-
“Onye Àmà nke Nọ na Mbara Igwe Kwesịrị Ntụkwasị Obi”Ụlọ Nche—2007 | Julaị 15
-
-
“Onye Àmà nke Nọ na Mbara Igwe Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
Ọ DỊLA anya ndị na-agụ uri na ndị na-ede uri towere ọnwa dị ka ihe magburu onwe ya ná mma. Dị ka ihe atụ, otu abụ e dere n’ike mmụọ nsọ Chineke kwuru banyere nwanyị “nke mara mma dị ka ọnwa.” (Abụ nke Abụ 6:10) Ọzọkwa, otu ọbụ abụ kpọrọ ya “onye àmà nke nọ na mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi” n’abụ ya. (Abụ Ọma 89:37) Olee ihe okwu a e ji kọwaa ọnwa pụtara?
Ọnwa na-agba ụwa gburugburu kwa ụbọchị 27 na awa atọ. N’ihi ya, ikwu na ọnwa na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ike ịdị na-egosi na ọ bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. Otú ọ dị, ọbụ abụ ahụ nwere ike ibu ihe ka mkpa ọ pụtara n’uche. N’abụ amụma ọ bụrụ banyere Alaeze ahụ Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya, ọ kpọrọ ọnwa “onye àmà kwesịrị ntụkwasị obi.”—Matiu 6:9, 10.
Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, Jehova Chineke gbara ndụ inye Eze Devid nke Izrel oge ochie Alaeze. (2 Samuel 7:12-16) Nzube nke ọgbụgba ndụ ahụ bụ ime ka Jizọs Kraịst, bụ́ onye nketa nke ocheeze Devid, nwee ikike iwu kwadoro ịnọkwasị n’ocheeze ahụ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 9:7; Luk 1:32, 33) Mgbe ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere ocheeze nke “mkpụrụ” Devid, ọ bụrụ, sị: “Dị ka ọnwa ka ọ ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi; ọzọ onye àmà nke nọ na mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 89:36, 37.
‘Ihe ukwu ahụ na-enye ìhè n’abalị’—ọnwa—bụ nnọọ ihe na-echetara anyị na ịchịisi Kraịst ga-adịgide adịgide. (Jenesis 1:16) Daniel 7:14 kwuru banyere Alaeze ya, sị: “Ọchịchị Ya bụ ọchịchị ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga, ọ bụkwa alaeze Ya bụ nke a na-agaghị emebi.” Ọnwa bụ onye àmà nke na-echetara anyị Alaeze ahụ na ngọzi ndị ọ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ.
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?Ụlọ Nche—2007 | Julaị 15
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?
Ọbụna n’ụwa a nọ ná nsogbu, ị pụrụ inweta obi ụtọ site n’ezi ihe ọmụma nke Bible banyere Chineke, Alaeze ya, na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ bịa na nke gị iji mụwara gị Bible n’efu, biko detara Ndịàmà Jehova akwụkwọ na P.M.B. 1090, Benin City 300001, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 2.
-