Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Sanhedrin Ekpee Jizọs Ikpe, Mechaa Kpọgara Ya Paịlet
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Jizọs guzo n’ihu Pọntiọs Paịlet

      ISI NKE 127

      Ndị Sanhedrin Ekpee Jizọs Ikpe, Mechaa Kpọgara Ya Paịlet

      MATIU 27:1-11 MAK 15:1 LUK 22:66–23:3 JỌN 18:28-35

      • NDỊ SANHEDRIN EKPEE JIZỌS IKPE N’ỤTỤTỤ

      • JUDAS ISKARỊỌT ANWAA ỊKWỤGBU ONWE YA

      • A KPỌGAARA JIZỌS PAỊLET KA PAỊLET MAA YA IKPE ỌNWỤ

      Chi abọwala mgbe Pita gọnahụrụ Jizọs nke ugboro atọ. Ndị Sanhedrin ekpechaala Jizọs ikpe ahụ iwu na-akwadoghị ha kpere ya n’abalị ma lasaa. Ugbu a chi bọrọ n’ụtụtụ Fraịdee, ha zukọkwara ọzọ. Ọ ga-abụ na ha chọrọ ime ka o yie ka iwu ọ̀ kwadoro ikpe abalị ahụ ha kpere Jizọs. A kpọpụtaara ha Jizọs.

      Ụlọikpe ahụ jụrụ Jizọs, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụgodị na mụ agwa unu, unu agaghị ekwere ma ọlị. Ọ bụrụkwa na mụ ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza ya ma ọlị.” Ma, Jizọs mere ka ha mara na ọ bụ ya bụ Nwa nke mmadụ ahụ e kwuru okwu ya na Daniel 7:13. Ọ gwara ha, sị: “Site ugbu a gaa n’ihu, Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’aka nri dị ike nke Chineke.”—Luk 22:67-69; Matiu 26:63.

      Ha nọgidere na-ajụ ya, sị: “Ị̀ na-ekwu na ị bụ Ọkpara Chineke?” Jizọs zara ha, sị: “Unu onwe unu na-ekwu na m bụ.” Ihe a Jizọs zara ha mere ya adị ha ka ò kwuluru Chineke, n’ihi ya, na o kwesịrị ọnwụ. Ha jụrụ onwe ha, sị: “Gịnị mere àmà ọzọ ji dị anyị mkpa?” (Luk 22:70, 71; Mak 14:64) Ha kere Jizọs agbụ ma kpọrọ ya gakwuru gọvanọ ha bụ́ onye Rom, aha ya bụ Pọntiọs Paịlet.

      O nwere ike ịbụ na Judas Iskarịọt hụrụ Jizọs mgbe a kpọ ya na-aga na nke Paịlet. Mgbe Judas hụrụ na a maala Jizọs ikpe ọnwụ, ọ kwara mmakwaara. Ma, kama ọ ga-eji obi ya niile chegharịa ma rịọ Chineke mgbaghara, ọ gara chịghachịrị ndị isi nchụàjà mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ ha kwụrụ ya. Judas gwara ha, sị: “Emehiere m mgbe m raara ọbara ezi omume nye.” Ma ndị a obi tara mmiri gwara ya, sị: “Nke ahụ ọ̀ gbasara anyị? Nke ahụ bụ okwu aka gị!”—Matiu 27:4.

      Judas wụsaara ha mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ n’ụlọ nsọ ma nwaa igbu onwe ya. Ihe a o mere bụ mmehie, tụkwasị na nke o mere eme. Mgbe Judas chọrọ ịkwụgbu onwe ya, ọ dị ka alaka osisi o kenyere ụdọ o ji akwụgbu onwe ya ọ̀ gbajiri, ya adaa n’elu nkume dị n’okpuru ebe ahụ, afọ ya agbawaa.—Ọrụ 1:17, 18.

      Oge a kpọ Jizọs gaa n’obí Pọntiọs Paịlet ka bụ ụtụtụ. Ndị Juu kpọ́ ya gaa ebe ahụ ekweghị abanye n’obí Paịlet. Ha chere na ha banye, ọ ga-eme ka ha ghara ịdị ọcha. Ọ bụrụ na ha adịghị ọcha, ha agaghị eri nri Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, bụ́ nke ga-amalite n’abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan. A na-eme ememme a n’oge Ememme Ngabiga.

      Paịlet pụtara n’èzí jụọ ha, sị: “Olee ebubo unu na-ebo nwoke a?” Ha zara ya, sị: “A sị na nwoke a abụghị onye na-eme ihe ọjọọ, anyị agaraghị enyefe ya n’aka gị.” Paịlet nwere ike ịna-eche na ha chọrọ ịmanye ya ka o kpee Jizọs ikpe. N’ihi ya, ọ sịrị: “Kpọrọnụ ya, kpeekwanụ ya ikpe dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu gosiri na ha chọrọ ka e gbuo Jizọs. Ọ bụ ya mere ha ji kwuo, sị: “Iwu akwadoghị ka anyị gbuo onye ọ bụla.”—Jọn 18:29-31.

      O doro anya na ọ bụrụ na ndị Juu anwaa anwaa gbuo Jizọs n’oge Ememme Ngabiga a, o nwere ike ịkpata ọgba aghara. Ma, ọ bụrụ na ha emee ka ndị Rom gbuo Jizọs maka ịgba ọchịchị Rom mgba okpuru, ọ ga-eme ka ndị mmadụ chee na aka ha adịghị n’ọnwụ Jizọs.

      Ndị ndú okpukpe agwaghị Paịlet na ha amaala Jizọs ikpe ọnwụ n’ihi ikwulu Chineke. Ha hapụrụ ebubo a ma bo ya ebubo ndị ọzọ. Ha kwuru, sị: ‘Anyị chọpụtara na nwoke a [1] na-ekpu mba anyị ihu, [2] na-amachibido ịkwụ Siza ụtụ isi, [3] na-ekwukwa na ya onwe ya bụ Kraịst, bụ́ eze.’—Luk 23:2.

      Ebe Paịlet na-anọchiteanya ndị Rom, ịnụ na Jizọs na-ekwu na ya bụ eze kwesịrị inye ya nsogbu n’obi. N’ihi ya, Paịlet banyere ọzọ n’obí ya, jụọ Jizọs, sị: “Ị̀ bụ eze ndị Juu?” Ihe ajụjụ a ọ jụrụ Jizọs pụtara bụ, ‘Ị̀ daala iwu ndị Rom kwuo na ị bụ eze, ebe ọ bụ Siza bụ eze?’ O nwere ike ịbụ na Jizọs chọrọ ịma ihe ndị Paịlet nụrụla gbasara ya. N’ihi ya, ọ jụrụ Paịlet, sị: “Ọ̀ bụ gị chepụtara ihe a ị na-ekwu, ka ọ̀ bụ ndị ọzọ gwara gị banyere m?”—Jọn 18:33, 34.

      Paịlet mere ka ó nweghị ihe ọ ma gbasara Jizọs. Ọ zara Jizọs ihe gosiri na ọ chọrọ ịmata onye Jizọs bụ. N’ihi ya, ọ zara Jizọs, sị: “Àbụ m onye Juu? Mba gị na ndị isi nchụàjà nyefere gị n’aka m. Gịnị ka i mere?”—Jọn 18:35.

      Jizọs achọghị ka a hapụ ikwu gbasara ebubo ahụ e boro ya na ọ bụ eze kwuwe ihe ọzọ. Ọ zara ajụjụ otú ọ ga-abụ na o juru Paịlet anya.

      ALA ỌBARA

      Ihe a bụ mgbe Judas wụsara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ n’ụlọ nsọ

      Ndị isi nchụàjà amaghị ihe ha ga-eji mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ Judas wụsara n’ụlọ nsọ mee. Ha kwuru, sị: “Iwu akwadoghị ịwụnye ha n’ebe dị nsọ a na-edebe akụ̀, n’ihi na ọ bụ ego ọbara.” N’ihi ya, ha ji ego ahụ zụọ ala onye ọkpụite, bụ́ ebe ha ga na-eli ndị bịara abịa. E bidoro ịkpọ ala ahụ “Ala Ọbara.”​—Matiu 27:6-8.

      • Gịnị mere ndị Sanhedrin ji zukọọ ọzọ n’ụtụtụ?

      • Olee otú Judas si nwụọ? Gịnị ka e ji mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ mee?

      • Olee ebubo ndị Juu boro Jizọs, bụ́ ndị ha chọrọ ka Paịlet jiri maka ha gbuo Jizọs?

  • Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Herọd na ndị agha ya ji Jizọs na-eme ihe ọchị

      ISI NKE 128

      Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha

      MATIU 27:12-14, 18, 19 MAK 15:2-5 LUK 23:4-16 JỌN 18:36-38

      • PAỊLET NA HERỌD EKPEE JIZỌS IKPE

      Jizọs achọghị izochiri Paịlet na ya bụ eze. Ma eze Jizọs bụ enweghị ihe ọ ga-emebiri ndị Rom. Jizọs kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” (Jọn 18:36) N’eziokwu, Jizọs nwere Alaeze, ma Alaeze ahụ esighị n’ụwa.

      Paịlet ahapụghị okwu ahụ otú ahụ. Ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ọ dị mma, ị̀ bụ eze?” Jizọs mere ka Paịlet mara na o kwutere ya. Ọ sịrị ya: “Gị onwe gị na-ekwu na m bụ eze. Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege ntị n’olu m.”—Jọn 18:37.

      Jizọs agwabuola Tọmọs, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.” Ugbu a, Paịlet anụla na ihe mere e ji zite Jizọs n’ụwa bụ ka ọ gbaara “eziokwu” àmà, karịchaa, eziokwu gbasara Alaeze ya. Jizọs kpebisiri ike na ya ga-agba àmà banyere eziokwu ahụ, ọ bụrụgodị na ọ ga-anwụ maka ya. Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” Ma, o chereghị ka Jizọs kọwakwuoro ya ihe eziokwu bụ. O chere na ihe ọ nụrụ ezuola ikpe Jizọs ikpe.—Jọn 14:6; 18:38.

      Paịlet gaghachikwuuru ndị Juu nọ n’èzí. Ọ ga-abụ na Jizọs nọ n’akụkụ Paịlet mgbe ọ gwara ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ nọ ebe ahụ, sị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere.” Ihe a Paịlet kwuru were ndị Juu iwe, ha asị ya: “Ọ na-akpasu ndị mmadụ ime aghara site n’izi ihe n’ime Judia dum, malite na Galili ruo ebe a.”—Luk 23:4, 5.

      Ọ ga-abụ na ọnwụ a ndị Juu na-esi juru Paịlet anya. Ka ndị isi nchụàjà na ndị okenye nọ na-eti mkpu ka e gbuo Jizọs, Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Ị́ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?” (Matiu 27:13) Jizọs gbara ya nkịtị. Otú Jizọs si nọrọ jii n’agbanyeghị ebubo dị iche iche a na-ebo ya juru Paịlet anya.

      Ndị Juu kwuru na Jizọs na-ezi ihe “malite na Galili.” Ihe a ha kwuru mere ka Paịlet mata na Jizọs bụ onye Galili. O mekwara ka Paịlet mata otú o nwere ike isi sere aka ya n’ikpe Jizọs ikpe. Ọ bụ Herọd Antipas (nwa Herọd Onye Ukwu) na-achị Galili mgbe ahụ. Ọ nọkwa na Jeruselem n’oge ahụ a na-eme Ememme Ngabiga. N’ihi ya, Paịlet zigaara ya Jizọs. Ọ bụ Herọd Antipas a kwuru ka e gbupụ Jọn Onye Na-eme Baptizim isi. Mgbe o mechara nụ na Jizọs na-arụ ọrụ ebube, o bidoro iche na Jizọs nwere ike ịbụ Jọn ahụ a sịrị na o si n’ọnwụ bilie.—Luk 9:7-9.

      Mgbe Herọd hụrụ Jizọs, obi tọrọ ya ụtọ. Ọ bụghị n’ihi na ọ chọrọ inyere Jizọs aka ma ọ bụkwanụ na ọ chọrọ ịmara ma ebubo a na-ebo ya hà bụ eziokwu. Ihe bụ́ mkpa Herọd bụ ịhụ Jizọs, “ọ nọkwa na-enwe olileanya ịhụ ihe ịrịba ama ụfọdụ ọ ga-eme.” (Luk 23:8) Ma, Jizọs emeghị ihe ịrịba ama ọ bụla n’ihu Herọd. Mgbe Herọd na-ajụ ya ajụjụ, Jizọs atụpụrụghị ya ọnụ. Ihe ndị a mere ka Herọd na ndị agha ya ‘kparịa Jizọs.’ (Luk 23:11) Ha yiwere ya uwe mara mma, jirikwa ya mee ihe ọchị. Herọd zighachiri Jizọs na nke Paịlet. Herọd na Paịlet nọ n’iro tupu mgbe ahụ, ma ha bịaziri ghọọ ezigbo ndị enyi.

      Mgbe a kpọghachiri Jizọs na nke Paịlet, Paịlet kpọkọtara ndị isi nchụàjà, ndị na-achị ndị Juu, na ndị Juu, ma gwa ha, sị: “Lee! agbara m ya ajụjụ n’ihu unu ma ahụghị m ihe ọ bụla nwoke a mere nke gosiri na ebubo ndị unu na-ebo ya bụ eziokwu. N’eziokwu, Herọd ahụghịkwa, n’ihi na o zighachiteere anyị ya; ma, lee! ọ dịghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere. Ya mere, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.”—Luk 23:14-16.

      Paịlet chọsiri ike ịhapụ Jizọs n’ihi na ọ ma na ọ bụ anyaụfụ mere ndị isi nchụàjà ji nyefee ya n’aka ya. Ka Paịlet na-agbalị ịhapụ Jizọs, ọ nụrụ ihe ọzọ mere o kwesịrị iji mee otú ahụ. Mgbe ọ nọ n’oche ikpe ya, nwunye ya ziteere ya ozi, sị: “Etinyela aka n’okwu onye ezi omume ahụ, n’ihi na ahụsiri m anya nke ukwuu taa ná nrọ n’ihi ya.” Ọ ga-abụ Chineke mere ka nwunye ya rọọ nrọ ahụ.—Matiu 27:19.

      Oleezi otú Paịlet ga-esi hapụ nwoke a aka ya dị ọcha, nke bụ́kwanụ ihe o kwesịrị ime?

      • Olee otú Jizọs si kwuo “eziokwu” banyere Alaeze ya?

      • Gịnị ka Paịlet kwuru banyere Jizọs? Olee otú ihe ahụ o kwuru dị ndị Juu? Gịnịzi ka Paịlet mere?

      • Gịnị mere obi ji tọọ Herọd Antipas ụtọ mgbe ọ hụrụ Jizọs? Gịnịkwa ka o mere Jizọs?

      • Olee ihe mere Paịlet ji chọọ ịhapụ Jizọs?

  • Paịlet Agwa Ndị Juu, Sị: “Lee Nwoke Ahụ!”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Mgbe Paịlet kpọpụtara Jizọs n’èzí. Jizọs kpu okpueze e ji ogwu kpaa n’isi ma yiri uwe na-acha odo odo

      ISI NKE 129

      Paịlet Agwa Ndị Juu, Sị: “Lee Nwoke Ahụ!”

      MATIU 27:15-17, 20-30 MAK 15:6-19 LUK 23:18-25 JỌN 18:39–19:5

      • PAỊLET AGBAA MBỌ KA A HAPỤ JIZỌS

      • NDỊ JUU EKWUO KA A HAPỤRỤ HA BARABAS

      • NDỊ AGHA EJIRI JIZỌS MEE IHE ỌCHỊ MA PỊA YA IHE

      Paịlet gwara ìgwè mmadụ chọrọ ka e gbuo Jizọs, sị: “Ahụghị m ihe ọ bụla nwoke a mere nke gosiri na ebubo ndị unu na-ebo ya bụ eziokwu. N’eziokwu, Herọd ahụghịkwa.” (Luk 23:14, 15) Paịlet gbalịrị isi ụzọ ọzọ hapụ Jizọs. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Unu nwekwara omenala na m ga-ahapụrụ unu otu onye n’oge ememme ngabiga. Ya mere, ùnu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”—Jọn 18:39.

      Paịlet ma na e nwere onye mkpọrọ aha ya bụ Barabas. Barabas bụ onye ohi, onye na-emegide ndị ọchịchị, nakwa ogbu ọchụ. Paịlet jụrụ ndị Juu, sị: “Olee onye unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ̀ bụ Barabas ka ọ̀ bụ Jizọs, onye a sịrị na ọ bụ Kraịst?” Ndị isi nchụàjà mere ka ìgwè mmadụ ahụ kwuo ka a hapụrụ ha Barabas kama ịhapụrụ ha Jizọs. Paịlet jụrụ ha ọzọ, sị: “Ònye n’ime ha abụọ ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha wee sị: “Ọ bụ Barabas”!—Matiu 27:17, 21.

      Ihe a ha kwuru wutere Paịlet, ya ajụọ ha, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme Jizọs, onye a sịrị na ọ bụ Kraịst?” Ha niile wee sị ya: “Ka a kpọgide ya n’osisi!” (Matiu 27:22) Ihere anaghị eme ha ikwu ka e gbuo nwoke aka ya dị ọcha. Paịlet jụrụ ha, sị: “N’ihi gịnị, olee ihe ọjọọ nwoke a mere? Ahụghị m ihe ọ bụla o mere nke ga-eme ka e gbuo ya; ya mere, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.”—Luk 23:22.

      N’agbanyeghị mbọ niile Paịlet gbara ka a hapụ Jizọs, ìgwè mmadụ ahụ iwe ji nọgidere na-eti mkpu, sị: “Ka a kpọgide ya n’osisi!” (Matiu 27:23) Ndị ndú okpukpe ahụ emeela ka ìgwè mmadụ ahụ mewe ara ara nke na ha chọrọ ka a wụfuo ọbara mmadụ. Ọ bụkwanụghị ọbara onye omekome ma ọ bụ onye gburu ọchụ. Kama, ọ bụ ọbara nwoke aka ya dị ọcha, bụ́ onye ha nabatara na Jeruselem ka Eze ụbọchị ise tupu mgbe ahụ. Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ mgbe ihe ndị a na-eme, ha ekwughị okwu ma ọ bụ pụta ka a hụ ha.

      Mgbe Paịlet hụrụ na mbọ ọ na-agba enweghị isi, hụkwa na ụzụ na-arị ibe ya elu, o weere mmiri kwọọ aka ya n’ihu ìgwè mmadụ ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Aka m dị ọcha n’ebe ọbara nwoke a dị. Unu onwe unu aghaghị ịhụ maka ya.” Ma ihe a o kwuru emeghị ka ìgwè mmadụ ahụ gbanwee obi ha. Kama, ha kwuru, sị: “Ka ọbara ya dị n’isi anyị, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”—Matiu 27:24, 25.

      Gọvanọ ahụ chọrọ ime ihe ga-adị ha mma, karịa ime ihe ọ maara ziri ezi. N’ihi ya, o mere ihe ìgwè mmadụ ahụ chọrọ, hapụrụ ha Barabas. O mere ka e yipụ Jizọs uwe ma pịa ya ihe.

      Mgbe ndị agha ahụ pịakasịchara Jizọs ahụ́, ha kpọọrọ ya banye n’obí gọvanọ ma jiri ogwu kpaa okpueze, kpuwe ya n’isi. Ha nyekwara ya okporo ahịhịa amị ma ọ bụ osisi n’aka nri ya ma yiwe ya uwe na-acha odo odo, bụ́ ụdị uwe ndị eze na-eyi. Ha ji ya mee ihe ọchị, sị: “Ndeewo, gị Eze ndị Juu!” (Matiu 27:28, 29) Ha bụrụ Jizọs ọnụ mmiri n’ihu ma maa ya ụra. Ha naara ya osisi ahụ, jiri ya na-akụ ya n’isi. Nke a mere ka ogwu ndị dị n’okpu ahụ bamie ya n’isi.

      Otú Jizọs si nọrọ nwayọọ ma jide onwe ya n’ihe a niile a na-eme ya masịrị Paịlet nke na ọ gbalịrị ọzọ ịgbụrụ isi ya. Ọ sịrị: “Lee! M na-akpọpụtara unu ya n’èzí ka unu wee mara na o nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.” O nwere ike ịbụ na Paịlet chere na ọ kpọpụta Jizọs ugbu a e merụchara ya ahụ́, ahụ́ ya ana-agba ọbara, na ìgwè mmadụ ahụ ga-agbanwe obi ha. Ka Jizọs guzo n’ihu ìgwè mmadụ ahụ obi fere azụ, Paịlet kwuru, sị: “Lee nwoke ahụ!”—Jọn 19:4, 5.

      N’agbanyeghị na a pịakasịchaala Jizọs ahụ́, ọ nọrọ nwayọọ ma jide onwe ya. Paịlet chọpụtadịrị nke a n’ihi na okwu ya yiri ka ọ̀ na-egosi na ọ na-akwanyere Jizọs ùgwù ma na-emetere ya ebere.

      ỊPỊA MMADỤ IHE

      Ụtarị e ji apịa mmadụ ihe

      Otu dọkịta aha ya bụ William D. Edwards kwuru otú ndị Rom si apịa mmadụ ihe n’akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association. Ọ sịrị:

      “Ihe a na-ejikarị apịa mmadụ ihe bụ ụtarị dị mkpirikpi . . . nke nwere ọtụtụ eriri akpụkpọ anụ nọ otu otu ma ọ bụ ndị a kpara akpa. Ogologo ha na-adị iche iche. E tinyegasịrị mkpụrụ ígwè ma ọ bụ iberibe ọkpụkpụ atụrụ ndị dị nkọ n’ala ala ụtarị ahụ. . . . Ka ndị agha Rom ji ike ha niile na-apịa mmadụ ihe ahụ n’azụ ugboro ugboro, mkpụrụ ígwè ndị ahụ na-emerụ onye ahụ ezigbo ahụ́. Eriri akpụkpọ anụ ahụ na ọkpụkpụ atụrụ ndị ahụ na-abanye ya n’ime ahụ́. Ka a na-apịa onye ahụ ihe, ụtarị ahụ na-abanye ya n’uru ahụ́ ma na-adọpụtasị iberibe anụ ahụ́ ndị na-agba ọbara.”

      • Ka Paịlet nwee ike ịgbụrụ isi ya, olee mbọ ọ gbara ka a hapụ Jizọs?

      • Olee otú ndị Rom si apịa mmadụ ihe?

      • Gịnị ka ndị agha Rom mere Jizọs mgbe ha pịachara ya ihe?

  • Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Mgbe osisi Jizọs bu na-aga ebe a ga-akpọgbu ya nyịturu ya, otu onye agha ana-amanye Saịmọn onye Saịrini ka o buru ya

      ISI NKE 130

      Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu

      MATIU 27:31, 32 MAK 15:20, 21 LUK 23:24-31 JỌN 19:6-17

      • PAỊLET AGBALỊA KA A HAPỤ JIZỌS

      • A MARA JIZỌS IKPE ỌNWỤ, KPỌRỌ YA GAA IGBU

      N’agbanyeghị ihe niile a pịara Jizọs na emo a kwara ya, mbọ niile Paịlet gbara ka a hapụ Jizọs emeghị ka ndị isi nchụàjà na ndị òtù ha gbanwee obi ha. O nweghị ihe ọzọ ha chọrọ ma ọ bụghị ka e gbuo Jizọs. Ha nọgidere na-eti mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!” Paịlet gwara ha, sị: “Kpọrọnụ ya n’onwe unu kpọgide n’osisi, n’ihi na o nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”—Jọn 19:6.

      Ebe ọ bụ na ndị Juu emelighị ka Paịlet kweta na Jizọs kwesịrị ọnwụ n’ihi ịgba ọchịchị mgba okpuru, ha laghachiri n’ebubo ha boro ya mgbe ndị Sanhedrin na-ekpe ya ikpe, ya bụ, na o kwuluru Chineke. Ha gwara Paịlet, sị: “Anyị nwere iwu, dịkwa ka iwu ahụ kwuru, o kwesịrị ịnwụ, n’ihi na o mere onwe ya ọkpara Chineke.” (Jọn 19:7) Ihe a bụ mbụ Paịlet na-anụ ebubo a.

      Paịlet banyere n’obí ya ọzọ ma gbaa mbọ ka ọ hụ ụzọ ọ ga-esi hapụ nwoke a tachirila obi n’agbanyeghị ihe niile e mere ya. Ọ bụkwa otu nwoke a ka nwunye ya rọrọ nrọ gbasara ya. (Matiu 27:19) Oleekwanụ ihe Paịlet ga-eme n’ebubo ọhụrụ a ndị Juu boro Jizọs, nke bụ́ na o mere onwe ya “ọkpara Chineke”? Paịlet ma na Jizọs si Galili. (Luk 23:5-7) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ebee ka i si bịa?” (Jọn 19:9) Ọ ga-abụ na Paịlet nọ na-eche na Jizọs adịbuola ndụ n’ụwa, nakwa na o nwere ike ịbụ na o si n’eluigwe bịa.

      Jizọs agwabuola Paịlet na ya bụ eze, nakwa na Alaeze ya esighị n’ụwa a. N’ihi ya, Jizọs gbachiziri Paịlet nkịtị mgbe ọ jụrụ ya ebe o si bịa. Nkịtị a Jizọs gbara Paịlet were Paịlet iwe, ya agwa Jizọs, sị: “Ị́ chọghị ịtụpụrụ m ọnụ? Ọ̀ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịhapụ gị, nweekwa ikike ịkpọgide gị n’osisi?”—Jọn 19:10.

      Jizọs gwara ya, sị: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya. Ọ bụ ya mere onye ahụ nyefere m n’aka gị ji nwee mmehie ka ukwuu.” (Jọn 19:11) O nwere ike ọ bụghị otu onye ka Jizọs bu n’obi. Ndị Jizọs na-ekwu na ha nwere mmehie ka ukwu karịa Paịlet bụ Keyafas, ndị òtù ya, na Judas Iskarịọt.

      Otú Jizọs si jide onwe ya na ihe Jizọs kwuru, nakwa ụjọ Paịlet na-atụ na o nwere ike ịbụ na Jizọs si n’eluigwe bịa mere ka Paịlet gbalịakwa ọzọ ịhapụ Jizọs. Ma, ndị Juu kwuru ihe ọzọ tụrụ Paịlet ụjọ. Ha gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza. Onye ọ bụla nke na-eme onwe ya eze na-ekwugide Siza.”—Jọn 19:12.

      Gọvanọ a kpọpụtara Jizọs ọzọ n’èzí ma nọrọ n’oche ikpe gwa ndị Juu, sị: “Lee! Eze unu!” Ndị Juu tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kpọgide ya n’osisi!” Paịlet jụrụ ha, sị: “M̀ ga-akpọgide eze unu n’osisi?” Ọ dịla anya obi na-adịghị ndị Juu mma na ndị Rom na-achị ha, n’agbanyeghị nke a, ndị isi nchụàjà katara obi kwuo, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.”—Jọn 19:14, 15.

      Paịlet ji ụjọ mee ihe ndị Juu na-enye ya nsogbu ka o mee. Ọ kpọnyere ha Jizọs ka ha kpọgide ya n’osisi. Ndị agha ahụ yipụrụ Jizọs uwe ahụ na-acha odo odo ma yiwe ya uwe elu ya. Mgbe ha kpọ ya na-apụ, ha bunyere ya osisi a ga-eji akpọgbu ya.

      Ọ fọla obere ka elekere iri na abụọ nke ehihie kụọ na Fraịdee, abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Jizọs ehibeghị ụra kemgbe ụtụtụ Tọzdee, a taakwala ya ọtụtụ ahụhụ kemgbe ahụ. Ka o bu osisi ahụ na-aga, ike gwụrụ ya. Ndị agha kpọ ya manyere otu nwoke aha ya bụ Saịmọn ka o buru osisi ahụ gaa n’ebe a ga-akpọgbu Jizọs. Saịmọn bụ onye Saịrini, nke dị n’Afrịka. Ọtụtụ ndị so ha na-aga, ụfọdụ nọdị na-eti aka n’obi ma na-ebe ákwá n’ihi ihe na-emenụ.

      Jizọs gwara ụmụ nwaanyị na-ebere ya ákwá, sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, kwụsịnụ ibere m ákwá. Kama nke ahụ, bewerenụ onwe unu na ụmụ unu ákwá; n’ihi na, lee! ụbọchị na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-asị, ‘Obi ụtọ na-adịrị ụmụ nwaanyị aga, nakwa akpa nwa na-amụghị nwa na ara nwa na-aṅụghị!’ Mgbe ahụ, ha ga-amalite ịsị ugwu ukwu, ‘Dakwasị anyị!’ sịkwa obere ugwu, ‘Kpuchie anyị!’ N’ihi na ọ bụrụ na ha na-eme ihe ndị a mgbe osisi dị ndụ, gịnị ga-eme mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ?”—Luk 23:28-31.

      Osisi Jizọs kwuru okwu ya ebe a nọchiri anya mba ndị Juu. Mba a dị ka osisi na-achọ ịkpọnwụ akpọnwụ, nke obere mmiri fọrọ n’ime ya, n’ihi na Jizọs na ndị Juu ole na ole kweere na ya ka nọ na ya. Mgbe ndị a na-anọghịzi ná mba ndị Juu, mba a ga-adị ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ n’anya Chineke. Ndị Juu ga-ebegbu onwe ha n’ákwá mgbe Chineke ga-eji ndị agha Rom bibie obodo ha.

      • Olee ebubo ndị ndú okpukpe boro Jizọs?

      • Gịnị mere ụjọ ji tụọ Paịlet?

      • Olee otú ndị isi nchụàjà si nweta Paịlet, ya ekweta ka e gbuo Jizọs?

      • Mgbe Jizọs kwuru na “osisi dị ndụ” ma mechaa ‘kpọnwụọ,’ gịnị ka okwu ya pụtara?

  • Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Jizọs na-ekwe onye omekome a kpọgidere ya na ya n’osisi nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”

      ISI NKE 131

      Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya

      MATIU 27:33-44 MAK 15:22-32 LUK 23:32-43 JỌN 19:17-24

      • A KPỌGIDERE JIZỌS N’OSISI ỊTA AHỤHỤ

      • NDỊ AGHA EJIRI IHE E DERE N’ELU ISI JIZỌS KWAA YA EMO

      • JIZỌS EKWEE MMADỤ NKWA ỊNỌ NA PARADAỊS

      A kpọọrọ Jizọs na mmadụ abụọ na-apụnara mmadụ ihe gaa n’ebe a ga-akpọgide ha n’osisi. Ebe ahụ adịghị anya na Jeruselem. A na-akpọ ya Gọlgọta ma ọ bụ Ebe Okpokoro Isi. Mmadụ nwere ike ịnọ ebe “dịtụ anya” na Jeruselem na-ahụ ebe ahụ.—Mak 15:40.

      E yipụrụ Jizọs na mmadụ abụọ ọzọ a mara ha na ya ikpe ọnwụ uwe ha. E wetaara ha mmanya e tinyere mea na ihe na-elu ilu ka ha ṅụọ. Ọ ga-abụ ụmụ nwaanyị Jeruselem tinyere mea ná mmanya ahụ. Ndị Rom na-ekwe ka e nye onye a chọrọ igbu egbu mmanya a n’ihi na ọ na-eme ka ihe a na-eme ya ghara ịfụcha ya ụfụ. Mgbe Jizọs detụrụ mmanya ahụ ire, ọ jụrụ ịṅụ ya. N’ihi gịnị? Ọ chọghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịma onwe ya n’oge a ọ nọ ná nnukwu nsogbu. Ọ chọkwara ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.

      Ndị agha gbatịrị Jizọs n’elu osisi ma kụbanye ntú n’aka ya na n’ụkwụ ya. (Mak 15:25) Ntú ndị ahụ mapuru anụ ahụ́ ya na akwara ya. Nke a fụrụ Jizọs ezigbo ụfụ. Ka a na-akwụwa osisi ahụ ọtọ, ọ fụkwuru ya ụfụ, n’ihi na ahụ́ ya dum nyịgidere ebe ahụ a kụnyere ya ntú n’ụkwụ na n’aka, mee ka ahụ́ ya na-adọwakwu. N’agbanyeghị ihe ndị a, Jizọs abaraghị ndị agha ahụ mba. O kpegaara Chineke ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”—Luk 23:34.

      Ndị Rom na-edekarị ihe onye ha chọrọ igbu mere ma kụnye ya n’osisi a kpọgidere ya. Mana ihe Paịlet dere kụgide n’osisi a kpọgidere Jizọs bụ: “Jizọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.” E dere ya n’asụsụ Hibru, Latịn, na Grik ka ọtụtụ ndị nwee ike ịgụ ya. Ihe ahụ Paịlet dere gosiri na obi adịghị ya mma n’ebe ndị Juu nọ, bụ́ ndị siri ọnwụ ka e gbuo Jizọs. Ndị isi nchụàjà iwe ji gbara ihe ahụ Paịlet dere ụkwụ. Ha gwara ya, sị: “Edela ‘Eze ndị Juu,’ kama dee na ọ sịrị, ‘Abụ m Eze ndị Juu.’” Ma, Paịlet achọghị ka ha jiri ya kwara ngwá ọrụ otú ha mere na mbụ. N’ihi ya, ọ sịrị: “Ihe m dere, edewo m ya.”—Jọn 19:19-22.

      Ndị isi nchụàjà ahụ iwe ji kwughachiri ebubo ahụ e boro Jizọs mgbe ahụ ndị Sanhedrin na-ekpe ya ikpe. Ọ bụ ya mere ndị na-agafe agafe ji na-efufe isi ha ma na-akwa ya emo, sị: “Tụfịa! Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ, onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị site n’isi n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata.” Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ gwakwara ibe ha, sị: “Ka Kraịst bụ́ Eze Izrel si n’osisi ịta ahụhụ rịdata ugbu a, ka anyị wee hụ ma kwere.” (Mak 15:29-32) Ndị ohi abụọ ahụ a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi, otu n’aka nri ya, nke ọzọ n’aka ekpe ya kwadịrị ya emo, ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe Jizọs mere.

      Ndị agha Rom anọ jikwa Jizọs mee ihe ọchị. O nwere ike ịbụ na ha nọ na-aṅụ mmanya gbara ụka kemgbe. Ugbu a, ha weliri iko mmanya ha n’ihu Jizọs n’agbanyeghị na ha ma na e nweghị otú Jizọs ga-esi matịa aka nara ha ya. Ndị agha Rom ahụ ji ihe ahụ Paịlet dere gbasara Jizọs kwaa ya emo. Ha sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” (Luk 23:36, 37) Leenụ, onye a bụ́ ụzọ, eziokwu, na ndụ, ka a na-akparị ma jiri na-eme ihe ọchị. Ma, o diri ihe niile ahụ. Ọ kparịghị ndị Juu na-ele ya anya, ma ọ bụ ndị agha Rom ji ya eme ihe ọchị. Ọ kparịghịkwa ndị omekome abụọ ahụ a kpọgidere ha na ya n’osisi.

      Ebe ndị agha Rom nọ na-efe nza maka uwe ime Jizọs

      Ndị agha Rom anọ ahụ weere uwe elu Jizọs kee ya ụzọ anọ. Ha fere nza ka ha mara onye ga-ewere nke ọ ga-ewere. Ma, uwe ime Jizọs ka uwe elu ya mma. Uwe ime a “enweghị ebe a dụkọtara ya n’ihi na a kpara ya akpa site n’elu gbadaa.” N’ihi ya, ndị agha ahụ gwarịtara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị kpebie site n’ife nza onye ọ ga-abụ nke ya.” Ha si otú a mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe elu m n’etiti onwe ha, ha fekwara nza maka uwe m.”—Jọn 19:23, 24; Abụ Ọma 22:18.

      Obere oge, otu n’ime ndị omekome ahụ ghọtara na Jizọs bụ eze n’eziokwu. Ọ baara onye nke ọzọ mba, sị: “Ị́ dịghị atụ egwu Chineke, ugbu a a mara gị otu ikpe ahụ a mara ya? Nke anyị zikwara nnọọ ezi, n’ihi na anyị na-anatazu ihe kwesịrị anyị maka ihe ndị anyị mere; ma ọ dịghị ihe na-ekwesịghị ekwesị nwoke a mere.” Ọ rịọziri Jizọs, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.”—Luk 23:40-42.

      Jizọs gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ,” ọ bụghị n’Alaeze eluigwe, kama “na Paradaịs.” (Luk 23:43) Nkwa a Jizọs kwere nwoke a dị iche na nke o kwere ndịozi ya. O kwere ha nkwa na ya na ha ga-anọ n’ocheeze n’Alaeze eluigwe. (Matiu 19:28; Luk 22:29, 30) O nwere ike ịbụ na onye omekome ahụ bụ́ onye Juu anụla banyere Paradaịs ahụ dị n’ụwa, bụ́ ebe Jehova tinyere Adam na Iv, nke ọ chọkwara ka ha na ụmụ ha biri na ya. Ka onye omekome ahụ na-anwụ, o bu n’obi na ya ga-ebi na Paradaịs n’ọdịnihu.

      • Gịnị mere Jizọs ji jụ ịṅụ mmanya ahụ e nyere ya?

      • Gịnị ka e dere ma kụgide n’osisi a kpọgidere Jizọs, oleekwa otú ihe ahụ dị ndị Juu n’obi?

      • Olee ihe e mere uwe Jizọs nke mezuru amụma dị na Baịbụl?

      • Olee nkwa Jizọs kwere otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ha na ya n’osisi?

  • “N’ezie, Nwoke A Bụ Ọkpara Chineke”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ihe a bụ mgbe onyeisi ndị agha nọ na-asị, “N’ezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke” mgbe Jizọs nwụchara n’ebe a a kpọgburu ya na ndị omekome abụọ

      ISI NKE 132

      “N’ezie, Nwoke A Bụ Ọkpara Chineke”

      MATIU 27:45-56 MAK 15:33-41 LUK 23:44-49 JỌN 19:25-30

      • JIZỌS ANWỤỌ N’ELU OSISI ỊTA AHỤHỤ

      • IHE NDỊ DỊ EGWU MERENỤ MGBE JIZỌS NWỤRỤ

      Mgbe o ruru “oge awa nke isii,” ma ọ bụ n’elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị dị egwu “gbachiri ala ahụ dum ruo n’oge awa nke itoolu,” ya bụ, n’elekere atọ nke ehihie. (Mak 15:33) Ọ bụghị chi na-eji mgbe ụfọdụ n’ehihie kpatara ọchịchịrị a. Mgbe chi na-eji n’ehihie bụ mgbe ọnwa ọhụrụ na-apụta apụta, ma ọnwa na-agbazu agbazu n’oge Ememme Ngabiga. Ihe ọzọkwa bụ na chi na-eji n’ehihie na-anọ naanị nkeji ole na ole. Ihe ndị a gosiri na ọ bụ Chineke mere ka ọchịchịrị ahụ gbaa.

      Chetụgodị otú obi ga-adị ndị ahụ na-akwa Jizọs emo mgbe ọchịchịrị ahụ gbara. N’oge ahụ, ụmụ nwaanyị anọ bịara nso n’ebe ahụ a kpọgidere Jizọs n’osisi. Ha bụ nne Jizọs, Salomi, Meri Magdalin, na Meri, bụ́ nne Jems nke Nta, bụ́ otu n’ime ndịozi Jizọs.

      N’oge Meri, nne Jizọs, guzo “n’akụkụ osisi ịta ahụhụ Jizọs” na-eru uju, Jọn onyeozi nọ ebe ahụ. Meri nọ ebe ahụ na-ahụ ka nwa ọ mụrụ ma zụọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ na-ahụsi anya. Ọ dị ya ka ‘à manyere ya ogologo mma agha n’obi.’ (Jọn 19:25; Luk 2:35) N’agbanyeghị na Jizọs nọ n’ahụ́ ụfụ, ọ nọ na-eche banyere nne ya. O jisiri ike felaa isi n’ebe Jọn nọ ma gwa nne ya, sị: “Nwaanyị, lee nwa gị!” O felakwara isi n’ebe nne ya nọ ma gwa Jọn, sị: “Lee nne gị!”—Jọn 19:26, 27.

      Jizọs si otú a kpọnye onyeozi ya ọ hụrụ n’anya nne ya ka ọ na-elekọta. Ọ ga-abụ na di Meri anwụọla mgbe ahụ. Jizọs ma na ụmụnne ya nwoke ndị nne ji ya na ha enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, Jizọs mere ka nne ya nwee onye ga na-egboro ya mkpa ya ma na-enyere ya aka ịnọsi ike n’ofufe Chineke. Ihe a Jizọs mere magburu nnọọ onwe ya.

      Mgbe ọchịchịrị ahụ gbachara, Jizọs kwuru, sị: “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” Ihe a Jizọs kwuru mezuru amụma dị n’Akwụkwọ Nsọ. (Jọn 19:28; Abụ Ọma 22:15) Jizọs chọpụtara na Nna ya akwụsịtụla ichebe ya ka e nwee ike ịma ma ọ̀ ga-akwụsi ike n’okwukwe ya ruo ọnwụ. N’ihi ya, o tiri mkpu, sị: “Eli, Eli, lama sabaktani?” nke pụtara ma a sụgharịa ya, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji gbahapụ m?” O nwere ike ịbụ asụsụ Arameik a na-asụ na Galili ka Jizọs ji tie mkpu a. Ụfọdụ ndị nọ nso ghọtahiere ihe Jizọs kwuru ma sị: “Lee! Ọ na-akpọ Ịlaịja.” Otu n’ime ha gbaara ọsọ mikpuo ogbo n’ime mmanya gbara ụka, fanye ya n’osisi ma welie ya tinye ya n’ọnụ ka ọ ṅụọ. Ma ndị ọzọ sịrị: “Hapụnụ ya! Ka anyị hụ ma Ịlaịja ọ̀ ga-abịa kpọdata ya.”—Mak 15:34-36.

      Jizọs tiri mkpu, sị: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30) N’eziokwu, o mechaala ihe niile Nna ya zitere ya n’ụwa ka o mee. N’ikpeazụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” (Luk 23:46) Jizọs si otú a nyefee Jehova ndụ ya. Obi siri ya ike na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ, n’ihi ya, o hulatara isi wee kubie ume.

      Ozugbo Jizọs kubiri ume, oké ala ọma jijiji mere, gbawasịa nkume. Ala ọma jijiji ahụ dị egwu nke na ọ gbawara ọtụtụ ili ndị dị n’azụ Jeruselem, bọpụta ozu ndị nwụrụ anwụ. Ndị na-agafe agafe, bụ́ ndị hụrụ ozu ndị ahụ, banyere “n’obodo nsọ” ahụ kọọrọ ndị mmadụ ihe ha hụrụ.—Matiu 27:51-53.

      Mgbe Jizọs nwụchara, ogologo ákwà mgbochi nke kewara Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ Chineke dọwara abụọ si n’isi ruo ala. Ihe a merenụ gosiri na Chineke na-ewesa ndị gburu Ọkpara ya iwe, gosikwa na ụzọ e si abanye n’Ebe Kasị Nsọ, ya bụ, eluigwe, emepeela.—Ndị Hibru 9:2, 3; 10:19, 20.

      Ihe ndị a merenụ mere ka ndị mmadụ tụọ ụjọ. Onyeisi ndị agha nke hụrụ maka ogbugbu Jizọs kwuru, sị: “N’ezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.” (Mak 15:39) O nwere ike ịbụ na ọ nọ mgbe Paịlet na-ekpe Jizọs ikpe na o kwuru na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ugbu a, o doola ya anya na Jizọs bụ onye ezi omume, bụrụkwa Ọkpara Chineke.

      Ndị ọzọ “tiiri aka n’obi na-ala” n’ihi na ihe ndị ahụ merenụ wutere ha nke ukwuu. (Luk 23:48) Ụfọdụ n’ime ndị nọ ebe dịtụ anya na-ele ihe niile na-emenụ bụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha na-eso ya agagharị mgbe ụfọdụ. Ihe niile a merenụ wutekwara ha nke ukwuu.

      “KPỌGIDE YA N’OSISI”

      Ndị iro Jizọs tiri mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi!” (Jọn 19:15) Okwu Grik e si sụgharịta ‘osisi’ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn bụ stau·rosʹ. Otu akwụkwọ a na-akpọ History of the Cross kwuru, sị: “Stauros pụtara ‘osisi kwụ ọtọ,’ nke siri ike, ụdị ahụ ndị ọrụ ugbo na-eji agba ubi ha ogige. O nweghị ihe ọzọ ọ pụtara.”

      • Gịnị gosiri na ọ bụghị chi na-eji n’ehihie mgbe ụfọdụ kpatara ọchịchịrị ahụ gbara awa atọ?

      • Olee ihe Jizọs mere nke gosiri na anyị kwesịrị ịna-elekọta nne na nna anyị merela agadi?

      • Gịnị ka ala ọma jijiji ahụ merenụ kpatara? Olee ihe ákwà mgbochi dọwara abụọ n’ụlọ nsọ na-egosi?

      • Olee otú ọnwụ Jizọs na ihe ndị merenụ mgbe ọ nwụrụ si metụ ndị mmadụ n’obi?

  • A Kwadebere Ozu Jizọs ma Buru Ya Gaa Lie
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe a na-akwadebe ozu Jizọs maka olili

      ISI NKE 133

      A Kwadebere Ozu Jizọs ma Buru Ya Gaa Lie

      MATIU 27:57–28:2 MAK 15:42–16:4 LUK 23:50–24:3 JỌN 19:31–20:1

      • E BUDARA OZU JIZỌS N’OSISI

      • A KWADEBERE OZU JIZỌS MAKA OLILI

      • ỤMỤ NWAANYỊ ACHỌPỤTA NA ILI JIZỌS TỌGBỌ CHAKOO

      O ruwela mgbede Fraịdee, abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan ga-amalite ná mgbede ya ma anyanwụ daa. Ọ bụkwa Ụbọchị Izu Ike. Jizọs anwụọla kemgbe, ma ndị omekome abụọ ahụ a kpọgidere ha na ya n’osisi anwụbeghị. Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na ozu “agaghị adị n’elu osisi abalị dum,” kama, a ga-eli ya “n’ụbọchị ahụ.”—Diuterọnọmi 21:22, 23.

      Ihe ọzọ bụ na Fraịdee bụ ụbọchị Nkwadebe, n’ihi na ọ bụ oge ndị mmadụ ji akwadebe ihe oriri ma rụọ ọrụ ndị a na-agaghị edebe edebe ka Ụbọchị Izu Ike gachaa. Anyanwụ daa, a ga-abanye n’Ụbọchị Izu Ike “nke ukwu.” (Jọn 19:31) Abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan bụ ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. Ememme a na-ewe ụbọchị asaa. Ụbọchị mbụ ya na-abụ Ụbọchị Izu Ike. (Levitikọs 23:5, 6) N’afọ ahụ, ụbọchị mbụ nke ememme a dabara n’ụbọchị nke asaa n’izu, nke na-abụkwa Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụ ya mere abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan afọ ahụ ji bụrụ Ụbọchị Izu Ike nke ukwu.

      N’ihi ya, ndị Juu gwara Paịlet ka o mee ka Jizọs na ndị omekome abụọ ahụ a kpọgburu ha na ya nwụọ ngwa ngwa. Olee otú ha ga-esi mee ya? Ọ bụ ịkụjisi ha ụkwụ. Nke a ga-eme ka ha ghara iji ụkwụ ha bulie onwe ha elu ka ha nwee ike ịna-ekuru ume. Ndị agha ahụ bịaghachiri kụjisie ndị omekome abụọ ahụ ụkwụ. Ma ha akụjisịghị Jizọs ụkwụ, n’ihi na o yiri ka Jizọs ọ̀ nwụọla mgbe ahụ. Ihe a mezuru ihe e dere n’Abụ Ọma 34:20. Ọ sịrị: “Ọ na-eche ọkpụkpụ niile nke onye ahụ nche; e nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.”

      Ka o doo onye ukwu na onye nta anya na Jizọs anwụọla n’eziokwu, otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ, ube ahụ amapuo akụkụ ebe obi ya dị. “Ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara.” (Jọn 19:34) Nke a mezukwara amụma ọzọ nke sịrị: “Ha ga-elegide anya n’Onye ahụ ha mara ube.”—Zekaraya 12:10.

      Otu onye Arimatia nke “bara ọgaranya” aha ya bụ Josef nọ ebe ahụ mgbe a na-egbu Jizọs. Nwoke a bụ onye a ma ama na Sanhedrin. (Matiu 27:57) Baịbụl kwuru na ‘ọ bụ ezi mmadụ na nwoke ezi omume,’ onye nọ “na-echere alaeze Chineke.” Ọ kwadoghị ikpe ahụ ndị Sanhedrin kpere Jizọs n’ihi na ọ bụ “onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ na nzuzo, n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu.” (Luk 23:50; Mak 15:43; Jọn 19:38) Josef katara obi gwa Paịlet ka o bunye ya ozu Jizọs. Paịlet kpọrọ onyeisi ndị agha ahụ hụrụ maka ogbugbu Jizọs jụọ ya ma Jizọs ọ̀ nwụọla, ya asị na ọ nwụọla. Ozugbo Paịlet matara na Jizọs anwụọla, o kwetara ka Josef buru ozu Jizọs.

      Josef zụtara ákwà linin mara mma nke dị ọcha ma butuo ozu Jizọs n’elu osisi. O ji ákwà linin ahụ fụọ ozu Jizọs iji kwadebe ya maka olili. Nikọdimọs, bụ́ “nwoke ahụ bịakwutere [Jizọs] na mbụ n’abalị,” nyekwara aka. (Jọn 19:39) O wetara mea a gwakọtara ya na alo. Ọ dị ihe dị ka otu narị paụnd n’ịdị arọ, dịrịkwa oké ọnụ. E ji mea ahụ a gwakọtara ya na alo tee n’ákwà ozu ma jiri ya fụọ Jizọs. Ọ bụ otú a ka ndị Juu si akwadebe ozu ha chọrọ ili.

      Josef nwere ili a wapụtara na nkume dị nso ebe ahụ. E litụbeghị mmadụ na ya. Ọ bụ ebe ahụ ka e liri Jizọs. Ha kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ili ahụ. Ha mere ya ọkụ ọkụ tupu Ụbọchị Izu Ike amalite. O nwere ike ịbụ na Meri Magdalin na Meri nne Jems nke Nta nọ na-enye aka akwadebe ozu Jizọs. Ha lawara ngwa ngwa ịga “kwadebe ihe na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ” ha ga-eji kwadebekwuo ozu Jizọs mgbe Ụbọchị Izu Ike gachara.—Luk 23:56.

      N’echi ya, bụ́ Ụbọchị Izu Ike, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii gakwuuru Paịlet ma gwa ya, sị: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye nduhie ahụ kwuru mgbe ọ ka nọ ndụ, sị, ‘Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, a ga-akpọlite m.’ Ya mere, nye iwu ka a na-eche ili ahụ nche ruo n’ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru ya wee gwa ndị mmadụ, sị, ‘E mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie!’ nduhie nke ikpeazụ a ga-akakwa nke mbụ njọ.” Paịlet wee sị ha: “Unu nwere ndị nche. Gaanụ chee ya nche otú ọ bụla unu maara unu ga-esi chee ya.”—Matiu 27:63-65.

      N’isi ụtụtụ Sọnde, Meri Magdalin, Meri nne Jems na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ wetara ihe na-esi ísì ụtọ n’ili ahụ iji tee ozu Jizọs. Ha gwara ibe ha, sị: “Ònye ga-akwapụrụ anyị nkume n’ọnụ ụzọ ili ncheta ahụ?” (Mak 16:3) Mgbe ha ruru, ha chọpụtara na ala ọma jijiji emeela ebe ahụ, nakwa na mmụọ ozi Chineke akwapụla nkume ahụ. Ndị nche anọghịzi ebe ahụ, ili ahụ dịkwa ka ọ̀ tọgbọrọ chakoo.

      • Gịnị mere Fraịdee ji bụrụ ụbọchị Nkwadebe? Gịnị mere Ụbọchị Izu Ike nke malitere mgbe anyanwụ dachara na Fraịdee ahụ ji bụrụ Ụbọchị Izu Ike “nke ukwu”?

      • Olee ihe Josef na Nikọdimọs mere iji hụ na e liri Jizọs? Olee ihe jikọrọ ha na Jizọs?

      • Olee ihe ndị isi nchụàjà gwara Paịlet ka o mee, ma gịnị mere n’isi ụtụtụ Sọnde?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya