Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ
    Ụlọ Nche—2001 | Jun 1
    • ọnọdụ ime mmụọ nke onye na-ejehie ejehie. Ee, ná ndabere nke ihe mgbapụta Kraịst, onye ahụ nwere nchegharị pụrụ ịbịa detụ “akụ̀ nke amara [Chineke]” ire.—Ndị Efesọs 1:7.

      “Obi Dị Ọcha” na ‘Mmụọ Dị Ọhụrụ’

      Mgbe Devid kwupụtasịrị mmehie ya, ọ dabaghị n’inwe mmetụta na-ezighị ezi nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe. Ihe ndị o kwuru n’Abụ Ọma ndị o dere banyere nkwupụta mmehie na-egosipụta ahụ efe o nwetara na mkpebi ya siri ike ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Lee, dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma nke 32. N’amaokwu nke 1, anyị na-agụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya.” N’agbanyeghị otú mmehie jọruru ná njọ, ọ bụrụ na mmadụ ejiri ezi obi nwee ncheghari, o kwere omume ịrụpụta obi ụtọ. Otu ụzọ isi gosipụta ezi obi a bụ site n’ịnabata ihe nile si n’ihe mmadụ mere pụta, dị ka Devid mere. (2 Samuel 12:13) Ọ nwaghị igosi Jehova na ihe o mere ziri ezi ma ọ bụ nwaa ịta ndị ọzọ ụta. Amaokwu nke 5 na-ekwu, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” Ezi nkwupụta mmehie na-eweta ahụ efe, nke na ọ dịghịzi mmadụ mkpa inwe akọ na uche na-ama ikpe n’ihi mmehie ndị gara aga o mere.

      Mgbe Devid rịọsịrị Jehova mgbaghara, ọ rịọrọ, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Ịrịọ maka “obi dị ọcha” na ‘mmụọ dị ọhụrụ’ na-egosi na Devid maara banyere ọchịchọ ime mmehie nke dị n’ime ya nakwa na enyemaka Chineke dị ya mkpa n’ime ka obi ya dị ọcha nakwa n’ịmalitezi n’isi. Kama ịmalite imetewere onwe ya ebere, o kpebisiri ike ịga n’ihu n’ozi ọ na-ejere Chineke. O kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị, Ị ga-emeghe egbugbere ọnụ m abụọ; ọnụ m ga-egosikwa otuto Gị.”—Abụ Ọma 51:15.

      Gịnị bụ mmeghachi omume Jehova n’ezi nchegharị Devid nwere na mgbalị siri ike o mere ijere ya ozi? O mesighachiri Devid obi ike n’ụzo a na-ekpo obi ọkụ: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.” (Abụ Ọma 32:8) Nke a bụ ihe mmesi obi ike nye onye ahụ nwere nchegharị na Jehova n’onwe ya na-echebara mmetụta na mkpa ya echiche. Jehova mere

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2001 | Jun 1
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      N’iburu n’uche njikere Jehova dị ịgbaghara mmehie site n’uru nke àjà mgbapụta ahụ, gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị Kraịst na-ekwupụtara ndị okenye ọgbakọ mmehie ha?

      Dị ka a pụrụ ịhụ n’ihe banyere Devid na Bat-sheba, Jehova gbaghaara Devid mmehie ya, n’agbanyeghị na ọ dị oké njọ, n’ihi ezi nchegharị Devid nwere. Mgbe Netan onye amụma bịakwutere ya, Devid kwupụtara n’ezoghị ọnụ, sị: “Emehiewo m megide Jehova.”—2 Samuel 12:13.

      Otú ọ dị, ọ bụghị nanị na Jehova na-anabata nkwupụta onye mmehie ji ezi obi mee ma gbaghara ya kama ọ na-emekwa ndokwa ịhụnanya iji nyere onye ahụ hiere ụzọ aka inwe ọganihu iji gbakee n’ụzọ ime mmụọ. N’ọnọdụ Devid, enyemaka ahụ si n’aka Netan onye amụma bịa. Taa, n’ọgbakọ ndị Kraịst, e nwere ndị ikom tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, ma ọ bụ ndị okenye. Jemes onye na-eso ụzọ na-akọwa, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike [n’ụzọ ime mmụọ]? ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị: ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie; ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.”—Jemes 5:14, 15.

      Ndị okenye nwere nkà pụrụ ime ihe dị ukwuu iji belata ihe mgbu nke obi nke onye mmehie ahụ

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya