ABỤ NKE 7
Jehova Bụ Ike Anyị
1. Jehova, ọ bụ gị n’enyea-ny’ike.
Naanị gị bụ Chi n’echeben-dị ya.
Anyị niile n’ekwus’Al’eze gị
Man-dị ’madụ g’anụ ma hà g’ajụ.
(UKWE)
OkéN-kumea-nyị, Onye kas’ike,
Anyị n’ekwusa ah’ọma gị.
Jehova, ọ bụ gị n’enyea-ny’ike.
Ị bụụr’anyị niile ebem-gbaba.
2. Jehova, i mere k’anyị h’ụzọ.
I meela k’anyị mat’eziokwu gị.
Baịbụl n’agw’anyị iwu gị niile.
Al’eze gị k’anyị ga n’akwado.
(UKWE)
OkéN-kumea-nyị, Onye kas’ike,
Anyị n’ekwusa ah’ọma gị.
Jehova, ọ bụ gị n’enyea-ny’ike.
Ị bụụr’anyị niile ebem-gbaba.
3. Anyị niile jiọ-ṅụ n’em’uche gị.
Setan n’achọ kan-dị gị laa n’iyi.
Nna, biko cheb’anyị, nyea-ny’ike.
Mee k’anyị fee naanị gị ru’ọgwụgwụ.
(UKWE)
OkéN-kumea-nyị, Onye kas’ike,
Anyị n’ekwusa ah’ọma gị.
Jehova, ọ bụ gị n’enyea-ny’ike.
Ị bụụr’anyị niile ebem-gbaba.
(Gụọkwa 2 Sam. 22:3; Ọma 18:2; Aịza. 43:12.)