Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g02 9/8 p. 32
  • Ha Nile Naara Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Nile Naara Ya
  • Teta!—2002
Teta!—2002
g02 9/8 p. 32

Ha Nile Naara Ya

N’otu ụlọ akwụkwọ dị na Basel, Switzerland, otu onye nkụzi mara ọkwa na ụmụ akwụkwọ aghaghị ịkwadebe okwu ha ga-ekwuru site na minit 10 ruo 15 n’isiokwu ọ bụla masịrị ha. Rosi, bụ́ onye dị afọ 15 họọrọ “Ịbụ Nwa Okoro na nwa Agbọghọ Gị—Inweta Ihe Kasị Mma n’Ime Ya,” dị ka isiokwu ya.

“Olee ụdị isiokwu dị ihe a?” ka ụmụ akwụkwọ ibe ya jụrụ ya. “Ị̀ na-aga ikwu okwu banyere ọgwụ ọjọọ?”

“Unu ga-ahụ,” ka ọ zaghachiri.

Ná mmechi okwu ya, ụmụ akwụkwọ ahụ kụrụ aka. Rosi kwuziri, sị: “N’ezie, minit 15 ezughị iji kọọ banyere ụzọ mmadụ ga-esi nweta ihe kasị mma n’oge ọ bụ nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ.” Ya mere o kwuru, sị: “Enwere m onyinye m ga-enye unu nile.” O nyere nwa akwụkwọ nke ọ bụla otu akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, akwụkwọ 20 ma a gụkọta ha. A fụchiri ha nke ọma ma denye aha otu nwa akwụkwọ na nke ọ bụla.

Ha nile ji ekele nara akwụkwọ ahụ, e mesịkwara hụ ka ha na-atụle ihe ndị dị na ya, bụ́ ndị gụnyere isiakwụkwọ ndị dị ka: “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ndị Mụrụ M Nyekwuo M Nnwere Onwe?,” “Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Ezi Ndị Enyi?,” “Ọrụ Dị Aṅaa Ka M Kwesịrị Ịhọrọ?,” “Olee Banyere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?,” na “Olee Otú M Ga-esi Mara Ma Ọ̀ Bụ Ezi Ịhụnanya?”

N’ozuzu ya, o nwere isiakwụkwọ 39. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu n’ime akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ògbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya