Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ụjọ ji ụmụ nwaanyị ndị a mgbe ha hụrụ na ili Jizọs tọgbọ chakoo

      ISI NKE 134

      Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ

      MATIU 28:3-15 MAK 16:5-8 LUK 24:4-12 JỌN 20:2-18

      • A KPỌLITERE JIZỌS N’ỌNWỤ

      • IHE NDỊ MERE N’ILI JIZỌS

      • Ọ PỤTARA N’IHU ỤMỤ NWAANYỊ ỤFỌDỤ

      Ụjọ tụrụ ụmụ nwaanyị ahụ mgbe ha hụrụ na ili ahụ dị ka ọ̀ tọgbọ chakoo. Meri Magdalin gbaara ọsọ gaa ịhụ “Saịmọn Pita na onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ onye Jizọs hụrụ n’anya nke ukwuu.” Onye ọzọ ahụ bụ Jọn onyeozi. (Jọn 20:2) Ma, ụmụ nwaanyị ndị nke ọzọ hụrụ mmụọ ozi nọ ebe ahụ. Mgbe ha banyere n’ili ahụ, ha hụkwara mmụọ ozi ọzọ. Mmụọ ozi a “yi uwe mwụda ọcha.”—Mak 16:5.

      Otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: “Ya ejuzila unu anya. Unu na-achọ Jizọs onye Nazaret, bụ́ onye a kpọgidere n’osisi. A kpọlitewo ya, ọ nọghị n’ebe a. Leenụ ebe e liri ya! Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya, gwakwa Pita, sị, ‘O buruwo unu ụzọ gawa Galili; n’ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya, dị nnọọ ka ọ gwara unu.’” (Mak 16:6, 7) Ihe ndị a ‘gbagwojuru ụmụ nwaanyị ahụ anya ma mee ka ha maa jijiji.’ N’ihi ya, ha gbaara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe ha hụrụ.—Mak 16:8.

      Ka ọ dị ugbu a, Meri ahụla Pita na Jọn. Ọ na-ekukwa ume ọkụ ọkụ. Ọ gwara ha, sị: “Ha ebupụwo Onyenwe anyị n’ili ncheta ahụ, anyị amaghịkwa ebe ha dọbara ya.” (Jọn 20:2) Pita na Jọn gbaara gawa n’ili ahụ. Ka ha nọ n’ụzọ, Jọn gbafere Pita ma buru ya ụzọ ruo. Mgbe Jọn rutere, o lebara anya n’ime ili ahụ ma hụ ákwà ndị e ji kee Jizọs. Ma, ọ banyeghị n’ili ahụ.

      Mgbe Pita rutere, ọ banyere n’ili ahụ ozugbo. Ọ hụrụ ákwà ndị e ji kee Jizọs n’ahụ́ na ndị e ji kee ya n’isi. Jọn banyeziri ma kweta na ihe Meri gwara ha bụ eziokwu. N’agbanyeghị ihe ndị Jizọs gwaburu ha, o nweghị onye n’ime ha ghọtara na a kpọlitela ya n’ọnwụ. (Matiu 16:21) Ihe a merenụ gbagwojuru ha anya, ha alawa. Ma, Meri laghachiri n’ili ahụ nọrọzie.

      N’oge ahụ, ụmụ nwaanyị ndị ahụ gbapụrụnụ ka nọ n’ụzọ na-aga ịgwa ndị na-eso ụzọ Jizọs na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Ka ha gba na-aga, Jizọs hụrụ ha n’ụzọ ma sị ha: “Ndeewonụ!” Ha bịara jide ya n’ụkwụ ma “kpọọrọ ya isiala.” Jizọs gwara ha, sị: “Unu atụla egwu! Gaanụ kọọrọ ụmụnna m, ka ha gaa Galili; n’ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.”—Matiu 28:9, 10; Luk 24:8-10.

      Tupu mgbe ahụ, ndị agha na-eche ili Jizọs nche “mara jijiji wee dị ka ndị nwụrụ anwụ” n’ihi ala ọma jijiji merenụ nakwa n’ihi ndị mmụọ ozi pụtaranụ. Mgbe ha nwetara onwe ha, ha banyere n’ime obodo “wee kọọrọ ndị isi nchụàjà ihe niile mere.” Ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu zukọrọ ma gbaa izu. Ha nyere ndị agha ahụ ego ka ha ghara ime ka ndị mmadụ mara ihe merenụ. Ha gwara ndị agha ahụ ka ha kwuo, sị: “Ndị na-eso ụzọ ya bịara n’abalị zuru ya mgbe anyị na-ehi ụra.”—Matiu 28:4, 11, 13.

      E nwere ike igbu ndị agha Rom ma ọ bụrụ na ha anọrọ n’ebe ha na-eche nche hie ụra. N’ihi ya, ndị isi nchụàjà kwere ha nkwa, sị: “Ọ bụrụkwa na ihe a [ya bụ, ụgha a sịrị ha ghaa na ha na-ehi ụra] eruo gọvanọ ntị, anyị ga-arịọ ya arịrịọ, meekwa ka unu ghara ichegbu onwe unu.” (Matiu 28:14) Ndị agha ahụ naara ndị isi nchụàjà ahụ ego ahụ ma mee ihe ha kwuru. N’ihi ya, akụkọ ụgha nke bụ́ na e zuuru ozu Jizọs ezuru gbasara n’etiti ndị Juu.

      Meri Magdalin ka nọ n’ili ahụ na-ebe ákwá. Mgbe o hulatara nyoba anya n’ili ahụ, ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha. Ha nọ n’ebe ozu Jizọs dịbu. Otu nọ n’ebe isi, nke ọzọ anọrọ n’ebe ụkwụ. Ha jụrụ ya, sị: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-akwa ákwá?” Meri gwara ha, sị: “Ha ebupụwo Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha debere ya.” Mgbe Meri tụgharịrị, ọ hụrụ onye ọzọ. Onye ahụ jụrụ ya ajụjụ ahụ ndị mmụọ ozi abụọ jụrụ ya. Ọ jụkwara ya, sị: “Ònye ka ị na-achọ?” Meri chere na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ, n’ihi ya, ọ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya, m ga-eburukwa ya.”—Jọn 20:13-15.

      Meri amaghị mgbe ahụ na ọ bụ Jizọs ka ya na ya na-ekwu okwu. Ma, mgbe Jizọs kpọrọ ya “Meri!,” nke bụ́ otú ọ na-esi akpọ ya, ọ mataziri na ọ bụ Jizọs. Meri ji obi ụtọ kpọọ ya, sị:“Rabonaị!” (nke pụtara “Onye Ozizi!”) Meri makụrụ Jizọs n’ihi na ụjọ na-atụ ya na Jizọs na-achọ ịla eluigwe. N’ihi ya, Jizọs gwara ya, sị: “Kwụsị ịrapara m n’ahụ́. N’ihi na arịgobeghị m gakwuru Nna m. Ma gakwuru ụmụnna m, sị ha, ‘Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.’”—Jọn 20:16, 17.

      Meri gbaara ọsọ gawa ebe ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ zukọtara. Mgbe o ruru, ọ gwara ha, sị: “Ahụrụ m Onyenwe anyị!” Ihe a o kwuru gosiri na ihe ụmụ nwaanyị ndị nke ọzọ gwara ha bụ eziokwu. (Jọn 20:18) N’agbanyeghị ihe ndị a, “okwu ndị a dị ha ka ihe nzuzu.”—Luk 24:11.

      • Mgbe Meri Magdalin chọpụtara na ili Jizọs tọgbọ chakoo, gịnị ka o mere? Olee ihe ụmụ nwaanyị ndị nke ọzọ mere?

      • Olee ihe Pita na Jọn mere mgbe ha hụrụ na ili Jizọs tọgbọ chakoo?

      • Ònye ka ụmụ nwaanyị abụọ ahụ hụrụ mgbe ha gbaara ọsọ na-aga ịkọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe ha hụrụ? Gịnị mere mgbe Meri Magdalin laghachiri n’ili Jizọs?

      • Olee otú akụkọ ahụ ụmụ nwaanyị ndị ahụ kọọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ha?

  • Jizọs Apụta n’Ihu Ọtụtụ Ndị Mgbe A Kpọlitechara Ya n’Ọnwụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ebe Jizọs pụtara n’ihu Tọmọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ

      ISI NKE 135

      Jizọs Apụta n’Ihu Ọtụtụ Ndị Mgbe A Kpọlitechara Ya n’Ọnwụ

      LUK 24:13-49 JỌN 20:19-29

      • JIZỌS APỤTA N’IHU NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA ABỤỌ NA-AGA EMEỌS

      • Ọ KỌWAARA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA IHE E DERE N’AKWỤKWỌ NSỌ

      • TỌMỌS AKWỤSỊ INWE OBI ABỤỌ

      Na Sọnde, abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ná mwute. Ha aghọtaghị ihe mere ili Jizọs ji tọgbọrọ chakoo. (Matiu 28:9, 10; Luk 24:11) Mgbe e mechara n’ụbọchị ahụ, otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Kliopas na onye ọzọ na-eso ụzọ Jizọs si Jeruselem na-aga Emeọs. Isi na Jeruselem gaa Emeọs dị ihe dị ka kilomita iri na otu.

      Ka ha na-aga n’ụzọ, ha nọ na-akparịta ihe merenụ na Jeruselem. Mgbe ha nọ na-akparịta ụka a, onye ha na-amaghị onye ọ bụ sonyeere ha. Onye ahụ jụrụ ha, sị: “Gịnị bụ ihe ndị a unu na-arụ ụka ya ka unu na-aga n’ụzọ?” Kliopas jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ onye ọbịa na Jeruselem nke na-enweghị onye ya na ya na-emekọrịta ihe, nke mere na ị maghị ihe ndị mere n’ime ya n’ụbọchị ndị a?” Onye ahụ wee sị ha: “Ihe ndị dị ka gịnị?”—Luk 24:17-19.

      Ha gwara ya, sị: “Ihe mere Jizọs onye Nazaret.” Ha gwakwara ya, sị: “Anyị nọ na-enwe olileanya na nwoke a bụ onye a kara aka ịnapụta Izrel.”—Luk 24:19-21.

      Kliopas na onye ya na ya so kọọrọ ya ihe ndị mere na Jeruselem n’ụbọchị ahụ. Ha kwuru na ụfọdụ ụmụ nwaanyị, ndị gara n’ebe e liri Jizọs, ahụghị ozu Jizọs. Ha hụkwara ihe dị ebube, ya bụ, ndị mmụọ ozi, ndị gwara ha na Jizọs dị ndụ. Ha gwakwara ya na mgbe ndị ọzọ gara n’ili ahụ, “ha hụkwara ya otú ahụ, dị nnọọ ka ndị inyom ahụ kwuru.”—Luk 24:24.

      Ihe ndị a merenụ gbagwojuru ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ ahụ anya. Onye ahụ sonyeere ha mere ka ha kwụsị iche ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị, nke bụ́ ihe na-emebi ha obi. Ọ sịrị ha: “Unu ndị na-amaghị ihe, ndị obi ha na-adịghịkwa ekwere ihe niile ndị amụma kwuru ngwa ngwa! Ọ̀ bụ na ọ dịghị mkpa ka ihe ndị a mee Kraịst, ka ọ banyekwa n’ebube ya?” (Luk 24:25, 26) Ọ kọwaara ha ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Kraịst.

      Ha atọ mechara ruo Emeọs nso. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ahụ chọrọ ka onye ahụ so ha kọwakwuoro ha Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, ha sịrị ya: “Nọnyere anyị, n’ihi na o ruwela mgbede, ụbọchị agwụwokwa agwụ.” O kwetara ka ha na ya nọrọ, ya esorokwa ha rie nri. Mgbe ha na-eri nri, o kpere ekpere, nyawaa ogbe achịcha, nye ha ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha matara onye ọ bụ. Ozugbo ha matara ya, ọ pụrụ n’anya ha. (Luk 24:29-31) Obi bịaziri sie ha ike na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ ahụ ji obi ụtọ kwuo otú ihe ha na ya kparịtara dị ha n’obi. Ha sịrị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, mgbe ọ nọ na-akọwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?” (Luk 24:32) Ha mere ngwa ngwa laghachi Jeruselem. Mgbe ha ruru, ha hụrụ ndịozi na ndị ọzọ so ha nọrọ. Tupu Kliopas na onye ya na ya so ekwuo na ha ahụla Jizọs, ndị nọ ebe ahụ kwuru, sị: “N’ikwu eziokwu, a kpọlitere Onyenwe anyị, ọ pụtakwara n’ihu Saịmọn!” (Luk 24:34) Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs kwuziri otú Jizọs si mee ka ha mata onye ọ bụ. N’eziokwu, ha esorola ná ndị hụrụ Jizọs.

      Ugbu a, otu ihe tụrụ ha ụjọ mere. Jizọs batara n’ime ụlọ ha nọ. Ọ dị ha ka ọ̀ bụ ná nrọ n’ihi na ha mechiri ụzọ emechi, ebe ọ bụ na ha na-atụ ụjọ ndị Juu. N’agbanyeghị na ha mechiri ụzọ emechi, Jizọs guzo n’ihu ha ugbu a. O medara obi gwa ha, sị: “Udo dịrị unu.” Ma ụjọ ji ha. ‘Ha chere na ha na-ahụ mmụọ.’ O nweekwala mgbe ha hụrụ Jizọs chee na ọ bụ mmụọ.—Luk 24:36, 37; Matiu 14:25-27.

      Jizọs gosiri ha aka ya na ụkwụ ya iji mee ka ha mata na ya abụghị mmụọ ma ọ bụ ihe ha na-eche n’echiche. O mere ka ha mata na ya nwere ahụ́ mmadụ. Ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu, gịnịkwa mere unu ji na-enwe obi abụọ? Leenụ aka m na ụkwụ m, na ọ bụ mụ onwe m; metụnụ m aka ka unu wee hụ, n’ihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ́ na ọkpụkpụ dị nnọọ ka unu na-ahụ na m nwere.” (Luk 24:36-39) Ihe a ọ gwara ha mere ka obi tọọ ha ụtọ. Ma ha ka nwetụrụ obi abụọ na ọ bụ ya.

      Jizọs gbalịkwuru ime ka ha mara na ọ bụ ya. Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ dị ihe unu nwere ebe ahụ unu ga-eri?” Ha nyere ya otu iberibe azụ̀ a mịrị amị, ya ataa. Ọ gwaziri ha, sị: “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ [ya bụ tupu e gbuo m], na ihe niile e dere n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.”—Luk 24:41-44.

      Jizọs nyeere Kliopas na onye ya na ya so aka ha amata ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụkwa ihe o meere ndị a ha na ya nọ ugbu a. Ọ sịrị ha: “Otú a ka e dere ya na Kraịst ga-ata ahụhụ ma si n’etiti ndị nwụrụ anwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, ọ bụkwa n’aha ya ka a ga-ekwusa nchegharị nke na-eme ka a gbaghara mmehie. A ga-ekwusa ya ná mba niile malite na Jeruselem. Unu ga-abụ ndị àmà nke ihe ndị a.”—Luk 24:46-48.

      N’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, Tọmọs onyeozi anọghị mgbe ahụ Jizọs batara. Ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs mechara gwa ya, sị: “Anyị hụrụ Onyenwe anyị!” Tọmọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mụ ahụghị apa ntu n’aka ya, rụnyekwa mkpịsị aka m n’apa ntu ndị ahụ, rụnyekwa aka m n’akụkụ ya, agaghị m ekweta ma ọlị.”—Jọn 20:25.

      Mgbe ụbọchị asatọ gachara, ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọkwara ọzọ n’ime ụlọ. Ha mechikwara ọnụ ụzọ ya emechi. Ma na nke ugbu a, Tọmọs so ha nọrọ. Jizọs batakwara n’ime ụlọ ahụ n’ụdị mmadụ ma kelee ha, sị: “Udo dịrị unu.” Jizọs lere Tọmọs anya ma sị ya: “Rụnye mkpịsị aka gị n’ebe a, lee aka m, werekwa aka gị rụnye n’akụkụ m, kwụsịkwa ịbụ onye na-adịghị ekweta ihe kama na-ekweta.” Tọmọs sịrị ya: “Onyenwe m na Chineke m!” (Jọn 20:26-28) Ugbu a, obi esiela ya ike na Jizọs adịla ndụ, bụrụkwa mmụọ na-anọchite anya Jehova Chineke.

      Jizọs gwara Tọmọs, sị: “Ọ̀ bụ n’ihi na ị hụrụ m ka i ji kweta? Obi ụtọ na-adịrị ndị na-ahụghị ihe ma kweta.”—Jọn 20:29.

      • Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ na-aga Emeọs, gịnị ka onye ahụ ha na-amaghị jụrụ ha?

      • Gịnị mere obi ji kporo ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ ọkụ?

      • Mgbe Kliopas na onye ya na ya so laghachiri Jeruselem, olee akụkọ ha nụrụ nke mere ha obi ụtọ? Oleezi ihe merenụ?

      • Olee ihe mere Tọmọs jizi kweta na Jizọs adịla ndụ?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya