Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/15 p. 14-15
  • Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Unu Nọ n’Ụlọ Ọgwụ
  • Ndị Dọkịta Na-enwe Nchegbu
    Teta!—2005
  • Ịkasi Ndị Ọrịa Ha Na-anaghị Ala Ala Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Na-enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Mgbalị Ndị M Mere Iji Mee Nhọrọ Ndị Amamihe Dị na Ha
    Teta!—2000
Teta!—2015
g 11/15 p. 14-15

Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka

Otu nwaanyị aha ya bụ Maribel kwuru na mgbe papa ya chọrọ isi n’ụlọ ọgwụ lawa, ha gakwuuru dọkịta ka ọ gwa ha ihe a chọpụtara n’ọbara papa ha. Dọkịta ahụ gwara ha na o nweghị ọrịa a chọpụtara. Ma, o mechara leruo anya n’ebe e dere ihe a chọpụtara ma hụ na ọbara papa ha adịchaghị otú o kwesịrị ịdị. Ọ rịọrọ ha mgbaghara ma kpọọ dọkịta ga-eleba ya anya. Maribel kwuru na ahụ́ papa ya akatụwala mma nakwa na a garaghị achọpụta ihe ahụ ma a sị na ha ajụwaghị dọkịta ahụ.

Ebe otu nwaanyị na-enyere di ya aka ede otú ọrịa si eme ya na ọgwụ ndị ọ na-aṅụ

Tupu unu agawa na nke dọkịta, depụta otú ọrịa ahụ si eme ya na ọgwụ ọ na-aṅụ

Mmadụ ịna-aga ahụ dọkịta mgbe niile ma ọ bụkwanụ ịnọ n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ ụbọchị adịghị mfe. Ma, ihe a Maribel kwuru n’elu gosiri na enyi mmadụ ma ọ bụ onye ikwu ya ịnọ ya nso mgbe ahụ́ na-adịghị ya bara ezigbo uru n’ihi na o nwere ike ịzọ ya. Olee otú ị ga-esi nyere onye nke gị ahụ́ na-adịghị aka?

Tupu unu agawa ịhụ dọkịta. Nyere onye ahụ aka dee ma otú ọrịa ahụ si eme ya ma ọgwụ ọ na-aṅụ. Deekwa ajụjụ unu ga-ajụ dọkịta. Ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ bụ enyi gị, jụọ ya otú ọrịa ahụ si emebu ya. I nwekwara ike ịjụ ya ma ò nwere onye ezinụlọ ha rịatụrụla ụdị ọrịa ahụ. Echela na dọkịta kwesịrị ịma gbasara ihe ndị ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ ga-ajụ unu ha.

Nwaanyị a na-ede ihe dọkịta na-ekwu gbasara ahụ́ di ya

Gee dọkịta ntị, jụọ ya ajụjụ ụfọdụ dị mkpa, deekwa ihe ụfọdụ ede

Mgbe unu na-ahụ dọkịta. Gị na onye ọrịa ahụ gee dọkịta ntị nke ọma ka unu ghọta ihe ọ na-ekwu. Jụọ ya ajụjụ ma o nwee ihe na-edochaghị gị anya, arụkwala ya ụka. Hapụkwa onye ahụ na-arịa ọrịa ka o jiri ọnụ ya jụọ ya ihe ụfọdụ. Gee ntị nke ọma, deekwa ihe ụfọdụ n’akwụkwọ. Jụọ dọkịta ahụ ka ọ gwa unu ụzọ ndị o nwere ike isi gwọọ ọrịa ahụ. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịgwa onye ọrịa ahụ ka unu nụ ihe dọkịta ọzọ nwere ike ikwu gbasara ọrịa ahụ.

Di na nwunye a na-eleru ihe dọkịta kwuru anya

Lebanụ ihe dọkịta kwuru anya nakwa otú o kwuru ọ ga-esi ṅụọ ọgwụ ya

Mgbe unu hụchara dọkịta lọta. Gị na onye ọrịa ahụ kwurịta ihe unu jetere na nke dọkịta. Nyere ya aka inweta ọgwụ ndị a gwara ya ṅụwa. Hụkwa na ọ na-aṅụ ha otú e si gwa ya. Egbukwala oge ịgwa dọkịta ma e nwee nke nyewere ya nsogbu. Gwakwa onye ọrịa ahụ ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya. Gbaakwa ya ume ka ọ ghara ileghara ihe ọ bụla dọkịta gwara ya ga-enyere ya aka anya, dị ka ịga hụ dọkịta mgbe ọ chọrọ ka ọ bịa. Kọkwaara onye ahụ ihe ọ bụla ọzọ ị ma gbasara ọrịa ya ahụ.

Mgbe Unu Nọ n’Ụlọ Ọgwụ

Ebe otu nwaanyị na onye na-ekwuchitere ya ọnụ ya na-agwa nọọsụ okwu

Hụ na e dejupụtara akwụkwọ ndị dị mkpa nke ọma

Anya ruo gị ala. Obi anaghị erucha onye ọrịa ala ma o rute n’ụlọ ọgwụ. Ma ọ bụrụ na ahụ́ eruo gị ala, i nwere ike ime ka ahụ́ ruo ma yanwa ma ndị ụlọ ọgwụ ala. Ọ ga-eme ka ha lebara ya anya nke ọma. Nyekwara onye ọrịa ahụ aka idejupụta akwụkwọ e ji anabata mmadụ n’ụlọ ọgwụ. Hapụkwa ya ka o jiri aka ya kpebie otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya. Ma, ọ bụrụ na ọrịa na-emesi ya ike nke na ọ gaghị ekwuli okwu, hụ na ndị ụlọ ọgwụ mere ihe o dere n’akwụkwọ gbasara otú e kwesịrị isi agwọ ya nakwa na ha mere ihe onye o dere n’akwụkwọ ga na-ekwuchitere ya ọnụ ya kwuru.a

Nwoke a na-ekwuchitere nwaanyị a na-arịa ọrịa ọnụ ya

Medaa obi gwa dọkịta ihe ị chọpụtara

Agbachila nkịtị. Gwa ndị ụlọ ọgwụ ihe ọ bụla ị chọrọ ịgwa ha. Ọ bụrụ na ị na-akwanyere ha ùgwù mgbe ị na-ekwu uche gị, ọ ga-eme ka ha lebara onye gị anya nke ọma. N’ọtụtụ ụlọ ọgwụ, ọ bụghị otu dọkịta na-agwọ onye ọrịa. Ọ ga-adị mma ma ị na-agwa dọkịta nke ọ bụla ihe ibe ya kwurula gbasara onye ọrịa ị na-elekọta. O nweekwa ihe ọhụrụ ị chọpụtara n’ahụ́ onye ahụ ị na-elekọta, mee ka ha mara.

Nwoke a na-agwa nọọsụ okwu gbasara nwaanyị a ahụ́ na-adịghị

Nyere onye nke gị aka n’egbochighị ndị ụlọ ọgwụ ịrụ ọrụ ha

Kwanyere ha ùgwù, na-ekelekwa ha. Ọrụ ndị ụlọ ọgwụ adịghị mfe. N’ihi ya, kpasoo ha àgwà otú ị ga-achọ ka a na-akpaso gị. (Matiu 7:12) Agwala ha okwu ka à ga-asị na ha amaghị ihe ha na-eme. Kama, na-agwa ha okwu otú ga-egosi na obi siri gị ike na ha ma ọrụ ha. Na-ajakwa ha mma maka mbọ ha na-agba. Ọ bụrụ na i mesoo ha otú a, ọ ga-eme ka ha mee ihe niile ha nwere ike ime iji gwọọ onye ahụ.

O nweghị onye na-anaghị arịa ọrịa. Ma ọ bụrụ na ị gbaa ezigbo mbọ, ị ga-enyeliri onye nke gị aka n’oge ọrịa ji ya aka.—Ilu 17:17.

a Ihe iwu otu obodo kwuru gbasara onye ọrịa ikpebi otú a ga-esi agwọ ya na-adị iche n’ihe iwu obodo ọzọ kwuru. Leruo akwụkwọ na-egosi otú onye ọrịa ahụ chọrọ ka e si gwọọ ya anya nke ọma ka i nwee ike ịmara ma ihe ndị e dere na ya ọ̀ dịkwa otú o kwesịrị ịdị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya