Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 12/8 p. 32
  • “Magazin Unu Eriwo M Ahụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Magazin Unu Eriwo M Ahụ”
  • Teta!—2000
Teta!—2000
g00 12/8 p. 32

“Magazin Unu Eriwo M Ahụ”

Akụkụ ụfọdụ nke otu akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Germany natara na nso nso a na-agụ, sị:

“Aghaghị m ikweta na magazin unu eriwo m ahụ. Ọ bụ otu ihe ahụ na-eme m kwa afọ. Nwa obere oge tupu m na-aga ezumike, ana m ekpebi iwepụ mbipụta abụọ kasị ọhụrụ iche m ga-agụ n’ụsọ mmiri. Ọ bụ mkpebi siri ike!

“Ma ozugbo ha na-aba m aka, nsogbu amalitela. M sị ka m letụ ihe ndị dị n’ime ha. Chei, lee akụkọ ndụ! Ọ dị mma, enwere m ike gụtụ ya nanị dị ka ihe mkpali, ma m gaghị agụ isiokwu ọzọ. Oo, ma isiokwu nke ọzọ yiri ihe na-adọrọ mmasị karịsịa. O metụ m n’ahụ ịkwụsị! Achọkwaranụ m ịgụ magazin ndị a n’oge ezumike. Ọ dị mma, ka m gụkwuo nanị otu isiokwu. Ihe ndị dị ‘n’Ikiri Ụwa’ na-enyekarị nnọọ ihe ọmụma! N’ikpeazụ, dị ka unu pụrụ iche, mgbe m na-erule n’ụsọ mmiri, ọ gakwaghị adị otu isiokwu ga-afọdụnụ.”

A na-egosipụta mmasị e nwere na Teta! site n’eziokwu ahụ bụ́ na a na-ebipụta ihe dị ka mkpụrụ 20,300,000 nke mbipụta ọ bụla n’asụsụ 82. Nchekwube ọ na-eme ka e nwee na-amasị ndị na-agụ ya. “Ihe Mere E Ji Na-ebipụta Teta!,” bụ́ nke na-adị ná mbipụta nke ọ bụla, na-akọwa na “magazin nke a na-ewulite ntụkwasị obi ná nkwa nke Onye Okike maka ụwa ọhụrụ nke udo na ntụkwasị obi.”

Ma, ọtụtụ ndị na-ajụ, sị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwere ka ahụhụ dịruo nnọọ ogologo oge?’ A zara ajụjụ a na broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya