Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Septemba p. 27
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘A Ga-eme Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Si n’Ọnwụ Bilie’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gịnị Ka Ịmụ Mmadụ Ọzọ Pụtara?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Septemba p. 27
Ebe Sọl dara n’ala, ìhè si n’eluigwe emee ka ọ ghara ịna-ahụ ụzọ. Ndị Juu ndị ọzọ gbara ya gburugburu.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe ọ sịrị na ọ dị ka ‘à ga-asị na ya bụ nwa a mụkworo amụkwo’? (1 Ndị Kọrịnt 15:8)

Ná 1 Ndị Kọrịnt 15:8, Pọl sịrị: “Mụnwa bụkwa onye ikpeazụ ọ pụtara n’ihu ya, dị ka à ga-asị na m bụ nwa a mụkworo amụkwo.” N’oge gara aga, anyị kwuru na ihe Pọl na-ekwu ebe a bụ ihe mere ya mgbe ọ hụrụ ọhụụ ebe Jizọs dị ebube n’eluigwe. O yiri ka e meere ya ihe ọma mụọ ya, ma ọ bụ kpọlite ya n’ọnwụ, ya abụrụ mmụọ mgbe oge na-erubeghị, ọtụtụ narị afọ tupu a malite inwe ụdị mbilite n’ọnwụ ahụ. Ma, ka anyị na-amụkwu amaokwu a, anyị chọpụtara na e kwesịrị ịgbanwe otú anyị sibu akọwa amaokwu a.

O doro anya na Pọl na-ekwu gbasara ihe mere mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. Ma, gịnị ka o bu n’obi mgbe ọ sịrị na ‘a mụkworo ya amụkwo’? E nwere ihe ụfọdụ o nwere ike ịbụ ha ka o bu n’obi.

Ọ ghọrọ Onye Kraịst na mberede, o sikwaara ya ike. Ọtụtụ mgbe, ịmụkwo nwa na-eme na mberede. Mgbe Sọl (bụ́ onye e mechara kpọwa Pọl) na-aga Damaskọs ka ọ gaa kpagbuo Ndị Kraịst, ọ tụghị anya ịhụ Jizọs, bụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ, n’ọhụụ. Otú o si ghọọ Onye Kraịst juru yanwa anya, jukwa Ndị Kraịst ndị ahụ ọ chọrọ ịga mesie ike n’obodo ahụ. Ihe ọzọ bụ na otú ahụ o si ghọọ Onye Kraịst mere ka ọ ghara ịna-ahụ ụzọ ruo ụbọchị ole na ole.​—Ọrụ 9:1-9, 17-19.

Ọ ghọrọ Onye Kraịst “n’oge na-adabaghị adaba.” Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu Grik a sụgharịrị “onye a mụkworo amụkwo” bụ “onye a mụrụ n’oge na-adabaghị adaba.” Otú Jerusalem Bible si kwuo ya bụ: “M dị ka onye a mụrụ mgbe ọ na-enweghị onye tụrụ anya ya.” Mgbe Pọl ghọrọ Onye Kraịst, Jizọs alaghachila eluigwe. Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie tupu ya alaghachi eluigwe, Pọl ahụghị ya otú ahụ ndị o kwuru banyere ha n’amaokwu ndị bu ụzọ hụrụ ya. (1 Kọr. 15:​4-8) Otú Jizọs si pụta n’ihu ya na mberede nyere ya ohere ịhụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, n’agbanyeghị na o yiri “oge na-adabaghị adaba.”

Ọ na-ekwu na ya erughị eru. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ihe Pọl kwuru ebe a na-ada ka onye na-akatọ onwe ya. Ọ bụrụ ihe Pọl bu n’obi, ọ na-ekwu na ya erughị eru ịbụ onyeozi. O kwudịrị, sị: “N’ime ndịozi niile, ọ bụ m kacha nta, e kwesịghịkwa ịkpọ m onyeozi, maka na akpagburu m ọgbakọ Chineke. Ma, ọ bụ amara Chineke meere m ka m ji nwee ike ịna-arụ ọrụ a.”​—1 Kọr. 15:9, 10.

N’ihi ya, o yiri ka ihe Pọl bu n’obi bụ na otú Jizọs si pụta n’ihu ya dara ya na mberede, na oge ọ ghọrọ Onye Kraịst adabaghị adaba, ma ọ bụ na ya erughị eru ịhụ ọhụụ ahụ dị ịtụnanya. Nke ọ bụla ọ bụ, Pọl ejighị ọhụụ ahụ gwuo egwu. O mere ka obi sie ya ike na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ka a sịkwa ihe mere o ji ekwukarị gbasara ihe ahụ ọ na-atụghị anya ya mere ya ma ọ gwawa ndị ọzọ gbasara mbilite n’ọnwụ Jizọs.​—Ọrụ 22:6-11; 26:13-18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya