Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 12/8 p. 32
  • E Mere Ka O Cheta Ihe O Ji Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Mere Ka O Cheta Ihe O Ji Kpọrọ Ihe
  • Teta!—2005
Teta!—2005
g05 12/8 p. 32

E Mere Ka O Cheta Ihe O Ji Kpọrọ Ihe

Ka otu nwanyị natasịrị akwụkwọ ahụ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, o kpebiri iwegara nwanne ya nwanyị nke tọrọ ya otu. Nwanne ya nwanyị a, bụ́ onye dị ihe dị ka afọ 85 ugbu a, na-arịa ọrịa Alzheimer. Otú ọ dị, ruo ihe dị ka afọ iri asaa, nwanyị a bụ onye mmụta Bible na-anụ ọkụ n’obi nakwa onye nkụzi Bible. Ma ọ na-esiri ya ike icheta ihe ndị na-eme ugbu a, ọ na-arakwa ya ahụ́ iji aka ya malite mkparịta ụka.

Nwanne ya nwanyị ahụ nke wetaara ya akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “N’ụbọchị nke mbụ, akọwaara m ya na e mere akwụkwọ a iji nyere ndị nne na nna aka ịkụnye ụkpụrụ na ozizi Bible n’ime ụmụ ha. Agwakwara m ya na m chọrọ ịgụrụ ya akwụkwọ a. Ọ dịghị ihe o kwuru. Otú ọ dị, mgbe m malitere ịgụ ya, o gosiri nnọọ mmasị, na-azakwa ajụjụ ọ bụla a jụrụ n’akwụkwọ ahụ. E nwere oge ndị ọ na-abụ m na-agụpụta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ya agụtọpụ ya n’isi—ma ọ na-abụ dị ka e si dee ya ná nsụgharị King James Version, bụ́ nke ọ maara site n’oge ọ ka na-eto eto. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ m gụwa otu akụkọ dị na Bible bụ́ nke ọ maara, ya ejide m aka, ma kwuo, sị, ‘Oo, echetara m ya!’

“Mgbe o ruwere oge anyị ga-esi na nke nwanne m nwanyị a laghachi—bụ́ mgbe m gụọrọla ya ihe karịrị ọkara akwụkwọ ahụ—o kwuru na ọ ga-amasị ya ka a na-agụrụ ya ya. Di ya, bụ́ onye na-egboro ya mkpa ya nile, gara n’ihu n’ịgụtọpụrụ ya akwụkwọ ahụ. Ahụmahụ a nyeere m aka ịghọta uru dị n’ịgụrụ ndị agadi na ndị ahụ́ na-esighị ike akwụkwọ ndị dị otú ahụ.”

Akwụkwọ a nke nwere ọmarịcha ihe osise, nke dịkwa peeji 256 ndị há ka nke magazin a, na-amasị ma ndị na-eto eto ma ndị agadi. Ọ bụ ezie na e ji ụzọ dị mfe kọwaa ihe mmụta ndị dabeere n’ihe Jizọs Kraịst kụziri, ihe a tụlere na ya bụ maka ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya