A Na-akpọ Gị Òkù—Ị̀ Ga-abịa?
ÒKÙ ỊBỊA EBEE? Ịbịa nzukọ kasị mkpa nke Ndịàmà Jehova na-enwe kwa afọ—ememe ncheta nke ọnwụ Kraịst, nke dabeere ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ́ nke o hiwere. Ihe ndekọ Matiu na-agwa anyị, sị: “Jizọs weere otu ogbe achịcha, mgbe ọ gọzisịworo ya, ọ nyawara ya, ka ọ na-enye ya ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịkwara: ‘Naranụ, rie. Nke a pụtara ahụ́ m.’ Ọzọ, o buuru iko, mgbe o nyesịworo ekele, o bunyekwara ha ya, na-asị: ‘Ṅụọnụ, unu nile; n’ihi na nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’”—Matiu 26:26-28.
A ga-akọwa ihe okwu ndị a pụtara n’ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’afọ a, bụ́ nke dabara na Thursday, March 28, mgbe anyanwụ dasịrị. Anyị na-enwe olileanya na ị ga-abịa. Biko chọpụta site n’aka Ndịàmà Jehova oge na ebe a ga-ezukọ kpọmkwem n’ógbè unu. Anyị ga-anabata gị.