Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/10 p. 32
  • Ọ Gbachiteere Ihe O Kweere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Gbachiteere Ihe O Kweere
  • Teta!—2010
Teta!—2010
g 1/10 p. 32

Ọ Gbachiteere Ihe O Kweere

◼ Mgbe ụlọ akwụkwọ Mọgan, bụ́ otu nwatakịrị dị afọ asaa, na-achọ ịga ezumike, a gwara ndị klas ha ka ha gụọ akụkọ banyere ememme Krismas. Mọgan gwara onye nkụzi ha na Baịbụl akwadoghị ememme ahụ. Onye nkụzi ha gwaziri ya ka ọ gụọ akụkọ ọzọ akọnuche ya ga-ekwe ya gụọ.

Ka e mechara, ụlọ akwụkwọ ha mere ememme e ji enye ụmụaka ndị mere nke ọma onyinye, a kpọkwara ndị ezinụlọ Mọgan n’ememme ahụ. Mgbe ha bịara ememme ahụ, o juru Mọgan anya mgbe e nyere ya onyinye n’ihi na o ji obi ike gbachitere ihe o kweere. Mgbe a jụrụ ya otú o si mụta inwe obi ike, o kwuru na ya na ndị ezinụlọ ya na-amụ akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ebe e si nweta ihe a kọwara n’akwụkwọ ahụ bụ n’akụkọ ndụ Jizọs Kraịst na n’ihe ndị ọ kụziri.

Akwụkwọ a, nke dị peeji 256 ma nwee ihe osise ndị mara mma, ga-enyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka ịkparịta ụka. N’ime ya, e nwere isiokwu ndị dị ka “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha,” “Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?,” na “Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị.”

Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetara m otu akwụkwọ e sere n’ebe a. Dee asụsụ ị chọrọ ya.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya