Mmadụ Inwe Ọtụtụ Ihe Ọ Ga-esi na Ha Mee Nhọrọ, Ọ̀ Na-eme Ka Ọ Ghara Inwecha Afọ Ojuju?
NDỊ nọ na United States taa nwere “ọtụtụ ohere ịhọrọ ihe ha chọrọ ná ndụ karịa otú o kwetụrụla mee n’oge ọ bụla ọzọ,” ka otu isiokwu gbara na magazin bụ́ Scientific American na-ekwu. Nke a bụ eziokwu ma a bịa ná mmadụ ịhọrọ ihe ọ chọrọ ịzụ, ihe a ga-arụrụ ya, ọrụ ọ chọrọ ịrụ, na ọbụna ụdị ndị ha na ya ga na-akpakọrịta. Ọ pụrụ iyi ihe amamihe dị na ya iche na mmadụ inwe ọtụtụ ihe ọ pụrụ isi na ha họrọ ihe ga-eme ka o nwekwuo afọ ojuju ná ndụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe ijuanya na nke a na-ebutere ya obi mgbawa. N’ụzọ dị aṅaa?
Isiokwu ahụ kwuru na otú ndị mmadụ si ele ime nhọrọ anya na-emetụta obi ụtọ ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-etinye oge na mgbalị dị ukwuu n’ịhụ na ha zụtara ihe kachasị mma site n’inyocha ihe e dere n’elu ihe ahụ ha chọrọ ịzụ nke ọma na inyocha ihe ọhụrụ ha chọrọ ịzụ, ha na-abịakwa jiri ihe ha zụtara na-atụnyere ihe ndị ọzọ zụtara. Ndị ọzọ na-azụ ihe na-agbalị inweta “ihe dị ha mma,” ọ sọkwa ya ya bụrụ na e nwere ndị ka mma ha pụrụ ịhọrọ. Ndị dị otú ahụ hụhaala ihe ha chọrọ, ha akwụsị ịchọ ya ebe ọzọ.
O doro anya na ọ na-esikwuru ndị na-achọkarị ihe kasị mma ike ikpebi nke ha ga-ahọrọ ma ọ bụrụ na ihe ndị ha ga-esi na ya mee nhọrọ karịrị akarị. Magazin ahụ bụ́ Scientific American na-ekwu na mgbe ha họrọsịịrị nke ha chọrọ ịhọrọ, “ha na-anọ na-eche banyere ihe ndị nke ha na-enweghị ohere nyochaa.” N’ikpeazụ, ndị dị otú ahụ “adịghị enwe afọ ojuju ná ndụ ka ndị ọzọ, obi ụtọ ha na-enwe adịghị aharu ka nke ndị ọzọ, ha adịghị enwekwa olileanya maka ọdịnihu ka ndị ọzọ, ha na-akakwa ndị ọzọ ada mbà n’obi.” Gịnị ka a pụrụ isi na nke a ghọta? Isiokwu ahụ kwuru, sị: “E nwere ezi ihe mere a ga-eji kweta na ọtụtụ ihe ndị mmadụ nwere isi na ha eme nhọrọ, so akpata ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, obi ụtọ imerime mmadụ na-adịghị enwe n’ebe nile n’ụwa taa.”
Otú ọ dị, ndị mere nchọpụta a na-ekwu na a pụrụ ibelata nchekasị a na-enweta n’ime nhọrọ. N’ụzọ dị aṅaa?
● Anyị pụrụ ikpebi iwetụlata aka n’ihe ole anyị chọrọ isi na ha mee nhọrọ mgbe mkpebi dị otú ahụ na-adịghị oké mkpa. Dị ka ihe atụ, mee ka ọ bụrụ iwu na ị gaghị abanye ihe karịrị ụlọ ahịa abụọ mgbe ị chọrọ ịzụ uwe.
● Ị hụhaala kpọmkwem ihe ị chọrọ, zụrụ ya kama ịnọkwa na-achọ nke ‘kasị mma,’ bụ́kwanụ nke ị na-agaghị achọta. Ị zụtahaala ya, echekwala banyere ya ọzọ.
● Hụ na ị kwụsịlatara ịdị na-eche banyere ihe mere nke ahụ ị na-azụtaghị ji yie ka ọ mara mma. Mụta ịdị na-elekwasị anya n’ihe ndị mere nke ahụ ị zụtara ji dị mma.
● A na-ekwukarị okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ na ị chọghị ka e mechuo gị ihu, atụla anya ihe dị ukwuu.” Ma, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịgbaso ndụmọdụ ahụ ma ọ bụrụ na ị chọrọ inwekwu afọ ojuju ná ndụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]
Ebe e si nweta ya: Magazin bụ́ Scientific American