi iwu ya nke na ụmụ mmadụ apụghị iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke abụwo nke a nwapụtara dị ka ụgha site n’iguzosi ike n’ezi ihe Job. N’otu aka ahụ, n’ọdịnihu dị nso mgbe “oké ìgwè mmadụ” nke ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ a gaje ịtụba Setan n’abyss. Ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe, tinyere Job kwesịrị ntụkwasị obi, ga-esonye “oké ìgwè mmadụ” ahụ, ịnụ ụtọ ngọzi nile nke paradaịs, ndị dị ukwuu ọbụna karịa ndị ahụ a kwụghachiri Job!—Mkpughe 7:9-17; 20:1-3, 11-13; Job 14:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 177.
Ajụjụ ná Ntụleghachi
◻ Ezi ihe nlereanya ndị dị aṅaa nke iguzosi ike n’ezi ihe ka Job, Jisọs, na Pọl setịpụrụ?
◻ Olee ụzọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe siworo chee Setan ihu?
◻ Olee ụzọ ndị ntorobịa pụrụ isi guzogide nzupụta aghụghọ nile nke Setan?
◻ Olee ihe a pụrụ ime iji nagide nzupụta nile nke Setan?
[Foto dị na peeji nke 7]
Na Etiopịa, Meswat na Yoalan na-ejere Jehova ozi oge nile ugbu a n’ịgbaso ihe nlereanya nna ha, bụ́ onye e gburu egbu
[Foto dị na peeji nke 7]
Entellia, onye ntorobịa nke guzosiri ike n’ezi ihe n’ebe ugwu Africa