Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 104
  • Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere na uche m anaghị adịli n’otu ihe?
  • Ihe ndị m ga-eme ka uche m nwee ike ịna-adị n’otu ihe
  • Ekwe ntị, tiivi ma ọ bụ kọmputa ò riela m ahụ́?
    Teta!—2011
  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?
    Teta!—2021
  • Ekwe Ntị, Tiivi Ma Ọ Bụ Kọmputa Ọ̀ Na-agbazi M Ara?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Ndị Enyi Gị?
    Teta!—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 104
Ebe otu nwa agbọghọ na-achụpụ ihe ndị na-eme ka uche ya pụọ n’ihe ọ chọrọ ịmụ. Ihe ndị ahụ nọchiri anya egwú, vidio, foto nakwa ozi ndị e zitere n’ekwentị.

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?

  • Gịnị mere na uche m anaghị adịli n’otu ihe?

  • Ihe ndị m ga-eme ka uche m nwee ike ịna-adị n’otu ihe

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị mere na uche m anaghị adịli n’otu ihe?

“Anaghị m agụzi akwụkwọ otú m si agụbu. Ọ na-esiziri m ike ịgụcha paragraf toro ogologo.”​—Elaine.

“M na-ele vidio, ọ na-adị m ka ọ naghị agasi ike, m na-achọkwa ime ya ka ọ gasiwe ike.”​—Miranda.

“Mgbe ọ bụla m na-eme otu ihe dị mkpa, ekwentị m mehaala mkpọtụ, naanị ihe m na-echewezi mgbe ahụ bụ, ‘Ònye ziteere m ozi?’”​—Jane.

Ekwentị na ihe ndị yiri ya, hà nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme? Ụfọdụ sị na o nwere ike. Nicholas Carr, bụ́ onye na-ede akwụkwọ na onye bụ́ ọkachamara n’otú ụlọ ọrụ ga-esi na-eme nke ọma, sịrị: “Ịgakarị n’Ịntanet na-eme ka uche anyị na-apụkarị n’ihe anyị na-eme. Ọ na-eme ka anyị na-achọkarị ka ihe niile na-aga ọsọ ọsọ n’enweghị nsogbu, ma uche anyị agaghị adịcha n’ihe ahụ anyị na-eme.”a

Ka anyị hụ ụzọ ebe atọ ekwentị na ihe ndị yiri ya nwere ike isi mee ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme.

  • Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria, sịrị: “Ụfọdụ ndị na-ezipụ ozi ma ọ bụ na-egwu egwuregwu vidio ma ọ bụdị na-awagharị n’Ịntanet n’ekwentị ha mgbe ha na ndị ọzọ na-akparịta ụka. Ha anaghịdị ege ntị n’ihe onye ha na ya na-akparịta ụka na-ekwu.”

  • Mgbe ị nọ na klas na-amụ ihe. Otu akwụkwọ a kpọrọ Digital Kids, sịrị: “Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ kwuru na ha na-eji ekwentị ha ezipụ ozi, na-achọ ihe n’Ịntanet, na-ele fim ma ọ bụ na-ege egwú mgbe a na-akụziri ha ihe na klas.” Ha ji ekwentị ha na-eme “ihe na-agbasaghị ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ.”

  • Mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị. Otu nwa okorobịa, dị afọ iri abụọ na abụọ, aha ya bụ Chris, sịrị: “Ihe na-akacha esiri m ike bụ ịkwụsị ile anya n’ekwentị m mgbe ọ bụla o mere mkpọtụ.” Ọ bụrụ na ị bụ nwa akwụkwọ, otu ihe onye nkụzi nyere gị mee n’ụlọ nke kwesịrị iwe gị otu awa, nwere ike iwe gị awa atọ ma ọ bụ karịa ma ọ bụrụ na ekwentị gị na-eme ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme.

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọ ga-esi ike uche gị adị n’ihe ị na-eme ma ọ bụrụ na ị na-ekwe ka ekwentị gị na-atụrụ gị ụka ma na-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-eme.

Ebe ịnyịnya ara tụliri otu nwata nwoke elu.

Uche na-anaghị adịli n’otu ihe dị ka ịnyịnya ara. Ọ bụ ya na-ekpebi ebe ọ ga-ebuga onye nwe ya

Ihe ndị m ga-eme ka uche m nwee ike ịna-adị n’otu ihe

  • Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka. Baịbụl sịrị: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.” (Ndị Filipaị 2:4) Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka, na-ege ya ntị nke ọma, i mee otú ahụ, ị na-egosi ya na i ji ya kpọrọ ihe. Na-ele ya anya n’ihu, ekwekwala ka ekwentị gị mee ka uche gị pụọ n’ihe unu na-ekwu.

    “Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka, gbalịa ka anya gị ghara ịna-agakarị n’ekwentị gị. Na-ele onye gị na ya na-ekwurịta okwu anya ma na-ege ya ntị iji gosi na ị na-akwanyere ya ùgwù.”​—Thomas.

    IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka, debe ekwentị gị ebe anya gị na-agaghị eru ya. Ndị ọkachamara kwuru na i jirihaala ekwentị gị, o nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe unu na-akparịta. Ọ pụtara na a kpọhaala gị ma ọ bụ zitere gị ozi, o nwere ike ime ka mkparịta ụka unu kwụsịtụ.

  • Mgbe ị nọ na klas na-amụ ihe. Baịbụl sịrị: “Na-egenụ ntị nke ọma.” (Luk 8:18) Buru ihe a Baịbụl kwuru n’uche mgbe niile. Ọ bụrụ na ụlọ akwụkwọ unu na-ekwe ka unu jiri ekwentị unu na-aga n’Ịntanet mgbe unu nọ na klas, ejila oge ahụ agụ ozi ndị e ziteere gị n’ekwentị, egwu egwuregwu vidio ma ọ bụ gị na ndị ọzọ ana-ezirịta ozi mgbe i kwesịrị ịna-ege ntị n’ihe a na-akụzi.

    “Gbalịa ka ị na-ege ntị nke ọma mgbe ị nọ na klas. Detuo ihe ụfọdụ dị mkpa onye nkụzi na-ekwu. O kwe mee, na-anọ n’ihu oche ka a ghara inwe ọtụtụ ihe ga na-adọpụ gị uche.”​—Karen.

    IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Jiri akwụkwọ na pen na-edetu ihe onye nkụzi na-ekwu kama iji kọmputa ma ọ bụ ekwentị. Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ji aka ya na-edetu ihe ọ na-anụ, ọ ga-esi ike uche ya apụọ n’ihe a na-ekwu, ọ ga-enyekwara ya aka icheta ihe a kụziiri ya.

    Ebe otu nwa agbọghọ nọ n’ime ụlọ ya na-amụ akwụkwọ. O dowere akpa ya, ekwentị ya, na magazin ndị na-adịghị ya mkpa n’ebe anya ya na-anaghị eru.
  • Mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị. Baịbụl sịrị: “Nweta amamihe. Gbalịa ka ị na-aghọta ihe.” (Ilu 4:5) Nke a pụtara na ị ga-echebakwuru ihe echiche ka i nwee ike ịghọta ya nke ọma, ọ bụghị ịgụ ya elu elu iji gafee ule.

    “Mgbe ọ bụla m na-amụ ihe, m na-etinye ekwentị m otú mmadụ na-agaghị enwe ike izitere m ozi ma ọ bụ kpọọ m. M na-eme ya ka uche m nwee ike ịdị n’ihe m na-eme. Anaghị m ele ma è nwere ozi ma ọ bụ ihe ọhụrụ batara n’ekwentị m. O nwee ihe m kwesịrị icheta m ga-eme, m na-edetu ya n’akwụkwọ ka m nwee ike icheta ya ma m mụchaa ihe.”​—Chris.

    IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Hụ na e nweghị ihe nọ gburugburu ebe ị nọ na-amụ ihe nke nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme. Debe ebe ahụ ọcha, hụkwa na o nweghị ihe kwasasịrị ebe niile.

a E si n’akwụkwọ a kpọrọ The Shallows​—What the Internet Is Doing to Our Brains (Ihe Ịntanet Na-eme Ụbụrụ Anyị) nweta ya.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Katie.

“Ị mụwa ihe, i nwere ike ịna-eme ka onye e bu na-agbagharị n’elu mmiri n’abanyeghị n’ime mmiri. Mana, ị chọọ ịmụta ihe, i kwesịrị ịna-eme ka onye banyere n’ime mmiri na-achọ ihe ndị bara uru dị n’ala ala mmiri.”​—Katie.

Rogelio.

“Ọ bụ onye ahụ́ dị mma na-eche echiche nke ọma. M rie nri ndị na-edozi ahụ́, ọ na-enyere m aka ka uche m na-adị n’ihe m na-eme. Ihe ọzọ na-enyere m aka bụ ihi ụra nke ọma. Ọ na-eme ka m mụrụ anya, uche m adịrịkwa n’ihe a na-ekwu.”​—Rogelio.

Ihe ị ga-eburu n’uche: Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?

  • Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka. Gosi na ị na-echebara ndị gị na ha na-ekwurịta okwu echiche. Na-ege ha ntị nke ọma ma na-ele ha anya n’ihu mgbe gị na ha na-akparịta. Ekwela ka ihe ọ bụla dọpụ gị uche.

  • Mgbe ị nọ na klas na-amụ ihe. Agụla ozi ndị e ziteere gị, agbala egwuregwu vidio, ma ọ bụ na-ezigara ndị ọzọ ozi n’ekwentị mgbe a na-akụziri unu ihe na klas.

  • Mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị. Hụ na e nweghị ihe ndị nọ n’ebe ị nọ na-amụ ihe nke nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme. Debe ebe ahụ ọcha, ekwekwala ka e nwee ihe kwasasịrị ebe niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya