Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 3
  • Ndị Rom 10:13—“Na-akpọku Aha Onyenwe Anyị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Rom 10:13—“Na-akpọku Aha Onyenwe Anyị”
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Rom 10:13 Pụtara
  • Ihe Ndị Gbara Ndị Rom 10:13 Gburugburu
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • A4 Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịmata Aha Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 3

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Rom 10:13—“Na-akpọku Aha Onyenwe Anyị”

“A ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.”​—Ndị Rom 10:​13, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Onye ọ bụla na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta.”​—Ndị Rom 10:13, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe Ndị Rom 10:13 Pụtara

Chineke anaghị akpa ókè. Ọ na-enye mmadụ niile ohere ka a zọpụta ha nakwa ka ha dịrị ndụ ebighị ebi n’agbanyeghị ebe onye ahụ si, asụsụ ya, ma ọ bụ ọkwá ya. Ọ bụrụ n’eziokwu na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, anyị ga na-akpọku aha Jehova. Jehova bụ ezigbo aha Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.a​—Abụ Ọma 83:18.

Na Baịbụl, mmadụ ‘ịna-akpọku aha Jehova’ apụtaghị naanị onye ahụ ịma aha Chineke na ịna-akpọ ya aha mgbe ọ na-efe ya. (Abụ Ọma 116:​12-14) Ọ pụtakwara na onye ahụ ga-atụkwasị Chineke obi, obi esiekwa ya ike na Chineke ga-enyere ya aka.​—Abụ Ọma 20:7; 99:6.

Jizọs Kraịst ji aha Chineke kpọrọ ihe. Ihe ndị mbụ o kwuru n’ekpere Onyenwe anyị ọ kụziiri anyị bụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ,” ma ọ bụ “ka otito dịrị aha Gị.” (Matiu 6:9) Jizọs kụzikwaara anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, anyị kwesịrị ịmata Jehova, na-erubere ya isi, hụkwa ya n’anya.​—Jọn 17:​3, 6, 26.

Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụ Jehova bụ “Onyenwe anyị” ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 10:13 na Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society? Ọ bụ n’ihi na ihe e kwuru ná Ndị Rom 10:13 si na Joel 2:32. N’ebe ahụ, ọ bụ aha Chineke ka e dere na ya n’asụsụ Hibru, ọ bụghị “Onyenwe anyị,” nke bụ́ aha a na-etu Chineke.b

Ihe Ndị Gbara Ndị Rom 10:13 Gburugburu

Ihe Baịbụl kwuru ná Ndị Rom 10 gosiri na mmadụ ga-enwerịrị okwukwe na Jizọs Kraịst ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ya na Chineke dịrị ná mma. (Ndị Rom 10:9) Ọtụtụ ihe e kwuru ‘n’Agba Ọhụrụ,’ bụ́ ndị e si n’ebe a na-akpọ “Agba Ochie” nweta, gosiri na ihe a bụ eziokwu. Otú mmadụ ga-esi egosi na o nwere okwukwe bụ onye ahụ ‘ikwupụta ya n’ihu ọha.’ Otu ụzọ ọ ga-esi eme ya bụ ịna-ezi ndị na-enwebeghị okwukwe ozi ọma ga-eme ka a zọpụta ha. Ozi ọma a bụ otú e si enye ndị ọzọ ohere ka ha nwee okwukwe ma nweta ndụ ebighị ebi.​—Ndị Rom 10:​10, 14, 15, 17.

Gụọ Ndị Rom isi 10 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a Aha Chineke gbara ihe dị ka ugboro puku asaa n’akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie. N’asụsụ Hibru, ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ anọ a na-akpọ Tetragramatọn ka e ji dee aha Chineke. Otú a na-esikarị ede aha ahụ n’Igbo bụ “Jehova.” Ma, ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl họọrọ ịna-ede ya “Yahweh.”

b Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst so dee Baịbụl dere aha Chineke ‘n’Agba Ọhụrụ’ n’ebe ndị ihe e kwuru na ha si ‘n’Agba Ochie’ ma ọ bụrụhaala na aha Chineke dị n’ebe ahụ. Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “E nwere ihe ụfọdụ gosiri na n’oge e dere Agba Ọhụrụ, e dere Tetragramatọn, ya bụ, aha Chineke bụ́ Yahweh, n’ebe niile ma ọ bụ n’ebe ụfọdụ e si n’Agba Ochie nweta ihe e dere n’Agba Ọhụrụ.” (Mpịakọta nke 6, peeji nke 392) Ị chọọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.” Ọ dị n’Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara​—Nke A5 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya