Isi nke Iri na Atọ
Eze Abụọ Na-alụ Ọgụ
1, 2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji enwe mmasị n’amụma ahụ e dekọrọ na Daniel isi nke 11?
EZE abụọ na-asọ mpi nọ n’oké ndọrọ ndọrọ maka onye ga-aka ike. Ka ọtụtụ afọ na-agafe, otu merie, e mesịa nke ọzọ emerie. Mgbe ụfọdụ, otu eze ga-aka ike ebe nke ọzọ ga-aghọ ihe na-adịghị arụ ọrụ, a na-enwekwa oge ha na-adịghị alụ ọgụ. Ma mgbe ahụ, agha ọzọ ga-ada na mberede, ọgụ ahụ agaakwa n’ihu. Ndị sonyeworo n’ihe omume a abụwo Eze Seleucus nke Mbụ Nicator nke Siria, Eze Ptolemy Lagus nke Ijipt, Adaeze Siria nke ghọrọ Eze Nwanyị Cleopatra nke Mbụ nke Ijipt, Ndị Eze Ukwu nke Rom bụ́ Ọgọstọs na Taịbiriọs, na Eze Nwanyị Zenobia nke Palmyra. Ka ọgụ ahụ na-abịa ná njedebe ya, Nazi Germany, ìgwè mba ndị nọ n’okpuru ọchịchị Kọmụnist, Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America, Njikọ Mba Nile, na Mba Ndị Dị n’Otu etinyewokwa aka. Njedebe ya bụ ihe omume nke ọ na-adịghị nke ọ bụla n’ime ndị ọchịchị a maara ya. Mmụọ ozi Jehova kwupụtara amụma a na-akpali akpali gwa Daniel onye amụma n’ihe dị ka afọ 2,500 gara aga.—Daniel, isi nke 11.
2 Lee ka Daniel na-aghaghị isiworị nwee obi ụtọ ịnụ ka mmụọ ozi ahụ na-ekpughere ya n’ụzọ zuru ezu nsọrịta mpi ga-adị n’etiti eze abụọ na-abịanụ! Ihe omume ahụ na-adọrọkwa mmasị anyị, n’ihi na ịzọ onye ka ike nke dị n’etiti eze abụọ ahụ dịịrị rute n’oge anyị. Ịhụ otú akụkọ ihe mere eme siworo gosi akụkụ mbụ nke amụma ahụ ịbụ eziokwu ga-ewusi okwukwe na ntụkwasị obi anyị ike ná mmezu nke akụkụ ikpeazụ nke ihe ndekọ amụma ahụ ịbụ ihe e ji n’aka. Ịṅa ntị n’amụma a ga-eme ka oge anyị nọ na ya doo anyị anya. Ọ ga-ewusikwa mkpebi anyị ike ịnọpụ iche n’ọgụ ahụ ka anyị ji ndidi na-echere Chineke ime ihe n’ihi anyị. (Abụ Ọma 146:3, 5) Mgbe ahụ, ka anyị gee ntị nke ọma ka mmụọ ozi Jehova na-agwa Daniel okwu.
MEGIDE ALAEZE GRIS
3. Ònye ka mmụọ ozi ahụ kwadoro “n’afọ mbụ nke Daraịọs, bụ́ onye Midia”?
3 “Ma mụ onwe m,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru, “n’afọ mbụ nke Daraịọs, bụ́ onye Midia [539/538 T.O.A.], nguzo ọtọ m bụ ka m ghọọrọ ya onye na-ejidesi ike na ebe siri ike.” (Daniel 11:1) Daraịọs adịkwaghị ndụ, ma mmụọ ozi ahụ zoro aka n’ọchịchị ya dị ka ebe ozi amụma ahụ malitere. Ọ bụ eze a nyere iwu ka a kpọpụta Daniel n’olulu ọdụm ahụ. Daraịọs enyewokwa iwu na ndị ọ na-achị ga-atụ Chineke Daniel egwu. (Daniel 6:21-27) Otú ọ dị, onye mmụọ ozi ahụ guzoro ọtọ ịbụrụ onye nkwado abụghị Daraịọs onye Midia, kama onye òtù mmụọ ozi ahụ bụ́ Maịkael—onyeisi nke ndị obodo Daniel. (Tụlee Daniel 10:12-14.) Mmụọ ozi Chineke nyere nkwado a mgbe Maịkael na-alụso mmụọ ọjọọ bụ́ onyeisi nke Medo-Peasia ọgụ.
4, 5. Olee ndị bụ eze anọ nke Peasia e buru amụma ha?
4 Mmụọ ozi Chineke gara n’ihu, sị: “Lee, ndị eze atọ ọzọ ga na-eguzoro Peasia ọtọ; ma nke anọ ga-abụ ọgaranya nwe akụ̀ ukwu karịa ha nile: ma mgbe e mere ka ọ dị ike site n’akụ̀ ya, ọ ga-akpọte ndị ya nile imegide alaeze Jevan [Gris].” (Daniel 11:2) Olee ndị bụdị ndị a na-achị Peasia?
5 Eze atọ ndị mbụ bụ Saịrọs Onye Ukwu, Cambyses nke Abụọ, na Daraịọs nke Mbụ (Hystaspes). Ebe Bardiya (ma ọ bụ ikekwe onye na-azọrọ ihe ọ na-abụghị nke aha ya bụ Gaumata) chịrị ruo nanị ọnwa asaa, amụma ahụ agụnyeghị ọchịchị ya dị mkpirikpi. Na 490 T.O.A., eze nke atọ, Daraịọs nke Mbụ, nwara ịwakpo Gris na nke ugbo abụọ ya. Otú ọ dị, e meriri ndị Peasia na Marathon, ha laghachikwara Asia Minor. Ọ bụ ezie na Daraịọs kwadebere nke ọma maka ịlụso Gris agha ọzọ, ọ pụghị ime nke ahụ tupu ọnwụ ya afọ anọ n’ihu. A hapụụrụ ya nwa ya nwoke na onye nọchiri ya, bụ́ eze “nke anọ,” bụ́ Xerxes nke Mbụ. Ọ bụ ya bụ Eze Ahasuerọs lụrụ Esta.—Esta 1:1; 2:15-17.
6, 7. (a) Olee otú eze nke anọ si ‘kpọtee ndị ya nile imegide alaeze Gris’? (b) Gịnị ka agha Xerxes busoro Gris rụpụtara?
6 Xerxes nke Mbụ n’ezie ‘kpọtere ndị ya nile imegide alaeze Gris,’ ya bụ, mba Gris nile kwụụrụ onwe ha dị ka otu ìgwè. “N’ịbụ onye ndị ọrụ ya nwere oké ọchịchọ gbara ume,” ka akwụkwọ bụ́ The Medes and Persians—Conquerors and Diplomats na-ekwu, “Xerxes ji ndị agha ụkwụ na nke mmiri mee mwakpo.” Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ nke ise T.O.A., bụ́ Herodotus, na-ede na “ọ dịghị ihe omume agha ọzọ ka nke a.” Ihe o dekọrọ na-asị na ndị agha mmiri ya “dị ndị ikom 517,610 ná ngụkọta. Ọnụ ọgụgụ ndị soja ji ụkwụ dị 1,700,000; ndị ji ịnyịnya dị 80,000; bụ́ nke a na-aghaghị ịgbakwụnyere ndị Arab ji camel, na ndị Libia ji ụgbọ ịnyịnya lụọ ọgụ, bụ́ ndị m gbakọtara dị 20,000. Ya mere ọnụ ọgụgụ nile nke ndị agha mmiri na nke ala dị ndị ikom 2,317,610 ná ngụkọta.”
7 N’ime atụmatụ maka inwe mmeri zuru ezu, Xerxes nke Mbụ chịịrị nnukwu ndị agha ya gaa ibuso Gris agha na 480 T.O.A. Mgbe ha meriri atụmatụ agha igbu oge nke ndị Gris na Thermopylae, ndị Peasia bibiri Atens. Otú ọ dị, na Salamis, e meriri ha n’ụzọ dị egwu. Mmeri ọzọ Gris nwere bụ na Plataea, na 479 T.O.A. Ọ dịghị otu onye n’ime ndị eze asaa nọchiri Xerxes n’ocheeze nke Alaeze Ukwu Peasia n’afọ 143 sochirinụ nke lụsoro Gris agha. Ma mgbe ahụ eze dị ike bilitere na Gris.
OTU NNUKWU ALAEZE EKEWAA ỤZỌ ANỌ
8. Olee “eze, onye bụ́ dike” nke guzoro ọtọ, oleekwa otú o si ‘chịwa n’oké ọchịchị’?
8 “Otu eze, onye bụ́ dike, ga-eguzo ọtọ, ọ ga-achịkwa achị n’oké ọchịchị, mee ka o si tọọ ya,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru. (Daniel 11:3) Alexander bụ́ onye dị afọ 20 ‘guzoro ọtọ’ dị ka eze Masedonia na 336 T.O.A. Ọ ghọrọ “eze, onye bụ́ dike”—Alexander Onye Ukwu. N’ịbụ onye atụmatụ nna ya, bụ́ Philip nke Abụọ kwaliri, o weghaara ógbè Peasia ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. N’ịgafe osimiri Yufretis na Taịgris, ndị ikom ya dị 47,000 meriri usuu ndị agha Daraịọs nke Atọ dị 250,000 na Gaugamela. Mgbe nke ahụ gasịrị, Daraịọs gbara ọsọ, e gbukwara ya, si otú ahụ na-eweta usoro ndị ọchịchị Peasia ná njedebe. Ugbu a Gris ghọrọ ike ọchịchị ụwa, Alexander ‘chịkwara n’oké ọchịchị, meekwa ka o si tọọ ya.’
9, 10. Olee otú amụma ahụ bụ́ na alaeze Alexander agaghị agafe n’aka ụmụ ya si mezuo?
9 Ọchịchị Alexander ga-achị ụwa ga-adịru nwa oge, n’ihi na mmụọ ozi Chineke gbakwụnyere, sị: “Mgbe o guzoro ọtọ, a ga-etipịa alaeze ya, kesaa ya ná nchere ihu ifufe anọ nke eluigwe; ma ọ gaghị adịrị ụmụ ya ga-anọchi ya, ọ gaghị adịkwa ka ala ọchịchị ya nke ọ chịrị si dị; n’ihi na a ga-efopụ alaeze ya, ọ ga-adịkwara ndị ọzọ na-abụghị ndị a.” (Daniel 11:4) Alexander eruchabeghị afọ 33 mgbe ọrịa mberede gburu ya na Babilọn na 323 T.O.A.
10 Nnukwu alaeze Alexander abaghị n’aka “ụmụ ya.” Nwanne ya nwoke bụ́ Philip nke Atọ Arrhidaeus chịrị ihe na-erughị afọ asaa e wee gbuo ya mgbe Olympias, nne Alexander, kwuru ka e mee otú ahụ na 317 T.O.A. Ọkpara Alexander bụ́ Alexander nke Anọ chịrị ruo 311 T.O.A. mgbe Cassander, bụ́ otu n’ime ndị ọchịagha nna ya, gburu ya. Nwa mkpuke Alexander bụ́ Heracles chọrọ ịchị n’aha nna ya ma e gburu ya na 309 T.O.A. Otú a ka eriri Alexander si gwụ, “ala ọchịchị ya” wee si n’ezinụlọ ya pụọ.
11. Olee otú e si kesaa alaeze Alexander “ná nchere ihu ifufe anọ nke eluigwe”?
11 Mgbe Alexander nwụsịrị, ‘e kesara alaeze ya ná nchere ihu ifufe anọ.’ Ndị ọchịagha ya dị ọtụtụ sere okwu n’etiti onwe ha ka ha na-azọ ókèala. Ọchịagha Antigonus nke Mbụ nke nwere otu anya, gbalịrị ịchịwa alaeze ukwu Alexander nile. Ma e gburu ya n’otu agha a lụrụ na Ipsus na Frijia. Ka ọ na-erule n’afọ 301 T.O.A., anọ n’ime ndị ọchịagha Alexander nọ na-achị nnukwu ókèala nke ọchịagha ha meriworo. Cassander chịrị Masedonia na Gris. Lysimachus chịrị Asia Minor na Thrace. Seleucus nke Mbụ Nicator nwetara Mesopotemia na Siria. Ptolemy Lagus weghakwaara Ijipt na Palestine. N’ikwekọ n’okwu amụma ahụ, e kewara nnukwu alaeze Alexander gaa n’ụzọ alaeze ndị Gris anọ.
EZE ABỤỌ NA-ASỌ MPI APỤTA
12, 13. (a) Olee otú e si belata alaeze anọ nke ndị Gris ịbụ abụọ? (b) Olee usoro ndị ọchịchị nke Seleucus guzobere na Siria?
12 Afọ ole na ole mgbe Cassander batasịrị n’ọchịchị, ọ nwụrụ, na 285 T.O.A., Lysimachus weghakwaara akụkụ Europe nke Alaeze Ukwu Gris. Na 281 T.O.A., Seleucus nke Mbụ Nicator gburu Lysimachus n’agha, na-eme ka Seleucus chịwa mpaghara bụ́ isi nke ókèala Esia. Antigonus nke Abụọ Gonatas, bụ́ nwa nwa nke otu n’ime ndị ọchịagha Alexander, nọkwasịrị n’ocheeze Masedonia na 276 T.O.A. Ka oge na-aga, Masedonia malitere na-adabere na Rom ma mesịa ghọọ ógbè Rom na 146 T.O.A.
13 Nanị abụọ n’ime alaeze Gris anọ ahụ ka a ma ama ugbu a—otu dị n’okpuru Seleucus nke Mbụ Nicator, nke ọzọ dịkwa n’okpuru Ptolemy Lagus. Seleucus guzobere usoro ọchịchị ndị eze Seleucid n’ime Siria. Ụfọdụ n’ime obodo ndị o guzobere bụ Antiọk—isi obodo ọhụrụ nke Siria—na ọdụ ụgbọ mmiri nke Seleusia. Pọl onyeozi mesịrị kụzie ihe n’Antiọk, bụ́ ebe mbụ a kpọrọ ụmụazụ Jisọs ndị Kristian. (Ọrụ 11:25, 26; 13:1-4) E gburu Seleucus na 281 T.O.A., ma usoro ndị ọchịchị ya chịgidere ruo 64 T.O.A. mgbe Ọchịagha Gnaeus Pompey nke Rom mere Siria ógbè ndị Rom.
14. Olee mgbe e guzobere usoro ndị ọchịchị Ptolemy n’Ijipt?
14 Alaeze Gris nke nọtekarịsịrị aka n’ime alaeze anọ ahụ bụ nke Ptolemy Lagus, ma ọ bụ Ptolemy nke Mbụ, bụ́ onye weere utu aha bụ́ eze na 305 T.O.A. Usoro ndị ọchịchị Ptolemy nke o guzobere nọgidere na-achị Ijipt ruo mgbe Rom meriri ya na 30 T.O.A.
15. Olee eze abụọ siri ike ndị sitere n’alaeze anọ nke ndị Gris pụta, oleekwa asọmpi ha malitere?
15 Ya mere n’ime alaeze ndị Gris anọ, eze abụọ siri ike pụtara—Seleucus nke Mbụ Nicator nke na-achị Siria na Ptolemy nke Mbụ nke na-achị Ijipt. Ndị eze abụọ a malitere asọmpi ahụ dịteworo aka n’etiti “eze Ugwu” na “eze Ndịda,” bụ́ nke a kọwara na Daniel isi nke 11. Mmụọ ozi Jehova akpọghị aha eze abụọ ahụ, n’ihi na ndị eze abụọ a bụ na mba ha si ga na-agbanwe n’ime ọtụtụ narị afọ na-agafenụ. N’ịhapụ ihe ọmụma ndị na-adịghị mkpa, mmụọ ozi ahụ kwuru banyere nanị ndị ọchịchị na ihe omume ndị ga-emetụta ọgụ ahụ.
ỌGỤ AHỤ AMALITE
16. (a) Eze abụọ ahụ nọ n’ebe ugwu na n’ebe ndịda nke ole ndị? (b) Olee ndị eze buru ụzọ nọrọ n’ọkwá “eze Ugwu” na “eze Ndịda”?
16 Gee ntị! N’ịkọwa mmalite nke ọgụ a dị ịrịba ama, mmụọ ozi Jehova na-asị: “Eze nke Ndịda ga-adị ike, ya na otu n’ime ndị isi ya [nke Alexander]; ọ [eze ugwu] ga-adịkwa ike n’elu ya, chịa achịa; oké ala ọchịchị ka ala ọchịchị ya ga-abụ.” (Daniel 11:5) Aha ahụ bụ́ “eze nke Ugwu” na “eze nke Ndịda” na-ezo aka n’eze ndị dị n’ebe ugwu na n’ebe ndịda nke ndị obodo Daniel, bụ́ ndị a tọhapụworo mgbe ahụ ná ndọrọ n’agha Babilọn ma weghachi ha n’ala Juda. “Eze nke Ndịda” nke mbụ bụ Ptolemy nke Mbụ nke Ijipt. Otu n’ime ndị ọchịagha Alexander, nke meriri Ptolemy nke Mbụ ma chịa “achịa” bụ Eze Seleucus nke Mbụ Nicator nke Siria. O weere ọkwá nke “eze nke Ugwu.”
17. Ònye na-achị ala Juda ná mmalite nke ọgụ ahụ dị n’etiti eze ugwu na eze ndịda?
17 Ná mmalite nke ọgụ ahụ, ala Juda nọ n’okpuru ọchịchị nke eze ndịda. Malite n’ihe dị ka na 320 T.O.A., Ptolemy nke Mbụ mere ka ndị Juu bịa n’Ijipt dị ka ndị ga-ebi na ya. Ógbè ndị Juu nwere ihe ịga nke ọma n’Aleksandria, bụ́ ebe Ptolemy nke Mbụ wuru otu ọ́bá akwụkwọ a ma ama. Ndị Juu nọ na Juda nọgidere n’okpuru ọchịchị Ijipt dị n’aka Ptolemy, bụ́ eze ndịda, ruo 198 T.O.A.
18, 19. Ka oge na-aga, olee otú eze abụọ ahụ na-amarịta aka si ‘dozie okwu n’ụzọ ziri ezi’?
18 Banyere eze abụọ ahụ, mmụọ ozi ahụ buru amụma, sị: “N’ọgwụgwụ afọ ụfọdụ ha ga-ekekọta onwe ha; ada eze nke Ndịda ga-abịakwutekwa eze Ugwu idozi okwu n’ụzọ ziri ezi: ma nwanyị ahụ agaghị anagide ike nke ogwe aka ya; nwoke ahụ agaghị eguzogidekwa, ya na ogwe aka ya; ma a ga-arara nwanyị ahụ nye, ya onwe ya, na ndị na-eme ka ọ bịa, na nna mụrụ ya, na nwoke nke na-eme ka ọ dị ike na mgbe ahụ nile.” (Daniel 11:6) Olee otú nke a si mezuo?
19 Amụma ahụ ekwughị banyere nwa na onye nọchiri Seleucus nke Mbụ Nicator, bụ́ Antiochus nke Mbụ, n’ihi na o bughị agha wetara mmeri megide eze ndịda. Ma onye nọchiri ya, bụ́ Antiochus nke Abụọ, lụrụ ọgụ dịruru ogologo oge megide Ptolemy nke Abụọ, bụ́ nwa Ptolemy nke Mbụ. Antiochus nke Abụọ bụ eze ugwu ebe Ptolemy nke Abụọ bụ eze ndịda. Antiochus nke Abụọ lụrụ Laodice, ha mụkwara nwa nwoke aha ya bụ Seleucus nke Abụọ, ebe Ptolemy nke Abụọ mụtara nwa nwanyị a gụrụ Berenice. Na 250 T.O.A., eze abụọ ndị a ‘doziri okwu n’ụzọ ziri ezi.’ Iji kwụọ ụgwọ nkekọta a, Antiochus nke Abụọ gbara nwunye ya bụ́ Laodice alụkwaghịm wee lụọ Berenice, bụ́ “ada eze nke Ndịda.” Berenice mụtaara ya otu nwa nwoke bụ́ onye ghọrọ onye ga-eketa ocheeze Siria kama ịbụ ụmụ Laodice ndị nwoke.
20. (a) Olee otú “ogwe aka” Berenice si ghara iguzo? (b) Olee otú e si gbuo Berenice, “ndị na-eme ka ọ bịa,” na onye “na-eme ka ọ dị ike”? (ch) Ònye ghọrọ eze Siria mgbe “ogwe aka” ma ọ bụ ike Antiochus nke Abụọ funahụsịrị ya?
20 “Ogwe aka” ma ọ bụ ike nkwado Berenice, bụ nna ya, bụ́ Ptolemy nke Abụọ. Mgbe ọ nwụrụ na 246 T.O.A, Berenice ‘anagideghị ike nke ogwe aka ya’ n’ebe di ya nọ. Antiochus nke Abụọ jụrụ ya, lụgharịa Laodice, ma kwuo na nwa ha nwoke ga-anọchi ya. Dị ka Laodice kpara nkata ya, e gburu Berenice na nwa ya nwoke. Dị ka ihe àmà gosiri, ndị si n’Ijipt kpọta Berenice na Siria—“ndị na-eme ka ọ bịa”—nwụkwara. Laodice ọbụna mere Antiochus nke Abụọ nsí, “ogwe aka,” ma ọ bụ ike ya sikwa otú a ‘ghara iguzugide.’ N’ihi ya, nna Berenice—“nna mụrụ ya”—na di ya bụ́ onye Siria—onye meworo ka ọ “dị ike” ruo nwa oge—nwụchara. Nke a mere ka nanị Seleucus nke Abụọ, bụ́ nwa Laodice, bụrụ eze Siria. Olee otú eze ọzọ nke usoro ndị eze Ptolemy ga-esi meghachi omume n’ihe ndị a nile?
OTU EZE ABỌỌ ỌBỌ OGBUGBU NWANNE YA NWANYỊ
21. (a) Ònye bụ “onye ga-esi n’ome” nke “mkpọrọgwụ” Berenice, oleekwa otú o si ‘guzoro ọtọ’? (b) Olee otú Ptolemy nke Atọ si “bata n’ebe siri ike nke eze Ugwu” wee merie ya?
21 “Otu onye ga-esi n’ome nke mkpọrọgwụ nwanyị ahụ nile guzo ọtọ n’ọnọdụ nwoke ahụ,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru, “bịakwute usuu ndị agha ya, bata n’ebe siri ike nke eze Ugwu, megide ha, ghọọ onye dị ike.” (Daniel 11:7) “Onye ga-esi n’ome” nke nne na nna ma ọ bụ “mkpọrọgwụ” Berenice bụ nwanne ya nwoke. Mgbe nna ya nwụrụ, o ‘guzoro ọtọ’ dị ka eze ndịda, Fero Ptolemy nke Atọ nke Ijipt. O mere ihe ozugbo iji bọọ ọbọ ogbugbu e gburu nwanne ya nwanyị. N’ibu agha megide Eze Seleucus nke Abụọ nke Siria, bụ́ onye Laodice jiworo gbuo Berenice na nwa ya nwoke, ọ wakporo ‘ebe siri ike nke eze Ugwu.’ Ptolemy nke Atọ weghaara akụkụ e wusiri ike nke Antiọk ma gbuo Laodice. N’ịga n’ebe ọwụwa anyanwụ site n’ebe eze ugwu na-achị, o bibiri Babylonia ma zọrọ ije gaa India.
22. Gịnị ka Ptolemy nke Atọ weghachiri n’Ijipt, n’ihi gịnịkwa ka o ji ‘guzo afọ ụfọdụ ghara imegide eze Ugwu ahụ’?
22 Gịnị ọzọ mere? Mmụọ ozi Chineke na-agwa anyị, sị: “Ọzọkwa, chi nile ha, ha na arụsị nile ha a wụrụ awụ, tinyere ihe nile ha a na-achọsi ike nke ukwuu nke ọlaọcha na nke ọlaedo, ka ọ ga-adọta n’agha bata n’Ijipt; ma ya onwe ya ga-eguzo afọ ụfọdụ ghara imegide eze Ugwu ahụ.” (Daniel 11:8) Ihe karịrị afọ 200 tupu mgbe ahụ, Eze Cambyses nke Abụọ nke Peasia meriri Ijipt ma kwakọrọ chi ndị Ijipt, “arụsi nile ha a wụrụ awụ” laa. N’ịkwakọrọ ihe dị n’ebe bụbu isi obodo ndị eze nke Peasia bụ́ Susa, Ptolemy nke Atọ wetaghachiri chi ndị a ma ‘dọrọ ha n’agha’ gaa Ijipt. O weghachikwara ọtụtụ “ihe nile ha a na-achọsi ike nke ukwuu nke ọlaọcha na nke ọlaedo” dị ka ihe ndị a kwatara n’agha. Ebe ọ ga-alọtarịrị ụlọ iji bịanyụọ nnupụisi biliterenụ, Ptolemy nke Atọ ‘guzoro wee ghara imegide eze Ugwu ahụ,’ ghara imerụ ya ahụ ọzọ.
EZE SIRIA EMEGWARA
23. N’ihi gịnị ka eze ugwu ji ‘laghachi n’ala nke aka ya’ mgbe ọ batasịrị n’alaeze nke eze ndịda?
23 Olee otú eze ugwu si meghachi omume? A gwara Daniel, sị: “Ọ ga-abatakwa n’alaeze nke eze Ndịda, ma ọ ga-alaghachi n’ala nke aka ya.” (Daniel 11:9) Eze ugwu—Eze Seleucus nke Abụọ nke Siria—megwaara. Ọ banyere “n’alaeze,” ma ọ bụ ógbè, nke eze Ijipt bụ́ eze ndịda ma e meriri ya. N’inwe nanị ntakịrị ndị agha ya fọdụrụnụ, Seleucus nke Abụọ ‘laghachiri n’ala nke aka ya,’ na-alaghachi azụ n’isi obodo Siria bụ́ Antiọk n’ihe dị ka na 242 T.O.A. Mgbe ọ nwụrụ, nwa ya nwoke, bụ́ Seleucus nke Atọ, nọchiri ya.
24. (a) Gịnị mere Seleucus nke Atọ? (b) Olee otú Eze Antiochus nke Atọ nke Siria si ‘bịa, rubiga ókè dị ka osimiri wee gabiga’ ókèala nke eze ndịda?
24 Gịnị ka e buru n’amụma banyere nwa Eze Seleucus nke Abụọ nke Siria? Mmụọ ozi ahụ gwara Daniel, sị: “Ma ụmụ ya ndị ikom ga-akpali onwe ha ibu agha, ha ga-achịkọtakwa ìgwè ọtụtụ usuu ndị agha, ọ ga-abịa abịa, rubiga ókè dị ka osimiri, gabiga: ọ ga-alaghachikwa, ha ga-akpalikwa onwe ha ibu agha ruo ebe ya siri ike.” (Daniel 11:10) Ogbugbu e gburu Seleucus nke Atọ wetara ọchịchị ya na njedebe n’ihe na-erughị afọ atọ. Nwanne ya nwoke, bụ́ Antiochus nke Atọ, nọchiri ya n’ocheeze Siria. Nwa Seleucus nke Abụọ a chịkọtara nnukwu usuu ndị agha maka ịwakpo eze ndịda, onye bụ́ mgbe ahụ Ptolemy nke Anọ. Eze Siria ọhụrụ bụ́ eze ugwu lụsoro Ijipt agha n’ụzọ gara nke ọma ma nwetaghachi ọdụ ụgbọ mmiri nke Seleusia, ógbè Coele-Syria, obodo nile nke Taịa na Ptolemaïs, na obodo ndị dị ya nso. O meriri ndị agha Eze Ptolemy nke Anọ ma weghara ọtụtụ obodo Juda. N’oge opupu ihe ubi nke 217 T.O.A., Antiochus nke Atọ hapụrụ Ptolemaïs wee gaa n’ebe ugwu, “ruo ebe ya siri ike” na Siria. Ma mgbanwe dị nso.
IHE AGBANWEE
25. Olee ebe Ptolemy nke Anọ na Antiochus nke Atọ nọ kwata n’agha, gịnịkwa ka e ‘nyere n’aka’ eze Ijipt bụ́ eze ndịda?
25 Dị ka Daniel, anyị na-ege nnọọ ntị ka mmụọ ozi Jehova gara n’ihu na-ebu amụma, sị: “Eze Ndịda ga-ewe iwe dị ilu, pụta, busoo ya agha, bụ́ eze Ugwu ahụ: ọ ga-eguzokwa oké ìgwè mmadụ, ma a ga-enye ìgwè mmadụ ahụ n’aka ya.” (Daniel 11:11) N’iji usuu ndị agha dị 75,000, eze ndịda, bụ́ Ptolemy nke Anọ, gawara n’ebe ugwu imegide onye iro ya. Eze Siria bụ́ eze ugwu, bụ́ Antiochus nke Atọ, achịkọtaworị “oké ìgwè mmadụ” dị 68,000 ịlụso ya ọgụ. Ma ‘e nyere ìgwè mmadụ ahụ n’aka’ eze ndịda n’agha a lụrụ n’obodo Raphia nke dị n’ụsọ oké osimiri, nke dị nso n’ókèala Ijipt.
26. (a) Olee “ìgwè mmadụ” nke eze ndịda chịịrị n’agha a lụrụ na Raphia, gịnịkwa bụ ihe ndị e kwekọrịtara na ya ná nkwekọrịta udo e mere n’ebe ahụ? (b) Olee otú Ptolemy nke Anọ si ghara ‘ịdị ike’? (ch) Ònye ghọrọ eze ndịda ọzọ?
26 Amụma ahụ gara n’ihu, na-asị: “A ga-achịpụkwa ìgwè mmadụ ahụ, obi ya ewee dị elu: ọ ga-emekwa ka [ọtụtụ iri puku] mmadụ daa adaa, ma ọ gaghị adị ike.” (Daniel 11:12) Ptolemy nke Anọ, bụ́ eze ndịda, ‘chịịrị’ ndị agha Siria ji ụkwụ dị 10,000 na ndị agha ụgbọ ịnyịnya 300 gbuo ma mee 4,000 ndị mkpọrọ. Mgbe nke a gasịrị ndị eze ahụ mere nkwekọrịta udo ebe Antiochus nke Atọ ka nọgidere na-enwe ọdụ ụgbọ mmiri Siria ya dị na Seleusia ma bụrụ onye a napụrụ Finisia na Coele-Syria. N’ihi mmeri a, obi eze Ijipt bụ́ eze ndịda ‘wee dị elu,’ karịsịa megide Jehova. Juda nọgidere n’okpuru ọchịchị Ptolemy nke Anọ. Otú ọ dị, ọ ‘dịghị ike’ isochi mmeri o meriri eze Siria bụ́ eze ugwu. Kama nke ahụ, Ptolemy nke Anọ biwere ndụ ịla n’iyi, nwa ya nwoke dị afọ ise, bụ́ Ptolemy nke Ise, ghọkwara eze ọzọ nke ndịda afọ ole na ole tupu Antiochus nke Atọ anwụọ.
ONYE MMERI ALỌGHACHI
27. Olee otú eze ugwu si bịaghachi “n’ọgwụgwụ mgbe ndị a” inwetaghachi ókèala site n’aka Ijipt?
27 N’ihi mmeri ya nile, a kpọwara Antiochus nke Atọ Antiochus Onye Ukwu. Banyere ya, mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Eze Ugwu ahụ ga-eguzobekwa ìgwè mmadụ ọzọ bara ụba karịa ìgwè mbụ; ọ bụkwa n’ọgwụgwụ mgbe ndị a, bụ́ nke afọ ndị a, ka ọ ga-abịa abịa, chịrị usuu ndị agha dị ukwuu, chị[rị]kwa ọtụtụ akụ̀.” (Daniel 11:13) “Mgbe ndị a” bụ afọ 16 ma ọ bụ karịa mgbe ndị Ijipt merisịrị ndị Siria na Raphia. Mgbe Ptolemy nke Ise ka na-eto eto ghọrọ eze ndịda, Antiochus nke Atọ jiri “ìgwè mmadụ ọzọ bara ụba karịa ìgwè mbụ” gaa inwetaghachi ókèala ndị eze Ijipt bụ́ eze ndịda nakọọrọ ya. Iji mezuo nke ahụ, o sonyeere ndị agha Eze Philip nke Ise nke Masedonia.
28. Olee nsogbu ndị eze ndịda ka na-eto eto nwere?
28 Eze ndịda nwekwara nsogbu n’ime alaeze ya. “Na mgbe ahụ ka ọtụtụ mmadụ ga-eguzo ọtọ imegide eze Ndịda,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru. (Daniel 11:14a) N’ezie ọtụtụ ‘mmadụ guzoro ọtọ imegide eze Ndịda.’ E wezụga ịlụso ndị agha Antiochus nke Atọ na ndị Masedonia sonyeere ya agha, eze ndịda ahụ na-eto eto chere ọtụtụ nsogbu ihu n’ụlọ n’Ijipt. N’ihi na onye na-elekọta ya bụ́ Agathocles, bụ́ onye chịrị n’aha ya, mesoro ndị Ijipt ihe n’ụzọ mpako, ọtụtụ nupụrụ isi. Mmụọ ozi ahụ gbakwụnyere, sị: “Ọzọ, ụmụ nke ndị na-eme ihe ike n’etiti ndị gị ga-ebuli onwe ha ime ka ọhụụ ahụ guzo; ma ha ga-asụ ngọngọ.” (Daniel 11:14b) Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị obodo Daniel ghọrọ “ụmụ nke ndị na-eme ihe ike,” ma ọ bụ ndị na-ebu agha mgbanwe. Ma “ọhụụ” ọ bụla ndị ikom Juu dị otú ahụ hụrụ banyere ọgwụgwụ nke ọchịchị ndị Jentaịl na-achị ala ha bụ ụgha, ha ga-adakwa, ma ọ bụ ‘sụọ ngọngọ.’
29, 30. (a) Olee otú “ogwe aka nile nke Ndịda” si daa ná mwakpo sitere n’ebe ugwu? (b) Olee otú eze ugwu si bịa ‘guzo n’ala ahụ mara mma’?
29 Mmụọ ozi Jehova gara n’ihu buo amụma, sị: “Eze Ugwu ahụ ga-abịakwa, wukọta obo ihe, were otu obodo nke e wusiri ike nke ukwuu: ogwe aka nile nke Ndịda agaghị eguzokwa, ha na ndị ọ họpụtara, ọ dịghịkwa ike ọ bụla ha nwere iguzo. Ma onye ahụ nke na-abịakwute ya ga-eme ka o si tọọ ya, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga na-eguzo n’ihu ya; ọ ga-eguzokwa n’ala ahụ mara mma, ngwụsị ga-adịkwa n’aka ya.”—Daniel 11:15, 16.
30 Usuu ndị agha nọ n’okpuru Ptolemy nke Ise, ma ọ bụ “ogwe aka nile nke Ndịda,” dara ná mwakpo sitere n’ebe ugwu. Na Paneas (Sisaria Filipaị), Antiochus nke Atọ chụbara Ọchịagha Scopas nke Ijipt na ndị ikom 10,000 “ọ họpụtara,” n’ime Saịdọn, bụ́ “obodo nke e wusiri ike.” N’ebe ahụ Antiochus nke Atọ ‘wukọtara obo ihe,’ na-eweghara ọdụ ụgbọ mmiri nke Finisia na 198 T.O.A. O mere “ka o si tọọ ya” n’ihi na ndị agha nke eze Ijipt bụ́ eze ndịda enweghị ike iguzo n’ihu ya. Antiochus nke Atọ wakpoziri Jerusalem, bụ́ isi obodo ‘ala ahụ mara mma,’ bụ́ Juda. Na 198 T.O.A., Jerusalem na Juda sitere n’ịbụ ndị eze Ijipt bụ́ eze ndịda na-achị gafee n’ịbụ ndị eze Siria bụ́ eze ugwu na-achị. Antiochus nke Atọ, bụ́ eze ugwu, malitekwara ‘iguzo n’ala ahụ mara mma.’ E nwere ‘ngwụsị sitere n’aka ya’ nye ndị Juu na ndị Ijipt nile na-emegide ya. Ruo ogologo oge ha aṅaa ka eze ugwu a ga-enwe ike ime ka o si tọọ ya?
ROM EGBOCHIE ONYE MMERI AHỤ
31, 32. N’ihi gịnị ka eze ugwu jiri mesịa soro eze ndịda ‘mee’ udo?
31 Mmụọ ozi Jehova na-enye anyị azịza a: “Ọ [eze ugwu] ga-edokwa ihu ya ịbịa abịa n’ike nke alaeze ya nile, ndị ziri ezi ga-esokwa ya; ọ ga-emekwa ihe: ọ bụkwa ada ndị inyom ka ọ ga-enye ya, ibibi ya; ma ihe ahụ agaghị eguzo, ọ bụghịkwa nke ya ka ọ ga-abụ.”—Daniel 11:17.
32 Eze ugwu, bụ́ Antiochus nke Atọ, ‘doro ihu ya’ ịchị Ijipt “n’ike nke alaeze ya nile.” Ma nanị ihe o meliri bụ isoro Ptolemy nke Ise, bụ́ eze ndịda ‘mee’ udo. Ihe Rom chọrọ emewo ka Antiochus nke Atọ gbanwee atụmatụ ya. Mgbe ya na Eze Philip nke Ise nke Masedonia jikọrọ aka ọnụ megide eze Ijipt ka bụ nwatakịrị iwekọrọ ókèala ya, ndị na-elekọta Ptolemy nke Ise gbakwuuru Rom maka nchebe. N’iji ohere ahụ nke ịgbasa ebe ndị ọ na-achị mee ihe, Rom gosiri ike ya.
33. (a) Gịnị bụ nkwekọrịta udo dị n’etiti Antiochus nke Atọ na Ptolemy nke Ise? (b) Gịnị bụ nzube nke alụmdi na nwunye dị n’etiti Cleopatra nke Mbụ na Ptolemy nke Ise, n’ihi gịnịkwa ka atụmatụ ahụ ji kụọ afọ n’ala?
33 N’ịbụ onye Rom manyere, Antiochus nke Atọ jiri okwu udo bịakwute eze ndịda. Kama isepụ aka n’ókèala ndị ahụ o meriri emeri, dị ka Rom kwuru ka o mee, Antiochus nke Atọ kpara nkata inyefe ha nanị n’aha site n’ime ka ada ya bụ́ Cleopatra nke Mbụ—“ada ndị inyom”—lụọ Ptolemy nke Ise. A ga-enye ógbè ndị gụnyere Juda, bụ́ ‘ala ahụ mara mma’ dị ka ụgwọ isi ya. Otú ọ dị, n’agbamakwụkwọ ahụ na 193 T.O.A., eze Siria ekweghị ka ógbè ndị a gaara Ptolemy nke Ise. Ọ bụ alụmdi na nwụnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke e hiwere iji mee ka Ijipt nọrọ n’okpuru Siria. Ma atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala n’ihi na Cleopatra nke Mbụ anọgideghị ‘bụrụ nke ya,’ n’ihi na o mesịrị dụnyere di ya úkwù. Mgbe agha dara n’etiti Antiochus nke Atọ na ndị Rom, Ijipt dụnyeere Rom úkwù.
34, 35. (a) Olee “àgwàetiti nile” eze ugwu chere ihu ya? (b) Olee otú Rom si kwụsị “ịta ụta” sitere n’ọnụ eze ugwu? (ch) Olee otú Antiochus nke Atọ si nwụọ, ònyekwa ghọrọ eze ugwu ọzọ?
34 N’izo aka ná mmeri ndị e meriri eze ugwu, mmụọ ozi ahụ gbakwụnyere, sị: “Ọ [Antiochus nke Atọ] ga-echigharịkwa ihu ya lee àgwàetiti nile, were ọtụtụ: ma otu ọchịagha [Rom] ga-eme ka ịta ụta ya kwụsịrị ya [Rom]; ee, ọ [Rom] ga-emekwa ka ịta ụta ya [nke sitere n’aka Antiochus nke Atọ] laghachikwute ya. Ọ [Antiochus nke Atọ] ga-echigharịkwa ihu ya lee ebe nile siri ike nke ala nke aka ya: ma ọ ga-asụ ngọngọ daa, a gaghị ahụkwa ya.”—Daniel 11:18, 19.
35 “Àgwàetiti nile” ndị ahụ bụ nke Masedonia, Gris, na Asia Minor. Agha dara na Gris na 192 T.O.A., a rabanyekwara Antiochus nke Atọ ịbịa Gris. N’enweghị obi ụtọ n’ihi mgbalị eze Siria mere iji nwetakwuo ókèala ndị ọzọ n’ebe ahụ, Rom busoro ya agha. Na Thermopylae, Rom meriri ya. Ihe dị ka otu afọ mgbe e merisịrị ya n’agha a lụrụ na Magnesia na 190 T.O.A., ọ hapụrụ ihe nile dị na Gris, Asia Minor, na n’akụkụ ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke Ugwu Taurus. Rom nara ya ụtụ buru ibu ma malite ịchị eze Siria bụ́ eze ugwu. N’ịbụ onye a chụpụrụ na Gris na Asia Minor ma bụrụkwa onye na-enwekwaghị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụgbọ mmiri agha ya nile, Antiochus nke Atọ ‘chigharịrị ihu ya n’ebe nile siri ike nke ala nke aka ya,’ bụ́ Siria. Ndị Rom ‘emewo ka ịta ụta ya laghachikwute ya.’ Antiochus nke Atọ nwụrụ mgbe ọ na-achọ izu ohi n’ụlọ nsọ dị n’Elymaïs, Peasia, na 187 T.O.A. O si otú a “daa” n’ọnwụ, nwa ya nwoke bụ́ Seleucus nke Anọ, bụ́ eze ugwu na-esonụ, nọchikwara ya.
ỌGỤ AHỤ AGAA N’IHU
36. (a) Olee otú eze ndịda si nwaa ime ka mgba ahụ gaa n’ihu, ma gịnị mere ya? (b) Olee otú Seleucus nke Anọ si daa, ònyekwa nọchiri ya?
36 Dị ka eze ndịda, Ptolemy nke Ise nwara inweta ógbè nile nke kwesịrị ịbịara ya dị ka ụgwọ isi Cleopatra, ma e mere ya nsí. Ptolemy nke Isii nọchiri ya. Gịnị banyere Seleucus nke Anọ? N’ịbụ onye ego dị mkpa iji kwụọ nhà dị ukwuu o ji Rom, o zipụrụ onye na-ejidere ya ego bụ́ Heliodorus ka ọ gaa bute akụ̀ na ụba nile a sị na a kwakọbara n’ụlọ nsọ Jerusalem. N’ịchọ inweta ocheeze ahụ, Heliodorus gburu Seleucus nke Anọ. Otú ọ dị, Eze Eumenes nke Pagamọm na nwanne ya nwoke bụ́ Eze Attalus chiri nwanne eze ahụ e gburu egbu bụ́ Antiochus nke Anọ eze.
37. (a) Olee otú Antiochus nke Anọ si nwaa igosi onwe ya ịbụ onye ka Jehova Chineke ike? (b) Gịnị ka mmetọ nke Antiochus nke Anọ metọrọ ụlọ nsọ dị na Jerusalem dujere na ya?
37 Eze ugwu ọhụrụ, bụ́ Antiochus nke Anọ, chọrọ igosipụta onwe ya ịbụ onye ka Chineke ike site n’ịnwa ikpochapụ ndokwa Jehova maka ife ofufe. N’ileda Jehova anya, ọ raara ụlọ nsọ Jerusalem nye Zeus, ma ọ bụ Jupita. Na December 167 T.O.A., e wukwasịrị ebe ịchụàjà ndị na-ekpere arụsị n’elu ebe ịchụàjà ukwu dị n’ogige ụlọ nsọ ahụ bụ́ ebe a na-achụburu Jehova àjà nsụre ọkụ kwa ụbọchị. Ụbọchị iri mgbe e mesịrị nke ahụ, a chụụrụ Zeus àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ndị ahụ na-ekpere arụsị. Mmetọ a dujere ná nnupụisi ndị Juu n’okpuru ndị Maccabee. Antiochus nke Anọ lụsoro ha ọgụ ruo afọ atọ. Na 164 T.O.A., n’ememe ncheta nke mmetọ ahụ, Judas Maccabaeus raraghachiiri ụlọ nsọ ahụ nye Jehova, e guzobekwara ememe nraranye—Hanukkah.—Jọn 10:22.
38. Olee otú ọchịchị ndị Maccabee si bịa ná njedebe?
38 Eleghị anya ndị Maccabee sooro Rom mee nkwekọrịta na 161 T.O.A. ma guzobe otu alaeze na 104 T.O.A. Ma esemokwu dị n’etiti ha na eze Siria bụ́ eze ugwu gara n’ihu. N’ikpeazụ, a kpọrọ Rom ka o tinye aka. Ọchịagha Gnaeus Pompey nke Rom weghaara Jerusalem na 63 T.O.A., mgbe ọ nọchibidosịrị ya ruo ọnwa atọ. Na 39 T.O.A., Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom họpụtara Herọd—onye Edọm—ịbụ eze Judia. N’iweta ọchịchị ndị Maccabee ná njedebe, o weghaara Jerusalem na 37 T.O.A.
39. Olee uru i riteworo site n’ịtụle Daniel 11:1-19?
39 Lee ka o si na-akpali akpali ịhụ ka akụkụ mbụ nke amụma banyere eze abụọ ahụ na-alụ ọgụ si mezuo kpam kpam! N’ezie, lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ileba anya n’akụkọ ihe mere eme nke ihe dị ka afọ 500 mgbe e zichara Daniel ozi amụma ahụ ma mata ndị ọchịchị nọ n’ọkwá nke eze ugwu na eze ndịda! Otú ọ dị, ndị ndị eze abụọ a bụ n’ụzọ ọchịchị na-agbanwe ka agha dị n’etiti ha nọgidere gabiga oge Jisọs Kraịst nọrọ n’elu ụwa, dịrịkwa rute n’ụbọchị anyị. Site n’ijikọta ihe ndị mere n’akụkọ ihe mere eme na nkọwa sara mbara na-akpali mmasị ndị e kpughere n’amụma a, anyị ga-enwe ike ịmata eze abụọ a na-asọrịta mpi.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Olee usoro ndị eze abụọ siri ike pụtara site n’alaeze ndị Gris, oleekwa asọmpi eze ndị ahụ malitere?
• Dị ka e buru n’amụma na Daniel 11:6, olee otú eze abụọ ahụ si ‘dozie okwu n’ụzọ ziri ezi’?
• Olee otú ọgụ ahụ si gaa n’ihu n’etiti
Seleucus nke Abụọ na Ptolemy nke Atọ (Daniel 11:7-9)?
Antiochus nke Atọ na Ptolemy nke Anọ (Daniel 11:10-12)?
Antiochus nke Atọ na Ptolemy nke Ise (Daniel 11:13-16)?
• Gịnị bụ nzube nke alụmdi na nwunye dị n’etiti Cleopatra nke Mbụ na Ptolemy nke Ise, n’ihi gịnịkwa ka atụmatụ ahụ ji kụọ afọ n’ala (Daniel 11:17-19)?
• Olee otú ịṅa ntị na Daniel 11:1-19 siworo baara gị uru?
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke nke 228]
Ndị Eze Dị na Daniel 11:5-19
Eze Ugwu Eze Ndịda
Daniel 11:5 Seleucus Mbụ Nicator Ptolemy nke Mbụ
Daniel 11:6 Antiochus nke Abụọ Ptolemy nke Abụọ
(nwunye ya bụ Laodice) (ada ya bụ Berenice)
Daniel 11:7-9 Seleucus nke Abụọ Ptolemy nke Atọ
Daniel 11:10-12 Antiochus nke Atọ Ptolemy nke Anọ
Daniel 11:13-19 Antiochus nke Atọ Ptolemy nke Ise
(ada ya, Cleopatra Onye nnọchi:
nke Mbụ) Ndị nnọchi: Ptolemy nke Isii
Seleucus nke Anọ na
Antiochus nke Anọ
[Foto]
Mkpụrụ ego nke na-egosi Ptolemy nke Abụọ na nwunye ya
[Foto]
Seleucus nke Mbụ Nicator
[Foto]
Antiochus nke Atọ
[Foto]
Ptolemy nke Isii
[Foto]
Ptolemy nke Atọ na ndị nọchiri ya wuru ụlọ nsọ a nke Horus n’Idfu, Ebe Mgbago Ijipt
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 216, 217]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Aha ahụ bụ́ “eze nke Ugwu” na “eze nke Ndịda” na-ezo aka n’eze ndị dị n’ebe ugwu na n’ebe ndịda nke ala ndị obodo Daniel
MASEDONIA
GRIS
ASIA MINOR
ISRAEL
LIBIA
IJIPT
ETIOPIA
SIRIA
Babilọn
AREBIA
[Foto]
Ptolemy nke Abụọ
[Foto]
Antiochus Onye Ukwu
[Foto]
Mbadamba nkume e dekwasịrị iwu Antiochus Onye Ukwu nyere
[Foto]
Mkpụrụ ego e sere Ptolemy nke Ise n’elu ya
[Foto]
Ọnụ ụzọ ámá Ptolemy nke Atọ, na Karnak, Ijipt
[Foto dị na peeji nke nke 210]
[Foto dị na peeji nke 215]
Seleucus nke Mbụ Nicator
[Foto dị na peeji nke 218]
Ptolemy nke Mbụ