“Ụmụ Akwụkwọ Na-eme Nnyocha na Ya Mgbe Mgbe”
OTU onye na-elekọta ọ́bá akwụkwọ, bụ́ onye si Divinópolis, nke dị na steeti Minas Gerais nke Brazil, degaara ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brazil akwụkwọ banyere mmasị dị ukwuu ụmụ akwụkwọ gosiworo na magazin Teta! Ọ kọwara, sị:
“N’ọ́bá akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ gọọmenti bụ́ ebe m na-arụ ọrụ, anyị na-enweta onyinye nke akwụkwọ na magazin nke [Ndịàmà Jehova] bipụtara mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ akwụkwọ nọ n’ebe a bụ́ Onyeàmà Jehova, ụmụ akwụkwọ ndị na-eme nnyocha n’isiokwu dịgasị iche iche na-emekarị nnyocha na Teta! Dị ka ihe atụ, mbipụta nke September 8, 2000 (Bekee) ghọrọ nke kasị baa uru n’ihi isiokwu ya ndị nwere ihe mmụta bụ́ ndị kwuru banyere Egwuregwu Olympic. N’ihi nke a, ọ ga-amasị m ịrịọ unu ka unu zitere anyị ọnụ ọgụgụ buru ibu nke mbipụta dịgasị iche iche nke Teta! E ji m n’aka na unu nwere mmasị dịkwa ka m nwere n’inye ndị na-eto eto anyị ihe ọgụgụ ndị na-ewuli elu.”
Na peeji nke 4, mbipụta ọ bụla nke Teta! na-akọwa ihe mere e ji na-ebipụta magazin ahụ. “Nke kachasị mkpa,” ka ọ na-akọwa, “magazin nke a na-ewulite ntụkwasị obi ná nkwa nke Onye Okike maka ụwa ọhụrụ nke udo na ntụkwasị obi nke na-aga ịnọchị anya ajọ usoro ihe dị ugbu a nke na-emebi iwu n’isi nso.”
Ndịàmà Jehova na-ebipụtakwa broshuọ ndị e mere kpọmkwem iji mezuo nzube ahụ, a kpọrọ otu n’ime ha Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.