Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g02 12/8 p. 32
  • ‘Ọchịchọ Maka Paradaịs’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ọchịchọ Maka Paradaịs’
  • Teta!—2002
Teta!—2002
g02 12/8 p. 32

‘Ọchịchọ Maka Paradaịs’

N’afọ gara aga, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Papua New Guinea natara otu akwụkwọ ozi sitere n’aka otu onye na-agụ Teta! bụ́ onye bi na Lae, Morobe Province. Ọ kọwara, sị:

“Aghaghị m ikwenyesi ike na emere m mkpebi dị mma afọ ise gara aga (mgbe m nọ na Port Moresby) ịgụ magazin Teta!, bụ́ nke nzukọ unu na-ebipụta. Agụwo m mbipụta ya ọ bụla kemgbe 1997. Magazin Teta! juru n’ụlọ m.

“Amụtawo m ihe dị ukwuu. Ụtọ asụsụ m adịwo mma karị, ìgwè okwu m, ihe ọmụma m n’ozuzu ya, na nghọta m banyere Onye Okike amụbawo nke ukwuu. Abụrụkwuola m onye na-anagide ihe, onye na-echebara ndị ọzọ echiche, onye na-etinye uche n’ihe, azụlitewokwa m nkwanye ùgwù ka ukwuu n’ebe ákụ́kụ́ na ụmụ anụmanụ nọ. Ana m atụ aro ka ọtụtụ ndị na-agụ Teta! nakwa mbipụta unu ndị ọzọ.”

Onye detara akwụkwọ ozi ahụ kwubiri, sị: “Ekweere m na ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ụwa aghọọ Ndịàmà Jehova, ọchịchọ anyị maka Paradaịs ga-emezu ozugbo. Jidenụ nke unu ji n’ọrụ ọma unu.”

Akwụkwọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-arụtụ aka ná nkwa Bible kwere na a ga-eji ụwa ọhụrụ nke Alaeze Chineke ga-eweta dochie anya usoro ihe dị ugbu a. Akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-arụtụ aka n’Alaeze ahụ dị ka ihe ngwọta nye nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a dị peeji 192 iji tụlee ya n’onwe gị, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya